Luke 20 (BOICB)

1 Otu ụbọchị, ka ọ nọ nʼụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe na-ekwusakwa oziọma. Ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye bịakwutere ya. 2 Ha sịrị ya, “Gwa anyị, olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Onye nyekwara gị ikike a?” 3 Ọ zara ha sị, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Gwanụ m, 4 baptizim nke Jọn, o si nʼeluigwe ka o si nʼaka mmadụ?” 5 Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị na o sitere nʼeluigwe, ọ ga-asị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ 6 Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na, ‘o sitere nʼaka mmadụ,’ ndị mmadụ ga-atụ anyị nkume, nʼihi na ha niile kweere na Jọn bụ onye amụma.” 7 Ya mere, ha zara, “Anyị amaghị ebe o si bịa.” 8 Jisọs sịrị ha, “Enwekwaghị m ike ịgwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.” 9 Ọ gara nʼihu tụọrọ ndị mmadụ ilu a sị, “Otu nwoke nwere ubi vaịnị, nke o nyefere nʼaka ndị ga-elekọta ya anya ma pụọ gaa njem nʼala ọzọ ebe ọ nọrọ ogologo oge. 10 Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zigara otu nʼime ndị ohu ya ka ọ bịakwute ndị ahụ na-elekọtara ya ubi, ka ha nyekwa ya ụfọdụ nʼime mkpụrụ ubi vaịnị ahụ. Ma ndị na-elekọtara ya ubi jidere ya, tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu. 11 O zigakwara ohu ya ọzọ. Ma ha tikwara ya ihe mee ya ihe ihere, zilakwaa ya nʼaka efu. 12 O zigakwara onye nke atọ, ma ha merụrụ ya ahụ, chụlaa ya. 13 “Mgbe ahụ, onyenwe ubi vaịnị ahụ sịrị, ‘Gịnị ka m ga-eme? Aga m ezigara ha ọkpara m, nke m hụrụ nʼanya, ma eleghị anya ha ga-asọpụrụ ya.’ 14 “Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ya, ha kwurịtara nʼetiti onwe ha, sị, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a, ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’ 15 Ya mere, ha kpụfere ya nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya. “Gịnị ka onye nwe ubi ahụ ga-eme ha? 16 Ọ ga-abịa, laa ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ nʼiyi, were ubi vaịnị ahụ nye ndị ọzọ.”Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Chineke ekwela.” 17 O legidere ha anya sị, “Gịnịkwa ka unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ pụtara, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ aghọọla nkume nke isi ntọala ụlọ’? 18 Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume ahụ, ka a ga-etiwasị, ma onye ọbụla ọ dakwasịrị, ka ọ ga-egwepịa.” 19 Ndị ozizi iwu na ndịisi nchụaja chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼotu oge ahụ nʼihi na ha matara na ọ bụ ha ka o bu nʼobi tụọ ilu ahụ, ma ha tụrụ egwu ndị mmadụ. 