Nehemiah 2 (BOICB)
1 Nʼọnwa Nisan, nʼiri afọ abụọ nke ọchịchị eze Ataksekses, mgbe e wetaara eze mmanya. E buru m mmanya ahụ bugara ya eze. Ugbu a, o nwebeghị mgbe ọbụla m jirila ihu mgbarụ bịa nʼihu eze. 2 Ya mere, eze jụrụ m, “Gịnị mere ihu gị ji gbaruo mgbe ọ dịghị ọrịa ji gị? Nke a na-egosi naanị na obi jọrọ gị njọ.”Ụjọ tụrụ m nnọọ nke ukwu. 3 Azara m eze sị, “Onyenwe m, ka ọchịchị eze dị ogologo ndụ. Gịnị ga-eme ka obi dị m ụtọ ebe ọ bụ na obodo ahụ e liri nna nna m ha aghọọla mkpọmkpọ ebe, nke a kpọkwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ?” 4 Eze sịrị m, “Ọ bụ gịnị ka ị chọrọ?”Mgbe ahụ ekpere m ekpere nʼobi m nye Chineke, 5 ma zaa eze sị, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, biko, ọ bụrụkwa na ohu gị achọta ihuọma nʼanya gị, ana m arịọ ka ị ziga m Juda, bụ obodo nna nna m ha, ka m gaa wugharịakwa ya.” 6 Eze sịrị m, ebe nwunye ya nọkwa nʼakụkụ ya, “Ije gị ọ ga-abụ ruo olee mgbe, olee mgbe ị ga-alọghachitekwa?” Ọ masịrị eze i ziga m. Ya mere, enyere m ya oge. 7 Mgbe ahụ, asịrị m ya, “Ọ bụrụ na ọ ga-amasị eze, aga m achọ ka i nye m akwụkwọ nke m ga-enye ndịisi ọchịchị niile nọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, ka ha kwere ka m site nʼobodo ha gafee ruo mgbe m ga-eru na Juda. 8 Nyekwa m akwụkwọ ozi m ga-enye Asaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o nye m osisi nke a ga-eji rụzie ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ụlọnsọ, na nke a ga-eji rụọ mgbidi obodo ahụ, na nke m ga-eji rụọ ụlọ nke aka m.” Eze meere m ihe ndị a niile, nʼihi na aka ebere Chineke dịnyere m. 9 Mgbe m rutere obodo ndị a dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Yufretis, enyere m ndịisi ọchịchị niile akwụkwọ ahụ eze dere nye m. Eze dunyere m ndịisi agha na ndị agha na-agba ịnyịnya ka ha chebe m nʼije m. 10 Ma mgbe Sanbalat, onye Horonaim, na Tobaya, onye Amọn bụ onyeisi ọrụ ọchịchị, nụrụ ihe banyere ọbịbịa m, iwe were ha nke ukwuu ịnụ na o nwere onye na-achọ inyere ndị Izrel aka. 11 E rutere m Jerusalem, nọdụkwa ebe ahụ mkpụrụ ụbọchị atọ, 12 eji m abalị pụọ kpọrọ mmadụ ole na ole. O nwebeghị onye ọbụla m gwara ihe Chineke tinyere m nʼobi ime na Jerusalem. Ọ dịghị ịnyịnya ọzọ anyị ji ma ọ bụghị nke ahụ m na-agba. 13 Nʼabalị a pụrụ m site nʼỌnụ ụzọ ama Ndagwurugwu ruo nʼisi iyi mmiri Nkịta ọhịa, sitekwa nʼebe ahụ ruo nʼỌnụ ụzọ ama ebe ikpofu ahịhịa. Anyị jegharịrị ịhụ ebe niile mgbidi Jerusalem dara ada, na ọnụ ụzọ ama ya niile nke ọkụ rere. 14 Emesịa, ejeruru m ọnụ ụzọ nke dị nʼebe isi iyi dị, ruokwa nʼọdọ mmiri eze, ma ịnyịnya ibu m enweghị ike isite nʼebe ahụ gafee. 