Luke 14 (BOICB)

1 Otu ụbọchị izuike, mgbe ọ gara iri ihe nʼụlọ otu onyendu ndị Farisii, ha nọ na-ele ya anya nke ọma. 2 Ma lee, otu nwoke ahụ ya zara aza nọkwa nʼihu ya ebe ahụ. 3 Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ ọrịa nʼụbọchị izuike ka ọ bụ na o zighị?” 4 Ma ha e kwughị okwu ọbụla. Ya mere ọ kpọrọ ya, gwọọ ya ma sị ya laa. 5 Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na otu nʼime unu nwere nwa nwoke maọbụ oke ehi nke dabara nʼime olulu mmiri nʼụbọchị izuike, ọ bụ na ọ gaghị eme ngwangwa dọpụta ya?” 6 Ma ha enweghị ike ịza ajụjụ a. 7 Mgbe ọ hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri si họrọ naanị oche ndị a na-asọpụrụ, oche ndị a na-asọpụrụ, ọ tụrụ ha ilu sị, 8 “Mgbe mmadụ ọbụla kpọrọ gị oriri nʼọlụlụ di na nwunye, abatala nọdụ nʼoche ndị a na-asọpụrụ, nʼihi na eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara onye ka gị nwe nsọpụrụ. 9 Nʼihi na onye ahụ kpọrọ unu oriri nwere ike bịakwute gị sị gị, nye nwoke a ọnọdụ gị. Mgbe ahụ, ị ga-ebili nʼanya ihere gaa nọdụ nʼoche dịkarịsịrị ala. 10 Ma mgbe a kpọrọ gị, nọdụ nʼoche dị ala, ka ọ ga-abụ na onye kpọrọ gị oriri bịa, ọ ga-asị gị ‘Enyi m, rigota nʼebe a ka elu.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwekwa ugwu nʼanya ndị niile a kpọrọ gị na ha oriri. 11 Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.” 12 Ọ gwara onye ahụ kpọrọ ya oriri sị, “Mgbe ị na-akpọ oriri nke nri ehihie maọbụ nke nri anyasị, akpọla naanị ndị enyi gị maọbụ ụmụnne gị ndị nwoke maọbụ ndị ikwu na ibe gị, maọbụ ndị agbataobi gị bara ọgaranya, nʼihi ma eleghị anya, ha pụrụ ịkpọkwa gị na mgbe nke ha, sị otu a kwụghachi gị ụgwọ. 13 Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye na ndị ọlụsị na ndị ngwụrọ na ndị ìsì. 14 A ga-agọzikwa gị, nʼihi na ha enweghị ike ịkwụghachi gị, a ga-akwụghachikwa gị mgbe ndị ezi omume ga-ebili nʼọnwụ.” 15 Mgbe otu nʼime ndị a kpọrọ oriri nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Ngọzị ga-adịrị onye ga-eso rie oriri nʼalaeze Chineke.” 16 Ma ọ sịrị ya, “Otu onye na-akwado oke oriri kpọkwa ọtụtụ mmadụ oku. 17 Mgbe oge oriri ahụ ruru, o zipụrụ ohu ya ka ọ ga gwa ndị ahụ ọ kpọrọ sị, ‘Bịanụ, nʼihi na e dozichaala ihe niile.’ 