Joshua 2 (BOICB)

1 Joshua nwa Nun sitere na Shitim zipụ ndị nnyopụta abụọ na nzuzo sị ha, “Gaanụ leta otu ihe si aga nʼala ahụ, karịsịa nʼobodo Jeriko.” Ha gara nʼobodo ahụ baa nʼụlọ nwanyị akwụna aha ya bụ Rehab nọọ ọnọdụ nʼebe ahụ. 2 Ma otu onye gwara eze Jeriko okwu sị, “Lee, ụfọdụ ụmụ ndị ikom Izrel batara obodo a nʼabalị inyochapụta ala anyị.” 3 Mgbe eze Jeriko nụrụ okwu a, o zigaara Rehab ozi sị, “Kpọpụta ndị ikom ahụ batara nʼụlọ gị nʼihi na ha bịara iledo ala anyị.” 4 Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa. 5 Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.” 6 (Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.) 7 Ya mere, ndị ikom ahụ pụrụ na-achụ ndị nnyopụta ahụ nʼakụkụ ụzọ gara ngabiga Jọdan. Ma ngwangwa ha pụrụ, e mechiri ọnụ ụzọ ama e si abata obodo ahụ. 8 Ma tupu ndị nnyopụta ahụ edina ala ịrahụ ụra nʼabalị ahụ, Rehab rịgokwuru ha, 9 gwa ha sị, “Ama m na ONYENWE ANYỊ enyela unu ala a, marakwa na oke ụjọ nke egwu unu adakwasịla anyị, nke mere na ndị niile bi nʼime ala a na-agbaze nʼegwu nʼihi unu, 10 nʼihi na anyị anụla otu ONYENWE ANYỊ si mee ka mmiri dị nʼOsimiri Uhie taa nʼihi unu, mgbe unu si nʼIjipt pụta. Anyị nụkwara ihe unu mere Saịhọn, na Ọg, bụ eze abụọ ndị Amọrị, ndị bi nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, otu unu si bibie ha, gbuchapụ ndị niile bi nʼala ahụ. 11 Ma mgbe anyị nụrụ ihe ndị a, obi anyị gbazere nʼihi ụjọ, mmụọ onye ọbụla dara mba nʼihi unu, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke unu bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. 12 “Ugbu a, ebe ọ bụ na m emeelara unu ebere, jirinụ ONYENWE ANYỊ ṅụọrọ m iyi na unu ga-emere ezinaụlọ m ebere. Gosinụ m ihe ịrịbama nʼeziokwu, 13 na unu ga-emekwa ka ndụ nna m, na nne m, na ụmụnne m ndị ikom na ndị inyom, na ndị ezinaụlọ ha niile dịrị, na unu ga-anapụta anyị site nʼọnwụ.” 14 Ndị ikom ahụ kwere ya nkwa sị, “Ndụ anyị lara ndụ unu. Ọ bụrụ na ị gbaghị anyị ama, anyị ga-egosi gị obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi mgbe ONYENWE ANYỊ ga-enye anyị ala a.” 15 Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ. 16 Ọ gwakwara ha sị, “Gbalaganụ nʼugwu, zoonụ onwe unu nʼebe ahụ ụbọchị atọ, tutu ndị ahụ na-achọ unu alaghachi azụ. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịpụta laghachi ebe unu si bịa.” 17 Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị, 18 ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile. 19 Ọ bụrụ na onye ọbụla esite nʼụlọ gị pụọ nʼezi, ọbara ya agaghị adị anyị nʼisi, anyị agaghị abụkwa ndị ikpe mara. Ma ikpe ọmụma dịrị anyị ma ọ bụrụ nʼihe ọbụla emee onye ọbụla gị na ya so nọdụ nʼime ụlọ. 20 Ma ọ bụrụ na ị gbaa anyị ama, ọ dịkwaghị iwu ji anyị imezu iyi a i mere ka anyị ṅụọrọ gị.” 21 Rehab zara sị ha, “Dịka okwu niile unu kwuru si dị, otu a ka ọ ga-adị.”O zilagara ha. Ha pụkwara gaara onwe ha. Ma Rehab kekwasịrị ụdọ uhie uhie ahụ nʼọnụ oghereikuku ụlọ ya. 22 Ndị ikom abụọ ahụ gara zoo onwe ha nʼugwu ahụ. Ha nọrọ ụbọchị atọ nʼebe ahụ dịka Rehab gwara ha, tutu ndị ahụ na-achụ ha laghachiri nʼobodo Jeriko. Ndị a chọọrọ ha gaa ebe niile, nʼokporoụzọ niile, ma ha ahụghị ha. 23 Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha. 24 Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, ONYENWE ANYỊ enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.”

