Malachi 2 (BOICB)

1 “Ma ugbu a, unu ndị nchụaja, ịdọ aka na ntị a dịrị unu. 2 Ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị, ọ bụrụkwa na unu ekpebighị nʼobi unu inye aha m otuto,” ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Aga m ezite ọbụbụ ọnụ nʼahụ unu, aga m abụkwa ngọzị unu niile ọnụ. E, abụọlarị unu ọnụ, nʼihi na unu ekpebighị nʼobi unu ịsọpụrụ m. 3 “Nʼihi unu, aga m abara ụmụ ụmụ unu mba. Agaghị m anabata onyinye unu, aga m efesakwa nsị anụ nʼihu unu, bụ nsị nke ihe onyinye unu, aga m ewezugakwa unu site nʼihu m. 4 Otu a ka unu ga-esi mara na ọ bụ mụ zitere unu ịdọ aka na ntị a, ka ọgbụgba ndụ mụ na Livayị gbara dịgide,” Ọ bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu. 5 “Ọgbụgba ndụ mụ na ya bụ nke ndụ na udo, ọ bụ m nyere ha ya, nke a bụ nʼihi nsọpụrụ. O nyere m nsọpụrụ nʼezie, tụkwaa aha m egwu. 6 Iwu nke eziokwu dị ya nʼọnụ, ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a chọpụtara nʼegbugbere ọnụ ya. O soro m jee ije nʼudo, na nʼịkwụba aka ọtọ. O mekwara ka ọtụtụ si nʼajọ omume ha chigharịa. 7 “Nʼihi na egbugbere ọnụ onye nchụaja kwesiri ijupụta nʼihe ọmụma; e kwesikwara isi nʼọnụ ya mụta ihe, nʼihi na ọ bụ onyeozi nke ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile. 8 Ma unu esitela nʼụzọ ahụ wezuga onwe unu, sitekwa nʼozizi unu mee ka ọtụtụ mmadụ sụọ ngọngọ. Unu emerụọla ọgbụgba ndụ nke Livayị.” Ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 9 “Nʼihi nke a, emeela m ka unu bụrụ ndị a na-elelị anya, na ndị e wedara nʼala nʼihu ndị mmadụ niile, nʼihi na unu agbasoghị ụzọ m, kama unu na-ele mmadụ anya nʼihu, nʼihe metụtara iwu.” 10 Ọ bụghị otu Nna ka anyị niile nwere? Ọ bụghị otu Chineke ahụ kere anyị? Gịnị mere anyị ji na-emerụ ọgbụgba ndụ nna anyị ha site na-enweghị ntụkwasị obi na mmekọrịta anyị na ibe anyị? 11 Juda ekwesighị ntụkwasị obi. E meela ihe arụ nʼIzrel na nʼime Jerusalem: Juda emerụọla ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ hụrụ nʼanya, lụọkwa ada chi ndị mba ọzọ. 12 Ka ONYENWE ANYỊ kewapụ onye mere ihe dị otu a nʼụlọ ikwu Jekọb, ka ọ ghara inwe onye akaebe, ka ọ ghara inwe onye ga-aza ya mgbe ọ kpọrọ oku maọbụ butere ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye. 13 Ihe ọzọ unu na-emekwa bụ ndị a: unu na-eme ka anya mmiri unu jupụta nʼebe ịchụ aja ONYENWE ANYỊ. Unu na-akwa akwa, na-eti mkpu akwa nʼihi na ọ naghị elenye anya nʼonyinye unu, maọbụ jiri obi ụtọ nabata ha. 14 Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị. 15 Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ. 16 “Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka ONYENWE ANYỊ Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ ONYENWE Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi. 17 Unu esitela nʼoke okwu unu mee ka ike gwụ ONYENWE ANYỊ.Ma unu na-ajụ, “Olee ụzọ anyị si mee ka ike gwụ ya?”Mgbe unu na-asị, “Ndị niile na-eme ihe ọjọọ dị mma nʼanya ONYENWE ANYỊ. Ihe ha na-atọkwa ya ụtọ,” maọbụ na-asịkwa, “Ebee ka Chineke ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi nọ?”

