Numbers 1 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị, nʼime ụlọ nzute, nʼụbọchị nke mbụ, nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ, mgbe ụmụ Izrel pụtachara site nʼobodo Ijipt. Ọ sịrị, 2 “Gaa gụọ ma chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile e nwere nʼetiti ọgbakọ Izrel, dịka ebo ha na agbụrụ ha si dị, na dịka ezinaụlọ ha si dịkwa. Depụta aha nwoke ọbụla nʼotu na otu. 3 Gị na Erọn ga-agụkọta ndị ikom Izrel niile gbara iri afọ abụọ maọbụ karịa ọnụ, bụ ndị tozuru ije agha. Unu ga-edo ha nʼusuu, nʼusuu. 4 Otu nwoke, site nʼebo Izrel ọbụla, onye bụ onyendu ezinaụlọ, ga-esonyere unu nʼọrụ a. 5 “Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ ga-enyere unu aka. “Site nʼebo Ruben, Elizọ na Shedeua, 6 site nʼebo Simiọn, Shelumiel nwa Zurishadai, 7 site nʼebo Juda, Nashọn nwa Aminadab, 8 site nʼebo Isaka, Netanel nwa Zua, 9 site nʼebo Zebụlọn, Eliab nwa Helọn, 10 Site nʼụmụ Josef:site nʼebo Ifrem, Elishama nwa Amihudsite nʼebo Manase, Gamaliel nwa Pedazo 11 site nʼebo Benjamin, Abidan nwa Gidiọn 12 site nʼebo Dan, Ahieza nwa Amishadai 13 site nʼebo Asha, Pagịel nwa Okran 14 site nʼebo Gad, Eliasaf nwa Deuel 15 site nʼebo Naftalị, Ahira nwa Enan.” 16 Ndị a bụ ndị ikom e si nʼọgbakọ ahụ họpụta, ndị bụ ndị ndu ebo dị iche iche nʼIzrel. Ha bụ ndị ndu ebo niile dị nʼIzrel. 17 Mosis na Erọn nabatara ndị ikom ndị a, bụ ndị e depụtara aha ha. 18 Emesịa, ha kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile ka ha zukọọ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa abụọ. Ndị niile zukọrọ kọwara ikwu ha na ezinaụlọ ha si pụta nʼotu na otu. Ma ndị ikom niile gbara site nʼiri afọ abụọ gbagoo ka e denyere aha ha nʼakwụkwọ nʼotu na otu, 19 dịka ONYENWE ANYỊ si nye Mosis nʼiwu. Otu a kwa ka Mosis si gụọ ha ọnụ nʼọzara Saịnaị. 20 Ụmụ Ruben, bụ ọkpara Izrel: Ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo; ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 21 Ọnụọgụgụ ndị niile si nʼebo Ruben dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500). 22 Site nʼụmụ Simiọn, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 23 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Simiọn dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ (59,300). 24 Site nʼụmụ Gad, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 25 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Gad dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise (45,650). 26 Site nʼụmụ Juda, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 27 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Juda dị iri puku asaa, puku anọ na narị isii (74,600). 28 Site nʼụmụ Isaka, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 29 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Isaka dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ (54,400). 