Leviticus 21 (BOICB)
1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Gwa ndị nchụaja, ụmụ ndị ikom Erọn okwu sị ha, ‘Onye nchụaja ekwesighị imerụ onwe ya mgbe mmadụ nwụrụ nʼetiti ụmụnna ya. 2 Karịakwa ma onye ahụ bụ onye dị ya nnọọ nso, dịka nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ nwa ya nwoke, maọbụ nwa ya nwanyị, maọbụ nwanne ya nwoke, 3 maọbụ nwanne ya nwanyị na-alụbeghị di, onye ọ na-elekọta nʼihi na o nweghị di. Nʼihi ya, o nwere ike merụọ onwe ya. 4 Ma ọ gakwaghị eme onwe ya ka ọ ghara ịdị ọcha nʼetiti ndị ọgọ ya, ma site otu a merụọ onwe ya. 5 “ ‘Ndị nchụaja ekwesighị ịkpụcha isi ha, maọbụ kpụchapụ akụkụ afụọnụ ha, maọbụ kaa ihe ọbụla nʼakpụkpọ ahụ ha. 6 Ha ga-abụ ndị dị nsọ nye Chineke ha, ndị na-agaghị emekwa ka aha Chineke ha ghara ịdị nsọ. Nʼihi na ọ bụ ha na-eche nʼihu ONYENWE ANYỊ onyinye aja nsure ọkụ, bụ nri Chineke ha. Nʼihi ya, ha aghaghị ịdị nsọ. 7 “ ‘Onye nchụaja agaghị alụ nwanyị e merụrụ site nʼịgba akwụna, maọbụ nwanyị lụtụrụla di nke kewapụrụ onwe ya site nʼahụ di ya, nʼihi na ndị nchụaja bụ ndị dị nsọ nye Chineke ha. 8 Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na ọ bụ ha na-eche nri Chineke nʼihu ya. Gụọ ha dịka ndị dị nsọ nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ dị nsọ, mụ onwe m na-eme ka unu dị nsọ. 9 “ ‘Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja emerụọ onwe ya site nʼịghọ onye akwụna, o sitela na ndụ ọjọọ dị otu a wetara nna ya ihe ihere. A ga-akpọ ya ọkụ. 10 “ ‘Onyeisi nchụaja, onye ahụ sitere nʼetiti ụmụnna ya, onye awụsara mmanụ nsọ nʼisi ya, onye ahọrọ doo nsọ iyiri uwe onye nchụaja ahụ, agaghị ahapụ agịrị isi ya ka ọ kpasasịa, maọbụ dọwaa uwe ya. 11 Ọ gaghị abanye ebe ozu dị. Ọ gaghị emerụ onwe ya, ọ bụladị ma ozu ahụ ọ bụ nke nne ya maọbụ nke nna ya. 12 Ọ gaghị esi nʼebe nsọ Chineke ya pụọ, maọbụ mee ya ka ọ ghara ịdị nsọ, nʼihi na e doola ya nsọ site na ite ya mmanụ nsọ nke Chineke ya. Abụ m ONYENWE ANYỊ. 13 “ ‘Nwanyị onyeisi nchụaja ga-alụ ga-abụ nwanyị na-amaghị nwoke. 14 Ọ gaghị alụ nwanyị di ya nwụrụ, maọbụ nwanyị ya na di ya na-ebikwaghị, maọbụ nwanyị akwụna. Nwanyị ọ ga-alụ ga-abụ naanị nwanyị na-amaghị nwoke nke si nʼetiti ụmụnna ya, 15 ka ọ ghara ime ka ụmụ ya ghara ịdị nsọ nʼetiti ụmụnna ya. Abụ m ONYENWE ANYỊ onye na-edo ya nsọ.’ ” 16 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 17 “Gwa Erọn, ‘Nʼọgbọ niile nke na-abịa, o nweghị onye ọbụla nʼime ụmụ ụmụ gị nke akụkụ ahụ ya na-ezughị oke ga-abịa nso iwetara Chineke ya ihe oriri. 