Nehemiah 3 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, Eliashib onyeisi nchụaja na ndị nchụaja ibe ya wuru mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu Narị na ụlọ elu Hananel. Ha wukwara Ọnụ Ụzọ ama Atụrụ, kwụba ibo ya, doo ya nsọ. 2 Ndị sitere obodo Jeriko rụkwara ọrụ nʼakụkụ ha. Ma Zakua nwa Imri, rụrụ ọrụ nke ha nʼakụkụ ndị ọrụ si Jeriko. 3 Ụmụ ndị ikom Hasena wuru Ọnụ Ụzọ ama Azụ, dobe osisi ya, kwụba ọnụ ụzọ ya, kpụọkwa ihe mkpọchi ya niile, na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. 4 Meremot, nwa Ụraya, nwa Hakoz, rụziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Onye na-eso ya bụ Meshulam, nwa Berekaya, nwa Meshezabel, rụziri mgbidi, onye na-esota ya bụ Zadọk nwa Baana, onye rụzikwara mgbidi. 5 Akụkụ nke ọzọ ka ndị ikom Tekoa rụziri, ma ndị ha a na-asọpụrụ ekweghị ehudata ubu ha nye ọrụ ahụ nʼokpuru ndị nlekọta ha. 6 Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia wuru Ọnụ Ụzọ Ama Jeshana. Ha tinyere osisi ya niile, kwụba ibo ọnụ ụzọ ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. 7 Ndị ọzọ rụrụ ọrụ nʼakụkụ ha bụ Melataya, onye Gibiọn, na Jadon onye Meronot, na ndị si Gibiọn na Mizpa. Obodo ndị a dị nʼokpuru onyeisi ọchịchị akụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis. 8 Uziel nwa Hahaya, bụ ọkpụ ụzụ ọlaedo, doziri otu akụkụ. Onye na-eso ya bụ Hananaya, otu onye nʼime ndị na-eme mmanụ otite na-esi isi ọma, doziri nke na-esote nke ahụ. Ha doziri Jerusalem ruruo ya na Mgbidi Obosara. 9 Onye na-eso ha bụ Refaya nwa Hua onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem. 10 Onye na-eso ya bụ Jedaya nwa Harumaf, onye rụrụ akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ nke aka ya. Onye na-eso ya nʼọrụ a bụ Hatush nwa Hashabneia. 11 Onye ọzọ bụ Malkija nwa Harim, na Hashub nwa Pahat-Moab, ndị wugharịrị ụlọ elu ọkụ, na otu akụkụ mgbidi ahụ. 12 Shalum nwa Halohesh na ụmụ ya ndị inyom meziri akụkụ mgbidi nke na-esota. Ọ bụ onyeisi ọchịchị otu akụkụ Jerusalem nke ọzọ. 13 Hanun duuru ndị obodo Zanoa wuo Ọnụ Ụzọ Ndagwurugwu. Ha wuziri ya, tinye ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. Ha wuzikwara mpaghara ahụ nke ịdị ogologo ya ruru narị mita ise, ruo nʼọnụ ụzọ ama dị nʼebe a na-ekpofu ahịhịa. 14 Malkija nwa Rekab, onyeisi ọchịchị ala nke dị Bet-Hakerem gburugburu, bụ onye wuziri ọnụ ụzọ ama dị nʼebe ikpofu ahịhịa. O tinyere ibo ya, ihe mkpọchi ya na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. 15 Shalum nwa Kol-Hoze, onyeisi ọchịchị ala dị Mizpa gburugburu, wuziri ọnụ ụzọ ama isi iyi, kpuchie elu ya, tinye ya ibo ọnụ ụzọ ya, ihe mkpọchi na ihe ntụchi ya niile nʼọnọdụ ha. O mezikwara mgbidi ahụ site nʼọdọ mmiri Siloam ruo nʼubi eze a gbara ogige, na ruokwa na nkwasa nrịda dị site nʼobodo Devid ma e site Jerusalem na-apụta. 