Joshua 1 (BOICB)

1 Mgbe Mosis, bụ odibo ONYENWE ANYỊ nwụrụ, ONYENWE ANYỊ gwara Joshua nwa Nun, onye na-enyere Mosis aka okwu sị, 2 “Mosis, odibo m anwụọla. Ugbu a, jikere onwe gị, meekwa ka ndị m jikere ịgafe ofe ọzọ nke osimiri Jọdan, ịbanye nʼala ahụ m na-aga inye ha, bụ ndị Izrel. 3 Ana m agwa gị ihe m gwara Mosis mgbe ọ dị ndụ sị, Ebe ọbụla unu ga-azọkwasị ụkwụ unu nʼala, ala ahụ ga-abụ nke unu. 4 Oke ala unu ga-abụ site nʼọzara dị na ndịda ruo Lebanọn, ma site nʼiyi ukwu Yufretis, tinyere ala niile nke ndị Het, ruo nʼosimiri ukwu ahụ dị nʼọdịda anyanwụ. 5 Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị. Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis. Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ. 6 Dịrị ike, nweekwa ume, nʼihi na ị ga-abụ onye ga-edu ndị a iketa ala ahụ m ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha ochie. 7 “Naanị dịrị ike, nweekwa ume. Lezie anya ime ihe niile Mosis bụ odibo m nyere gị nʼiwu. Ewezugala onwe gị na ya gaa aka nri maọbụ aka ekpe, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma nʼebe ọbụla ị na-aga. 8 Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ị ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma. 9 Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.” 10 Mgbe ahụ, Joshua nyere ndịisi Izrel niile iwu sị ha, 11 “Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke na-enye unu.’ ” 12 Joshua kpọkọtara ndịisi ebo Ruben, na Gad, na ọkara ebo Manase, gwa ha okwu sị, 13 “Chetanụ iwu ahụ Mosis odibo ONYENWE ANYỊ nyere unu, mgbe ọ sịrị, ‘ONYENWE ANYỊ Chineke unu na-enye unu izuike. O nyekwala unu ala a.’ 14 Kama ndị nwunye unu, na ụmụntakịrị unu, na anụ ụlọ unu, ga-anọ nʼala a dị nʼọwụwa anyanwụ nke Mosis nyere unu. Ma ndị agha unu, ndị jikeere ejike, ga-eduru ndị Izrel ndị ọzọ gafee osimiri Jọdan inyere ụmụnna ha aka, 15 tutu ruo mgbe ONYENWE ANYỊ Chineke unu nyere ha izuike, dịka o si nye unu, na tutu ruo mgbe ha nwetara ala niile bụ nke ONYENWE ANYỊ Chineke unu ga-enye ha. Mgbe nke a mezuru, unu ga-alaghachi azụ, nweta ala ahụ Mosis onyeozi ONYENWE ANYỊ nyere unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan.” 16 Mgbe ahụ, ha zara Joshua, “Ihe ọbụla nke ị nyere anyị nʼiwu anyị ga-eme ha, ebe ọbụla i zigara anyị ka anyị ga-aga. 17 Anyị ga-ege gị ntị dịka anyị si gee Mosis ntị. Ka ONYENWE ANYỊ Chineke gị nọnyere gị dịka o si nọnyere Mosis. 18 Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu i nyere anyị, ọ ga-anwụ. Naanị dịrị ike, nweekwa obi ike.”

