Matthew 16 (BOICB)

1 Ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara ya sị, “Gosi anyị ihe ịrịbama si nʼeluigwe.” 2 Ọ zara ha, “Mgbe o ruru anyasị unu na-asị, ‘Ihu eluigwe ga-adị mma nʼihi na ọ na-acha uhie uhie.’ 3 Nʼụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nʼihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie ma na-eji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nʼihe ịrịbama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nʼime ya pụtara. 4 Ajọ ọgbọ nke jupụtara nʼịkwa iko, nke na-arịọkwa ihe ịrịbama. Ọ nweghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi ya karịa ihe ịrịbama Jona.” Mgbe ahụ ọ sitere nʼebe ahụ ha nọ pụọ. 5 Mgbe ha gafesịrị nʼofe ọzọ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha ejighị achịcha ọbụla. 6 Nʼoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha, “Lezienụ anya, ma na-ezekwa ihe ndị na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.” 7 Ha malitere na-ekwurịta nʼetiti onwe ha, na-asị, ọ bụ nʼihi na anyị ewetaghị ogbe achịcha ọbụla. 8 Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche, ọ sịrị, “Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nʼihi na unu enweghị achịcha? 9 Olee mgbe unu ga-amata ihe? Ọ bụ na unu echetaghị puku mmadụ ise ahụ m jiri ogbe achịcha ise mee ka ha rijuo afọ? Ọ bụ nkata ole ka unu tụtụjuru? 10 Unu echetakwaghị na m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ? Iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara? 11 Gịnị mere unu aghọtaghị na ọ bụghị ihe banyere achịcha ka m na-ekwu? Cheenụ onwe unu nche nʼebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.” 12 Mgbe ahụ ka ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha nke a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii. 13 Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?” 14 Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, maọbụ otu nʼime ndị amụma.” 15 Ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?” 16 Saimọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” 17 Jisọs gwara ya sị, “Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya. 18 Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya. 19 Aga m enye gị mkpisi igodo alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ nʼelu ụwa, ka a ga-ekekwa agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ nʼagbụ nʼụwa, a ga-atọpụkwa ya nʼeluigwe.” 20 Mgbe ahụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka onye ọbụla mata na ya bụ Kraịst ahụ. 21 Site nʼoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya, na ya aghaghị ịga Jerusalem, ebe ọ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche site nʼaka ndị okenye, na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu. O mere ka ha mata na aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie. 22 Pita duuru ya pụọ nʼotu akụkụ, nọdụ nʼebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!” 23 Ma o chigharịrị sị Pita, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu! Ị bụ ihe mgbochi nye m. Nʼihi na ihe ị na-eche echiche ya bụ naanị echiche mmadụ, ọ bụghị uche Chineke.” 24 Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buru obe ya, soro m nʼazụ. 25 Nʼihi na onye ọbụla na-eche ndụ ya nche ka ọ hapụ ifunarị ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-achọtakwa ya. 26 Nʼihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya? Maọbụ gịnị bụ ihe ahụ dị nʼụwa nke mmadụ ga-eji gbanwee ndụ ya? 27 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị. 28 “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe, agaghị edetụ ọnwụ ire, tụpụ ha ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼalaeze ya.”

