Luke 21 (BOICB)

1 Ọ leliri anya elu hụ ka ndị ọgaranya si etinye onyinye ha nʼime igbe onyinye. 2 Ọ hụkwara otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ ka ọ bịara tinye naanị mkpụrụ ego kọpa abụọ. 3 Ọ sịrị, “Nʼezie, agwa m unu, nwanyị ogbenye a di ya nwụrụ etinyela ego karịa ndị ọzọ niile. 4 Nʼihi na ndị ọzọ niile nyere onyinye ha site nʼego mapụtaara ha nʼakụnụba ha, ma ya onwe ya sitere nʼogbenye ya tinye ihe niile o ji biri.” 5 Mgbe ụfọdụ na-ekwu okwu banyere otu e si were nkume mara mma na onyinye e chere nʼihu Chineke, chọọ ụlọnsọ ukwu ahụ mma, ọ sịrị, 6 “Ma banyere ihe ndị a, oge na-abịa mgbe ihe ndị a niile unu na-ahụ na-agaghị adịkwa. Ọ dịghị otu nkume a ga-ahapụ nʼelu ibe ya, a ga-akwatusị ha niile.” 7 Ha jụrụ ya sị, “Onye ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama ga-egosi na ha na-aga imezu?” 8 Ọ sịrị, “Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya,’ na-asịkwa na ‘Oge ahụ dị nso.’ Unu esokwala ha. 9 Mgbe ọbụla unu nụrụ akụkọ agha dị iche iche na ọgbaaghara, ka ụjọ ghara ịtụ unu, ihe ndị a aghaghị ibu ụzọ mezuo, ma ọgwụgwụ oge erubeghị.” 10 Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Mba ga-ebili megide mba, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze. 11 A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nʼebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe dị egwu na ihe ịrịbama dị ukwuu site na mbara eluigwe. 12 “Ma tupu ihe ndị a niile emezuo, ha ga-ejide unu, kpagbukwaa unu. Ha ga-enyefe unu nʼaka ọtụtụ ụlọ ekpere. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-akpọpụkwa unu nʼihu ndị eze na ndị ọchịchị nʼihi aha m. 13 Nke a ga-abụrụ unu ohere iji gbaa akaebe. 14 Ma burunu ụzọ kpebie nʼobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu maka ihe unu ga-aza. 15 Nʼihi na aga m enye unu ụdị okwu na amamihe nke ndị na-ebo unu ebubo na-enweghị ike iguzogide maọbụ kwuo okwu megide. 16 Ọ bụladị ndị mụrụ unu, ụmụnne unu ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị ikwu unu na ndị enyi unu, ha ga-arara unu nye nʼaka ndị ọchịchị, ndị ga-egbukwa ụfọdụ nʼime unu. 17 Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. 18 Ma otu agịrị isi dị nʼisi unu agaghị ala nʼiyi. 19 Unu ga-azọpụta ndụ unu site na ntachiobi unu. 20 “Mgbe unu hụrụ ka ndị agha gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nʼiyi eruola. 21 Nʼoge ahụ ka ndị nọ na Judịa gbalaga nʼugwu, ka ndị nọ nʼime obodo si na ya pụta, ka ndị na-anọghị nʼobodo gharakwa ịba nʼime ya. 22 Nʼihi na oge a ga-abụ oge ịbọ ọbọ ka e mezuo ihe niile akwụkwọ nsọ kwuru. 23 Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ! A ga-enwe oke ihe mgbu nʼala a, iwe ga-adakwasịkwa ụmụ mmadụ. 24 Mma agha ga-egbu ha, mba niile ga-adọrọkwa ha nʼagha. Ndị mba ọzọ ga na-azọtọsị Jerusalem nʼụkwụ ruo mgbe oge nke ndị mba ọzọ ahụ zuru. 25 “A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa. 26 Ndị mmadụ ga-adakwa mba nʼobi nʼihi ụjọ mgbe ha ghọtara ihe gaje ịbịakwasị ụwa, nʼihi na a ga-eme ka ike niile nke dị nʼeluigwe maa jijiji. 27 Nʼoge ahụ, a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼike na ebube nʼigwe ojii. 28 Mgbe ihe ndị a malitere ime, guzoronụ ọtọ welie isi unu elu, nʼihi na oge mgbapụta unu dị nso.” 29 Ọ tụụrụ ha ilu a, “Leenụ osisi fiig na osisi ndị ọzọ niile anya. 30 Mgbe ha bidoro ipupụta ahịhịa ọhụrụ, unu na-amata na ọkọchị adịla nso. 31 Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso. 32 “Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. 33 Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga. 34 “Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya. 35 Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa. 36 Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.” 37 Kwa ụbọchị, ọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma nʼuhuruchi, ọ na-arịgoro nʼelu Ugwu Oliv ị ga nọọ ọnọdụ abalị. 38 Ndị mmadụ niile na-abịakwute ya nʼisi ụtụtụ niile nʼụlọnsọ ukwu ịnụrụ okwu ya.

