Numbers 2 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn sị ha, 2 “Ụmụ Izrel ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute, nʼebe dịpụturu adịpụ site nʼụlọ nzute ahụ. Onye ọbụla ga-ama ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ọkọlọtọ ebo ya, ha na ihe ịrịbama nke ụlọ ha.” 3 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ,usuu ndị agha ebo Juda, ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha ga-abụ Nashọn nwa Aminadab. 4 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ya dị puku iri asaa na anọ, na narị isii (74,600) 5 Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Isaka ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Netanel nwa Zua. 6 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ (54,400). 7 Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Zebụlọn ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Eliab nwa Helọn. 8 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ (57,400). 9 Ọnụọgụgụ ndị niile a gụkọtara ha na Juda nʼọwụwa anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku asatọ na puku isii na narị anọ (186,400). Ha ga-ebu ụzọ bulie ije. 10 Nʼakụkụ ndịda kausuu ndị agha ebo Ruben ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Elizọ nwa Shedeua. 11 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500). 12 Nʼakụkụ ha ka ebo Simiọn ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Shelumiel nwa Zurishadai. 13 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ (59,300). 14 Ebo Gad ga-esokwa ha. Onyendu ha bụ Eliasaf nwa Deuel. 15 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise (45,650). 16 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ruben bikọrọ na ndịda ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na otu, na narị anọ na iri ise (151,450) dịka usuu ndị agha ha si dị. Ebo atọ a bụ ndị na-eso ebo atọ nke mbụ ahụ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije. 17 Ka ụlọ nzute na-azọli ije, ụlọ ikwu ndị Livayị ga-anọ nʼetiti ụlọ ikwu ndị ọzọ. Ha ga-ebili ije nʼusoro dịka ha si maa ụlọ ikwu ha. Ndị ọbụla nʼọnọdụ ha, nʼokpuru ọkọlọtọ nke na-akọwa ndị ha bụ. 18 Nʼakụkụ ọdịda anyanwụka ebo Ifrem ga-ama ụlọ ikwu ha dịka ọkọlọtọ ha si dị. Onyendu ha bụ Elishama nwa Amihud. 19 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ na narị ise (40,500). 20 Ebo Manase ga-amakwa ụlọ ikwu nʼakụkụ ha. Onyendu ha bụ Gamaliel nwa Pedazo. 21 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ (32,200). 22 Nʼakụkụ ha ka ebo Benjamin ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Abidan nwa Gidiọn. 23 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ (35,400). 24 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ifrem bikọrọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, puku asatọ na narị mmadụ (108,100). Ha niile na-esokwa nʼazụ ndị Livayị na ụlọ nzute ahụ. Ndị a bụ ndị na-eso nʼọnọdụ nke atọ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije. 25 Ebo Dan na usuu ndị agha haga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ elu elu nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai 26 Ọnụọgụgụ usuu ha dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa (62,700). 27 Nʼakụkụ ha ka ebo Asha ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Pagịel nwa Okran. 28 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500). 29 Otu aka ahụ ka ebo Naftalị ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Ahira nwa Enan. 30 Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400). 31 Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii (157,600). Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. 32 Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise (603,550) nʼọnụọgụgụ. 33 Ma otu ọ dị, a gụnyeghị ebo Livayị nʼọnụọgụgụ ndị Izrel ndị ọzọ dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis si dị. 34 Ya mere, ndị Izrel mere ihe niile dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. Otu a ka ha si maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Otu a kwa ka ha si ebuli ije. Onye ọbụla nʼime ha dịka ebo ha na ezinaụlọ ha si dị.