In Other Versions

Joshua 1 in the ANGEFD

Joshua 1 in the ANTPNG2D

Joshua 1 in the AS21

Joshua 1 in the BAGH

Joshua 1 in the BBPNG

Joshua 1 in the BBT1E

Joshua 1 in the BDS

Joshua 1 in the BEV

Joshua 1 in the BHAD

Joshua 1 in the BIB

Joshua 1 in the BLPT

Joshua 1 in the BNT

Joshua 1 in the BNTABOOT

Joshua 1 in the BNTLV

Joshua 1 in the BOATCB

Joshua 1 in the BOATCB2

Joshua 1 in the BOBCV

Joshua 1 in the BOCNT

Joshua 1 in the BOECS

Joshua 1 in the BOGWICC

Joshua 1 in the BOHCB

Joshua 1 in the BOHCV

Joshua 1 in the BOHLNT

Joshua 1 in the BOHNTLTAL

Joshua 1 in the BOILNTAP

Joshua 1 in the BOITCV

Joshua 1 in the BOKCV

Joshua 1 in the BOKCV2

Joshua 1 in the BOKHWOG

Joshua 1 in the BOKSSV

Joshua 1 in the BOLCB

Joshua 1 in the BOLCB2

Joshua 1 in the BOMCV

Joshua 1 in the BONAV

Joshua 1 in the BONCB

Joshua 1 in the BONLT

Joshua 1 in the BONUT2

Joshua 1 in the BOPLNT

Joshua 1 in the BOSCB

Joshua 1 in the BOSNC

Joshua 1 in the BOTLNT

Joshua 1 in the BOVCB

Joshua 1 in the BOYCB

Joshua 1 in the BPBB

Joshua 1 in the BPH

Joshua 1 in the BSB

Joshua 1 in the CCB

Joshua 1 in the CUV

Joshua 1 in the CUVS

Joshua 1 in the DBT

Joshua 1 in the DGDNT

Joshua 1 in the DHNT

Joshua 1 in the DNT

Joshua 1 in the ELBE

Joshua 1 in the EMTV

Joshua 1 in the ESV

Joshua 1 in the FBV

Joshua 1 in the FEB

Joshua 1 in the GGMNT

Joshua 1 in the GNT

Joshua 1 in the HARY

Joshua 1 in the HNT

Joshua 1 in the IRVA

Joshua 1 in the IRVB

Joshua 1 in the IRVG

Joshua 1 in the IRVH

Joshua 1 in the IRVK

Joshua 1 in the IRVM

Joshua 1 in the IRVM2

Joshua 1 in the IRVO

Joshua 1 in the IRVP

Joshua 1 in the IRVT

Joshua 1 in the IRVT2

Joshua 1 in the IRVU

Joshua 1 in the ISVN

Joshua 1 in the JSNT

Joshua 1 in the KAPI

Joshua 1 in the KBT1ETNIK

Joshua 1 in the KBV

Joshua 1 in the KJV

Joshua 1 in the KNFD

Joshua 1 in the LBA

Joshua 1 in the LBLA

Joshua 1 in the LNT

Joshua 1 in the LSV

Joshua 1 in the MAAL

Joshua 1 in the MBV

Joshua 1 in the MBV2

Joshua 1 in the MHNT

Joshua 1 in the MKNFD

Joshua 1 in the MNG

Joshua 1 in the MNT

Joshua 1 in the MNT2

Joshua 1 in the MRS1T

Joshua 1 in the NAA

Joshua 1 in the NASB

Joshua 1 in the NBLA

Joshua 1 in the NBS

Joshua 1 in the NBVTP

Joshua 1 in the NET2

Joshua 1 in the NIV11

Joshua 1 in the NNT

Joshua 1 in the NNT2

Joshua 1 in the NNT3

Joshua 1 in the PDDPT

Joshua 1 in the PFNT

Joshua 1 in the RMNT

Joshua 1 in the SBIAS

Joshua 1 in the SBIBS

Joshua 1 in the SBIBS2

Joshua 1 in the SBICS

Joshua 1 in the SBIDS

Joshua 1 in the SBIGS

Joshua 1 in the SBIHS

Joshua 1 in the SBIIS

Joshua 1 in the SBIIS2

Joshua 1 in the SBIIS3

Joshua 1 in the SBIKS

Joshua 1 in the SBIKS2

Joshua 1 in the SBIMS

Joshua 1 in the SBIOS

Joshua 1 in the SBIPS

Joshua 1 in the SBISS

Joshua 1 in the SBITS

Joshua 1 in the SBITS2

Joshua 1 in the SBITS3

Joshua 1 in the SBITS4

Joshua 1 in the SBIUS

Joshua 1 in the SBIVS

Joshua 1 in the SBT

Joshua 1 in the SBT1E

Joshua 1 in the SCHL

Joshua 1 in the SNT

Joshua 1 in the SUSU

Joshua 1 in the SUSU2

Joshua 1 in the SYNO

Joshua 1 in the TBIAOTANT

Joshua 1 in the TBT1E

Joshua 1 in the TBT1E2

Joshua 1 in the TFTIP

Joshua 1 in the TFTU

Joshua 1 in the TGNTATF3T

Joshua 1 in the THAI

Joshua 1 in the TNFD

Joshua 1 in the TNT

Joshua 1 in the TNTIK

Joshua 1 in the TNTIL

Joshua 1 in the TNTIN

Joshua 1 in the TNTIP

Joshua 1 in the TNTIZ

Joshua 1 in the TOMA

Joshua 1 in the TTENT

Joshua 1 in the UBG

Joshua 1 in the UGV

Joshua 1 in the UGV2

Joshua 1 in the UGV3

Joshua 1 in the VBL

Joshua 1 in the VDCC

Joshua 1 in the YALU

Joshua 1 in the YAPE

Joshua 1 in the YBVTP

Joshua 1 in the ZBP