In Other Versions

Luke 21 in the ANGEFD

Luke 21 in the ANTPNG2D

Luke 21 in the AS21

Luke 21 in the BAGH

Luke 21 in the BBPNG

Luke 21 in the BBT1E

Luke 21 in the BDS

Luke 21 in the BEV

Luke 21 in the BHAD

Luke 21 in the BIB

Luke 21 in the BLPT

Luke 21 in the BNT

Luke 21 in the BNTABOOT

Luke 21 in the BNTLV

Luke 21 in the BOATCB

Luke 21 in the BOATCB2

Luke 21 in the BOBCV

Luke 21 in the BOCNT

Luke 21 in the BOECS

Luke 21 in the BOGWICC

Luke 21 in the BOHCB

Luke 21 in the BOHCV

Luke 21 in the BOHLNT

Luke 21 in the BOHNTLTAL

Luke 21 in the BOILNTAP

Luke 21 in the BOITCV

Luke 21 in the BOKCV

Luke 21 in the BOKCV2

Luke 21 in the BOKHWOG

Luke 21 in the BOKSSV

Luke 21 in the BOLCB

Luke 21 in the BOLCB2

Luke 21 in the BOMCV

Luke 21 in the BONAV

Luke 21 in the BONCB

Luke 21 in the BONLT

Luke 21 in the BONUT2

Luke 21 in the BOPLNT

Luke 21 in the BOSCB

Luke 21 in the BOSNC

Luke 21 in the BOTLNT

Luke 21 in the BOVCB

Luke 21 in the BOYCB

Luke 21 in the BPBB

Luke 21 in the BPH

Luke 21 in the BSB

Luke 21 in the CCB

Luke 21 in the CUV

Luke 21 in the CUVS

Luke 21 in the DBT

Luke 21 in the DGDNT

Luke 21 in the DHNT

Luke 21 in the DNT

Luke 21 in the ELBE

Luke 21 in the EMTV

Luke 21 in the ESV

Luke 21 in the FBV

Luke 21 in the FEB

Luke 21 in the GGMNT

Luke 21 in the GNT

Luke 21 in the HARY

Luke 21 in the HNT

Luke 21 in the IRVA

Luke 21 in the IRVB

Luke 21 in the IRVG

Luke 21 in the IRVH

Luke 21 in the IRVK

Luke 21 in the IRVM

Luke 21 in the IRVM2

Luke 21 in the IRVO

Luke 21 in the IRVP

Luke 21 in the IRVT

Luke 21 in the IRVT2

Luke 21 in the IRVU

Luke 21 in the ISVN

Luke 21 in the JSNT

Luke 21 in the KAPI

Luke 21 in the KBT1ETNIK

Luke 21 in the KBV

Luke 21 in the KJV

Luke 21 in the KNFD

Luke 21 in the LBA

Luke 21 in the LBLA

Luke 21 in the LNT

Luke 21 in the LSV

Luke 21 in the MAAL

Luke 21 in the MBV

Luke 21 in the MBV2

Luke 21 in the MHNT

Luke 21 in the MKNFD

Luke 21 in the MNG

Luke 21 in the MNT

Luke 21 in the MNT2

Luke 21 in the MRS1T

Luke 21 in the NAA

Luke 21 in the NASB

Luke 21 in the NBLA

Luke 21 in the NBS

Luke 21 in the NBVTP

Luke 21 in the NET2

Luke 21 in the NIV11

Luke 21 in the NNT

Luke 21 in the NNT2

Luke 21 in the NNT3

Luke 21 in the PDDPT

Luke 21 in the PFNT

Luke 21 in the RMNT

Luke 21 in the SBIAS

Luke 21 in the SBIBS

Luke 21 in the SBIBS2

Luke 21 in the SBICS

Luke 21 in the SBIDS

Luke 21 in the SBIGS

Luke 21 in the SBIHS

Luke 21 in the SBIIS

Luke 21 in the SBIIS2

Luke 21 in the SBIIS3

Luke 21 in the SBIKS

Luke 21 in the SBIKS2

Luke 21 in the SBIMS

Luke 21 in the SBIOS

Luke 21 in the SBIPS

Luke 21 in the SBISS

Luke 21 in the SBITS

Luke 21 in the SBITS2

Luke 21 in the SBITS3

Luke 21 in the SBITS4

Luke 21 in the SBIUS

Luke 21 in the SBIVS

Luke 21 in the SBT

Luke 21 in the SBT1E

Luke 21 in the SCHL

Luke 21 in the SNT

Luke 21 in the SUSU

Luke 21 in the SUSU2

Luke 21 in the SYNO

Luke 21 in the TBIAOTANT

Luke 21 in the TBT1E

Luke 21 in the TBT1E2

Luke 21 in the TFTIP

Luke 21 in the TFTU

Luke 21 in the TGNTATF3T

Luke 21 in the THAI

Luke 21 in the TNFD

Luke 21 in the TNT

Luke 21 in the TNTIK

Luke 21 in the TNTIL

Luke 21 in the TNTIN

Luke 21 in the TNTIP

Luke 21 in the TNTIZ

Luke 21 in the TOMA

Luke 21 in the TTENT

Luke 21 in the UBG

Luke 21 in the UGV

Luke 21 in the UGV2

Luke 21 in the UGV3

Luke 21 in the VBL

Luke 21 in the VDCC

Luke 21 in the YALU

Luke 21 in the YAPE

Luke 21 in the YBVTP

Luke 21 in the ZBP