Joshua 11 (BOICB)

1 Mgbe Jabin eze Hazọ nụrụ nke a, o ziri ozi zigara Jobab eze ndị Madọn, zigakwara ndị eze obodo Shịmrọn na Akshaf, 2 na ndị eze bi nʼobodo ugwu ugwu, na ndị bi nʼime Araba, na ndịda Kineret, na ndagwurugwu ọdịda anyanwụ, na nʼime Nafọt Doa, nke dị nʼọdịda anyanwụ, 3 zigakwara eze ndị Kenan ndị bi nʼọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ, zigakwara eze ndị Amọrait, na eze ndị Het, na eze ndị Periz, na nke ndị Jebus nke dị nʼala ugwu. O zigakwara eze ndị Hiv ndị bi na ndịda Hemon, na mpaghara Mizpa. 4 Ndị eze a niile kwekọrịtara chịkọtaa ndị agha ha niile nʼotu. Ndị agha ha chịkọtara dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha ji ọtụtụ ịnyịnya na ọtụtụ ụgbọ agha. 5 Eze ndị a niile zukọrọ maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri Merọm, maka ibuso Izrel agha. 6 Ma ONYENWE ANYỊ sịrị Joshua, “Atụla ha egwu, nʼihi na echi, nʼoge dịka ugbu a, aga m ewere ha niile nʼọnọdụ ndị egburu egbu nyefee ha nʼaka Izrel. Ị ga-ebipụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, kpọọkwa ụgbọ agha ha niile ọkụ.” 7 Ya mere, Joshua na ndị agha ya niile bịaruru akụkụ mmiri Merọm na mberede, lụso ha agha. 8 ONYENWE ANYỊ nyefere ndị agha ha nʼaka ndị Izrel, ndị lụgburu ha, chụọ ha ọsọ ruo nʼoke ala Saịdọn, ruokwa ebe a na-akpọ Mizrefot Maim, na ruo nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼime Ndagwurugwu Mizpa. Ya mere, o nweghị ọ bụladị otu onye iro a hapụrụ ndụ nʼagha ahụ. 9 Joshua na ndị agha ya mere ha ihe ONYENWE ANYỊ kwuru na a ga-eme ha. Ha gbupụrụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, surekwaa ụgbọ agha ha niile nʼọkụ. 10 Mgbe ahụ, Joshua laghachiri azụ busoo Hazọ agha merie ya, were mma agha gbuo eze ya, nʼihi na Hazọ bụrịị isi obodo alaeze ahụ niile. 11 Ha ji mma agha gbuo ndị niile bi nʼobodo ahụ, bibie ha kpamkpam, ọ dịghị onye a hapụrụ nke na-eku ume. O sukwara Hazọ ọkụ. 12 Joshua weere obodo niile nke ndị eze ahụ na ndị eze ha niile, jiri mma agha gbuchapụ ha. Ọ lakwara ha niile nʼiyi, dịka Mosis onyeozi ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu. 13 Ma ndị Izrel esughị obodo ọbụla nʼime ndị ahụ niile e wuru na mkputamkpu ala ọkụ, karịakwa obodo Hazọ, nke Joshua kpọrọ ọkụ. 14 Ihe niile a kwatara nʼagha nʼobodo ndị a, na anụ ụlọ ha niile, ka ndị Izrel weere. Ma ha gburu mmadụ niile. Ha ahapụghị ọ bụladị otu onye ndụ. 15 Nʼihi na nke a bụ iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis onyeozi ya. Mosis nyekwara Joshua otu iwu a. Ugbu a Joshua emeela dịka a gwara ya. O mezuru ihe ndị a niile, bụ nke ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 16 Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile, bụ ala ugwu ugwu ahụ, na ala Negeb, na ala Goshen, na obosara ala ọdịda anyanwụ ahụ niile, na ala Araba, na ala ugwu ahụ niile, na ala ahụ dị na mgbada ugwu Izrel. 17 Nʼihi nke a, ala ndị Izrel nwere gbasara nʼụzọ niile site nʼugwu Halak, nke dị nso na Sia, ruo Baal-Gad nke dị na Ndagwurugwu Lebanọn, na ndịda ugwu Hemon. Joshua jidere ma gbukwaa ndị eze ndị ala ahụ niile. 18 O were Joshua ogologo oge imeri obodo ndị a niile na eze ha nʼagha. 19 Ọ dịkwaghị obodo ọzọ e mere ka ha na ụmụ Izrel dị nʼudo karịa naanị ndị Hiv, ndị bi na Gibiọn. Obodo ndị ọzọ niile ka a lara nʼiyi. 20 Nʼihi na ọ bụ ONYENWE ANYỊ, nʼonwe ya, mere ka ndị eze ahụ nyịchie obi ha, ka ha lụso Izrel agha, ka o si otu a laa ha nʼiyi, kpochapụkwa ha niile, na-emereghị ha amara, dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 21 Nʼoge ahụ kwa, Joshua gara kpochapụ ndị Anak ahụ bi nʼala ugwu ugwu, ya bụ, na Hebrọn, na Debịa, na Anab, na ala ugwu ugwu Juda, na ala ugwu ugwu Izrel. O gburu ha niile, laa obodo ha nʼiyi. 22 Ọ dịkwaghị otu onye Anak a hapụrụ ndụ nʼoke ala Izrel niile, karịakwa ndị fọdụrụ na Gaza, na Gat, na nʼime Ashdọd. 23 Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile dịka ONYENWE ANYỊ si nye ya Mosis nʼiwu. O nyekwara ndị Izrel ala ahụ dịka ihe nketa ha. O kenyere ha ala ahụ dịka ebo ha si dị. Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, ala ahụ dara jụụ. Ibu agha adịghịkwa nʼime ya ọzọ.

