Joshua 3 (BOICB)
1 Nʼisi ụtụtụ, Joshua na ụmụ Izrel niile hapụrụ Shitim bịaruo nʼakụkụ osimiri Jọdan, maa ụlọ ikwu nʼebe ahụ. Nʼebe a ka ha nọ chere tutu ruo mgbe ha ga-agafe. 2 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ndịisi ụmụ Izrel gabigara jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ahụ, 3 nye ha iwu sị, “Mgbe unu hụrụ igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu, ka ndị nchụaja, ụmụ Livayị, bulitere ya, unu onwe unu ga-esi nʼebe unu nọ bilie soro ha nʼazụ. 4 Ma a ga-enwe oke nʼetiti unu na ha, ihe dịka otu kilomita site nʼebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị. Unu agaghị abịaru ya nso. Nke a bụ maka ị mara ụzọ unu ga-eso, nʼihi na unu esibeghị nʼụzọ a gaa ije mbụ.” 5 Joshua gwara ndị Izrel sị, “Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na echi ka ONYENWE ANYỊ ga-eme oke ihe ebube dị iche iche nʼetiti unu.” 6 Joshua gwara ndị nchụaja sị ha, “Bulienụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gabiga nʼihu ndị Izrel.” Ha buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bido ịga nʼihu ụmụ Izrel. 7 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị. 8 Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ” 9 Mgbe ahụ, Joshua gwara ụmụ Izrel niile sị, “Bịanụ nso, bịanụ nụrụ okwu niile nke ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 10 Otu a ka unu ga-esi mata nʼezie na Chineke dị ndụ nọ nʼetiti unu, unu ga-amatakwa na ọ ghaghị ịnapụ ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Hiv, na ndị Periz, na ndị Gigash, na ndị Amọrait, na ndị Jebus ala ha nʼihu unu. 11 Lee, igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, Onyenwe ụwa niile ga-agabiga nʼihu unu banye nʼime Jọdan. 12 Ugbu a sitenụ nʼebo Izrel niile họpụta ndị ikom iri na abụọ, site nʼebo ọbụla otu onye. 13 Ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, Onyenwe ụwa niile zọnyere ụkwụ na Jọdan, mmiri Jọdan nke si nʼebe elu ya na-arịdata ga-akwụsị ịsọ, guzoro dịka mgbidi.” 14 Ya mere, mgbe ndị Izrel sitere nʼụlọ ikwu ha bilie njem ịgabiga osimiri Jọdan, ndị nchụaja bụ igbe ọgbụgba ndụ buuru ha ụzọ na-aga ha nʼihu. 15 Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile. Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan, 16 mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko. 17 Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.
In Other Versions
Joshua 3 in the ANGEFD
Joshua 3 in the ANTPNG2D
Joshua 3 in the AS21
Joshua 3 in the BAGH
Joshua 3 in the BBPNG
Joshua 3 in the BBT1E
Joshua 3 in the BDS
Joshua 3 in the BEV
Joshua 3 in the BHAD
Joshua 3 in the BIB
Joshua 3 in the BLPT
Joshua 3 in the BNT
Joshua 3 in the BNTABOOT
Joshua 3 in the BNTLV
Joshua 3 in the BOATCB
Joshua 3 in the BOATCB2
Joshua 3 in the BOBCV
Joshua 3 in the BOCNT
Joshua 3 in the BOECS
Joshua 3 in the BOGWICC
Joshua 3 in the BOHCB
Joshua 3 in the BOHCV
Joshua 3 in the BOHLNT
Joshua 3 in the BOHNTLTAL
Joshua 3 in the BOILNTAP