15 Ya mere, ejiri m nʼabalị jeruo ndagwurugwu ahụ, leruo mgbidi ahụ anya. Emesịa, atụgharịrị m lọghachi site nʼọnụ ụzọ Ama ndagwurugwu. 16 Ndịisi obodo amaghị ebe m gara maọbụ ihe m na-eme, nʼihi na agwabeghị m onye Juu ọbụla ihe m bu nʼobi, maọbụ ndị nchụaja, maọbụ ndị a na-asọpụrụ, maọbụ ndị ọchịchị obodo, maọbụ onye ọzọ ọbụla ndị ga-arụ ọrụ ahụ. 17 Nʼikpeazụ, agwara m ha sị, “Unu maara nke ọma ihe dakwasịrị obodo anyị. Lee otu mgbidi ya si dakasịa, na otu ọnụ ụzọ ama ya si rechapụ ọkụ. Ka anyị wuzienụ mgbidi Jerusalem, si otu a wepụ ihe ihere a dịịrị anyị.” 18 Akọọrọ m ha ọchịchọ ahụ Chineke tinyere m nʼobi na ihe mụ na eze kwuru, na otu o si kwadoo ihe m gwara ya.Ha zara m sị, “Ọ dị mma, ka anyị wugharịanụ mgbidi ahụ.” Ọrụ ahụ bidokwara na-atụfughị oge. 19 Ma mgbe Sanbalat, onye Horon, na Tobaya, onyeozi ndị Amọn, na Geshem onye Arab, nụrụ ya, ha kwara anyị emo sị, “Gịnị bụ ihe nke a unu na-eme? Ọ bụ eze ka unu na-enupu isi megide?” 20 Ma azara m ha sị, “Chineke nke eluigwe ga-eme ka ihe gara anyị nke ọma. Anyị onwe anyị bụ ndị ohu ya ga-amalite iwughachi mgbidi a, ma unu onwe unu, unu enweghị oke maọbụ ọnọdụ ziri ezi maọbụ ihe ncheta ọbụla nʼime Jerusalem.”
In Other Versions
Nehemiah 2 in the ANGEFD
Nehemiah 2 in the ANTPNG2D
Nehemiah 2 in the AS21
Nehemiah 2 in the BAGH
Nehemiah 2 in the BBPNG
Nehemiah 2 in the BBT1E
Nehemiah 2 in the BDS
Nehemiah 2 in the BEV
Nehemiah 2 in the BHAD
Nehemiah 2 in the BIB
Nehemiah 2 in the BLPT
Nehemiah 2 in the BNT
Nehemiah 2 in the BNTABOOT
Nehemiah 2 in the BNTLV
Nehemiah 2 in the BOATCB
Nehemiah 2 in the BOATCB2
Nehemiah 2 in the BOBCV
Nehemiah 2 in the BOCNT
Nehemiah 2 in the BOECS
Nehemiah 2 in the BOGWICC
Nehemiah 2 in the BOHCB
Nehemiah 2 in the BOHCV
Nehemiah 2 in the BOHLNT
Nehemiah 2 in the BOHNTLTAL
Nehemiah 2 in the BOILNTAP
Nehemiah 2 in the BOITCV
Nehemiah 2 in the BOKCV
Nehemiah 2 in the BOKCV2
Nehemiah 2 in the BOKHWOG
Nehemiah 2 in the BOKSSV
Nehemiah 2 in the BOLCB
Nehemiah 2 in the BOLCB2
Nehemiah 2 in the BOMCV
Nehemiah 2 in the BONAV
Nehemiah 2 in the BONCB
Nehemiah 2 in the BONLT
Nehemiah 2 in the BONUT2
Nehemiah 2 in the BOPLNT
Nehemiah 2 in the BOSCB
Nehemiah 2 in the BOSNC
Nehemiah 2 in the BOTLNT
Nehemiah 2 in the BOVCB
Nehemiah 2 in the BOYCB
Nehemiah 2 in the BPBB
Nehemiah 2 in the BPH
Nehemiah 2 in the BSB
Nehemiah 2 in the CCB
Nehemiah 2 in the CUV
Nehemiah 2 in the CUVS
Nehemiah 2 in the DBT
Nehemiah 2 in the DGDNT
Nehemiah 2 in the DHNT
Nehemiah 2 in the DNT
Nehemiah 2 in the ELBE
