Nehemiah 4 (BOICB)
1 Iwe were Sanbalat nke ukwuu mgbe ọ nụrụ na anyị na-ewuzigharị mgbidi ahụ niile. O were iwe dị ọkụ, ọnụma jukwara ya obi. Ọ chịrị ndị Juu ọchị, kwaakwa ha emo. 2 Nʼihu ndị otu ya na ndịisi agha Sameria, o kwuru si, “Gịnị ka ndị Juu ole na ole a na-adịghị ike na-eme? Ha na-achọ iwugharị mgbidi obodo a? Ha ga-achụ aja? Ha ga-arụcha ọrụ niile nʼotu ụbọchị? Ha ga-esita nʼaja a kụpịasịrị akụpịa mee ka nkume ndị a dị ndụ, ka ọ bụ site na nkume ochie ndị a akpọrọ ọkụ?” 3 Tobaya onye Amọn, onye nọ ya nʼakụkụ mgbe ahụ, kwukwara okwu sị; “Leenụ ụdị mgbidi ha na-ewu! Ọ bụrụ na nkịta ọhịa arịkwasị ya nʼelu ọ ga-ada!” 4 Mgbe ahụ, e kpere m ekpere sị, “Chineke, biko nụrụ emo a na-akwa anyị. Ka ịkwa emo ha laghachikwa ha nʼisi; ka a dọtakwa ha nʼagha buru ha jee mba ọzọ. 5 Elefula mmehie ha anya, agbagharakwala ha, nʼihi na ha ledara gị anya, ledakwa anyị anya, bụ ndị na-ewuzi mgbidi gị.” 6 Ya mere, anyị wuziri mgbidi ahụ ruo mgbe ha niile ruru ọkara nʼịdị elu ya, nʼihi na onye ọbụla wepụtara obi ya ịrụ ọrụ. 7 Ma mgbe Sanbalat, Tobaya, ndị Arab, ndị Amọn na ndị Ashdọd nụrụ na ọrụ iwuzi mgbidi Jerusalem na-aga nʼihu, nụkwa na-emechichala ebe niile puru epu, iwe were ha nke ukwuu. 8 Ha niile gbara izu ịchịrị ndị agha bịa imegide Jerusalem, ime ka ọgbaaghara dị nʼobodo ahụ. 9 Ma anyị kpere ekpere nye Chineke, kwụbakwa ndị nche iguzogide ha ehihie na abalị. 10 Mgbe ahụ, ndị Juda bidoro itamu ntamu na-asị, na ike ebidola ịgwụ ndị ọrụ ha, na mkpọmkpọ ihe fọdụrụ ka buru ibu, na naanị anyị apụghị ịrụcha mgbidi ahụ. 11 Ma nʼotu oge ahụ kwa, ndị iro anyị na-agba izu nʼakụkụ, na-achọ igbu anyị mgbe anyị na-eleghị anya ha maọbụ mara ka ọrụ ahụ kwụsị. 12 Ndị Juu ndị bi ha nso bịara ọtụtụ mgbe gwa anyị, “Ebe ọbụla unu gbagara, ha ga-ebuso unu agha.” 13 Nʼihi ya, eguzobere m ndị ụfọdụ nʼebe niile dịkarịsịrị ala nʼazụ mgbidi ahụ, nʼebe niile ghere oghe, e guzobere ha, kpanye ha mma agha, ùbe na ụta nʼaka dịka ezinaụlọ ha si dị. 14 Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.” 15 Mgbe ndị iro anyị chọpụtara na anyị amatala izu ọjọọ ha, na Chineke emebiekwala atụmatụ ha, anyị onwe anyị laghachiri nʼọrụ anyị nke iwuzi mgbidi ahụ. 16 Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, anyị kere onwe anyị ụzọ abụọ. Ụfọdụ ndị ji ùbe, ọta na ụta na-anọ na nche mgbe ndị ọzọ na-arụ ọrụ. Ndịisi niile pụtakwara guzo nʼazụ ndị Juda niile ebe ha nọ nʼihu ọrụ ha. 17 Ndị na-edo nkume na ndị ọrụ ọbụla debere ngwa ọgụ ha nʼebe