Matthew 3 (BOICB)
1 Nʼoge ahụ, Jọn omee baptizim bịara na-ezisa ozi nʼọzara Judịa. Isi okwu ya bụ, 2 “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.” 3 Nʼihi na nwoke a bụ onye e kwuru okwu banyere ya site nʼọnụ onye amụma Aịzaya sị,“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị,‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị,meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ” 4 Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ. 5 Nʼoge ahụ, ndị mmadụ sitere Jerusalem, na Judịa niile, nʼala niile dị Jọdan gburugburu, na-apụkwuru ya. 6 Mgbe ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan. 7 Ma mgbe ọhụrụ ọtụtụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha na-abịa ka e mee ha baptizim, ọ sịrị ha, “Unu ụmụ ajụala, onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa? 8 Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. 9 Unu echekwala na unu pụrụ ị sị nʼime onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna,’ nʼihi na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ. 10 Ma ugbu a atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi niile. Osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu, tụba ya nʼime ọkụ. 11 “Mụ onwe m ji mmiri eme unu baptizim nʼihi nchegharị, ma onye dị ike karịa m na-abịa. Onye m na-erughị ịchịta akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ were mee unu baptizim. 12 Ihe ịfụcha ọka ya dị ya nʼaka, ọ ga-azacha ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, chịkọta mkpụrụ ọka wiiti tinye ha nʼọba, ma jiri ọkụ a na-apụghị imenyụ emenyụ rechapụ igbugbo ọka.” 13 Mgbe ahụ, Jisọs sitere na Galili bịa nʼosimiri Jọdan ka Jọn mee ya baptizim. 14 Ma Jọn chọrọ igbochi ya, sị, “Ọ bụ m kwesiri ịbịakwute gị ka ị mee m baptizim. Gịnị mere i ji abịakwute m?” 15 Ma Jisọs zara ya sị, “Kwere ka ọ dịrị otu a ugbu a, o kwesiri ka anyị mezuo ezi omume niile.” Mgbe ahụ Jọn kwenyere. 16 Ngwangwa e mechara Jisọs baptizim, o sitere na mmiri ahụ rịpụta. Nʼotu oge ahụ, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ nke Chineke ka o si nʼelu fedata dị ka nduru na-ebekwasị Jisọs nʼisi. 17 Otu olu sitere nʼeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Ihe ya dị m ezi mma.”
In Other Versions
Matthew 3 in the ANGEFD
Matthew 3 in the ANTPNG2D
Matthew 3 in the AS21
Matthew 3 in the BAGH
Matthew 3 in the BBPNG
Matthew 3 in the BBT1E
Matthew 3 in the BDS
Matthew 3 in the BEV
Matthew 3 in the BHAD
Matthew 3 in the BIB
Matthew 3 in the BLPT
Matthew 3 in the BNT
Matthew 3 in the BNTABOOT
Matthew 3 in the BNTLV
Matthew 3 in the BOATCB
Matthew 3 in the BOATCB2
Matthew 3 in the BOBCV
Matthew 3 in the BOCNT
Matthew 3 in the BOECS
Matthew 3 in the BOGWICC
Matthew 3 in the BOHCB
Matthew 3 in the BOHCV
Matthew 3 in the BOHLNT
Matthew 3 in the BOHNTLTAL
Matthew 3 in the BOILNTAP
Matthew 3 in the BOITCV
Matthew 3 in the BOKCV
Matthew 3 in the BOKCV2
Matthew 3 in the BOKHWOG
Matthew 3 in the BOKSSV
Matthew 3 in the BOLCB