18 O nweghị nwoke ọbụla nwere ọrụsị ọbụla ga-abịa nso, o nweghị nwoke kpuru ìsì, maọbụ onye ngwụrọ, maọbụ onye imi mpịa, maọbụ onye ụkwụ maọbụ aka ya na-ezughị oke, 19 maọbụ onye ọkpụkpụ ụkwụ ya maọbụ ọkpụkpụ aka ya gbajiri, 20 maọbụ onye mkpumkpu azụ dị, maọbụ nwa akakpọ, maọbụ onye na-adịghị ahụzi ụzọ, maọbụ onye agba na-ata, maọbụ onye akpụkpa dị nʼahụ, maọbụ onye mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa. 21 O nweghị nwa nwa Erọn onye nchụaja ọbụla nwere ọrụsị ga-abịa iwetara ONYENWE ANYỊ aja onyinye site nʼọkụ. Ebe ọ bụ na o nwere ọrụsị, ọ gaghị abịa nso iwetara Chineke ya nri. 22 Ma o nwere ike iri nri ahụ dịkarịsịrị nsọ nke sitere na nri Chineke ya, tinyekwara nri ahụ dị nsọ. 23 Kama ọ gaghị abịa nso akwa mgbochi ahụ maọbụ bịaruo ebe ịchụ aja nso, nʼihi ezughị oke ya. Ka ọ ghara imerụ ebe nsọ m, nʼihi na abụ m ONYENWE ANYỊ onye na-edo ha nsọ.’ ” 24 Ya mere Mosis nyere Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile iwu ndị a.
In Other Versions
Leviticus 21 in the ANGEFD
Leviticus 21 in the ANTPNG2D
Leviticus 21 in the AS21
Leviticus 21 in the BAGH
Leviticus 21 in the BBPNG
Leviticus 21 in the BBT1E
Leviticus 21 in the BDS
Leviticus 21 in the BEV
Leviticus 21 in the BHAD
Leviticus 21 in the BIB
Leviticus 21 in the BLPT
Leviticus 21 in the BNT
Leviticus 21 in the BNTABOOT
Leviticus 21 in the BNTLV
Leviticus 21 in the BOATCB
Leviticus 21 in the BOATCB2
Leviticus 21 in the BOBCV
Leviticus 21 in the BOCNT
Leviticus 21 in the BOECS
Leviticus 21 in the BOGWICC
Leviticus 21 in the BOHCB
Leviticus 21 in the BOHCV
Leviticus 21 in the BOHLNT
Leviticus 21 in the BOHNTLTAL
Leviticus 21 in the BOILNTAP
Leviticus 21 in the BOITCV
Leviticus 21 in the BOKCV
Leviticus 21 in the BOKCV2
Leviticus 21 in the BOKHWOG
Leviticus 21 in the BOKSSV
Leviticus 21 in the BOLCB
Leviticus 21 in the BOLCB2
Leviticus 21 in the BOMCV
Leviticus 21 in the BONAV
Leviticus 21 in the BONCB
Leviticus 21 in the BONLT
Leviticus 21 in the BONUT2
Leviticus 21 in the BOPLNT
Leviticus 21 in the BOSCB
Leviticus 21 in the BOSNC
Leviticus 21 in the BOTLNT
Leviticus 21 in the BOVCB
Leviticus 21 in the BOYCB
Leviticus 21 in the BPBB
Leviticus 21 in the BPH
Leviticus 21 in the BSB
Leviticus 21 in the CCB
Leviticus 21 in the CUV
Leviticus 21 in the CUVS
Leviticus 21 in the DBT
Leviticus 21 in the DGDNT
Leviticus 21 in the DHNT
Leviticus 21 in the DNT
Leviticus 21 in the ELBE
Leviticus 21 in the EMTV
Leviticus 21 in the ESV
Leviticus 21 in the FBV
Leviticus 21 in the FEB
Leviticus 21 in the GGMNT
Leviticus 21 in the GNT
Leviticus 21 in the HARY
Leviticus 21 in the HNT