20 Ya mere, ha chere ya nche nke ọma, ma zipụ ndị nnyopụta, ndị mere onwe ha dịka ndị ezi omume, ka ha chọpụta ma o nwere ụzọ ha ga-esi jide ya site nʼihe ọ ga-ekwu, ka ha site na nke a nyefee ya nʼaka ọchịchị na ike onyeisi ala. 21 Ya mere ndị nnyopụta ahụ jụrụ ya sị, “Onye ozizi, anyị mara na i na-ekwu ma na-ezikwa ihe ziri ezi, matakwa na i dịghị ele mmadụ anya nʼihu, kama ị na-ezi ụzọ Chineke dị ka eziokwu si dị. 22 O ziri ezi nʼiwu ka anyị tụọ ụtụ isi nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?” 23 Ma ọ matara na nke a bụ ajụjụ aghụghọ, ya mere ọ sịrị ha, 24 “Gosinụ m otu mkpụrụ ego denarị. Isi onye ka e sere nʼelu ya, aha onye ka e dekwasịkwara ya?”Ha sịrị, “Ọ bụ nke Siza.” 25 Ọ sịrị ha, “Ya mere, nyenụ Siza ihe bụ nke Siza, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke Chineke.” 26 Ha enweghị ike ijide ya nʼihi ihe o kwuru nʼebe ahụ, nʼihu ọha mmadụ. Ọsịsa ya juru ha anya, ha mechikwara ọnụ. 27 Ụfọdụ ndị Sadusii, ndị sị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya 28 ma jụọ ya sị, “Onye ozizi, Mosis deere anyị na ọ bụrụ na nwanne nwoke mmadụ anwụọ hapụ nwunye ya na-amụtaghị nwa, na nwoke dị otu a ga-alụrụ nwunye nwanne ya nwoke ahụ, sị otu a, mụtara nwanne ya ụmụ. 29 Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, onye nke mbụ lụrụ nwanyị, nwụọ na-amụtaghị nwa. 30 Nke abụọ kwa 31 na onye nke atọ lụrụkwara ya. Nʼotu aka ahụ ha asaa lụchara ya ma nwụọ na-amụtaghị nwa. 32 Nʼikpeazụ nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara. 33 Ya mere, nʼoge mbilite nʼọnwụ nwunye onye ka ọ ga-abụ? Nʼihi na ha asaa lụchara ya?” 34 Jisọs gwara ha, “Ndị nke ọgbọ a na-alụ nwunye, ma na-enyekwa ụmụ ha ka a lụrụ ha. 35 Ma ndị ahụ a gụrụ dị ka ndị kwesiri isoro keta oke nʼọgbọ ahụ, nakwa na mbilite nʼọnwụ agaghị alụ di na nwunye. 36 Nʼezie, ha apụghịkwa ịnwụ ọzọ, nʼihi na ha dị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke, nʼihi na ha bụ ụmụ nke mbilite nʼọnwụ. 37 Ọ bụladị Mosis nʼonwe ya zipụtara na mbilite nʼọnwụ dị, nʼakụkọ banyere ọhịa ahụ na-ere ọkụ, mgbe ọ na-akpọ Onyenwe anyị ‘Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.’ 38 Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ, nʼihi nʼebe ọ nọ mmadụ niile dị ndụ.” 39 Ụfọdụ ndị ozizi iwu zara ya sị, “Onye ozizi, ị kwuru nke ọma.” 40 O nwekwaghị onye ọbụla jụrụ ya ajụjụ ọzọ. 41 Ma ọ sịrị ha, “Olee otu ha si kwuo na Kraịst ahụ bụ nwa Devid? 42 Devid nʼonwe ya kwupụtara nʼakwụkwọ Abụ Ọma, sị: “ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m, “Nọdụ ala nʼaka nri m 43 ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’ 44 Devid nʼonwe ya kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị.’ Oleekwanụ otu o si bụrụ nwa ya?” 45 Mgbe ndị mmadụ na-ege ntị, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, 46 “Kpacharanụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, ndị hụrụ ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa nʼanya. Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla. 47 Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.”

