Matthew 21 (BOICB)

1 Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji dị nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya. 2 Ọ gwara ha sị, “Baanụ nʼime obodo nta ahụ dị unu nʼihu, ngwangwa unu ga-ahụ otu ịnyịnya ibu elibere nʼosisi nʼebe ahụ, nke ya na nwa ya nọ nʼotu ebe. Tọpụta ha ma kpụtaranụ m ha. 3 Ọ bụrụkwa na onye ọbụla asị unu ihe ọbụla, unu ga-asị ha, ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ha ngwangwa.” 4 E mere nke a ka okwu e kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. 5 “Gwanụ ada Zayọn sị,‘lee, eze gị ka ọ na-abịakwute gị.Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ na-anọkwasịkwa nʼelu ịnyịnya ibu,ee, nʼelu nwa ịnyịnya, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.’ ” 6 Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sịrị ha mee. 7 Ha kpụtara ịnyịnya ibu ahụ na nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ha ka Jisọs nọkwasị nʼelu ha. 8 Ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. Ndị ọzọ gbuturu alaka osisi, tụsaa ha nʼụzọ nʼihu ya. 9 Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị:“Hozanna dịrị Nwa Devid!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!” 10 Mgbe ọ batara nʼime Jerusalem, ụzụ tụrụ, obodo ahụ niile mere mkpọtụ. Ndị mmadụ bidoro na-ajụ ajụjụ na-asị, “Onye kwa bụ onye a?” 11 Igwe mmadụ ahụ nọ na-asị, “Nwoke a bụ Jisọs, onye amụma ahụ sị Nazaret, obodo dị nʼime Galili.” 12 Jisọs banyere nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem, malite ịchụpụ ndị niile na-ere ahịa na ndị na-azụ ahịa nʼime ụlọnsọ ahụ. O kpuru tebul ndị na-agbanwe ego ihu nʼala, kwatuokwa oche ndị na-ere nduru. 13 Ọ sịrị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ, ‘Ụlọ m ka a ga-akpọ ụlọ ekpere,’ ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnarị mmadụ ihe nʼike.’” 14 Ndị ìsì na ndị ngwụrọ bịakwutere ya nʼụlọnsọ ahụ. Ọ gwọkwara ha. 15 Ma mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịbama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nʼoke olu nʼogige ụlọnsọ ahụ, na-asị, “Hozanna dịrị Nwa Devid.” Iwe were ha nke ukwuu. 16 Ha sịrị ya, “Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?”Jisọs zara sị ha, “E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị, “ ‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’?” 17 Ọ hapụrụ ha, si nʼobodo ahụ pụọ gaa Betani, ebe ọ nọrọ nʼabalị ahụ niile. 18 Nʼụtụtụ, mgbe ọ laghachiri nʼobodo ahụ, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. 19 Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ. 20 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, o juru ha anya, ha jụọ sị, “Gịnị mere osisi fiig a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?” 21 Jisọs zara sị ha, “Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na unu e nwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe e mere osisi fiig ahụ. Unu pụrụ inye ugwu a iwu sị ya, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa danye nʼoke osimiri.’ Ọ ga-emezukwa. 22 Ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼekpere, ọ bụrụ na unu ekwere unu ga-anatakwa ya.” 23 Mgbe Jisọs batara nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya ka ọ nọ na-akụzi ihe jụọ ya sị, “Olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Ọ bụ onye nyekwara gị ikike a?” 24 Jisọs zara sị ha, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a niile. 25 Baptizim nke Jọn o sitere nʼeluigwe, ka ọ si nʼaka mmadụ?”Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o si nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Ọ bụ gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ 26 Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o sitere nʼaka mmadụ,’ anyị na-atụ igwe mmadụ ndị a egwu, nʼihi na mmadụ niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.” 27 Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.”Jisọs zakwara ha sị, “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a. 28 “Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ nwoke abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m nwoke, gaa rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m taa.’ 29 “Ọ zara ya sị, ‘Agaghị m aga.’ Ma o mesịrị gbanwee obi ya gaakwa rụọ ọrụ ahụ. 30 “Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta gwakwa ya otu ihe ahụ. Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga, onyenwe anyị.’ Ma nʼikpeazụ ọ gaghị. 31 “Onye nʼime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?”Ha zara sị ya, “Onye nke mbụ.”Jisọs kọwaara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, ndị ọna ụtụ na ụmụ nwanyị akwụna ga-ebu unu ụzọ banye nʼalaeze Chineke. 32 Nʼihi na Jọn bịakwutere unu igosi unu ụzọ ezi omume, ma unu ekweghị. Ndị ọna ụtụ, na ụmụ nwanyị akwụna chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ nke a, o mekwaghị ka unu chegharịa kwere na ya. 33 “Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ. 34 Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị odibo ya ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nʼubi ahụ. 35 “Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị odibo ya ahụ tie otu onye nʼime ha ihe, gbukwaa onye ọzọ nʼime ha. Ha tụkwara otu nʼime ha nkume. 36 Emesịa, o zigakwara ọtụtụ ndị odibo karịrị ndị nke mbụ nʼọnụọgụgụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ. 37 Nʼikpeazụ o zigara ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m.’ 38 “Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’ 39 Ya mere, ha jidere ya nʼike, kpụrụ ya gafee nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya nʼebe ahụ. 40 “Mgbe onye nwe ubi vaịnị ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?” 41 Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.” 42 Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’ 43 “Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-amịpụta ezi mkpụrụ. 44 Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume a ga-etiwasị, ma ọ ga-egwepịa onye ọbụla nke ọ dakwasịrị.” 45 Mgbe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nụrụ ilu ya ndị a, ha ghọtara na ọ na-ekwu banyere ha. 46 Ha chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya, ma oke egwu igwe mmadụ ahụ tụrụ ha, nʼihi na ha gụrụ ya nʼonye amụma.