16 Onye na-eso ya bụ Nehemaya nwa Azbuk, onyeisi ọchịchị ọkara nʼime Bet Zoa. O wuziri mgbidi ahụ ruo ncherita ihu ebe ili Devid, ruokwa ọdọ ebe emere maka ichekọta mmiri, na nʼỤlọ ndị Dike nʼagha. 17 Ndị na-eso ya bụ ndị Livayị, ndị nke Rehum nwa Bani na-achịkọta. Onye ọzọ bụ Hashabaya onyeisi ọchịchị ọkara ndị bi na Keila. Ọ rụrụ ọrụ e kenyere ndị ya. 18 Onye ọzọ na-eso ya bụ Binui nwa Henadad onye bụ onyeisi ọchịchị ọkara akụkụ Keila nke ọzọ. O du ndị Keila ibe ya rụọ ọrụ ha ketara. 19 Onye na-eso ya bụ Eza nwa Jeshua onyeisi ọchịchị obodo Mizpa. Ya na ndị otu ya rụziri akụkụ mgbidi ahụ dị na mgbago ebe ụlọ nchịkọta ngwa agha ruo na nkuku ya. 20 Onye ọzọ na-eso ya bụ Baruk, nwa Zabai, onye ji nnọọ ịnụ ọkụ nʼobi rụzie mgbidi ahụ site na nkuku ya ruo nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ Eliashib, bụ onyeisi nchụaja. 21 Onye na-eso ya bụ Meremot nwa Ụraya, nwa Hakoz. Ọ sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ Eliashib rụziri ruo na ngwụcha ya. 22 Ndị nchụaja si nʼakụkụ Jerusalem wuziri akụkụ nke na-esote ya. 23 Isonye ha, Benjamin na Hashub wuziri akụkụ ahụ dị nʼihu ụlọ ha. Azaraya nwa Maaseia, onye bụkwa nwa nwa Ananaya wuziri nke na-esote ya, nke dịkwa nʼakụkụ ụlọ ya. 24 Binui nwa Henadad wuziri akụkụ nke ọzọ, nke sitere nʼihu ụlọ Azaraya ruo na nkuku mgbidi ahụ. 25 Palal nwa Uzai wuziri akụkụ nke na-eso ya site na nkuku mgbidi ahụ ruo nʼụlọ elu dị nʼakụkụ elu elu ụlọeze nʼebe dị nso nʼogige ndị nche. Nke so ya bụ Pedaia nwa Parosh, 26 na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ ahụ bụ ndị bi nʼelu ugwu Ofel, wuziri akụkụ nke na-esote ruo nʼebe dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke Ọnụ Ụzọ Ama Mmiri, ruokwa nʼụlọ elu nche nke ụlọ ukwu ahụ. 27 Ndị ikom Tekoa wuru akụkụ nke ọzọ na-esote ya. Ha sitere nʼebe chere ụlọ elu nche nke ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, wuzie mgbidi ahụ ruo na mgbidi dị Ofel nso. 28 Ụfọdụ ndị nchụaja wuziri akụkụ na-esote, nke dị nʼugwu, site nʼỌnụ Ụzọ Ama Ịnyịnya. Onye ọbụla wuziri mgbidi nke dị nʼihu ụlọ ya. 29 Zadọk nwa Imea wuziri nke na-esota, bu akụkụ mgbidi ahụ chere ihu nʼụlọ ya. Shemaya nwa Shekanaya onye na-eche Ọnụ Ụzọ Ama Ọwụwa Anyanwụ wuziri akụkụ nke na-esota. 30 Hananaya nwa Shelemaya na Hanun nwa Zalaf nke isii, wuziri akụkụ mgbidi nke ọzọ. Meshulam nwa Berekaya wuziri akụkụ mgbidi na-esota, bụkwa nke dị nʼihu ụlọ obibi ya. 31 Malkija ọkpụ ụzụ ọlaedo wuziri akụkụ na-esota ruo nʼụlọ ahụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ndị na-azụ ahịa na-anọkọ. Ụlọ a dị na ncherita ihu Ọnụ Ụzọ Ama Nnyocha. Malkija sitekwara nʼebe ahụ wuzie mgbidi ahụ ruo nʼọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ. 32 Ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo na ndị ahịa rụchara ọrụ iwuzi akụkụ mgbidi nke fọdụrụ, site nʼetiti ọnụụlọ ahụ dị nʼelu nkuku mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ.

