Leviticus 1 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ sitere nʼụlọ nzute ahụ kpọ Mosis oku, gwa ya sị, 2 “Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Mgbe onye ọbụla nʼime unu wetaara ONYENWE ANYỊ onyinye, ka onyinye ọ ga-eweta bụrụ anụ ụlọ si nʼetiti igwe ehi maọbụ igwe ewu na atụrụ. 3 “ ‘Ọ bụrụ na ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ e wetara site nʼigwe ehi, ọ bụ oke ehi nke na-enweghị ntụpọ ka ọ ga-eweta. Nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka ọ ga-eweta ya, ka ọ bụrụ ihe ONYENWE ANYỊ ga-anabata. 4 Onye ahụ wetara ya ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ aja nsure ọkụ ahụ, a ga-anabata ya maka iji kpuchie mmehie ya. 5 Nwoke ahụ ga-egbu nwa oke ehi ahụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja ga-ewere ọbara ya fesa ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja, nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ nzute ahụ. 6 Ị ga-agba ehi aja nsure ọkụ ahụ akpụkpọ, bọkasịa ya ntakịrị ntakịrị. 7 Ụmụ Erọn, ndị nchụaja ga-etinye ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ, doo nkụ nʼusoro nʼelu ya. 8 Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ndị nchụaja ga-atụkwasị akụkụ ehi ahụ niile, na isi ya, na abụba ya, nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. 9 Ma a ga-asacha ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya mmiri. Onye nchụaja ga-akpọ ha niile ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ nke dị ezi ụtọ nye ONYENWE ANYỊ. 10 “ ‘Ọ bụrụ na onyinye aja nsure ọkụ ahụ si nʼigwe ewu na atụrụ, ọ ga-abụrịrị mkpi maọbụ ebule na-enweghị nkwarụ. 11 Onye wetara ya ga-egbu ya nʼihu ONYENWE ANYỊ nʼakụkụ ebe ịchụ aja chere ihu nʼugwu. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ. 12 Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ wetara ya, ga-abọ ya. Onye nchụaja ga-ewere akụkụ ya niile, na isi ya, na abụba ya tụkwasị ha nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ dị nʼebe ịchụ aja. 13 Ma ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, ka onye ahụ ga-asa mmiri, tupu onye nchụaja eweta ha niile kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị ezi ụtọ nye ONYENWE ANYỊ. 14 “ ‘Ọ bụrụ na onyinye ọ na-enye ONYENWE ANYỊ dịka aja nsure ọkụ bụ site nʼụmụ anụ ufe, ọ ghaghị ịbụ nduru, maọbụ nwa kpalakwukwu. 15 Onye nchụaja ga-ewebata anụ ufe ahụ nʼebe ịchụ aja, tụbipụ isi ya, wụsa ọbara ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja. 16 Ọ ga-ewepụ akpa nri ya, na ihe dị ya nʼime, tụnye ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja ahụ; ebe a na-ekposa ntụ. 17 Ọ ga-ejide nku ya abụọ nyawaa ha, ma ọ gaghị anyakapụcha ha. Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-akpọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị ONYENWE ANYỊ ezi ụtọ.