In Other Versions

Joshua 11 in the ANGEFD

Joshua 11 in the ANTPNG2D

Joshua 11 in the AS21

Joshua 11 in the BAGH

Joshua 11 in the BBPNG

Joshua 11 in the BBT1E

Joshua 11 in the BDS

Joshua 11 in the BEV

Joshua 11 in the BHAD

Joshua 11 in the BIB

Joshua 11 in the BLPT

Joshua 11 in the BNT

Joshua 11 in the BNTABOOT

Joshua 11 in the BNTLV

Joshua 11 in the BOATCB

Joshua 11 in the BOATCB2

Joshua 11 in the BOBCV

Joshua 11 in the BOCNT

Joshua 11 in the BOECS

Joshua 11 in the BOGWICC

Joshua 11 in the BOHCB

Joshua 11 in the BOHCV

Joshua 11 in the BOHLNT

Joshua 11 in the BOHNTLTAL

Joshua 11 in the BOILNTAP

Joshua 11 in the BOITCV

Joshua 11 in the BOKCV

Joshua 11 in the BOKCV2

Joshua 11 in the BOKHWOG

Joshua 11 in the BOKSSV

Joshua 11 in the BOLCB

Joshua 11 in the BOLCB2

Joshua 11 in the BOMCV

Joshua 11 in the BONAV

Joshua 11 in the BONCB

Joshua 11 in the BONLT

Joshua 11 in the BONUT2

Joshua 11 in the BOPLNT

Joshua 11 in the BOSCB

Joshua 11 in the BOSNC

Joshua 11 in the BOTLNT

Joshua 11 in the BOVCB

Joshua 11 in the BOYCB

Joshua 11 in the BPBB

Joshua 11 in the BPH

Joshua 11 in the BSB

Joshua 11 in the CCB

Joshua 11 in the CUV

Joshua 11 in the CUVS

Joshua 11 in the DBT

Joshua 11 in the DGDNT

Joshua 11 in the DHNT

Joshua 11 in the DNT

Joshua 11 in the ELBE

Joshua 11 in the EMTV

Joshua 11 in the ESV

Joshua 11 in the FBV

Joshua 11 in the FEB

Joshua 11 in the GGMNT

Joshua 11 in the GNT

Joshua 11 in the HARY

Joshua 11 in the HNT

Joshua 11 in the IRVA

Joshua 11 in the IRVB

Joshua 11 in the IRVG

Joshua 11 in the IRVH

Joshua 11 in the IRVK

Joshua 11 in the IRVM

Joshua 11 in the IRVM2

Joshua 11 in the IRVO

Joshua 11 in the IRVP

Joshua 11 in the IRVT

Joshua 11 in the IRVT2

Joshua 11 in the IRVU

Joshua 11 in the ISVN

Joshua 11 in the JSNT

Joshua 11 in the KAPI

Joshua 11 in the KBT1ETNIK

Joshua 11 in the KBV

Joshua 11 in the KJV