In Other Versions

Malachi 2 in the ANGEFD

Malachi 2 in the ANTPNG2D

Malachi 2 in the AS21

Malachi 2 in the BAGH

Malachi 2 in the BBPNG

Malachi 2 in the BBT1E

Malachi 2 in the BDS

Malachi 2 in the BEV

Malachi 2 in the BHAD

Malachi 2 in the BIB

Malachi 2 in the BLPT

Malachi 2 in the BNT

Malachi 2 in the BNTABOOT

Malachi 2 in the BNTLV

Malachi 2 in the BOATCB

Malachi 2 in the BOATCB2

Malachi 2 in the BOBCV

Malachi 2 in the BOCNT

Malachi 2 in the BOECS

Malachi 2 in the BOGWICC

Malachi 2 in the BOHCB

Malachi 2 in the BOHCV

Malachi 2 in the BOHLNT

Malachi 2 in the BOHNTLTAL

Malachi 2 in the BOILNTAP

Malachi 2 in the BOITCV

Malachi 2 in the BOKCV

Malachi 2 in the BOKCV2

Malachi 2 in the BOKHWOG

Malachi 2 in the BOKSSV

Malachi 2 in the BOLCB

Malachi 2 in the BOLCB2

Malachi 2 in the BOMCV

Malachi 2 in the BONAV

Malachi 2 in the BONCB

Malachi 2 in the BONLT

Malachi 2 in the BONUT2

Malachi 2 in the BOPLNT

Malachi 2 in the BOSCB

Malachi 2 in the BOSNC

Malachi 2 in the BOTLNT

Malachi 2 in the BOVCB

Malachi 2 in the BOYCB

Malachi 2 in the BPBB

Malachi 2 in the BPH

Malachi 2 in the BSB

Malachi 2 in the CCB

Malachi 2 in the CUV

Malachi 2 in the CUVS

Malachi 2 in the DBT

Malachi 2 in the DGDNT

Malachi 2 in the DHNT

Malachi 2 in the DNT

Malachi 2 in the ELBE

Malachi 2 in the EMTV

Malachi 2 in the ESV

Malachi 2 in the FBV

Malachi 2 in the FEB

Malachi 2 in the GGMNT

Malachi 2 in the GNT

Malachi 2 in the HARY

Malachi 2 in the HNT

Malachi 2 in the IRVA

Malachi 2 in the IRVB

Malachi 2 in the IRVG

Malachi 2 in the IRVH

Malachi 2 in the IRVK

Malachi 2 in the IRVM

Malachi 2 in the IRVM2

Malachi 2 in the IRVO

Malachi 2 in the IRVP

Malachi 2 in the IRVT

Malachi 2 in the IRVT2

Malachi 2 in the IRVU

Malachi 2 in the ISVN

Malachi 2 in the JSNT

Malachi 2 in the KAPI

Malachi 2 in the KBT1ETNIK

Malachi 2 in the KBV

Malachi 2 in the KJV

Malachi 2 in the KNFD

Malachi 2 in the LBA

Malachi 2 in the LBLA

Malachi 2 in the LNT

Malachi 2 in the LSV

Malachi 2 in the MAAL

Malachi 2 in the MBV

Malachi 2 in the MBV2

Malachi 2 in the MHNT

Malachi 2 in the MKNFD

Malachi 2 in the MNG

Malachi 2 in the MNT

Malachi 2 in the MNT2

Malachi 2 in the MRS1T

Malachi 2 in the NAA

Malachi 2 in the NASB

Malachi 2 in the NBLA

Malachi 2 in the NBS

Malachi 2 in the NBVTP

Malachi 2 in the NET2

Malachi 2 in the NIV11

Malachi 2 in the NNT

Malachi 2 in the NNT2

Malachi 2 in the NNT3

Malachi 2 in the PDDPT

Malachi 2 in the PFNT

Malachi 2 in the RMNT

Malachi 2 in the SBIAS

Malachi 2 in the SBIBS

Malachi 2 in the SBIBS2

Malachi 2 in the SBICS

Malachi 2 in the SBIDS

Malachi 2 in the SBIGS

Malachi 2 in the SBIHS

Malachi 2 in the SBIIS

Malachi 2 in the SBIIS2

Malachi 2 in the SBIIS3

Malachi 2 in the SBIKS

Malachi 2 in the SBIKS2

Malachi 2 in the SBIMS

Malachi 2 in the SBIOS

Malachi 2 in the SBIPS

Malachi 2 in the SBISS

Malachi 2 in the SBITS

Malachi 2 in the SBITS2

Malachi 2 in the SBITS3

Malachi 2 in the SBITS4

Malachi 2 in the SBIUS

Malachi 2 in the SBIVS

Malachi 2 in the SBT

Malachi 2 in the SBT1E

Malachi 2 in the SCHL

Malachi 2 in the SNT

Malachi 2 in the SUSU

Malachi 2 in the SUSU2

Malachi 2 in the SYNO

Malachi 2 in the TBIAOTANT

Malachi 2 in the TBT1E

Malachi 2 in the TBT1E2

Malachi 2 in the TFTIP

Malachi 2 in the TFTU

Malachi 2 in the TGNTATF3T

Malachi 2 in the THAI

Malachi 2 in the TNFD

Malachi 2 in the TNT

Malachi 2 in the TNTIK

Malachi 2 in the TNTIL

Malachi 2 in the TNTIN

Malachi 2 in the TNTIP

Malachi 2 in the TNTIZ

Malachi 2 in the TOMA

Malachi 2 in the TTENT

Malachi 2 in the UBG

Malachi 2 in the UGV

Malachi 2 in the UGV2

Malachi 2 in the UGV3

Malachi 2 in the VBL

Malachi 2 in the VDCC

Malachi 2 in the YALU

Malachi 2 in the YAPE

Malachi 2 in the YBVTP

Malachi 2 in the ZBP