In Other Versions

Joshua 2 in the ANGEFD

Joshua 2 in the ANTPNG2D

Joshua 2 in the AS21

Joshua 2 in the BAGH

Joshua 2 in the BBPNG

Joshua 2 in the BBT1E

Joshua 2 in the BDS

Joshua 2 in the BEV

Joshua 2 in the BHAD

Joshua 2 in the BIB

Joshua 2 in the BLPT

Joshua 2 in the BNT

Joshua 2 in the BNTABOOT

Joshua 2 in the BNTLV

Joshua 2 in the BOATCB

Joshua 2 in the BOATCB2

Joshua 2 in the BOBCV

Joshua 2 in the BOCNT

Joshua 2 in the BOECS

Joshua 2 in the BOGWICC

Joshua 2 in the BOHCB

Joshua 2 in the BOHCV

Joshua 2 in the BOHLNT

Joshua 2 in the BOHNTLTAL

Joshua 2 in the BOILNTAP

Joshua 2 in the BOITCV

Joshua 2 in the BOKCV

Joshua 2 in the BOKCV2

Joshua 2 in the BOKHWOG

Joshua 2 in the BOKSSV

Joshua 2 in the BOLCB

Joshua 2 in the BOLCB2

Joshua 2 in the BOMCV

Joshua 2 in the BONAV

Joshua 2 in the BONCB

Joshua 2 in the BONLT

Joshua 2 in the BONUT2

Joshua 2 in the BOPLNT

Joshua 2 in the BOSCB

Joshua 2 in the BOSNC

Joshua 2 in the BOTLNT

Joshua 2 in the BOVCB

Joshua 2 in the BOYCB

Joshua 2 in the BPBB

Joshua 2 in the BPH

Joshua 2 in the BSB

Joshua 2 in the CCB

Joshua 2 in the CUV

Joshua 2 in the CUVS

Joshua 2 in the DBT

Joshua 2 in the DGDNT

Joshua 2 in the DHNT

Joshua 2 in the DNT

Joshua 2 in the ELBE

Joshua 2 in the EMTV

Joshua 2 in the ESV

Joshua 2 in the FBV

Joshua 2 in the FEB

Joshua 2 in the GGMNT

Joshua 2 in the GNT

Joshua 2 in the HARY

Joshua 2 in the HNT

Joshua 2 in the IRVA

Joshua 2 in the IRVB

Joshua 2 in the IRVG

Joshua 2 in the IRVH

Joshua 2 in the IRVK

Joshua 2 in the IRVM

Joshua 2 in the IRVM2

Joshua 2 in the IRVO

Joshua 2 in the IRVP

Joshua 2 in the IRVT

Joshua 2 in the IRVT2

Joshua 2 in the IRVU

Joshua 2 in the ISVN

Joshua 2 in the JSNT

Joshua 2 in the KAPI

Joshua 2 in the KBT1ETNIK

Joshua 2 in the KBV

Joshua 2 in the KJV

Joshua 2 in the KNFD

Joshua 2 in the LBA

Joshua 2 in the LBLA

Joshua 2 in the LNT

Joshua 2 in the LSV

Joshua 2 in the MAAL

Joshua 2 in the MBV

Joshua 2 in the MBV2

Joshua 2 in the MHNT

Joshua 2 in the MKNFD

Joshua 2 in the MNG

Joshua 2 in the MNT

Joshua 2 in the MNT2

Joshua 2 in the MRS1T

Joshua 2 in the NAA

Joshua 2 in the NASB

Joshua 2 in the NBLA

Joshua 2 in the NBS

Joshua 2 in the NBVTP

Joshua 2 in the NET2

Joshua 2 in the NIV11

Joshua 2 in the NNT

Joshua 2 in the NNT2

Joshua 2 in the NNT3

Joshua 2 in the PDDPT

Joshua 2 in the PFNT

Joshua 2 in the RMNT

Joshua 2 in the SBIAS

Joshua 2 in the SBIBS

Joshua 2 in the SBIBS2

Joshua 2 in the SBICS

Joshua 2 in the SBIDS

Joshua 2 in the SBIGS

Joshua 2 in the SBIHS

Joshua 2 in the SBIIS

Joshua 2 in the SBIIS2

Joshua 2 in the SBIIS3

Joshua 2 in the SBIKS

Joshua 2 in the SBIKS2

Joshua 2 in the SBIMS

Joshua 2 in the SBIOS

Joshua 2 in the SBIPS

Joshua 2 in the SBISS

Joshua 2 in the SBITS

Joshua 2 in the SBITS2

Joshua 2 in the SBITS3

Joshua 2 in the SBITS4

Joshua 2 in the SBIUS

Joshua 2 in the SBIVS

Joshua 2 in the SBT

Joshua 2 in the SBT1E

Joshua 2 in the SCHL

Joshua 2 in the SNT

Joshua 2 in the SUSU

Joshua 2 in the SUSU2

Joshua 2 in the SYNO

Joshua 2 in the TBIAOTANT

Joshua 2 in the TBT1E

Joshua 2 in the TBT1E2

Joshua 2 in the TFTIP

Joshua 2 in the TFTU

Joshua 2 in the TGNTATF3T

Joshua 2 in the THAI

Joshua 2 in the TNFD

Joshua 2 in the TNT

Joshua 2 in the TNTIK

Joshua 2 in the TNTIL

Joshua 2 in the TNTIN

Joshua 2 in the TNTIP

Joshua 2 in the TNTIZ

Joshua 2 in the TOMA

Joshua 2 in the TTENT

Joshua 2 in the UBG

Joshua 2 in the UGV

Joshua 2 in the UGV2

Joshua 2 in the UGV3

Joshua 2 in the VBL

Joshua 2 in the VDCC

Joshua 2 in the YALU

Joshua 2 in the YAPE

Joshua 2 in the YBVTP

Joshua 2 in the ZBP