Matthew 3 in the BOLCB2
Matthew 3 in the BOMCV
Matthew 3 in the BONAV
Matthew 3 in the BONCB
Matthew 3 in the BONLT
Matthew 3 in the BONUT2
Matthew 3 in the BOPLNT
Matthew 3 in the BOSCB
Matthew 3 in the BOSNC
Matthew 3 in the BOTLNT
Matthew 3 in the BOVCB
Matthew 3 in the BOYCB
Matthew 3 in the BPBB
Matthew 3 in the BPH
Matthew 3 in the BSB
Matthew 3 in the CCB
Matthew 3 in the CUV
Matthew 3 in the CUVS
Matthew 3 in the DBT
Matthew 3 in the DGDNT
Matthew 3 in the DHNT
Matthew 3 in the DNT
Matthew 3 in the ELBE
Matthew 3 in the EMTV
Matthew 3 in the ESV
Matthew 3 in the FBV
Matthew 3 in the FEB
Matthew 3 in the GGMNT
Matthew 3 in the GNT
Matthew 3 in the HARY
Matthew 3 in the HNT
Matthew 3 in the IRVA
Matthew 3 in the IRVB
Matthew 3 in the IRVG
Matthew 3 in the IRVH
Matthew 3 in the IRVK
Matthew 3 in the IRVM
Matthew 3 in the IRVM2
Matthew 3 in the IRVO
Matthew 3 in the IRVP
Matthew 3 in the IRVT
Matthew 3 in the IRVT2
Matthew 3 in the IRVU
Matthew 3 in the ISVN
Matthew 3 in the JSNT
Matthew 3 in the KAPI
Matthew 3 in the KBT1ETNIK
Matthew 3 in the KBV
Matthew 3 in the KJV
Matthew 3 in the KNFD
Matthew 3 in the LBA
Matthew 3 in the LBLA
Matthew 3 in the LNT
Matthew 3 in the LSV
Matthew 3 in the MAAL
Matthew 3 in the MBV
Matthew 3 in the MBV2
Matthew 3 in the MHNT
Matthew 3 in the MKNFD
Matthew 3 in the MNG
Matthew 3 in the MNT
Matthew 3 in the MNT2
Matthew 3 in the MRS1T
Matthew 3 in the NAA
Matthew 3 in the NASB
Matthew 3 in the NBLA
Matthew 3 in the NBS
Matthew 3 in the NBVTP
Matthew 3 in the NET2
Matthew 3 in the NIV11
Matthew 3 in the NNT
Matthew 3 in the NNT2
Matthew 3 in the NNT3
Matthew 3 in the PDDPT
Matthew 3 in the PFNT
Matthew 3 in the RMNT
Matthew 3 in the SBIAS
Matthew 3 in the SBIBS
Matthew 3 in the SBIBS2
Matthew 3 in the SBICS
Matthew 3 in the SBIDS
Matthew 3 in the SBIGS
Matthew 3 in the SBIHS
Matthew 3 in the SBIIS
Matthew 3 in the SBIIS2
Matthew 3 in the SBIIS3
Matthew 3 in the SBIKS
Matthew 3 in the SBIKS2
Matthew 3 in the SBIMS
Matthew 3 in the SBIOS
Matthew 3 in the SBIPS
Matthew 3 in the SBISS
Matthew 3 in the SBITS
Matthew 3 in the SBITS2
Matthew 3 in the SBITS3
Matthew 3 in the SBITS4
Matthew 3 in the SBIUS
Matthew 3 in the SBIVS
Matthew 3 in the SBT
Matthew 3 in the SBT1E
Matthew 3 in the SCHL
Matthew 3 in the SNT
Matthew 3 in the SUSU
Matthew 3 in the SUSU2
Matthew 3 in the SYNO
Matthew 3 in the TBIAOTANT
Matthew 3 in the TBT1E
Matthew 3 in the TBT1E2
Matthew 3 in the TFTIP
Matthew 3 in the TFTU
Matthew 3 in the TGNTATF3T
Matthew 3 in the THAI
Matthew 3 in the TNFD
Matthew 3 in the TNT
Matthew 3 in the TNTIK
Matthew 3 in the TNTIL
Matthew 3 in the TNTIN
Matthew 3 in the TNTIP
Matthew 3 in the TNTIZ
Matthew 3 in the TOMA
Matthew 3 in the TTENT
Matthew 3 in the UBG
Matthew 3 in the UGV
Matthew 3 in the UGV2
Matthew 3 in the UGV3
Matthew 3 in the VBL
Matthew 3 in the VDCC
Matthew 3 in the YALU
Matthew 3 in the YAPE
Matthew 3 in the YBVTP
Matthew 3 in the ZBP