Luke 4 (BOICB)

1 Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọdan lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara. 2 Ebe ahụ ka ekwensu nwara ya ọnwụnwa iri ụbọchị anọ. Nʼụbọchị ndị ahụ niile o righị nri ọbụla. Nʼikpeazụ agụụ gụrụ ya. 3 Ekwensu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.” 4 Jisọs zara ya sị, “E dere ya, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’ ” 5 Ekwensu duuru ya rigoo nʼebe dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa, nʼotu ntabi anya. 6 Ọ gwara ya sị, “M ga-enye gị ikike niile ndị a na ebube ha. Ọ bụ m ka e nyere ha, e nwere m ike inye ha onye ọbụla m chọrọ inye ha. 7 Ya mere, ọ bụrụ na ị kpọọ isiala nye m, ha ga-abụ nke gị.” 8 Jisọs zara ya sị, “E deela ya: ‘Ị ga-akpọ isiala nye Onyenwe anyị Chineke gị, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ” 9 Ekwensu duuru ya gaa Jerusalem, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, si nʼebe a tụda onwe gị nʼala. 10 Nʼihi na e dere ya,“ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,ichekwa gị nke ọma; 11 ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha,ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’” 12 Jisọs zara ya sị, “E kwuola ya, Anwala Onyenwe anyị Chineke gị ọnwụnwa. ” 13 Mgbe ekwensu nwasịrị ya ọnwụnwa ndị a niile, ọ hapụrụ ya ruo mgbe ohere ọzọ dapụtara. 14 Jisọs lọghachiri na Galili nʼike nke Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ obodo niile. 15 O ziri ihe nʼọtụtụ ụlọ ekpere ha, mmadụ niile na-etokwa ya. 16 Mgbe o rutere Nazaret ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ. 17 E nyere ya akwụkwọ nke onye amụma Aịzaya dere. O meghere ya chọta ebe e dere sị, 18 “Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na o teela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ, ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì, ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha. 19 Ikwupụta afọ Onyenwe anyị ga-eme amara.” 20 O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya. 21 Ma o bidoro ịgwa ha sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ a mezuru na ntị unu.” 22 Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?” 23 Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’ ”  24 Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya. 25 Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii. 26 Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo Zarefat nʼakụkụ Saịdọn. 27 Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala Izrel, ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa Neeman onye Siria.” 28 Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. 29 Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ. 30 Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya. 31 O sitere nʼebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nʼụbọchị izuike, o bidoro izi ha ihe. 32 Ozizi ya juru ha anya, nʼihi na okwu ya nwere ikike. 33 Otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ, onye mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya. O tiri mkpu nʼoke olu, 34 “Hapụ anyị! Gịnị ka ị na-achọ nʼebe anyị nọ, gị, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara ka ị laa anyị nʼiyi? Ama m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke!” 35 Jisọs baara ya mba sị, “Nọrọ jii! Si nʼime ya pụta.” Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya nʼala nʼihu ha niile, o sikwa nʼime ya pụọ ma o merụghị ya ahụ. 36 Ihe ndị a juru ha niile anya, ha jụrịtara ibe ha sị, “Gịnị bụ ozizi nke a? O ji ịchị isi na ike na-enye mmụọ na-adịghị ọcha ndị a iwu, ha na-apụtakwa!” 37 Akụkọ banyere ya gbasara jeruo obodo niile dị ebe ahụ gburugburu. 38 Mgbe ọ hapụrụ ụlọ ekpere ahụ gaa nʼụlọ Saimọn. Nne nwunye Saimọn nwere ahụ ọkụ, ha rịọrọ ya ka o nyere ya aka. 39 O guzoro nʼihu ya, ma baara ahụ ọkụ ahụ mba, ọ hapụrụ ya nʼotu ntabi anya ahụ. O bilikwara lee ha ọbịa. 40 Mgbe anyanwụ na-ada, ọtụtụ ndị nwere ndị na-arịa ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute Jisọs. O bikwasịrị ha niile aka nʼotu nʼotu, gwọọ ha. 41 Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nʼime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke.” Ma ọ baara ha mba, o kweghị ka ha kwuo okwu, nʼihi na ha matara na ọ bụ Kraịst. 42 Mgbe chi bọrọ, ọ pụrụ gaa ebe naanị ya nọ. Ndị mmadụ nọ na-achọgharị ya; mgbe ha bịaruru ebe ọ nọ, ha gbalịsịrị ike ime ka ọ ghara ịhapụ ha. 43 Ma ọ sịrị ha, “Aghaghị m ikwusa oziọma alaeze Chineke nʼobodo ndị ọzọ, nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka e zitere m.” 44 Ọ gara nʼihu na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere niile dị na Judịa.

