Jonah 1 (BOICB)

1 Okwu ONYENWE ANYỊ bịakwutere Jona nwa Amitai, na-asị, 2 “Bilie, gaa Ninive, bụ obodo ukwu ahụ, kwusaa okwu megide ya, nʼihi na ajọ omume ha abịarutela nʼihu m.” 3 Ma Jona gbapụrụ ọsọ site nʼihu ONYENWE ANYỊ chee ihu ya ije Tashish. O biliri jee Jopa, nʼebe ọ hụrụ ụgbọ mmiri nke na-aga Tashish. Ọ kwụrụ ụgwọ ije ụgbọ, banye isoro gaa Tashish ka o nwee ike gbapụ site nʼihu ONYENWE ANYỊ. 4 Ma ONYENWE ANYỊ mere ka ifufe dị egwu malite ife nʼelu osimiri ahụ, ebili mmiri bidokwara na-amagharị, chọọ itiwasị ụgbọ mmiri ahụ. 5 Mgbe ahụ, ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ ahụ tụrụ oke egwu, malite itiku chi ha. Ha malitekwara itufu ihe niile dị nʼụgbọ mmiri ahụ, ime ka ụgbọ ahụ dị mfe.Ma nʼoge ihe ndị a na-eme, Jona nọrịị nʼala ala ụgbọ mmiri ahụ ebe o dinara ala na-arahụ ụra. 6 Onyeisi ụgbọ jekwuru Jona sị ya, “Gịnị ka ị nọ nʼebe a na-eme, ị na-arahụ ụra? Bilie, kpọkuo chi gị, ma eleghị anya o nwere ike ileta anyị anya, meere anyị ebere, zọpụta anyị.” 7 Mgbe ahụ, ndị nọ nʼụgbọ sịrịtara ibe ha, “Bịanụ ka anyị fee nza mata onye ihe ọjọọ dị otu a sị nʼaka ya bịakwasị anyị.” Ya mere, ha fere nza, nza ahụ a maa Jona. 8 Nʼihi ya, ha sịrị ya, “Gwa anyị, onye mere ka ihe dị otu a bịakwasị anyị. Gịnị bụ ọrụ gị? Ebee ka i si bịa? Ị bụ onye obodo ebee? Ole agbụrụ i si na ya pụta?” 9 Ọ sịrị, “Abụ m onye Hibru, na onye na-akpọ isiala nye ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nke eluigwe, onye kere osimiri na ala akọrọ.” 10 Egwu dị ukwuu tụrụ ụmụ nwoke ahụ, ha sịrị ya, “Gịnị ka i mere?” Nʼihi na ha matara na o si nʼihu ONYENWE ANYỊ na-agbapụ ọsọ, nʼihi na ọ gwala ha rịị na ọ bụ otu o si dị. 11 Ma ebili mmiri ahụ gara nʼihu na-amali nʼike nʼike. Nʼihi ya, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme gị, nke ga-eme ka osimiri dajụọ?” 12 Ọ gwara ha, “Bulienụ m tụnye nʼime osimiri. Nke a ga-emekwa ka ọ dajụọ. Nʼihi na amaara m na ọ bụ nʼihi m ka ebili mmiri ọjọọ a ji na-abịakwasị unu.” 13 Kama, ndị ikom ahụ ji ike nyasie ụgbọ ahụ ichigharị ya laghachi nʼelu ala, ma ha enweghị ike. Nʼihi na oke osimiri ahụ na-amali elu karịa ka ọ dị na mbụ. 14 Mgbe ahụ, ha tikuru ONYENWE ANYỊ mkpu akwa sị, “ONYENWE ANYỊ, biko ekwela ka anyị nwụọ nʼihi ọnwụ nwoke a. Biko, atụkwasịkwala ọbara nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ nʼisi anyị, nʼihi na gị ONYENWE ANYỊ emeela dịka i si chọọ.” 15 Ya mere, ha buliri Jona elu tụnye ya nʼime osimiri ahụ, ebili mmiri ahụ dajụkwara. 16 Mgbe nke a mere ndị ikom ahụ tụrụ egwu ONYENWE ANYỊ nke ukwuu. Ha chụụrụ ONYENWE ANYỊ aja, kwekwa ya nkwa dị iche iche. 17 Ma ONYENWE ANYỊ akwadolarị otu azụ buru ibu ka o loo Jona. Ya mere, Jona nọrọ nʼafọ azụ ahụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị.