Joshua 11 in the KNFD

Joshua 11 in the LBA

Joshua 11 in the LBLA

Joshua 11 in the LNT

Joshua 11 in the LSV

Joshua 11 in the MAAL

Joshua 11 in the MBV

Joshua 11 in the MBV2

Joshua 11 in the MHNT

Joshua 11 in the MKNFD

Joshua 11 in the MNG

Joshua 11 in the MNT

Joshua 11 in the MNT2

Joshua 11 in the MRS1T

Joshua 11 in the NAA

Joshua 11 in the NASB

Joshua 11 in the NBLA

Joshua 11 in the NBS

Joshua 11 in the NBVTP

Joshua 11 in the NET2

Joshua 11 in the NIV11

Joshua 11 in the NNT

Joshua 11 in the NNT2

Joshua 11 in the NNT3

Joshua 11 in the PDDPT

Joshua 11 in the PFNT

Joshua 11 in the RMNT

Joshua 11 in the SBIAS

Joshua 11 in the SBIBS

Joshua 11 in the SBIBS2

Joshua 11 in the SBICS

Joshua 11 in the SBIDS

Joshua 11 in the SBIGS

Joshua 11 in the SBIHS

Joshua 11 in the SBIIS

Joshua 11 in the SBIIS2

Joshua 11 in the SBIIS3

Joshua 11 in the SBIKS

Joshua 11 in the SBIKS2

Joshua 11 in the SBIMS

Joshua 11 in the SBIOS

Joshua 11 in the SBIPS

Joshua 11 in the SBISS

Joshua 11 in the SBITS

Joshua 11 in the SBITS2

Joshua 11 in the SBITS3

Joshua 11 in the SBITS4

Joshua 11 in the SBIUS

Joshua 11 in the SBIVS

Joshua 11 in the SBT

Joshua 11 in the SBT1E

Joshua 11 in the SCHL

Joshua 11 in the SNT

Joshua 11 in the SUSU

Joshua 11 in the SUSU2

Joshua 11 in the SYNO

Joshua 11 in the TBIAOTANT

Joshua 11 in the TBT1E

Joshua 11 in the TBT1E2

Joshua 11 in the TFTIP

Joshua 11 in the TFTU

Joshua 11 in the TGNTATF3T

Joshua 11 in the THAI

Joshua 11 in the TNFD

Joshua 11 in the TNT

Joshua 11 in the TNTIK

Joshua 11 in the TNTIL

Joshua 11 in the TNTIN

Joshua 11 in the TNTIP

Joshua 11 in the TNTIZ

Joshua 11 in the TOMA

Joshua 11 in the TTENT

Joshua 11 in the UBG

Joshua 11 in the UGV

Joshua 11 in the UGV2

Joshua 11 in the UGV3

Joshua 11 in the VBL

Joshua 11 in the VDCC

Joshua 11 in the YALU

Joshua 11 in the YAPE

Joshua 11 in the YBVTP

Joshua 11 in the ZBP