18 “Ma ha niile nʼotu nʼotu malitere inye ọsịsa. Onye nke mbụ sịrị, ‘Azụrụ m iberibe ala ọhụrụ, ọ dịkwa mkpa na m ga-eje hụ ya, biko gbaghara m, agaghị m abịa.’ 19 “Onye nke ọzọ sịrị, ‘Azụrụ m ehi e ji arụ ọrụ ubi, iri e jikọrọ abụọ abụọ. Ana m aga ugbu a ka m nwalee ha, biko gbaghara m, agaghị m abịa.’ 20 “Ma onye ọzọ sịkwara, ‘Alụrụ m nwunye ọhụrụ, nʼihi nke a agaghị m abịa.’ 21 “Ohu ahụ lọtara, kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị ahụ a kpọrọ oriri kwuru. Mgbe ahụ, iwe dị ukwuu were nna ya ukwu, nke a mere ka o zipụ ohu ya sị ya, ‘Gaa ngwangwa nʼokporoụzọ ukwu na nʼokporoụzọ nta dị nʼobodo a, kpọbata ndị ogbenye, na ndị ụkwụ rụrụ, na ndị ìsì na ndị ngwụrọ.’ 22 “Ohu ahụ sịrị, ‘Nna m ukwu, emeela m ihe i kwuru, ma ohere ka fọdụrụ.’ 23 “Nna ukwu ahụ sịrị ohu ahụ, ‘Gaakwa nʼokporoụzọ ukwu na okporoụzọ nta, mee ka ndị mmadụ bata nʼụlọ m, ka ụlọ m jupụta na mmadụ. 24 Nʼihi na agwa m unu, ọ dịghị otu onye nʼime ndị ahụ a kpọrọ oriri ga-edetụ nri m ọnụ.’ ” 25 Ugbu a, oke igwe mmadụ na-eso ya ma ọ tụgharịrị sị ha: 26 “Onye ọbụla chọrọ iso m, ma o bụghị ụzọ kpọ nne na nna ya, na nwunye ya, na ụmụ ya, na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị tinyekwara ndụ nke ya onwe ya asị, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m. 27 Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, enweghị ike ịbụ onye na-eso ụzọ m. 28 “Ọ dị onye ọbụla nʼime unu chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, iji chọpụta ma o nwekwara ego ga-ezu iwucha ya? 29 Nʼihi na ọ bụrụ na ọ tọọ ntọala ma o nwekwaghị ike wuchaa ya, onye ọbụla hụrụ ya ga-achị ya ọchị, 30 na-asị, ‘Nwoke a malitere iwu ụlọ, ma o nweghị ike wuchaa ya.’ 31 “Maọbụ olee eze chọrọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị ebu ụzọ nọdụ ala tulee ma puku ndị agha iri ya ọ ga-ezuru ya iji lụso onye ji iri puku ndị agha abụọ abịakwute ya ọgụ? 32 Ọ bụrụ na o nweghị ike, ọ ga-ezipụ ozi rịọ ka e kpee udo mgbe onye nke ọzọ ka nọ nʼebe dị anya. 33 Nʼụzọ dị otu a, onye ọbụla na-ajụghị ihe niile o nwere, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m. 34 “Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? 35 Ọ bakwaghị uru nye ala maọbụ iji mee nri ala. Kama ọ bụ itufu ya. “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”