In Other Versions

Nehemiah 3 in the ANGEFD

Nehemiah 3 in the ANTPNG2D

Nehemiah 3 in the AS21

Nehemiah 3 in the BAGH

Nehemiah 3 in the BBPNG

Nehemiah 3 in the BBT1E

Nehemiah 3 in the BDS

Nehemiah 3 in the BEV

Nehemiah 3 in the BHAD

Nehemiah 3 in the BIB

Nehemiah 3 in the BLPT

Nehemiah 3 in the BNT

Nehemiah 3 in the BNTABOOT

Nehemiah 3 in the BNTLV

Nehemiah 3 in the BOATCB

Nehemiah 3 in the BOATCB2

Nehemiah 3 in the BOBCV

Nehemiah 3 in the BOCNT

Nehemiah 3 in the BOECS

Nehemiah 3 in the BOGWICC

Nehemiah 3 in the BOHCB

Nehemiah 3 in the BOHCV

Nehemiah 3 in the BOHLNT

Nehemiah 3 in the BOHNTLTAL

Nehemiah 3 in the BOILNTAP

Nehemiah 3 in the BOITCV

Nehemiah 3 in the BOKCV

Nehemiah 3 in the BOKCV2

Nehemiah 3 in the BOKHWOG

Nehemiah 3 in the BOKSSV

Nehemiah 3 in the BOLCB

Nehemiah 3 in the BOLCB2

Nehemiah 3 in the BOMCV

Nehemiah 3 in the BONAV

Nehemiah 3 in the BONCB

Nehemiah 3 in the BONLT

Nehemiah 3 in the BONUT2

Nehemiah 3 in the BOPLNT

Nehemiah 3 in the BOSCB

Nehemiah 3 in the BOSNC

Nehemiah 3 in the BOTLNT

Nehemiah 3 in the BOVCB

Nehemiah 3 in the BOYCB

Nehemiah 3 in the BPBB

Nehemiah 3 in the BPH

Nehemiah 3 in the BSB

Nehemiah 3 in the CCB

Nehemiah 3 in the CUV

Nehemiah 3 in the CUVS

Nehemiah 3 in the DBT

Nehemiah 3 in the DGDNT

Nehemiah 3 in the DHNT

Nehemiah 3 in the DNT

Nehemiah 3 in the ELBE

Nehemiah 3 in the EMTV

Nehemiah 3 in the ESV

Nehemiah 3 in the FBV

Nehemiah 3 in the FEB

Nehemiah 3 in the GGMNT

Nehemiah 3 in the GNT

Nehemiah 3 in the HARY

Nehemiah 3 in the HNT

Nehemiah 3 in the IRVA

Nehemiah 3 in the IRVB

Nehemiah 3 in the IRVG

Nehemiah 3 in the IRVH

Nehemiah 3 in the IRVK

Nehemiah 3 in the IRVM

Nehemiah 3 in the IRVM2

Nehemiah 3 in the IRVO

Nehemiah 3 in the IRVP

Nehemiah 3 in the IRVT

Nehemiah 3 in the IRVT2

Nehemiah 3 in the IRVU

Nehemiah 3 in the ISVN

Nehemiah 3 in the JSNT

Nehemiah 3 in the KAPI

Nehemiah 3 in the KBT1ETNIK

Nehemiah 3 in the KBV

Nehemiah 3 in the KJV

Nehemiah 3 in the KNFD

Nehemiah 3 in the LBA

Nehemiah 3 in the LBLA

Nehemiah 3 in the LNT

Nehemiah 3 in the LSV

Nehemiah 3 in the MAAL

Nehemiah 3 in the MBV

Nehemiah 3 in the MBV2

Nehemiah 3 in the MHNT

Nehemiah 3 in the MKNFD

Nehemiah 3 in the MNG

Nehemiah 3 in the MNT

Nehemiah 3 in the MNT2

Nehemiah 3 in the MRS1T

Nehemiah 3 in the NAA

Nehemiah 3 in the NASB

Nehemiah 3 in the NBLA

Nehemiah 3 in the NBS

Nehemiah 3 in the NBVTP

Nehemiah 3 in the NET2

Nehemiah 3 in the NIV11

Nehemiah 3 in the NNT

Nehemiah 3 in the NNT2

Nehemiah 3 in the NNT3

Nehemiah 3 in the PDDPT

Nehemiah 3 in the PFNT

Nehemiah 3 in the RMNT

Nehemiah 3 in the SBIAS

Nehemiah 3 in the SBIBS

Nehemiah 3 in the SBIBS2

Nehemiah 3 in the SBICS

Nehemiah 3 in the SBIDS

Nehemiah 3 in the SBIGS

Nehemiah 3 in the SBIHS

Nehemiah 3 in the SBIIS

Nehemiah 3 in the SBIIS2

Nehemiah 3 in the SBIIS3

Nehemiah 3 in the SBIKS

Nehemiah 3 in the SBIKS2

Nehemiah 3 in the SBIMS

Nehemiah 3 in the SBIOS

Nehemiah 3 in the SBIPS

Nehemiah 3 in the SBISS

Nehemiah 3 in the SBITS

Nehemiah 3 in the SBITS2

Nehemiah 3 in the SBITS3

Nehemiah 3 in the SBITS4

Nehemiah 3 in the SBIUS

Nehemiah 3 in the SBIVS

Nehemiah 3 in the SBT

Nehemiah 3 in the SBT1E

Nehemiah 3 in the SCHL

Nehemiah 3 in the SNT

Nehemiah 3 in the SUSU

Nehemiah 3 in the SUSU2

Nehemiah 3 in the SYNO

Nehemiah 3 in the TBIAOTANT

Nehemiah 3 in the TBT1E

Nehemiah 3 in the TBT1E2

Nehemiah 3 in the TFTIP

Nehemiah 3 in the TFTU

Nehemiah 3 in the TGNTATF3T

Nehemiah 3 in the THAI

Nehemiah 3 in the TNFD

Nehemiah 3 in the TNT

Nehemiah 3 in the TNTIK

Nehemiah 3 in the TNTIL

Nehemiah 3 in the TNTIN

Nehemiah 3 in the TNTIP

Nehemiah 3 in the TNTIZ

Nehemiah 3 in the TOMA

Nehemiah 3 in the TTENT

Nehemiah 3 in the UBG

Nehemiah 3 in the UGV

Nehemiah 3 in the UGV2

Nehemiah 3 in the UGV3

Nehemiah 3 in the VBL

Nehemiah 3 in the VDCC

Nehemiah 3 in the YALU

Nehemiah 3 in the YAPE

Nehemiah 3 in the YBVTP

Nehemiah 3 in the ZBP