In Other Versions

Matthew 21 in the ANGEFD

Matthew 21 in the ANTPNG2D

Matthew 21 in the AS21

Matthew 21 in the BAGH

Matthew 21 in the BBPNG

Matthew 21 in the BBT1E

Matthew 21 in the BDS

Matthew 21 in the BEV

Matthew 21 in the BHAD

Matthew 21 in the BIB

Matthew 21 in the BLPT

Matthew 21 in the BNT

Matthew 21 in the BNTABOOT

Matthew 21 in the BNTLV

Matthew 21 in the BOATCB

Matthew 21 in the BOATCB2

Matthew 21 in the BOBCV

Matthew 21 in the BOCNT

Matthew 21 in the BOECS

Matthew 21 in the BOGWICC

Matthew 21 in the BOHCB

Matthew 21 in the BOHCV

Matthew 21 in the BOHLNT

Matthew 21 in the BOHNTLTAL

Matthew 21 in the BOILNTAP

Matthew 21 in the BOITCV

Matthew 21 in the BOKCV

Matthew 21 in the BOKCV2

Matthew 21 in the BOKHWOG

Matthew 21 in the BOKSSV

Matthew 21 in the BOLCB

Matthew 21 in the BOLCB2

Matthew 21 in the BOMCV

Matthew 21 in the BONAV

Matthew 21 in the BONCB

Matthew 21 in the BONLT

Matthew 21 in the BONUT2

Matthew 21 in the BOPLNT

Matthew 21 in the BOSCB

Matthew 21 in the BOSNC

Matthew 21 in the BOTLNT

Matthew 21 in the BOVCB

Matthew 21 in the BOYCB

Matthew 21 in the BPBB

Matthew 21 in the BPH

Matthew 21 in the BSB

Matthew 21 in the CCB

Matthew 21 in the CUV

Matthew 21 in the CUVS

Matthew 21 in the DBT

Matthew 21 in the DGDNT

Matthew 21 in the DHNT

Matthew 21 in the DNT

Matthew 21 in the ELBE

Matthew 21 in the EMTV

Matthew 21 in the ESV

Matthew 21 in the FBV

Matthew 21 in the FEB

Matthew 21 in the GGMNT

Matthew 21 in the GNT

Matthew 21 in the HARY

Matthew 21 in the HNT

Matthew 21 in the IRVA

Matthew 21 in the IRVB

Matthew 21 in the IRVG

Matthew 21 in the IRVH

Matthew 21 in the IRVK

Matthew 21 in the IRVM

Matthew 21 in the IRVM2

Matthew 21 in the IRVO

Matthew 21 in the IRVP

Matthew 21 in the IRVT

Matthew 21 in the IRVT2

Matthew 21 in the IRVU

Matthew 21 in the ISVN

Matthew 21 in the JSNT

Matthew 21 in the KAPI

Matthew 21 in the KBT1ETNIK

Matthew 21 in the KBV

Matthew 21 in the KJV