ọ ga-eru ha aka mgbe ọbụla ha na-arụ ọrụ. 18 Ndị ọzọ tinyere mma agha ha nʼukwu ha. Ndị na-egbu opi nọkwa m nʼakụkụ mgbe niile maka ịfụ opi mgbe a chọrọ ya. 19 Mgbe ahụ, asịrị m ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị na ndị mmadụ ọzọ ahụ niile, “Ọrụ anyị nwere ịrụ dị ukwuu, gbasapụkwa, anyị anọkọtaghị ọnụ nʼotu ebe, ekewakwara anyị ebe dị iche iche na mgbidi. 20 Ya mere, mgbe ọbụla unu nụrụ ụda opi, gbaranụ ọsọ bịa nʼebe m nọ. Chineke ga-alụkwara anyị ọgụ.” 21 Ya mere, anyị nọgidere nʼọrụ anyị site nʼìhè mbụ nke ụtụtụ rụọ mgbe kpakpando pụtara. Ọkara nʼime ndị ọrụ jikwa ùbe nọrọ na nche. 22 Agwara m ndịisi ọrụ niile okwu sị ha na onyeisi ọrụ ọbụla na ndị na-enyere ya aka nʼọrụ ga na-anọ na Jerusalem nʼabalị niile. Nʼụzọ dị otu a, ndị ọrụ ga-arụ ọrụ ha nʼoge ihe dị, ma ha ga-anọkwa na nche nʼabalị. 23 Nʼoge ndị a niile, eyipụghị m uwe m yi nʼahụ. O nwekwaghị onye ọbụla ọzọ, maọbụ nwanne m nwoke, maọbụ ndị nche na-eso m onye yipụrụ uwe ya ma onye ukwu ma onye nta. Mma agha anyị na-adịkwa anyị nʼukwu mgbe niile, ọbụladị mgbe anyị chọrọ mmiri.
In Other Versions
Nehemiah 4 in the ANGEFD
Nehemiah 4 in the ANTPNG2D
Nehemiah 4 in the AS21
Nehemiah 4 in the BAGH
Nehemiah 4 in the BBPNG
Nehemiah 4 in the BBT1E
Nehemiah 4 in the BDS
Nehemiah 4 in the BEV
Nehemiah 4 in the BHAD
Nehemiah 4 in the BIB
Nehemiah 4 in the BLPT
Nehemiah 4 in the BNT
Nehemiah 4 in the BNTABOOT
Nehemiah 4 in the BNTLV
Nehemiah 4 in the BOATCB
Nehemiah 4 in the BOATCB2
Nehemiah 4 in the BOBCV
Nehemiah 4 in the BOCNT
Nehemiah 4 in the BOECS
Nehemiah 4 in the BOGWICC
Nehemiah 4 in the BOHCB
Nehemiah 4 in the BOHCV
Nehemiah 4 in the BOHLNT
Nehemiah 4 in the BOHNTLTAL
Nehemiah 4 in the BOILNTAP
Nehemiah 4 in the BOITCV
Nehemiah 4 in the BOKCV
Nehemiah 4 in the BOKCV2
Nehemiah 4 in the BOKHWOG
Nehemiah 4 in the BOKSSV
Nehemiah 4 in the BOLCB
Nehemiah 4 in the BOLCB2
Nehemiah 4 in the BOMCV
Nehemiah 4 in the BONAV
Nehemiah 4 in the BONCB
Nehemiah 4 in the BONLT
Nehemiah 4 in the BONUT2
Nehemiah 4 in the BOPLNT
Nehemiah 4 in the BOSCB
Nehemiah 4 in the BOSNC
Nehemiah 4 in the BOTLNT
Nehemiah 4 in the BOVCB
Nehemiah 4 in the BOYCB
Nehemiah 4 in the BPBB
Nehemiah 4 in the BPH
Nehemiah 4 in the BSB
Nehemiah 4 in the CCB
Nehemiah 4 in the CUV
Nehemiah 4 in the CUVS
Nehemiah 4 in the DBT
Nehemiah 4 in the DGDNT
Nehemiah 4 in the DHNT
Nehemiah 4 in the DNT
Nehemiah 4 in the ELBE
Nehemiah 4 in the EMTV
Nehemiah 4 in the ESV
Nehemiah 4 in the FBV