Nehemiah 2 in the EMTV
Nehemiah 2 in the ESV
Nehemiah 2 in the FBV
Nehemiah 2 in the FEB
Nehemiah 2 in the GGMNT
Nehemiah 2 in the GNT
Nehemiah 2 in the HARY
Nehemiah 2 in the HNT
Nehemiah 2 in the IRVA
Nehemiah 2 in the IRVB
Nehemiah 2 in the IRVG
Nehemiah 2 in the IRVH
Nehemiah 2 in the IRVK
Nehemiah 2 in the IRVM
Nehemiah 2 in the IRVM2
Nehemiah 2 in the IRVO
Nehemiah 2 in the IRVP
Nehemiah 2 in the IRVT
Nehemiah 2 in the IRVT2
Nehemiah 2 in the IRVU
Nehemiah 2 in the ISVN
Nehemiah 2 in the JSNT
Nehemiah 2 in the KAPI
Nehemiah 2 in the KBT1ETNIK
Nehemiah 2 in the KBV
Nehemiah 2 in the KJV
Nehemiah 2 in the KNFD
Nehemiah 2 in the LBA
Nehemiah 2 in the LBLA
Nehemiah 2 in the LNT
Nehemiah 2 in the LSV
Nehemiah 2 in the MAAL
Nehemiah 2 in the MBV
Nehemiah 2 in the MBV2
Nehemiah 2 in the MHNT
Nehemiah 2 in the MKNFD
Nehemiah 2 in the MNG
Nehemiah 2 in the MNT
Nehemiah 2 in the MNT2
Nehemiah 2 in the MRS1T
Nehemiah 2 in the NAA
Nehemiah 2 in the NASB
Nehemiah 2 in the NBLA
Nehemiah 2 in the NBS
Nehemiah 2 in the NBVTP
Nehemiah 2 in the NET2
Nehemiah 2 in the NIV11
Nehemiah 2 in the NNT
Nehemiah 2 in the NNT2
Nehemiah 2 in the NNT3
Nehemiah 2 in the PDDPT
Nehemiah 2 in the PFNT
Nehemiah 2 in the RMNT
Nehemiah 2 in the SBIAS
Nehemiah 2 in the SBIBS
Nehemiah 2 in the SBIBS2
Nehemiah 2 in the SBICS
Nehemiah 2 in the SBIDS
Nehemiah 2 in the SBIGS
Nehemiah 2 in the SBIHS
Nehemiah 2 in the SBIIS
Nehemiah 2 in the SBIIS2
Nehemiah 2 in the SBIIS3
Nehemiah 2 in the SBIKS
Nehemiah 2 in the SBIKS2
Nehemiah 2 in the SBIMS
Nehemiah 2 in the SBIOS
Nehemiah 2 in the SBIPS
Nehemiah 2 in the SBISS
Nehemiah 2 in the SBITS
Nehemiah 2 in the SBITS2
Nehemiah 2 in the SBITS3
Nehemiah 2 in the SBITS4
Nehemiah 2 in the SBIUS
Nehemiah 2 in the SBIVS
Nehemiah 2 in the SBT
Nehemiah 2 in the SBT1E
Nehemiah 2 in the SCHL
Nehemiah 2 in the SNT
Nehemiah 2 in the SUSU
Nehemiah 2 in the SUSU2
Nehemiah 2 in the SYNO
Nehemiah 2 in the TBIAOTANT
Nehemiah 2 in the TBT1E
Nehemiah 2 in the TBT1E2
Nehemiah 2 in the TFTIP
Nehemiah 2 in the TFTU
Nehemiah 2 in the TGNTATF3T
Nehemiah 2 in the THAI
Nehemiah 2 in the TNFD
Nehemiah 2 in the TNT
Nehemiah 2 in the TNTIK
Nehemiah 2 in the TNTIL
Nehemiah 2 in the TNTIN
Nehemiah 2 in the TNTIP
Nehemiah 2 in the TNTIZ
Nehemiah 2 in the TOMA
Nehemiah 2 in the TTENT
Nehemiah 2 in the UBG
Nehemiah 2 in the UGV
Nehemiah 2 in the UGV2
Nehemiah 2 in the UGV3
Nehemiah 2 in the VBL
Nehemiah 2 in the VDCC
Nehemiah 2 in the YALU
Nehemiah 2 in the YAPE
Nehemiah 2 in the YBVTP
Nehemiah 2 in the ZBP