Numbers 8 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Gwa Erọn okwu sị ya, ‘Mgbe ọbụla ị mụnyere oriọna asaa nke iheọkụ, ị ga-edozi ha ka ìhè ha na-enwupụta naanị nʼihu iheọkụ ahụ.’ ” 3 Erọn mere otu a. O doziri oriọna ndị ahụ ka ha chee ihu nʼihe ịdọba oriọna, dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 4 Otu a ka esi mee ihe ịdọba oriọna ahụ. Ọ bụ naanị ọlaedo ka e ji kpụọ iheọkụ ahụ, site nʼụkwụ ya ruo nʼokooko niile e ji chọọ ya mma. A kpụrụ iheọkụ ahụ nʼusoro dịka oyiyi ONYENWE ANYỊ gosiri Mosis si dị. 5 Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, 6 “Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel, kpọpụta ụmụ Livayị, doo ha iche, mee ha ka ha dịrị ọcha. 7 Ime ka ha dị ọcha, lee ihe ị ga-eme. Fesa ha mmiri na-asachapụ mmehie. Hụkwa na ha kpụchapụrụ ajị niile dị ha nʼahụ, ma sachaa uwe ha. Si otu a mee ka ha bụrụ ndị dị ọcha. 8 Gwa ha ka ha weta nwa oke ehi na onyinye mkpụrụ ọka, bụ ụtụ ọka a gwara mmanụ. Ha ga-ewetakwa nwa oke ehi ọzọ; ka ọ bụrụ ihe ha ji achụ aja mmehie. 9 Emesịa, kpọbata ụmụ Livayị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Meekwa ka ọgbakọ ndị Izrel niile zukọọ nʼebe ahụ. 10 Kpọpụta ndị Livayị nʼihu ONYENWE ANYỊ, ma mee ka ndị Izrel niile bikwasị ha aka ha. 11 Mgbe ahụ, Erọn ga-ewere ndị Livayị chee ONYENWE ANYỊ nʼihu dịka onyinye mfufe ndị Izrel niile na-enye ya. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ Livayị niile ga-abụ ndị jikere ijere ONYENWE ANYỊ ozi. 12 “Emesịa, ndị Livayị ga-abịa bikwasị aka ha nʼisi oke ehi abụọ ndị ahụ jiri otu nʼime oke ehi abụọ ndị ahụ chụọ aja mmehie nye ONYENWE ANYỊ, jiri nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ, maka ikpuchi mmehie ndị Livayị. 13 Mgbe ahụ, mee ka ndị Livayị guzo nʼihu Erọn na ụmụ ndị ikom, werekwa ha nyefee ONYENWE ANYỊ nʼaka dịka a ga-asị na ha bụ onyinye mfufe a na-enye ONYENWE ANYỊ. 14 Otu a ka ị ga-esi doo ndị Livayị nsọ ime ka ha dịrị iche site nʼigwe ụmụ Izrel ndị ọzọ. Ọ bụ m nwe ndị Livayị. 15 “Mgbe i dosiri ndị Livayị nsọ, cheekwa ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe, ha ga-abịa nʼime ụlọ nzute ahụ ije ozi dịrị ha. 16 Ha bụ nke m site nʼetiti ụmụ Izrel niile. Anarala m ha ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ, nwa nwoke nke nwanyị ọbụla nʼIzrel. 17 Nʼihi na nwa nwoke mbụ ọbụla a mụrụ nʼetiti ndị Izrel bụ nke m, ma mmadụ ma anụmanụ niile. Edoro m ha nsọ nye onwe m, site nʼabalị ụbọchị ahụ m tigbusiri ụmụ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIjipt. 18 Ewerela m ndị Livayị nʼọnọdụ ụmụ nwoke mbụ niile a mụrụ nʼIzrel. 19 Site nʼetiti ndị Izrel niile, ewerela m ndị Livayị nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom dịka onyinye, ka ha rụọ ọrụ niile dị nʼime ụlọ nzute ahụ nʼọnọdụ ụmụ Izrel. Ka ha kpuchiere ha mmehie ha niile ka ihe otiti nke nrịa nrịa ghara ịbịakwasị ụmụ Izrel, mgbe ọbụla ha bịara nso ebe nsọ ahụ.” 20 Ya mere, Mosis na Erọn na nzukọ niile nke ụmụ Izrel chere ụmụ Livayị nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼusoro dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 21 Ndị Livayị niile doro onwe ha ọcha, sachakwaa uwe ha niile. Erọn chere ha nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka onyinye aja mfufe, chụọrọ ha aja ikpuchi mmehie, ime ka ha dị ọcha. 22 Nʼikpeazụ, ndị Livayị bịara ije ozi ha nʼụlọ nzute nʼokpuru Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Ha nyekwara ndị Livayị ọrụ dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 23 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 24 “Iwu m ndị a metụtara ndị Livayị niile. Nwoke onye Livayị ọbụla ga-ebido ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute m mgbe ọ gbara iri afọ abụọ na ise. 25 Ọ ga-akwụsịkwa ịrụ ọrụ nʼime ya mgbe ọ gbara iri afọ ise, mgbe oge ezumike ọrụ ya ga-amalite. 26 Ha nwere ike inyere ụmụnne ha aka nʼịrụ ọrụ ha nʼime ụlọ nzute, ma ha onwe ha agaghị arụ ọrụ ahụ. Otu a ka ị ga-esi dozie ọrụ ije ozi nke ndị Livayị.”

