Joshua 17 (BOICB)
1 Nke a bụ oke e kenyere ndị ebo Manase, bụ ọkpara Josef, ya bụ Makia ọkpara Manase, onye bụ nna nna ndị Gilead. Onye natara ala Gilead na Bashan, nʼihi na ndị agbụrụ Makia bụ dike nʼagha. 2 Ya mere, oke a dịịrị ndị fọdụrụ nʼebo Manase dịka ezinaụlọ ha si dị. Agbụrụ Abieza, Helek, Asriel, Shekem, Hefa na Shemida. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom agbụrụ Manase, nwa Josef, dịka ikwu ha si dị. 3 Ma Zelofehad, nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, amụtaghị ụmụ ndị ikom kama ọ mụtara naanị ụmụ ndị inyom, ndị aha ha bụ nke a: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. 4 Ndị inyom ndị a bịakwutere Elieza, onye nchụaja na Joshua nwa Nun, nʼihu ndị ndu ụmụ Izrel niile sị ha, “ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị ya kenye anyị ala nke anyị, dịka o si kenye ụmụ ndị ikom ikwu anyị.” Ya mere, dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya Mosis nʼiwu, Joshua nyere ha ihe nketa ruuru ha nʼetiti ụmụnne nna ha, dịka ndị ọzọ si keta. 5 Manase chịtara ala oke iri, tinyere Gilead, na Bashan nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan, 6 nʼihi na e mere ka ndị inyom Manase keta oke nʼetiti ndị ikom ebo Manase. Ala fọdụrụ na Gilead bụ ndị ikom ebo Manase nwe ya. 7 Oke ala ebo Manase gbatịrị site nʼAsha ruo na Mikmetat, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Shekem. Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ndịda site nʼebe ahụ tinyere ndị bi nʼala En-Tapụọa. 8 Ala dị gburugburu Tapụọa bụ ala ebo Manase, ma obodo Tapụọa nʼonwe ya, nke dị nʼoke ala ebo Manase, bụ obodo ebo Ifrem. 9 Oke ala ụmụ Manase gbatịrị ga ndịda ruo na mmiri iyi Kana. Ụfọdụ obodo ndị Ifrem dị nʼebe ahụ, nʼetiti obodo ndị Manase, kama oke ala ndị Manase nʼakụkụ ugwu iyi ahụ kwụsịrị nʼosimiri Mediterenịa. 10 Ala dị na ndịda bụ nke e kenyere Ifrem, ma ala mgbago ugwu bụ nke Manase. Ala ndị Manase gbatịrị ruo nʼosimiri Mediterenịa ma ha na ndị Asha nwekọrọ oke ala nʼakụkụ ugwu, ebe ha na ndị Isaka nwere oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. 11 Manase ka e nyere obodo ndị a, nke dị nʼala e nyere Isaka na Asha: obodo Bet-Shan, na Ibleam, na Doa, na Endoa, na Teanak, na Megido, na obodo nta niile gbara ha gburugburu. Obodo nke atọ bụ Nafọt. 12 Ma ụmụ Manase enweghị ike ịchụpụ ndị Kenan bi nʼobodo ndị ahụ, nʼihi na ndị Kenan nọgidere bichie obodo ndị a. 13 Ma nʼikpeazụ, mgbe ụmụ Izrel ghọrọ ndị dị ike, ha achụpụghị ndị Kenan niile bi nʼobodo ndị a kpamkpam, kama ha mere ka ha bụrụ ndị na-ejere ụmụ Izrel ozi, dịka ndị ohu ha. 14 Ma ụmụ ụmụ Josef sịrị Joshua, “Gịnị mere i ji nye anyị naanị otu ụzọ ala ka ọ bụrụ ihe nketa anyị? Ị hụrụ na ONYENWE ANYỊ gọziri anyị mee ka ọnụọgụgụ anyị baa ụba.” 15 Joshua zara sị ha: “Ọ bụrụ na ala ugwu ugwu Ifrem agaghị ezuru unu nʼihi na unu bara ụba nʼọnụọgụgụ, gaanụ nʼoke ọhịa sụchasịa ala, nʼime ala ndị Periz, na nke ndị Refaim.” 16 Ụmụ Josef zara Joshua sị, “Ala ugwu ugwu a agaghị ezuru anyị. Ọzọ, ndị Kenan niile bi nʼala dị larịị nwere ụgbọala igwe, ma ndị niile bi na Bet-Shan, na ụmụ obodo nta ha na ndị bikwa na Ndagwurugwu Jezril.” 17 Ma Joshua zara ụmụ Josef, ya bụ, Ifrem na Manase, sị ha, “Unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, bụrụkwa ndị dị ike, ọ bụghị naanị otu oke ka unu ga-eketa, 18 nʼihi na ala ugwu ugwu oke ọhịa ahụ bụkwa nke unu. Sụchaanụ ya, ruo na nsọtụ ya, ka ọ bụrụ nke unu. Ọ bụ ezie na ndị Kenan bi nʼime ya nwere ụgbọ agha igwe, bụrụkwa ndị sịrị ike, unu nwere ike ịchụpụ ha.”
