Leviticus 9 (BOICB)

1 Nʼụbọchị nke asatọ, Mosis kpọrọ Erọn na ụmụ ya ndị ikom, na ndị okenye Izrel. 2 Ọ gwara Erọn sị, “Site nʼime igwe ehi were nwa oke ehi ị ga-eji chụọ aja mmehie. Werekwa ebule na-enweghị ntụpọ ị ga-eji chụọ aja nsure ọkụ, nke m ga-eche nʼihu ONYENWE ANYỊ. 3 Ọ gwakwara ụmụ Izrel sị ha, ‘Họrọnụ mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie, na nwa ehi, na nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ, ndị gbara naanị otu afọ, a ga-eji chụọ aja nsure ọkụ, 4 na ehi, na ebule a ga-eji chụọ aja udo nʼihu ONYENWE ANYỊ, tinyere mkpụrụ ọka a gwara mmanụ. Nʼihi na taa ka ONYENWE ANYỊ ga-eme ka unu hụ ya anya.’ ” 5 Ha wetara ihe ndị a niile bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute dịka Mosis nyere nʼiwu. Ọgbakọ ụmụ Izrel niile bịara nso guzo nʼihu ONYENWE ANYỊ. 6 Mgbe ahụ, Mosis sịrị ha, “Ihe ndị a bụ ihe ONYENWE ANYỊ nyere unu nʼiwu idebe, ka ebube ya si otu a pụta ìhè nʼihu unu.” 7 Mosis sịrị Erọn, “Bịa nso nʼebe ịchụ aja. Chụọ aja mmehie, na aja nsure ọkụ nke a ga-eji kpuchie mmehie gị na mmehie ndị ahụ niile. Chụọ aja onyinye dịrị ndị ahụ, maka ikpuchiri ha mmehie ha, dịka ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu.” 8 Erọn bịara nso nʼebe ịchụ aja, gbuo nwa ehi ahụ ka ọ bụrụ aja mmehie nke ya. 9 Ụmụ Erọn buteere ya ọbara ehi ahụ. O tinyere mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja. Ọ wụrụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja ahụ. 10 Ọ kpọrọ abụba ya, na akụrụ ya abụọ, na ihe kpuchiri umeju si nʼaja mmehie ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis iwu. 11 Ma anụ ahụ ya, na akpụkpọ ya, ka ọ kpọrọ ọkụ nʼazụ ebe obibi. 12 Emesịa, o gburu anụ e wetara maka aja nsure ọkụ ahụ. Ụmụ ya ndị ikom nyere ya ọbara anụ ahụ, nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja. 13 Ha nyefere ya aja nsure ọkụ ahụ nʼaka nʼotu ha sị bọọ ya, tinyere isi ya. Ọ kpọrọ ihe niile ọkụ nʼebe ịchụ aja. 14 Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, kpọọ ha ọkụ, dịka aja nsure ọkụ. 15 Emesịa, Erọn wetara onyinye nke dị maka ndị mmadụ, o were ewu ahụ bụ maka mmehie ndị mmadụ, gbuo ya, were chụọ aja mmehie, dịka o mere nke mbụ. 16 Ọ chụkwara aja nsure ọkụ nʼusoro dịka iwu e nyere si dị. 17 O webatakwara aja mkpụrụ ọka ahụ, kporo nke juru ya aka, kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, tinyekwara aja nsure ọkụ nke ụtụtụ ahụ. 18 Nʼikpeazụ, o gburu ehi na ebule ahụ, nke bụ aja udo ndị Izrel. Ụmụ Erọn buteere ya ọbara nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja. 19 Ọ chịkọtara abụba niile dị ehi na ebule ndị ahụ nʼahụ, na ọdụdụ ha, na abụba kpuchiri ihe ime ha, ya na akụrụ ha, na abụba kpuchiri umeju ha, 20 tụkwasị ha nʼobi anụ ndị ahụ, kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja. 21 Mgbe ahụ, Erọn fufere, dịka onyinye mfufe, obi anụ ahụ, na apata aka nri ha nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka Mosis nyere nʼiwu. 22 Erọn weliri aka ya elu nʼebe ụmụ Izrel nọ, gọzie ha. Emesịa, mgbe ọ chụchara aja mmehie, na aja nsure ọkụ na aja udo, o sitere nʼebe ịchụ aja ahụ rịdata. 23 Mosis na Erọn bara nʼime ụlọ nzute. Mgbe ha pụtara, ha gọziri ọha mmadụ ahụ. Mgbe ahụ kwa, ebube ONYENWE ANYỊ pụtara ìhè nye mmadụ niile nʼọgbakọ ahụ. 24 Ọkụ sitekwara nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ daa, rechapụ aja nsure ọkụ ahụ, na abụba ahụ dị nʼebe ịchụ aja. Mgbe ndị Izrel hụrụ ya, ha tiri mkpu ọṅụ. Daa, kpuo ihu nʼala.