In Other Versions

Leviticus 1 in the ANGEFD

Leviticus 1 in the ANTPNG2D

Leviticus 1 in the AS21

Leviticus 1 in the BAGH

Leviticus 1 in the BBPNG

Leviticus 1 in the BBT1E

Leviticus 1 in the BDS

Leviticus 1 in the BEV

Leviticus 1 in the BHAD

Leviticus 1 in the BIB

Leviticus 1 in the BLPT

Leviticus 1 in the BNT

Leviticus 1 in the BNTABOOT

Leviticus 1 in the BNTLV

Leviticus 1 in the BOATCB

Leviticus 1 in the BOATCB2

Leviticus 1 in the BOBCV

Leviticus 1 in the BOCNT

Leviticus 1 in the BOECS

Leviticus 1 in the BOGWICC

Leviticus 1 in the BOHCB

Leviticus 1 in the BOHCV

Leviticus 1 in the BOHLNT

Leviticus 1 in the BOHNTLTAL

Leviticus 1 in the BOILNTAP

Leviticus 1 in the BOITCV

Leviticus 1 in the BOKCV

Leviticus 1 in the BOKCV2

Leviticus 1 in the BOKHWOG

Leviticus 1 in the BOKSSV

Leviticus 1 in the BOLCB

Leviticus 1 in the BOLCB2

Leviticus 1 in the BOMCV

Leviticus 1 in the BONAV

Leviticus 1 in the BONCB

Leviticus 1 in the BONLT

Leviticus 1 in the BONUT2

Leviticus 1 in the BOPLNT

Leviticus 1 in the BOSCB

Leviticus 1 in the BOSNC

Leviticus 1 in the BOTLNT

Leviticus 1 in the BOVCB

Leviticus 1 in the BOYCB

Leviticus 1 in the BPBB

Leviticus 1 in the BPH

Leviticus 1 in the BSB

Leviticus 1 in the CCB

Leviticus 1 in the CUV

Leviticus 1 in the CUVS

Leviticus 1 in the DBT

Leviticus 1 in the DGDNT

Leviticus 1 in the DHNT

Leviticus 1 in the DNT

Leviticus 1 in the ELBE

Leviticus 1 in the EMTV

Leviticus 1 in the ESV

Leviticus 1 in the FBV

Leviticus 1 in the FEB

Leviticus 1 in the GGMNT

Leviticus 1 in the GNT

Leviticus 1 in the HARY

Leviticus 1 in the HNT

Leviticus 1 in the IRVA

Leviticus 1 in the IRVB

Leviticus 1 in the IRVG

Leviticus 1 in the IRVH

Leviticus 1 in the IRVK

Leviticus 1 in the IRVM

Leviticus 1 in the IRVM2

Leviticus 1 in the IRVO

Leviticus 1 in the IRVP

Leviticus 1 in the IRVT

Leviticus 1 in the IRVT2

Leviticus 1 in the IRVU

Leviticus 1 in the ISVN

Leviticus 1 in the JSNT

Leviticus 1 in the KAPI

Leviticus 1 in the KBT1ETNIK

Leviticus 1 in the KBV

Leviticus 1 in the KJV

Leviticus 1 in the KNFD

Leviticus 1 in the LBA

Leviticus 1 in the LBLA

Leviticus 1 in the LNT

Leviticus 1 in the LSV

Leviticus 1 in the MAAL

Leviticus 1 in the MBV

Leviticus 1 in the MBV2

Leviticus 1 in the MHNT

Leviticus 1 in the MKNFD

Leviticus 1 in the MNG

Leviticus 1 in the MNT

Leviticus 1 in the MNT2

Leviticus 1 in the MRS1T

Leviticus 1 in the NAA

Leviticus 1 in the NASB

Leviticus 1 in the NBLA

Leviticus 1 in the NBS

Leviticus 1 in the NBVTP

Leviticus 1 in the NET2

Leviticus 1 in the NIV11

Leviticus 1 in the NNT

Leviticus 1 in the NNT2

Leviticus 1 in the NNT3

Leviticus 1 in the PDDPT

Leviticus 1 in the PFNT

Leviticus 1 in the RMNT

Leviticus 1 in the SBIAS

Leviticus 1 in the SBIBS

Leviticus 1 in the SBIBS2

Leviticus 1 in the SBICS

Leviticus 1 in the SBIDS

Leviticus 1 in the SBIGS

Leviticus 1 in the SBIHS

Leviticus 1 in the SBIIS

Leviticus 1 in the SBIIS2

Leviticus 1 in the SBIIS3

Leviticus 1 in the SBIKS

Leviticus 1 in the SBIKS2

Leviticus 1 in the SBIMS

Leviticus 1 in the SBIOS

Leviticus 1 in the SBIPS

Leviticus 1 in the SBISS

Leviticus 1 in the SBITS

Leviticus 1 in the SBITS2

Leviticus 1 in the SBITS3

Leviticus 1 in the SBITS4

Leviticus 1 in the SBIUS

Leviticus 1 in the SBIVS

Leviticus 1 in the SBT

Leviticus 1 in the SBT1E

Leviticus 1 in the SCHL

Leviticus 1 in the SNT

Leviticus 1 in the SUSU

Leviticus 1 in the SUSU2

Leviticus 1 in the SYNO

Leviticus 1 in the TBIAOTANT

Leviticus 1 in the TBT1E

Leviticus 1 in the TBT1E2

Leviticus 1 in the TFTIP

Leviticus 1 in the TFTU

Leviticus 1 in the TGNTATF3T

Leviticus 1 in the THAI

Leviticus 1 in the TNFD

Leviticus 1 in the TNT

Leviticus 1 in the TNTIK

Leviticus 1 in the TNTIL

Leviticus 1 in the TNTIN

Leviticus 1 in the TNTIP

Leviticus 1 in the TNTIZ

Leviticus 1 in the TOMA

Leviticus 1 in the TTENT

Leviticus 1 in the UBG

Leviticus 1 in the UGV

Leviticus 1 in the UGV2

Leviticus 1 in the UGV3

Leviticus 1 in the VBL

Leviticus 1 in the VDCC

Leviticus 1 in the YALU

Leviticus 1 in the YAPE

Leviticus 1 in the YBVTP

Leviticus 1 in the ZBP