In Other Versions

Luke 20 in the ANGEFD

Luke 20 in the ANTPNG2D

Luke 20 in the AS21

Luke 20 in the BAGH

Luke 20 in the BBPNG

Luke 20 in the BBT1E

Luke 20 in the BDS

Luke 20 in the BEV

Luke 20 in the BHAD

Luke 20 in the BIB

Luke 20 in the BLPT

Luke 20 in the BNT

Luke 20 in the BNTABOOT

Luke 20 in the BNTLV

Luke 20 in the BOATCB

Luke 20 in the BOATCB2

Luke 20 in the BOBCV

Luke 20 in the BOCNT

Luke 20 in the BOECS

Luke 20 in the BOGWICC

Luke 20 in the BOHCB

Luke 20 in the BOHCV

Luke 20 in the BOHLNT

Luke 20 in the BOHNTLTAL

Luke 20 in the BOILNTAP

Luke 20 in the BOITCV

Luke 20 in the BOKCV

Luke 20 in the BOKCV2

Luke 20 in the BOKHWOG

Luke 20 in the BOKSSV

Luke 20 in the BOLCB

Luke 20 in the BOLCB2

Luke 20 in the BOMCV

Luke 20 in the BONAV

Luke 20 in the BONCB

Luke 20 in the BONLT

Luke 20 in the BONUT2

Luke 20 in the BOPLNT

Luke 20 in the BOSCB

Luke 20 in the BOSNC

Luke 20 in the BOTLNT

Luke 20 in the BOVCB

Luke 20 in the BOYCB

Luke 20 in the BPBB

Luke 20 in the BPH

Luke 20 in the BSB

Luke 20 in the CCB

Luke 20 in the CUV

Luke 20 in the CUVS

Luke 20 in the DBT

Luke 20 in the DGDNT

Luke 20 in the DHNT

Luke 20 in the DNT

Luke 20 in the ELBE

Luke 20 in the EMTV

Luke 20 in the ESV

Luke 20 in the FBV

Luke 20 in the FEB

Luke 20 in the GGMNT

Luke 20 in the GNT

Luke 20 in the HARY

Luke 20 in the HNT

Luke 20 in the IRVA

Luke 20 in the IRVB

Luke 20 in the IRVG

Luke 20 in the IRVH

Luke 20 in the IRVK

Luke 20 in the IRVM

Luke 20 in the IRVM2

Luke 20 in the IRVO

Luke 20 in the IRVP

Luke 20 in the IRVT

Luke 20 in the IRVT2

Luke 20 in the IRVU

Luke 20 in the ISVN

Luke 20 in the JSNT

Luke 20 in the KAPI

Luke 20 in the KBT1ETNIK

Luke 20 in the KBV

Luke 20 in the KJV

Luke 20 in the KNFD

Luke 20 in the LBA

Luke 20 in the LBLA

Luke 20 in the LNT

Luke 20 in the LSV

Luke 20 in the MAAL

Luke 20 in the MBV

Luke 20 in the MBV2

Luke 20 in the MHNT

Luke 20 in the MKNFD

Luke 20 in the MNG

Luke 20 in the MNT

Luke 20 in the MNT2

Luke 20 in the MRS1T

Luke 20 in the NAA

Luke 20 in the NASB

Luke 20 in the NBLA

Luke 20 in the NBS

Luke 20 in the NBVTP

Luke 20 in the NET2

Luke 20 in the NIV11

Luke 20 in the NNT

Luke 20 in the NNT2

Luke 20 in the NNT3

Luke 20 in the PDDPT

Luke 20 in the PFNT

Luke 20 in the RMNT

Luke 20 in the SBIAS

Luke 20 in the SBIBS

Luke 20 in the SBIBS2

Luke 20 in the SBICS

Luke 20 in the SBIDS

Luke 20 in the SBIGS

Luke 20 in the SBIHS

Luke 20 in the SBIIS

Luke 20 in the SBIIS2

Luke 20 in the SBIIS3

Luke 20 in the SBIKS

Luke 20 in the SBIKS2

Luke 20 in the SBIMS

Luke 20 in the SBIOS

Luke 20 in the SBIPS

Luke 20 in the SBISS

Luke 20 in the SBITS

Luke 20 in the SBITS2

Luke 20 in the SBITS3

Luke 20 in the SBITS4

Luke 20 in the SBIUS

Luke 20 in the SBIVS

Luke 20 in the SBT

Luke 20 in the SBT1E

Luke 20 in the SCHL

Luke 20 in the SNT

Luke 20 in the SUSU

Luke 20 in the SUSU2

Luke 20 in the SYNO

Luke 20 in the TBIAOTANT

Luke 20 in the TBT1E

Luke 20 in the TBT1E2

Luke 20 in the TFTIP

Luke 20 in the TFTU

Luke 20 in the TGNTATF3T

Luke 20 in the THAI

Luke 20 in the TNFD

Luke 20 in the TNT

Luke 20 in the TNTIK

Luke 20 in the TNTIL

Luke 20 in the TNTIN

Luke 20 in the TNTIP

Luke 20 in the TNTIZ

Luke 20 in the TOMA

Luke 20 in the TTENT

Luke 20 in the UBG

Luke 20 in the UGV

Luke 20 in the UGV2

Luke 20 in the UGV3

Luke 20 in the VBL

Luke 20 in the VDCC

Luke 20 in the YALU

Luke 20 in the YAPE

Luke 20 in the YBVTP

Luke 20 in the ZBP