In Other Versions
Joshua 17 in the ANGEFD
Joshua 17 in the ANTPNG2D
Joshua 17 in the AS21
Joshua 17 in the BAGH
Joshua 17 in the BBPNG
Joshua 17 in the BBT1E
Joshua 17 in the BDS
Joshua 17 in the BEV
Joshua 17 in the BHAD
Joshua 17 in the BIB
Joshua 17 in the BLPT
Joshua 17 in the BNT
Joshua 17 in the BNTABOOT
Joshua 17 in the BNTLV
Joshua 17 in the BOATCB
Joshua 17 in the BOATCB2
Joshua 17 in the BOBCV
Joshua 17 in the BOCNT
Joshua 17 in the BOECS
Joshua 17 in the BOGWICC
Joshua 17 in the BOHCB
Joshua 17 in the BOHCV
Joshua 17 in the BOHLNT
Joshua 17 in the BOHNTLTAL
Joshua 17 in the BOILNTAP
Joshua 17 in the BOITCV
Joshua 17 in the BOKCV
Joshua 17 in the BOKCV2
Joshua 17 in the BOKHWOG
Joshua 17 in the BOKSSV
Joshua 17 in the BOLCB
Joshua 17 in the BOLCB2
Joshua 17 in the BOMCV
Joshua 17 in the BONAV
Joshua 17 in the BONCB
Joshua 17 in the BONLT
Joshua 17 in the BONUT2
Joshua 17 in the BOPLNT
Joshua 17 in the BOSCB
Joshua 17 in the BOSNC
Joshua 17 in the BOTLNT
Joshua 17 in the BOVCB
Joshua 17 in the BOYCB
Joshua 17 in the BPBB
Joshua 17 in the BPH
Joshua 17 in the BSB
Joshua 17 in the CCB
Joshua 17 in the CUV
Joshua 17 in the CUVS
Joshua 17 in the DBT
Joshua 17 in the DGDNT
Joshua 17 in the DHNT
Joshua 17 in the DNT
Joshua 17 in the ELBE
Joshua 17 in the EMTV
Joshua 17 in the ESV
Joshua 17 in the FBV
Joshua 17 in the FEB
Joshua 17 in the GGMNT
Joshua 17 in the GNT
Joshua 17 in the HARY
Joshua 17 in the HNT
Joshua 17 in the IRVA
Joshua 17 in the IRVB
Joshua 17 in the IRVG
Joshua 17 in the IRVH
Joshua 17 in the IRVK
Joshua 17 in the IRVM
Joshua 17 in the IRVM2
Joshua 17 in the IRVO
Joshua 17 in the IRVP
Joshua 17 in the IRVT
Joshua 17 in the IRVT2
Joshua 17 in the IRVU
Joshua 17 in the ISVN
Joshua 17 in the JSNT
Joshua 17 in the KAPI
Joshua 17 in the KBT1ETNIK
Joshua 17 in the KBV
Joshua 17 in the KJV
Joshua 17 in the KNFD
Joshua 17 in the LBA
Joshua 17 in the LBLA
Joshua 17 in the LNT
Joshua 17 in the LSV
Joshua 17 in the MAAL
Joshua 17 in the MBV
Joshua 17 in the MBV2
Joshua 17 in the MHNT
Joshua 17 in the MKNFD
Joshua 17 in the MNG
Joshua 17 in the MNT
Joshua 17 in the MNT2
Joshua 17 in the MRS1T
Joshua 17 in the NAA
Joshua 17 in the NASB
Joshua 17 in the NBLA
Joshua 17 in the NBS
Joshua 17 in the NBVTP
Joshua 17 in the NET2
Joshua 17 in the NIV11
Joshua 17 in the NNT
Joshua 17 in the NNT2
Joshua 17 in the NNT3
Joshua 17 in the PDDPT
Joshua 17 in the PFNT
Joshua 17 in the RMNT
Joshua 17 in the SBIAS
Joshua 17 in the SBIBS
Joshua 17 in the SBIBS2
Joshua 17 in the SBICS
Joshua 17 in the SBIDS
Joshua 17 in the SBIGS
Joshua 17 in the SBIHS
Joshua 17 in the SBIIS
Joshua 17 in the SBIIS2
Joshua 17 in the SBIIS3
Joshua 17 in the SBIKS
Joshua 17 in the SBIKS2
Joshua 17 in the SBIMS
Joshua 17 in the SBIOS
Joshua 17 in the SBIPS
Joshua 17 in the SBISS
Joshua 17 in the SBITS
Joshua 17 in the SBITS2
Joshua 17 in the SBITS3
Joshua 17 in the SBITS4
Joshua 17 in the SBIUS
Joshua 17 in the SBIVS
Joshua 17 in the SBT
Joshua 17 in the SBT1E
Joshua 17 in the SCHL
Joshua 17 in the SNT
Joshua 17 in the SUSU
Joshua 17 in the SUSU2
Joshua 17 in the SYNO
Joshua 17 in the TBIAOTANT
Joshua 17 in the TBT1E
Joshua 17 in the TBT1E2
Joshua 17 in the TFTIP
Joshua 17 in the TFTU
Joshua 17 in the TGNTATF3T
Joshua 17 in the THAI
Joshua 17 in the TNFD
Joshua 17 in the TNT
Joshua 17 in the TNTIK
Joshua 17 in the TNTIL
Joshua 17 in the TNTIN
Joshua 17 in the TNTIP
Joshua 17 in the TNTIZ
Joshua 17 in the TOMA
Joshua 17 in the TTENT
Joshua 17 in the UBG
Joshua 17 in the UGV
Joshua 17 in the UGV2
Joshua 17 in the UGV3
Joshua 17 in the VBL
Joshua 17 in the VDCC
Joshua 17 in the YALU
Joshua 17 in the YAPE
Joshua 17 in the YBVTP
Joshua 17 in the ZBP