In Other Versions

Numbers 2 in the ANGEFD

Numbers 2 in the ANTPNG2D

Numbers 2 in the AS21

Numbers 2 in the BAGH

Numbers 2 in the BBPNG

Numbers 2 in the BBT1E

Numbers 2 in the BDS

Numbers 2 in the BEV

Numbers 2 in the BHAD

Numbers 2 in the BIB

Numbers 2 in the BLPT

Numbers 2 in the BNT

Numbers 2 in the BNTABOOT

Numbers 2 in the BNTLV

Numbers 2 in the BOATCB

Numbers 2 in the BOATCB2

Numbers 2 in the BOBCV

Numbers 2 in the BOCNT

Numbers 2 in the BOECS

Numbers 2 in the BOGWICC

Numbers 2 in the BOHCB

Numbers 2 in the BOHCV

Numbers 2 in the BOHLNT

Numbers 2 in the BOHNTLTAL

Numbers 2 in the BOILNTAP

Numbers 2 in the BOITCV

Numbers 2 in the BOKCV

Numbers 2 in the BOKCV2

Numbers 2 in the BOKHWOG

Numbers 2 in the BOKSSV

Numbers 2 in the BOLCB

Numbers 2 in the BOLCB2

Numbers 2 in the BOMCV

Numbers 2 in the BONAV

Numbers 2 in the BONCB

Numbers 2 in the BONLT

Numbers 2 in the BONUT2

Numbers 2 in the BOPLNT

Numbers 2 in the BOSCB

Numbers 2 in the BOSNC

Numbers 2 in the BOTLNT

Numbers 2 in the BOVCB

Numbers 2 in the BOYCB

Numbers 2 in the BPBB

Numbers 2 in the BPH

Numbers 2 in the BSB

Numbers 2 in the CCB

Numbers 2 in the CUV

Numbers 2 in the CUVS

Numbers 2 in the DBT

Numbers 2 in the DGDNT

Numbers 2 in the DHNT

Numbers 2 in the DNT

Numbers 2 in the ELBE

Numbers 2 in the EMTV

Numbers 2 in the ESV

Numbers 2 in the FBV

Numbers 2 in the FEB

Numbers 2 in the GGMNT

Numbers 2 in the GNT

Numbers 2 in the HARY

Numbers 2 in the HNT

Numbers 2 in the IRVA

Numbers 2 in the IRVB

Numbers 2 in the IRVG

Numbers 2 in the IRVH

Numbers 2 in the IRVK

Numbers 2 in the IRVM

Numbers 2 in the IRVM2

Numbers 2 in the IRVO

Numbers 2 in the IRVP

Numbers 2 in the IRVT

Numbers 2 in the IRVT2

Numbers 2 in the IRVU

Numbers 2 in the ISVN

Numbers 2 in the JSNT

Numbers 2 in the KAPI

Numbers 2 in the KBT1ETNIK

Numbers 2 in the KBV

Numbers 2 in the KJV

Numbers 2 in the KNFD

Numbers 2 in the LBA

Numbers 2 in the LBLA

Numbers 2 in the LNT

Numbers 2 in the LSV

Numbers 2 in the MAAL

Numbers 2 in the MBV

Numbers 2 in the MBV2

Numbers 2 in the MHNT

Numbers 2 in the MKNFD

Numbers 2 in the MNG

Numbers 2 in the MNT

Numbers 2 in the MNT2

Numbers 2 in the MRS1T

Numbers 2 in the NAA

Numbers 2 in the NASB

Numbers 2 in the NBLA

Numbers 2 in the NBS

Numbers 2 in the NBVTP

Numbers 2 in the NET2

Numbers 2 in the NIV11

Numbers 2 in the NNT

Numbers 2 in the NNT2

Numbers 2 in the NNT3

Numbers 2 in the PDDPT

Numbers 2 in the PFNT

Numbers 2 in the RMNT

Numbers 2 in the SBIAS

Numbers 2 in the SBIBS

Numbers 2 in the SBIBS2

Numbers 2 in the SBICS

Numbers 2 in the SBIDS

Numbers 2 in the SBIGS

Numbers 2 in the SBIHS

Numbers 2 in the SBIIS

Numbers 2 in the SBIIS2

Numbers 2 in the SBIIS3

Numbers 2 in the SBIKS

Numbers 2 in the SBIKS2

Numbers 2 in the SBIMS

Numbers 2 in the SBIOS

Numbers 2 in the SBIPS

Numbers 2 in the SBISS

Numbers 2 in the SBITS

Numbers 2 in the SBITS2

Numbers 2 in the SBITS3

Numbers 2 in the SBITS4

Numbers 2 in the SBIUS

Numbers 2 in the SBIVS

Numbers 2 in the SBT

Numbers 2 in the SBT1E

Numbers 2 in the SCHL

Numbers 2 in the SNT

Numbers 2 in the SUSU

Numbers 2 in the SUSU2

Numbers 2 in the SYNO

Numbers 2 in the TBIAOTANT

Numbers 2 in the TBT1E

Numbers 2 in the TBT1E2

Numbers 2 in the TFTIP

Numbers 2 in the TFTU

Numbers 2 in the TGNTATF3T

Numbers 2 in the THAI

Numbers 2 in the TNFD

Numbers 2 in the TNT

Numbers 2 in the TNTIK

Numbers 2 in the TNTIL

Numbers 2 in the TNTIN

Numbers 2 in the TNTIP

Numbers 2 in the TNTIZ

Numbers 2 in the TOMA

Numbers 2 in the TTENT

Numbers 2 in the UBG

Numbers 2 in the UGV

Numbers 2 in the UGV2

Numbers 2 in the UGV3

Numbers 2 in the VBL

Numbers 2 in the VDCC

Numbers 2 in the YALU

Numbers 2 in the YAPE

Numbers 2 in the YBVTP

Numbers 2 in the ZBP