In Other Versions

Matthew 16 in the ANGEFD

Matthew 16 in the ANTPNG2D

Matthew 16 in the AS21

Matthew 16 in the BAGH

Matthew 16 in the BBPNG

Matthew 16 in the BBT1E

Matthew 16 in the BDS

Matthew 16 in the BEV

Matthew 16 in the BHAD

Matthew 16 in the BIB

Matthew 16 in the BLPT

Matthew 16 in the BNT

Matthew 16 in the BNTABOOT

Matthew 16 in the BNTLV

Matthew 16 in the BOATCB

Matthew 16 in the BOATCB2

Matthew 16 in the BOBCV

Matthew 16 in the BOCNT

Matthew 16 in the BOECS

Matthew 16 in the BOGWICC

Matthew 16 in the BOHCB

Matthew 16 in the BOHCV

Matthew 16 in the BOHLNT

Matthew 16 in the BOHNTLTAL

Matthew 16 in the BOILNTAP

Matthew 16 in the BOITCV

Matthew 16 in the BOKCV

Matthew 16 in the BOKCV2

Matthew 16 in the BOKHWOG

Matthew 16 in the BOKSSV

Matthew 16 in the BOLCB

Matthew 16 in the BOLCB2

Matthew 16 in the BOMCV

Matthew 16 in the BONAV

Matthew 16 in the BONCB

Matthew 16 in the BONLT

Matthew 16 in the BONUT2

Matthew 16 in the BOPLNT

Matthew 16 in the BOSCB

Matthew 16 in the BOSNC

Matthew 16 in the BOTLNT

Matthew 16 in the BOVCB

Matthew 16 in the BOYCB

Matthew 16 in the BPBB

Matthew 16 in the BPH

Matthew 16 in the BSB

Matthew 16 in the CCB

Matthew 16 in the CUV

Matthew 16 in the CUVS

Matthew 16 in the DBT

Matthew 16 in the DGDNT

Matthew 16 in the DHNT

Matthew 16 in the DNT

Matthew 16 in the ELBE

Matthew 16 in the EMTV

Matthew 16 in the ESV

Matthew 16 in the FBV

Matthew 16 in the FEB

Matthew 16 in the GGMNT

Matthew 16 in the GNT

Matthew 16 in the HARY

Matthew 16 in the HNT

Matthew 16 in the IRVA

Matthew 16 in the IRVB

Matthew 16 in the IRVG

Matthew 16 in the IRVH

Matthew 16 in the IRVK

Matthew 16 in the IRVM

Matthew 16 in the IRVM2

Matthew 16 in the IRVO

Matthew 16 in the IRVP

Matthew 16 in the IRVT

Matthew 16 in the IRVT2

Matthew 16 in the IRVU

Matthew 16 in the ISVN

Matthew 16 in the JSNT

Matthew 16 in the KAPI

Matthew 16 in the KBT1ETNIK

Matthew 16 in the KBV

Matthew 16 in the KJV

Matthew 16 in the KNFD

Matthew 16 in the LBA

Matthew 16 in the LBLA

Matthew 16 in the LNT

Matthew 16 in the LSV

Matthew 16 in the MAAL

Matthew 16 in the MBV

Matthew 16 in the MBV2

Matthew 16 in the MHNT

Matthew 16 in the MKNFD

Matthew 16 in the MNG

Matthew 16 in the MNT

Matthew 16 in the MNT2

Matthew 16 in the MRS1T

Matthew 16 in the NAA

Matthew 16 in the NASB

Matthew 16 in the NBLA

Matthew 16 in the NBS

Matthew 16 in the NBVTP

Matthew 16 in the NET2

Matthew 16 in the NIV11

Matthew 16 in the NNT

Matthew 16 in the NNT2

Matthew 16 in the NNT3

Matthew 16 in the PDDPT

Matthew 16 in the PFNT

Matthew 16 in the RMNT

Matthew 16 in the SBIAS

Matthew 16 in the SBIBS

Matthew 16 in the SBIBS2

Matthew 16 in the SBICS

Matthew 16 in the SBIDS

Matthew 16 in the SBIGS

Matthew 16 in the SBIHS

Matthew 16 in the SBIIS

Matthew 16 in the SBIIS2

Matthew 16 in the SBIIS3

Matthew 16 in the SBIKS

Matthew 16 in the SBIKS2

Matthew 16 in the SBIMS

Matthew 16 in the SBIOS

Matthew 16 in the SBIPS

Matthew 16 in the SBISS

Matthew 16 in the SBITS

Matthew 16 in the SBITS2

Matthew 16 in the SBITS3

Matthew 16 in the SBITS4

Matthew 16 in the SBIUS

Matthew 16 in the SBIVS

Matthew 16 in the SBT

Matthew 16 in the SBT1E

Matthew 16 in the SCHL

Matthew 16 in the SNT

Matthew 16 in the SUSU

Matthew 16 in the SUSU2

Matthew 16 in the SYNO

Matthew 16 in the TBIAOTANT

Matthew 16 in the TBT1E

Matthew 16 in the TBT1E2

Matthew 16 in the TFTIP

Matthew 16 in the TFTU

Matthew 16 in the TGNTATF3T

Matthew 16 in the THAI

Matthew 16 in the TNFD

Matthew 16 in the TNT

Matthew 16 in the TNTIK

Matthew 16 in the TNTIL

Matthew 16 in the TNTIN

Matthew 16 in the TNTIP

Matthew 16 in the TNTIZ

Matthew 16 in the TOMA

Matthew 16 in the TTENT

Matthew 16 in the UBG

Matthew 16 in the UGV

Matthew 16 in the UGV2

Matthew 16 in the UGV3

Matthew 16 in the VBL

Matthew 16 in the VDCC

Matthew 16 in the YALU

Matthew 16 in the YAPE

Matthew 16 in the YBVTP

Matthew 16 in the ZBP