In Other Versions

Leviticus 9 in the ANGEFD

Leviticus 9 in the ANTPNG2D

Leviticus 9 in the AS21

Leviticus 9 in the BAGH

Leviticus 9 in the BBPNG

Leviticus 9 in the BBT1E

Leviticus 9 in the BDS

Leviticus 9 in the BEV

Leviticus 9 in the BHAD

Leviticus 9 in the BIB

Leviticus 9 in the BLPT

Leviticus 9 in the BNT

Leviticus 9 in the BNTABOOT

Leviticus 9 in the BNTLV

Leviticus 9 in the BOATCB

Leviticus 9 in the BOATCB2

Leviticus 9 in the BOBCV

Leviticus 9 in the BOCNT

Leviticus 9 in the BOECS

Leviticus 9 in the BOGWICC

Leviticus 9 in the BOHCB

Leviticus 9 in the BOHCV

Leviticus 9 in the BOHLNT

Leviticus 9 in the BOHNTLTAL

Leviticus 9 in the BOILNTAP

Leviticus 9 in the BOITCV

Leviticus 9 in the BOKCV

Leviticus 9 in the BOKCV2

Leviticus 9 in the BOKHWOG

Leviticus 9 in the BOKSSV

Leviticus 9 in the BOLCB

Leviticus 9 in the BOLCB2

Leviticus 9 in the BOMCV

Leviticus 9 in the BONAV

Leviticus 9 in the BONCB

Leviticus 9 in the BONLT

Leviticus 9 in the BONUT2

Leviticus 9 in the BOPLNT

Leviticus 9 in the BOSCB

Leviticus 9 in the BOSNC

Leviticus 9 in the BOTLNT

Leviticus 9 in the BOVCB

Leviticus 9 in the BOYCB

Leviticus 9 in the BPBB

Leviticus 9 in the BPH

Leviticus 9 in the BSB

Leviticus 9 in the CCB

Leviticus 9 in the CUV

Leviticus 9 in the CUVS

Leviticus 9 in the DBT

Leviticus 9 in the DGDNT

Leviticus 9 in the DHNT

Leviticus 9 in the DNT

Leviticus 9 in the ELBE

Leviticus 9 in the EMTV

Leviticus 9 in the ESV

Leviticus 9 in the FBV

Leviticus 9 in the FEB

Leviticus 9 in the GGMNT

Leviticus 9 in the GNT

Leviticus 9 in the HARY

Leviticus 9 in the HNT

Leviticus 9 in the IRVA

Leviticus 9 in the IRVB

Leviticus 9 in the IRVG

Leviticus 9 in the IRVH

Leviticus 9 in the IRVK

Leviticus 9 in the IRVM

Leviticus 9 in the IRVM2

Leviticus 9 in the IRVO

Leviticus 9 in the IRVP

Leviticus 9 in the IRVT

Leviticus 9 in the IRVT2

Leviticus 9 in the IRVU

Leviticus 9 in the ISVN

Leviticus 9 in the JSNT

Leviticus 9 in the KAPI

Leviticus 9 in the KBT1ETNIK

Leviticus 9 in the KBV

Leviticus 9 in the KJV

Leviticus 9 in the KNFD

Leviticus 9 in the LBA

Leviticus 9 in the LBLA

Leviticus 9 in the LNT

Leviticus 9 in the LSV

Leviticus 9 in the MAAL

Leviticus 9 in the MBV

Leviticus 9 in the MBV2

Leviticus 9 in the MHNT

Leviticus 9 in the MKNFD

Leviticus 9 in the MNG

Leviticus 9 in the MNT

Leviticus 9 in the MNT2

Leviticus 9 in the MRS1T

Leviticus 9 in the NAA

Leviticus 9 in the NASB

Leviticus 9 in the NBLA

Leviticus 9 in the NBS

Leviticus 9 in the NBVTP

Leviticus 9 in the NET2

Leviticus 9 in the NIV11

Leviticus 9 in the NNT

Leviticus 9 in the NNT2

Leviticus 9 in the NNT3

Leviticus 9 in the PDDPT

Leviticus 9 in the PFNT

Leviticus 9 in the RMNT

Leviticus 9 in the SBIAS

Leviticus 9 in the SBIBS

Leviticus 9 in the SBIBS2

Leviticus 9 in the SBICS

Leviticus 9 in the SBIDS

Leviticus 9 in the SBIGS

Leviticus 9 in the SBIHS

Leviticus 9 in the SBIIS

Leviticus 9 in the SBIIS2

Leviticus 9 in the SBIIS3

Leviticus 9 in the SBIKS

Leviticus 9 in the SBIKS2

Leviticus 9 in the SBIMS

Leviticus 9 in the SBIOS

Leviticus 9 in the SBIPS

Leviticus 9 in the SBISS

Leviticus 9 in the SBITS

Leviticus 9 in the SBITS2

Leviticus 9 in the SBITS3

Leviticus 9 in the SBITS4

Leviticus 9 in the SBIUS

Leviticus 9 in the SBIVS

Leviticus 9 in the SBT

Leviticus 9 in the SBT1E

Leviticus 9 in the SCHL

Leviticus 9 in the SNT

Leviticus 9 in the SUSU

Leviticus 9 in the SUSU2

Leviticus 9 in the SYNO

Leviticus 9 in the TBIAOTANT

Leviticus 9 in the TBT1E

Leviticus 9 in the TBT1E2

Leviticus 9 in the TFTIP

Leviticus 9 in the TFTU

Leviticus 9 in the TGNTATF3T

Leviticus 9 in the THAI

Leviticus 9 in the TNFD

Leviticus 9 in the TNT

Leviticus 9 in the TNTIK

Leviticus 9 in the TNTIL

Leviticus 9 in the TNTIN

Leviticus 9 in the TNTIP

Leviticus 9 in the TNTIZ

Leviticus 9 in the TOMA

Leviticus 9 in the TTENT

Leviticus 9 in the UBG

Leviticus 9 in the UGV

Leviticus 9 in the UGV2

Leviticus 9 in the UGV3

Leviticus 9 in the VBL

Leviticus 9 in the VDCC

Leviticus 9 in the YALU

Leviticus 9 in the YAPE

Leviticus 9 in the YBVTP

Leviticus 9 in the ZBP