Leviticus 21 in the IRVA
Leviticus 21 in the IRVB
Leviticus 21 in the IRVG
Leviticus 21 in the IRVH
Leviticus 21 in the IRVK
Leviticus 21 in the IRVM
Leviticus 21 in the IRVM2
Leviticus 21 in the IRVO
Leviticus 21 in the IRVP
Leviticus 21 in the IRVT
Leviticus 21 in the IRVT2
Leviticus 21 in the IRVU
Leviticus 21 in the ISVN
Leviticus 21 in the JSNT
Leviticus 21 in the KAPI
Leviticus 21 in the KBT1ETNIK
Leviticus 21 in the KBV
Leviticus 21 in the KJV
Leviticus 21 in the KNFD
Leviticus 21 in the LBA
Leviticus 21 in the LBLA
Leviticus 21 in the LNT
Leviticus 21 in the LSV
Leviticus 21 in the MAAL
Leviticus 21 in the MBV
Leviticus 21 in the MBV2
Leviticus 21 in the MHNT
Leviticus 21 in the MKNFD
Leviticus 21 in the MNG
Leviticus 21 in the MNT
Leviticus 21 in the MNT2
Leviticus 21 in the MRS1T
Leviticus 21 in the NAA
Leviticus 21 in the NASB
Leviticus 21 in the NBLA
Leviticus 21 in the NBS
Leviticus 21 in the NBVTP
Leviticus 21 in the NET2
Leviticus 21 in the NIV11
Leviticus 21 in the NNT
Leviticus 21 in the NNT2
Leviticus 21 in the NNT3
Leviticus 21 in the PDDPT
Leviticus 21 in the PFNT
Leviticus 21 in the RMNT
Leviticus 21 in the SBIAS
Leviticus 21 in the SBIBS
Leviticus 21 in the SBIBS2
Leviticus 21 in the SBICS
Leviticus 21 in the SBIDS
Leviticus 21 in the SBIGS
Leviticus 21 in the SBIHS
Leviticus 21 in the SBIIS
Leviticus 21 in the SBIIS2
Leviticus 21 in the SBIIS3
Leviticus 21 in the SBIKS
Leviticus 21 in the SBIKS2
Leviticus 21 in the SBIMS
Leviticus 21 in the SBIOS
Leviticus 21 in the SBIPS
Leviticus 21 in the SBISS
Leviticus 21 in the SBITS
Leviticus 21 in the SBITS2
Leviticus 21 in the SBITS3
Leviticus 21 in the SBITS4
Leviticus 21 in the SBIUS
Leviticus 21 in the SBIVS
Leviticus 21 in the SBT
Leviticus 21 in the SBT1E
Leviticus 21 in the SCHL
Leviticus 21 in the SNT
Leviticus 21 in the SUSU
Leviticus 21 in the SUSU2
Leviticus 21 in the SYNO
Leviticus 21 in the TBIAOTANT
Leviticus 21 in the TBT1E
Leviticus 21 in the TBT1E2
Leviticus 21 in the TFTIP
Leviticus 21 in the TFTU
Leviticus 21 in the TGNTATF3T
Leviticus 21 in the THAI
Leviticus 21 in the TNFD
Leviticus 21 in the TNT
Leviticus 21 in the TNTIK
Leviticus 21 in the TNTIL
Leviticus 21 in the TNTIN
Leviticus 21 in the TNTIP
Leviticus 21 in the TNTIZ
Leviticus 21 in the TOMA
Leviticus 21 in the TTENT
Leviticus 21 in the UBG
Leviticus 21 in the UGV
Leviticus 21 in the UGV2
Leviticus 21 in the UGV3
Leviticus 21 in the VBL
Leviticus 21 in the VDCC
Leviticus 21 in the YALU
Leviticus 21 in the YAPE
Leviticus 21 in the YBVTP
Leviticus 21 in the ZBP