In Other Versions

Luke 4 in the ANGEFD

Luke 4 in the ANTPNG2D

Luke 4 in the AS21

Luke 4 in the BAGH

Luke 4 in the BBPNG

Luke 4 in the BBT1E

Luke 4 in the BDS

Luke 4 in the BEV

Luke 4 in the BHAD

Luke 4 in the BIB

Luke 4 in the BLPT

Luke 4 in the BNT

Luke 4 in the BNTABOOT

Luke 4 in the BNTLV

Luke 4 in the BOATCB

Luke 4 in the BOATCB2

Luke 4 in the BOBCV

Luke 4 in the BOCNT

Luke 4 in the BOECS

Luke 4 in the BOGWICC

Luke 4 in the BOHCB

Luke 4 in the BOHCV

Luke 4 in the BOHLNT

Luke 4 in the BOHNTLTAL

Luke 4 in the BOILNTAP

Luke 4 in the BOITCV

Luke 4 in the BOKCV

Luke 4 in the BOKCV2

Luke 4 in the BOKHWOG

Luke 4 in the BOKSSV

Luke 4 in the BOLCB

Luke 4 in the BOLCB2

Luke 4 in the BOMCV

Luke 4 in the BONAV

Luke 4 in the BONCB

Luke 4 in the BONLT

Luke 4 in the BONUT2

Luke 4 in the BOPLNT

Luke 4 in the BOSCB

Luke 4 in the BOSNC

Luke 4 in the BOTLNT

Luke 4 in the BOVCB

Luke 4 in the BOYCB

Luke 4 in the BPBB

Luke 4 in the BPH

Luke 4 in the BSB

Luke 4 in the CCB

Luke 4 in the CUV

Luke 4 in the CUVS

Luke 4 in the DBT

Luke 4 in the DGDNT

Luke 4 in the DHNT

Luke 4 in the DNT

Luke 4 in the ELBE

Luke 4 in the EMTV

Luke 4 in the ESV

Luke 4 in the FBV

Luke 4 in the FEB

Luke 4 in the GGMNT

Luke 4 in the GNT

Luke 4 in the HARY

Luke 4 in the HNT

Luke 4 in the IRVA

Luke 4 in the IRVB

Luke 4 in the IRVG

Luke 4 in the IRVH

Luke 4 in the IRVK

Luke 4 in the IRVM

Luke 4 in the IRVM2

Luke 4 in the IRVO

Luke 4 in the IRVP

Luke 4 in the IRVT

Luke 4 in the IRVT2

Luke 4 in the IRVU

Luke 4 in the ISVN

Luke 4 in the JSNT

Luke 4 in the KAPI

Luke 4 in the KBT1ETNIK

Luke 4 in the KBV

Luke 4 in the KJV

Luke 4 in the KNFD

Luke 4 in the LBA

Luke 4 in the LBLA

Luke 4 in the LNT

Luke 4 in the LSV

Luke 4 in the MAAL

Luke 4 in the MBV

Luke 4 in the MBV2

Luke 4 in the MHNT

Luke 4 in the MKNFD

Luke 4 in the MNG

Luke 4 in the MNT

Luke 4 in the MNT2

Luke 4 in the MRS1T

Luke 4 in the NAA

Luke 4 in the NASB

Luke 4 in the NBLA

Luke 4 in the NBS

Luke 4 in the NBVTP

Luke 4 in the NET2

Luke 4 in the NIV11

Luke 4 in the NNT

Luke 4 in the NNT2

Luke 4 in the NNT3

Luke 4 in the PDDPT

Luke 4 in the PFNT

Luke 4 in the RMNT

Luke 4 in the SBIAS

Luke 4 in the SBIBS

Luke 4 in the SBIBS2

Luke 4 in the SBICS

Luke 4 in the SBIDS

Luke 4 in the SBIGS

Luke 4 in the SBIHS

Luke 4 in the SBIIS

Luke 4 in the SBIIS2

Luke 4 in the SBIIS3

Luke 4 in the SBIKS

Luke 4 in the SBIKS2

Luke 4 in the SBIMS

Luke 4 in the SBIOS

Luke 4 in the SBIPS

Luke 4 in the SBISS

Luke 4 in the SBITS

Luke 4 in the SBITS2

Luke 4 in the SBITS3

Luke 4 in the SBITS4

Luke 4 in the SBIUS

Luke 4 in the SBIVS

Luke 4 in the SBT

Luke 4 in the SBT1E

Luke 4 in the SCHL

Luke 4 in the SNT

Luke 4 in the SUSU

Luke 4 in the SUSU2

Luke 4 in the SYNO

Luke 4 in the TBIAOTANT

Luke 4 in the TBT1E

Luke 4 in the TBT1E2

Luke 4 in the TFTIP

Luke 4 in the TFTU

Luke 4 in the TGNTATF3T

Luke 4 in the THAI

Luke 4 in the TNFD

Luke 4 in the TNT

Luke 4 in the TNTIK

Luke 4 in the TNTIL

Luke 4 in the TNTIN

Luke 4 in the TNTIP

Luke 4 in the TNTIZ

Luke 4 in the TOMA

Luke 4 in the TTENT

Luke 4 in the UBG

Luke 4 in the UGV

Luke 4 in the UGV2

Luke 4 in the UGV3

Luke 4 in the VBL

Luke 4 in the VDCC

Luke 4 in the YALU

Luke 4 in the YAPE

Luke 4 in the YBVTP

Luke 4 in the ZBP