Matthew 21 in the KNFD

Matthew 21 in the LBA

Matthew 21 in the LBLA

Matthew 21 in the LNT

Matthew 21 in the LSV

Matthew 21 in the MAAL

Matthew 21 in the MBV

Matthew 21 in the MBV2

Matthew 21 in the MHNT

Matthew 21 in the MKNFD

Matthew 21 in the MNG

Matthew 21 in the MNT

Matthew 21 in the MNT2

Matthew 21 in the MRS1T

Matthew 21 in the NAA

Matthew 21 in the NASB

Matthew 21 in the NBLA

Matthew 21 in the NBS

Matthew 21 in the NBVTP

Matthew 21 in the NET2

Matthew 21 in the NIV11

Matthew 21 in the NNT

Matthew 21 in the NNT2

Matthew 21 in the NNT3

Matthew 21 in the PDDPT

Matthew 21 in the PFNT

Matthew 21 in the RMNT

Matthew 21 in the SBIAS

Matthew 21 in the SBIBS

Matthew 21 in the SBIBS2

Matthew 21 in the SBICS

Matthew 21 in the SBIDS

Matthew 21 in the SBIGS

Matthew 21 in the SBIHS

Matthew 21 in the SBIIS

Matthew 21 in the SBIIS2

Matthew 21 in the SBIIS3

Matthew 21 in the SBIKS

Matthew 21 in the SBIKS2

Matthew 21 in the SBIMS

Matthew 21 in the SBIOS

Matthew 21 in the SBIPS

Matthew 21 in the SBISS

Matthew 21 in the SBITS

Matthew 21 in the SBITS2

Matthew 21 in the SBITS3

Matthew 21 in the SBITS4

Matthew 21 in the SBIUS

Matthew 21 in the SBIVS

Matthew 21 in the SBT

Matthew 21 in the SBT1E

Matthew 21 in the SCHL

Matthew 21 in the SNT

Matthew 21 in the SUSU

Matthew 21 in the SUSU2

Matthew 21 in the SYNO

Matthew 21 in the TBIAOTANT

Matthew 21 in the TBT1E

Matthew 21 in the TBT1E2

Matthew 21 in the TFTIP

Matthew 21 in the TFTU

Matthew 21 in the TGNTATF3T

Matthew 21 in the THAI

Matthew 21 in the TNFD

Matthew 21 in the TNT

Matthew 21 in the TNTIK

Matthew 21 in the TNTIL

Matthew 21 in the TNTIN

Matthew 21 in the TNTIP

Matthew 21 in the TNTIZ

Matthew 21 in the TOMA

Matthew 21 in the TTENT

Matthew 21 in the UBG

Matthew 21 in the UGV

Matthew 21 in the UGV2

Matthew 21 in the UGV3

Matthew 21 in the VBL

Matthew 21 in the VDCC

Matthew 21 in the YALU

Matthew 21 in the YAPE

Matthew 21 in the YBVTP

Matthew 21 in the ZBP