30 Site nʼụmụ Zebụlọn, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 31 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Zebụlọn dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ (57,400). 32 Site nʼụmụ Josef, ya bụ ụmụ Ifrem, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 33 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Ifrem dị iri puku anọ na narị ise (40,500). 34 Site nʼụmụ Manase, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 35 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Manase dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ (32,200). 36 Site nʼụmụ Benjamin, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 37 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Benjamin dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ (35,400). 38 Site nʼụmụ Dan, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 39 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Dan dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa (62,700). 40 Site nʼụmụ Asha, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 41 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Asha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500). 42 Site nʼụmụ Naftalị, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dị ka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị. 43 Ọnụọgụgụ ndị niile sị nʼebo Naftalị dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400). 44 Ndị a bụ ndị ikom Mosis na Erọn, na ndị ndu Izrel iri na abụọ ndị ahụ gụrụ ọnụ, onye ọbụla nʼime ha nọchitere anya ezinaụlọ ya. 45 Ndị Izrel niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị nwere ike ije agha ka a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. 46 Mgbakọ ọnụọgụgụ ndị a niile dị, narị puku isii, puku atọ, narị ise na iri ise (603,550). 47 A gụnyekọtaghị ọnụọgụgụ ebo nna nna Livayị nʼịgụ ọnụ a, 48 nʼihi na ONYENWE ANYỊ gwara Mosis, sị, 49 “Ị gaghị agụ ndị ebo Livayị ọnụ. Ị gakwaghị agbakọnye ọnụọgụgụ ha nʼọnụọgụgụ ndị Izrel. 50 Kama, ị ga-ahọpụta ndị Livayị ka ha bụrụ ndị nlekọta ụlọ nzute Ihe Ama, na ngwongwo niile, na ihe niile dị nye ya. Ọ bụ ha ga-ebu ụlọ nzute ahụ na ngwongwo ya niile: ha ga na-elekọta ihe banyere ya, ọ bụkwa gburugburu ya ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha. 51 Mgbe ọbụla kwa a ga-ebugharị ya maka njem, ọ bụ ọrụ ha iweda ya. Mgbe ọbụla a ga-eguzo ya ọtọ, ọ bụkwa ọrụ ndị Livayị iguzobe ya ọtọ. Onye ọbụla ọzọ ga-abịa nso ka a ga-egbu. 52 Ebo Izrel ndị ọzọ ga-enwe ebe dị iche nye onwe ha, ebe ha ga-ewu ụlọ ikwu ha. Ha ga-akwụbakwa ọkọlọtọ nke ha, igosi aha ebo ha. 53 Ndị Livayị ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute Ihe Ama ahụ, ka iwe ọkụ m ghara ịbịakwasị nʼahụ nzukọ ụmụ Izrel. Ọ bụ ọrụ ndị Livayị ilekọta ụlọ nzute Ihe Ama ahụ.” 54 Ya mere, Izrel mere ihe ndị a niile ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu.