In Other Versions

Jonah 1 in the ANGEFD

Jonah 1 in the ANTPNG2D

Jonah 1 in the AS21

Jonah 1 in the BAGH

Jonah 1 in the BBPNG

Jonah 1 in the BBT1E

Jonah 1 in the BDS

Jonah 1 in the BEV

Jonah 1 in the BHAD

Jonah 1 in the BIB

Jonah 1 in the BLPT

Jonah 1 in the BNT

Jonah 1 in the BNTABOOT

Jonah 1 in the BNTLV

Jonah 1 in the BOATCB

Jonah 1 in the BOATCB2

Jonah 1 in the BOBCV

Jonah 1 in the BOCNT

Jonah 1 in the BOECS

Jonah 1 in the BOGWICC

Jonah 1 in the BOHCB

Jonah 1 in the BOHCV

Jonah 1 in the BOHLNT

Jonah 1 in the BOHNTLTAL

Jonah 1 in the BOILNTAP

Jonah 1 in the BOITCV

Jonah 1 in the BOKCV

Jonah 1 in the BOKCV2

Jonah 1 in the BOKHWOG

Jonah 1 in the BOKSSV

Jonah 1 in the BOLCB

Jonah 1 in the BOLCB2

Jonah 1 in the BOMCV

Jonah 1 in the BONAV

Jonah 1 in the BONCB

Jonah 1 in the BONLT

Jonah 1 in the BONUT2

Jonah 1 in the BOPLNT

Jonah 1 in the BOSCB

Jonah 1 in the BOSNC

Jonah 1 in the BOTLNT

Jonah 1 in the BOVCB

Jonah 1 in the BOYCB

Jonah 1 in the BPBB

Jonah 1 in the BPH

Jonah 1 in the BSB

Jonah 1 in the CCB

Jonah 1 in the CUV

Jonah 1 in the CUVS

Jonah 1 in the DBT

Jonah 1 in the DGDNT

Jonah 1 in the DHNT

Jonah 1 in the DNT

Jonah 1 in the ELBE

Jonah 1 in the EMTV

Jonah 1 in the ESV

Jonah 1 in the FBV

Jonah 1 in the FEB

Jonah 1 in the GGMNT

Jonah 1 in the GNT

Jonah 1 in the HARY

Jonah 1 in the HNT

Jonah 1 in the IRVA

Jonah 1 in the IRVB

Jonah 1 in the IRVG

Jonah 1 in the IRVH

Jonah 1 in the IRVK

Jonah 1 in the IRVM

Jonah 1 in the IRVM2

Jonah 1 in the IRVO

Jonah 1 in the IRVP

Jonah 1 in the IRVT

Jonah 1 in the IRVT2

Jonah 1 in the IRVU

Jonah 1 in the ISVN

Jonah 1 in the JSNT

Jonah 1 in the KAPI

Jonah 1 in the KBT1ETNIK

Jonah 1 in the KBV

Jonah 1 in the KJV

Jonah 1 in the KNFD

Jonah 1 in the LBA

Jonah 1 in the LBLA

Jonah 1 in the LNT

Jonah 1 in the LSV

Jonah 1 in the MAAL

Jonah 1 in the MBV

Jonah 1 in the MBV2

Jonah 1 in the MHNT

Jonah 1 in the MKNFD

Jonah 1 in the MNG

Jonah 1 in the MNT

Jonah 1 in the MNT2

Jonah 1 in the MRS1T

Jonah 1 in the NAA

Jonah 1 in the NASB

Jonah 1 in the NBLA

Jonah 1 in the NBS

Jonah 1 in the NBVTP

Jonah 1 in the NET2

Jonah 1 in the NIV11

Jonah 1 in the NNT

Jonah 1 in the NNT2

Jonah 1 in the NNT3

Jonah 1 in the PDDPT

Jonah 1 in the PFNT

Jonah 1 in the RMNT

Jonah 1 in the SBIAS

Jonah 1 in the SBIBS

Jonah 1 in the SBIBS2

Jonah 1 in the SBICS

Jonah 1 in the SBIDS

Jonah 1 in the SBIGS

Jonah 1 in the SBIHS

Jonah 1 in the SBIIS

Jonah 1 in the SBIIS2

Jonah 1 in the SBIIS3

Jonah 1 in the SBIKS

Jonah 1 in the SBIKS2

Jonah 1 in the SBIMS

Jonah 1 in the SBIOS

Jonah 1 in the SBIPS

Jonah 1 in the SBISS

Jonah 1 in the SBITS

Jonah 1 in the SBITS2

Jonah 1 in the SBITS3

Jonah 1 in the SBITS4

Jonah 1 in the SBIUS

Jonah 1 in the SBIVS

Jonah 1 in the SBT

Jonah 1 in the SBT1E

Jonah 1 in the SCHL

Jonah 1 in the SNT

Jonah 1 in the SUSU

Jonah 1 in the SUSU2

Jonah 1 in the SYNO

Jonah 1 in the TBIAOTANT

Jonah 1 in the TBT1E

Jonah 1 in the TBT1E2

Jonah 1 in the TFTIP

Jonah 1 in the TFTU

Jonah 1 in the TGNTATF3T

Jonah 1 in the THAI

Jonah 1 in the TNFD

Jonah 1 in the TNT

Jonah 1 in the TNTIK

Jonah 1 in the TNTIL

Jonah 1 in the TNTIN

Jonah 1 in the TNTIP

Jonah 1 in the TNTIZ

Jonah 1 in the TOMA

Jonah 1 in the TTENT

Jonah 1 in the UBG

Jonah 1 in the UGV

Jonah 1 in the UGV2

Jonah 1 in the UGV3

Jonah 1 in the VBL

Jonah 1 in the VDCC

Jonah 1 in the YALU

Jonah 1 in the YAPE

Jonah 1 in the YBVTP

Jonah 1 in the ZBP