In Other Versions

Luke 14 in the ANGEFD

Luke 14 in the ANTPNG2D

Luke 14 in the AS21

Luke 14 in the BAGH

Luke 14 in the BBPNG

Luke 14 in the BBT1E

Luke 14 in the BDS

Luke 14 in the BEV

Luke 14 in the BHAD

Luke 14 in the BIB

Luke 14 in the BLPT

Luke 14 in the BNT

Luke 14 in the BNTABOOT

Luke 14 in the BNTLV

Luke 14 in the BOATCB

Luke 14 in the BOATCB2

Luke 14 in the BOBCV

Luke 14 in the BOCNT

Luke 14 in the BOECS

Luke 14 in the BOGWICC

Luke 14 in the BOHCB

Luke 14 in the BOHCV

Luke 14 in the BOHLNT

Luke 14 in the BOHNTLTAL

Luke 14 in the BOILNTAP

Luke 14 in the BOITCV

Luke 14 in the BOKCV

Luke 14 in the BOKCV2

Luke 14 in the BOKHWOG

Luke 14 in the BOKSSV

Luke 14 in the BOLCB

Luke 14 in the BOLCB2

Luke 14 in the BOMCV

Luke 14 in the BONAV

Luke 14 in the BONCB

Luke 14 in the BONLT

Luke 14 in the BONUT2

Luke 14 in the BOPLNT

Luke 14 in the BOSCB

Luke 14 in the BOSNC

Luke 14 in the BOTLNT

Luke 14 in the BOVCB

Luke 14 in the BOYCB

Luke 14 in the BPBB

Luke 14 in the BPH

Luke 14 in the BSB

Luke 14 in the CCB

Luke 14 in the CUV

Luke 14 in the CUVS

Luke 14 in the DBT

Luke 14 in the DGDNT

Luke 14 in the DHNT

Luke 14 in the DNT

Luke 14 in the ELBE

Luke 14 in the EMTV

Luke 14 in the ESV

Luke 14 in the FBV

Luke 14 in the FEB

Luke 14 in the GGMNT

Luke 14 in the GNT

Luke 14 in the HARY

Luke 14 in the HNT

Luke 14 in the IRVA

Luke 14 in the IRVB

Luke 14 in the IRVG

Luke 14 in the IRVH

Luke 14 in the IRVK

Luke 14 in the IRVM

Luke 14 in the IRVM2

Luke 14 in the IRVO

Luke 14 in the IRVP

Luke 14 in the IRVT

Luke 14 in the IRVT2

Luke 14 in the IRVU

Luke 14 in the ISVN

Luke 14 in the JSNT

Luke 14 in the KAPI

Luke 14 in the KBT1ETNIK

Luke 14 in the KBV

Luke 14 in the KJV

Luke 14 in the KNFD

Luke 14 in the LBA

Luke 14 in the LBLA

Luke 14 in the LNT

Luke 14 in the LSV

Luke 14 in the MAAL

Luke 14 in the MBV

Luke 14 in the MBV2

Luke 14 in the MHNT

Luke 14 in the MKNFD

Luke 14 in the MNG

Luke 14 in the MNT

Luke 14 in the MNT2

Luke 14 in the MRS1T

Luke 14 in the NAA

Luke 14 in the NASB

Luke 14 in the NBLA

Luke 14 in the NBS

Luke 14 in the NBVTP

Luke 14 in the NET2

Luke 14 in the NIV11

Luke 14 in the NNT

Luke 14 in the NNT2

Luke 14 in the NNT3

Luke 14 in the PDDPT

Luke 14 in the PFNT

Luke 14 in the RMNT

Luke 14 in the SBIAS

Luke 14 in the SBIBS

Luke 14 in the SBIBS2

Luke 14 in the SBICS

Luke 14 in the SBIDS

Luke 14 in the SBIGS

Luke 14 in the SBIHS

Luke 14 in the SBIIS

Luke 14 in the SBIIS2

Luke 14 in the SBIIS3

Luke 14 in the SBIKS

Luke 14 in the SBIKS2

Luke 14 in the SBIMS

Luke 14 in the SBIOS

Luke 14 in the SBIPS

Luke 14 in the SBISS

Luke 14 in the SBITS

Luke 14 in the SBITS2

Luke 14 in the SBITS3

Luke 14 in the SBITS4

Luke 14 in the SBIUS

Luke 14 in the SBIVS

Luke 14 in the SBT

Luke 14 in the SBT1E

Luke 14 in the SCHL

Luke 14 in the SNT

Luke 14 in the SUSU

Luke 14 in the SUSU2

Luke 14 in the SYNO

Luke 14 in the TBIAOTANT

Luke 14 in the TBT1E

Luke 14 in the TBT1E2

Luke 14 in the TFTIP

Luke 14 in the TFTU

Luke 14 in the TGNTATF3T

Luke 14 in the THAI

Luke 14 in the TNFD

Luke 14 in the TNT

Luke 14 in the TNTIK

Luke 14 in the TNTIL

Luke 14 in the TNTIN

Luke 14 in the TNTIP

Luke 14 in the TNTIZ

Luke 14 in the TOMA

Luke 14 in the TTENT

Luke 14 in the UBG

Luke 14 in the UGV

Luke 14 in the UGV2

Luke 14 in the UGV3

Luke 14 in the VBL

Luke 14 in the VDCC

Luke 14 in the YALU

Luke 14 in the YAPE

Luke 14 in the YBVTP

Luke 14 in the ZBP