Joshua 3 in the BOITCV
Joshua 3 in the BOKCV
Joshua 3 in the BOKCV2
Joshua 3 in the BOKHWOG
Joshua 3 in the BOKSSV
Joshua 3 in the BOLCB
Joshua 3 in the BOLCB2
Joshua 3 in the BOMCV
Joshua 3 in the BONAV
Joshua 3 in the BONCB
Joshua 3 in the BONLT
Joshua 3 in the BONUT2
Joshua 3 in the BOPLNT
Joshua 3 in the BOSCB
Joshua 3 in the BOSNC
Joshua 3 in the BOTLNT
Joshua 3 in the BOVCB
Joshua 3 in the BOYCB
Joshua 3 in the BPBB
Joshua 3 in the BPH
Joshua 3 in the BSB
Joshua 3 in the CCB
Joshua 3 in the CUV
Joshua 3 in the CUVS
Joshua 3 in the DBT
Joshua 3 in the DGDNT
Joshua 3 in the DHNT
Joshua 3 in the DNT
Joshua 3 in the ELBE
Joshua 3 in the EMTV
Joshua 3 in the ESV
Joshua 3 in the FBV
Joshua 3 in the FEB
Joshua 3 in the GGMNT
Joshua 3 in the GNT
Joshua 3 in the HARY
Joshua 3 in the HNT
Joshua 3 in the IRVA
Joshua 3 in the IRVB
Joshua 3 in the IRVG
Joshua 3 in the IRVH
Joshua 3 in the IRVK
Joshua 3 in the IRVM
Joshua 3 in the IRVM2
Joshua 3 in the IRVO
Joshua 3 in the IRVP
Joshua 3 in the IRVT
Joshua 3 in the IRVT2
Joshua 3 in the IRVU
Joshua 3 in the ISVN
Joshua 3 in the JSNT
Joshua 3 in the KAPI
Joshua 3 in the KBT1ETNIK
Joshua 3 in the KBV
Joshua 3 in the KJV
Joshua 3 in the KNFD
Joshua 3 in the LBA
Joshua 3 in the LBLA
Joshua 3 in the LNT
Joshua 3 in the LSV
Joshua 3 in the MAAL
Joshua 3 in the MBV
Joshua 3 in the MBV2
Joshua 3 in the MHNT
Joshua 3 in the MKNFD
Joshua 3 in the MNG
Joshua 3 in the MNT
Joshua 3 in the MNT2
Joshua 3 in the MRS1T
Joshua 3 in the NAA
Joshua 3 in the NASB
Joshua 3 in the NBLA
Joshua 3 in the NBS
Joshua 3 in the NBVTP
Joshua 3 in the NET2
Joshua 3 in the NIV11
Joshua 3 in the NNT
Joshua 3 in the NNT2
Joshua 3 in the NNT3
Joshua 3 in the PDDPT
Joshua 3 in the PFNT
Joshua 3 in the RMNT
Joshua 3 in the SBIAS
Joshua 3 in the SBIBS
Joshua 3 in the SBIBS2
Joshua 3 in the SBICS
Joshua 3 in the SBIDS
Joshua 3 in the SBIGS
Joshua 3 in the SBIHS
Joshua 3 in the SBIIS
Joshua 3 in the SBIIS2
Joshua 3 in the SBIIS3
Joshua 3 in the SBIKS
Joshua 3 in the SBIKS2
Joshua 3 in the SBIMS
Joshua 3 in the SBIOS
Joshua 3 in the SBIPS
Joshua 3 in the SBISS
Joshua 3 in the SBITS
Joshua 3 in the SBITS2
Joshua 3 in the SBITS3
Joshua 3 in the SBITS4
Joshua 3 in the SBIUS
Joshua 3 in the SBIVS
Joshua 3 in the SBT
Joshua 3 in the SBT1E
Joshua 3 in the SCHL
Joshua 3 in the SNT
Joshua 3 in the SUSU
Joshua 3 in the SUSU2
Joshua 3 in the SYNO
Joshua 3 in the TBIAOTANT
Joshua 3 in the TBT1E
Joshua 3 in the TBT1E2
Joshua 3 in the TFTIP
Joshua 3 in the TFTU
Joshua 3 in the TGNTATF3T
Joshua 3 in the THAI
Joshua 3 in the TNFD
Joshua 3 in the TNT
Joshua 3 in the TNTIK
Joshua 3 in the TNTIL
Joshua 3 in the TNTIN
Joshua 3 in the TNTIP
Joshua 3 in the TNTIZ
Joshua 3 in the TOMA
Joshua 3 in the TTENT
Joshua 3 in the UBG
Joshua 3 in the UGV
Joshua 3 in the UGV2
Joshua 3 in the UGV3
Joshua 3 in the VBL
Joshua 3 in the VDCC
Joshua 3 in the YALU
Joshua 3 in the YAPE
Joshua 3 in the YBVTP
Joshua 3 in the ZBP