Nehemiah 4 in the FEB
Nehemiah 4 in the GGMNT
Nehemiah 4 in the GNT
Nehemiah 4 in the HARY
Nehemiah 4 in the HNT
Nehemiah 4 in the IRVA
Nehemiah 4 in the IRVB
Nehemiah 4 in the IRVG
Nehemiah 4 in the IRVH
Nehemiah 4 in the IRVK
Nehemiah 4 in the IRVM
Nehemiah 4 in the IRVM2
Nehemiah 4 in the IRVO
Nehemiah 4 in the IRVP
Nehemiah 4 in the IRVT
Nehemiah 4 in the IRVT2
Nehemiah 4 in the IRVU
Nehemiah 4 in the ISVN
Nehemiah 4 in the JSNT
Nehemiah 4 in the KAPI
Nehemiah 4 in the KBT1ETNIK
Nehemiah 4 in the KBV
Nehemiah 4 in the KJV
Nehemiah 4 in the KNFD
Nehemiah 4 in the LBA
Nehemiah 4 in the LBLA
Nehemiah 4 in the LNT
Nehemiah 4 in the LSV
Nehemiah 4 in the MAAL
Nehemiah 4 in the MBV
Nehemiah 4 in the MBV2
Nehemiah 4 in the MHNT
Nehemiah 4 in the MKNFD
Nehemiah 4 in the MNG
Nehemiah 4 in the MNT
Nehemiah 4 in the MNT2
Nehemiah 4 in the MRS1T
Nehemiah 4 in the NAA
Nehemiah 4 in the NASB
Nehemiah 4 in the NBLA
Nehemiah 4 in the NBS
Nehemiah 4 in the NBVTP
Nehemiah 4 in the NET2
Nehemiah 4 in the NIV11
Nehemiah 4 in the NNT
Nehemiah 4 in the NNT2
Nehemiah 4 in the NNT3
Nehemiah 4 in the PDDPT
Nehemiah 4 in the PFNT
Nehemiah 4 in the RMNT
Nehemiah 4 in the SBIAS
Nehemiah 4 in the SBIBS
Nehemiah 4 in the SBIBS2
Nehemiah 4 in the SBICS
Nehemiah 4 in the SBIDS
Nehemiah 4 in the SBIGS
Nehemiah 4 in the SBIHS
Nehemiah 4 in the SBIIS
Nehemiah 4 in the SBIIS2
Nehemiah 4 in the SBIIS3
Nehemiah 4 in the SBIKS
Nehemiah 4 in the SBIKS2
Nehemiah 4 in the SBIMS
Nehemiah 4 in the SBIOS
Nehemiah 4 in the SBIPS
Nehemiah 4 in the SBISS
Nehemiah 4 in the SBITS
Nehemiah 4 in the SBITS2
Nehemiah 4 in the SBITS3
Nehemiah 4 in the SBITS4
Nehemiah 4 in the SBIUS
Nehemiah 4 in the SBIVS
Nehemiah 4 in the SBT
Nehemiah 4 in the SBT1E
Nehemiah 4 in the SCHL
Nehemiah 4 in the SNT
Nehemiah 4 in the SUSU
Nehemiah 4 in the SUSU2
Nehemiah 4 in the SYNO
Nehemiah 4 in the TBIAOTANT
Nehemiah 4 in the TBT1E
Nehemiah 4 in the TBT1E2
Nehemiah 4 in the TFTIP
Nehemiah 4 in the TFTU
Nehemiah 4 in the TGNTATF3T
Nehemiah 4 in the THAI
Nehemiah 4 in the TNFD
Nehemiah 4 in the TNT
Nehemiah 4 in the TNTIK
Nehemiah 4 in the TNTIL
Nehemiah 4 in the TNTIN
Nehemiah 4 in the TNTIP
Nehemiah 4 in the TNTIZ
Nehemiah 4 in the TOMA
Nehemiah 4 in the TTENT
Nehemiah 4 in the UBG
Nehemiah 4 in the UGV
Nehemiah 4 in the UGV2
Nehemiah 4 in the UGV3
Nehemiah 4 in the VBL
Nehemiah 4 in the VDCC
Nehemiah 4 in the YALU
Nehemiah 4 in the YAPE
Nehemiah 4 in the YBVTP
Nehemiah 4 in the ZBP