In Other Versions

Numbers 8 in the ANGEFD

Numbers 8 in the ANTPNG2D

Numbers 8 in the AS21

Numbers 8 in the BAGH

Numbers 8 in the BBPNG

Numbers 8 in the BBT1E

Numbers 8 in the BDS

Numbers 8 in the BEV

Numbers 8 in the BHAD

Numbers 8 in the BIB

Numbers 8 in the BLPT

Numbers 8 in the BNT

Numbers 8 in the BNTABOOT

Numbers 8 in the BNTLV

Numbers 8 in the BOATCB

Numbers 8 in the BOATCB2

Numbers 8 in the BOBCV

Numbers 8 in the BOCNT

Numbers 8 in the BOECS

Numbers 8 in the BOGWICC

Numbers 8 in the BOHCB

Numbers 8 in the BOHCV

Numbers 8 in the BOHLNT

Numbers 8 in the BOHNTLTAL

Numbers 8 in the BOILNTAP

Numbers 8 in the BOITCV

Numbers 8 in the BOKCV

Numbers 8 in the BOKCV2

Numbers 8 in the BOKHWOG

Numbers 8 in the BOKSSV

Numbers 8 in the BOLCB

Numbers 8 in the BOLCB2

Numbers 8 in the BOMCV

Numbers 8 in the BONAV

Numbers 8 in the BONCB

Numbers 8 in the BONLT

Numbers 8 in the BONUT2

Numbers 8 in the BOPLNT

Numbers 8 in the BOSCB

Numbers 8 in the BOSNC

Numbers 8 in the BOTLNT

Numbers 8 in the BOVCB

Numbers 8 in the BOYCB

Numbers 8 in the BPBB

Numbers 8 in the BPH

Numbers 8 in the BSB

Numbers 8 in the CCB

Numbers 8 in the CUV

Numbers 8 in the CUVS

Numbers 8 in the DBT

Numbers 8 in the DGDNT

Numbers 8 in the DHNT

Numbers 8 in the DNT

Numbers 8 in the ELBE

Numbers 8 in the EMTV

Numbers 8 in the ESV

Numbers 8 in the FBV

Numbers 8 in the FEB

Numbers 8 in the GGMNT

Numbers 8 in the GNT

Numbers 8 in the HARY

Numbers 8 in the HNT

Numbers 8 in the IRVA

Numbers 8 in the IRVB

Numbers 8 in the IRVG

Numbers 8 in the IRVH

Numbers 8 in the IRVK

Numbers 8 in the IRVM

Numbers 8 in the IRVM2

Numbers 8 in the IRVO

Numbers 8 in the IRVP

Numbers 8 in the IRVT

Numbers 8 in the IRVT2

Numbers 8 in the IRVU

Numbers 8 in the ISVN

Numbers 8 in the JSNT

Numbers 8 in the KAPI

Numbers 8 in the KBT1ETNIK

Numbers 8 in the KBV

Numbers 8 in the KJV

Numbers 8 in the KNFD

Numbers 8 in the LBA

Numbers 8 in the LBLA

Numbers 8 in the LNT

Numbers 8 in the LSV

Numbers 8 in the MAAL

Numbers 8 in the MBV

Numbers 8 in the MBV2

Numbers 8 in the MHNT

Numbers 8 in the MKNFD

Numbers 8 in the MNG

Numbers 8 in the MNT

Numbers 8 in the MNT2

Numbers 8 in the MRS1T

Numbers 8 in the NAA

Numbers 8 in the NASB

Numbers 8 in the NBLA

Numbers 8 in the NBS

Numbers 8 in the NBVTP

Numbers 8 in the NET2

Numbers 8 in the NIV11

Numbers 8 in the NNT

Numbers 8 in the NNT2

Numbers 8 in the NNT3

Numbers 8 in the PDDPT

Numbers 8 in the PFNT

Numbers 8 in the RMNT

Numbers 8 in the SBIAS

Numbers 8 in the SBIBS

Numbers 8 in the SBIBS2

Numbers 8 in the SBICS

Numbers 8 in the SBIDS

Numbers 8 in the SBIGS

Numbers 8 in the SBIHS

Numbers 8 in the SBIIS

Numbers 8 in the SBIIS2

Numbers 8 in the SBIIS3

Numbers 8 in the SBIKS

Numbers 8 in the SBIKS2

Numbers 8 in the SBIMS

Numbers 8 in the SBIOS

Numbers 8 in the SBIPS

Numbers 8 in the SBISS

Numbers 8 in the SBITS

Numbers 8 in the SBITS2

Numbers 8 in the SBITS3

Numbers 8 in the SBITS4

Numbers 8 in the SBIUS

Numbers 8 in the SBIVS

Numbers 8 in the SBT

Numbers 8 in the SBT1E

Numbers 8 in the SCHL

Numbers 8 in the SNT

Numbers 8 in the SUSU

Numbers 8 in the SUSU2

Numbers 8 in the SYNO

Numbers 8 in the TBIAOTANT

Numbers 8 in the TBT1E

Numbers 8 in the TBT1E2

Numbers 8 in the TFTIP

Numbers 8 in the TFTU

Numbers 8 in the TGNTATF3T

Numbers 8 in the THAI

Numbers 8 in the TNFD

Numbers 8 in the TNT

Numbers 8 in the TNTIK

Numbers 8 in the TNTIL

Numbers 8 in the TNTIN

Numbers 8 in the TNTIP

Numbers 8 in the TNTIZ

Numbers 8 in the TOMA

Numbers 8 in the TTENT

Numbers 8 in the UBG

Numbers 8 in the UGV

Numbers 8 in the UGV2

Numbers 8 in the UGV3

Numbers 8 in the VBL

Numbers 8 in the VDCC

Numbers 8 in the YALU

Numbers 8 in the YAPE

Numbers 8 in the YBVTP

Numbers 8 in the ZBP