In Other Versions

Numbers 1 in the ANGEFD

Numbers 1 in the ANTPNG2D

Numbers 1 in the AS21

Numbers 1 in the BAGH

Numbers 1 in the BBPNG

Numbers 1 in the BBT1E

Numbers 1 in the BDS

Numbers 1 in the BEV

Numbers 1 in the BHAD

Numbers 1 in the BIB

Numbers 1 in the BLPT

Numbers 1 in the BNT

Numbers 1 in the BNTABOOT

Numbers 1 in the BNTLV

Numbers 1 in the BOATCB

Numbers 1 in the BOATCB2

Numbers 1 in the BOBCV

Numbers 1 in the BOCNT

Numbers 1 in the BOECS

Numbers 1 in the BOGWICC

Numbers 1 in the BOHCB

Numbers 1 in the BOHCV

Numbers 1 in the BOHLNT

Numbers 1 in the BOHNTLTAL

Numbers 1 in the BOILNTAP

Numbers 1 in the BOITCV

Numbers 1 in the BOKCV

Numbers 1 in the BOKCV2

Numbers 1 in the BOKHWOG

Numbers 1 in the BOKSSV

Numbers 1 in the BOLCB

Numbers 1 in the BOLCB2

Numbers 1 in the BOMCV

Numbers 1 in the BONAV

Numbers 1 in the BONCB

Numbers 1 in the BONLT

Numbers 1 in the BONUT2

Numbers 1 in the BOPLNT

Numbers 1 in the BOSCB

Numbers 1 in the BOSNC

Numbers 1 in the BOTLNT

Numbers 1 in the BOVCB

Numbers 1 in the BOYCB

Numbers 1 in the BPBB

Numbers 1 in the BPH

Numbers 1 in the BSB

Numbers 1 in the CCB

Numbers 1 in the CUV

Numbers 1 in the CUVS

Numbers 1 in the DBT

Numbers 1 in the DGDNT

Numbers 1 in the DHNT

Numbers 1 in the DNT

Numbers 1 in the ELBE

Numbers 1 in the EMTV

Numbers 1 in the ESV

Numbers 1 in the FBV

Numbers 1 in the FEB

Numbers 1 in the GGMNT

Numbers 1 in the GNT

Numbers 1 in the HARY

Numbers 1 in the HNT

Numbers 1 in the IRVA

Numbers 1 in the IRVB

Numbers 1 in the IRVG

Numbers 1 in the IRVH

Numbers 1 in the IRVK

Numbers 1 in the IRVM

Numbers 1 in the IRVM2

Numbers 1 in the IRVO

Numbers 1 in the IRVP

Numbers 1 in the IRVT

Numbers 1 in the IRVT2

Numbers 1 in the IRVU

Numbers 1 in the ISVN

Numbers 1 in the JSNT

Numbers 1 in the KAPI

Numbers 1 in the KBT1ETNIK

Numbers 1 in the KBV

Numbers 1 in the KJV

Numbers 1 in the KNFD

Numbers 1 in the LBA

Numbers 1 in the LBLA

Numbers 1 in the LNT

Numbers 1 in the LSV

Numbers 1 in the MAAL

Numbers 1 in the MBV

Numbers 1 in the MBV2

Numbers 1 in the MHNT

Numbers 1 in the MKNFD

Numbers 1 in the MNG

Numbers 1 in the MNT

Numbers 1 in the MNT2

Numbers 1 in the MRS1T

Numbers 1 in the NAA

Numbers 1 in the NASB

Numbers 1 in the NBLA

Numbers 1 in the NBS

Numbers 1 in the NBVTP

Numbers 1 in the NET2

Numbers 1 in the NIV11

Numbers 1 in the NNT

Numbers 1 in the NNT2

Numbers 1 in the NNT3

Numbers 1 in the PDDPT

Numbers 1 in the PFNT

Numbers 1 in the RMNT

Numbers 1 in the SBIAS

Numbers 1 in the SBIBS

Numbers 1 in the SBIBS2

Numbers 1 in the SBICS

Numbers 1 in the SBIDS

Numbers 1 in the SBIGS

Numbers 1 in the SBIHS

Numbers 1 in the SBIIS

Numbers 1 in the SBIIS2

Numbers 1 in the SBIIS3

Numbers 1 in the SBIKS

Numbers 1 in the SBIKS2

Numbers 1 in the SBIMS

Numbers 1 in the SBIOS

Numbers 1 in the SBIPS

Numbers 1 in the SBISS

Numbers 1 in the SBITS

Numbers 1 in the SBITS2

Numbers 1 in the SBITS3

Numbers 1 in the SBITS4

Numbers 1 in the SBIUS

Numbers 1 in the SBIVS

Numbers 1 in the SBT

Numbers 1 in the SBT1E

Numbers 1 in the SCHL

Numbers 1 in the SNT

Numbers 1 in the SUSU

Numbers 1 in the SUSU2

Numbers 1 in the SYNO

Numbers 1 in the TBIAOTANT

Numbers 1 in the TBT1E

Numbers 1 in the TBT1E2

Numbers 1 in the TFTIP

Numbers 1 in the TFTU

Numbers 1 in the TGNTATF3T

Numbers 1 in the THAI

Numbers 1 in the TNFD

Numbers 1 in the TNT

Numbers 1 in the TNTIK

Numbers 1 in the TNTIL

Numbers 1 in the TNTIN

Numbers 1 in the TNTIP

Numbers 1 in the TNTIZ

Numbers 1 in the TOMA

Numbers 1 in the TTENT

Numbers 1 in the UBG

Numbers 1 in the UGV

Numbers 1 in the UGV2

Numbers 1 in the UGV3

Numbers 1 in the VBL

Numbers 1 in the VDCC

Numbers 1 in the YALU

Numbers 1 in the YAPE

Numbers 1 in the YBVTP

Numbers 1 in the ZBP