Numbers 9 (BOICB)
1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu ndị a nʼọzara Saịnaị nʼọnwa mbụ nʼafọ nke abụọ site nʼoge ha hapụrụ ala Ijipt. Ọ sịrị ya, 2 “Gwa ụmụ Izrel ka ha mee Mmemme Ngabiga nʼoge a kara aka. 3 Ha mee ya nʼoge a kara aka, malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa a. Ha ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e ji eme ya si dị.” 4 Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel sị ha mee Mmemme Ngabiga. 5 Ha mekwara ya nʼọzara Saịnaị malite nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. Ndị Izrel mere ihe niile nʼusoro dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis si dị. 6 Ma ụfọdụ nʼime ụmụ Izrel esoghị mee Mmemme Ngabiga ahụ nʼihi na ha rụrụ arụ site nʼịnọ ozu nso. Nʼihi ya, ha bịakwutere Mosis na Erọn nʼụbọchị ahụ, 7 sị Mosis, “Anyị ghọrọ ndị rụrụ arụ nʼihi ịnọ ozu mmadụ nso. Gịnị ga-egbochi anyị iso ndị Izrel ndị ọzọ iwetara ONYENWE ANYỊ onyinye nʼoge a kara aka?” 8 Mosis zara sị ha, “Cherenụ ka m ga jụta ONYENWE ANYỊ ihe bụ uche ya banyere mkpa unu.” 9 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, 10 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na e nwee onye Izrel ọbụla nke merụrụ onwe ya nʼoge Mmemme Ngabiga site nʼịnọ ozu mmadụ nso, maọbụ site nʼịnọ nʼije, ha nwekwara ike iso mee Mmemme Ngabiga ONYENWE ANYỊ. 11 Kama ha ga-eme ya nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa abụọ. Ha ga-eri nwa atụrụ ha, achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ilu. 12 Ha agaghị erifọ ihe ọbụla nʼime ya ruo chi ọbụbọ ụbọchị so ya. Ha agaghị agbaji ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ. Mgbe ha mere Mmemme Ngabiga, ha ga-esorokwa ụzọ niile e si eme mmemme ahụ mee nke ha. 13 Ma ọbụla nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha, onye nke na-anọghị nʼije nʼoge Mmemme Ngabiga ma kpachapụrụ anya hapụ isoro ndị ọzọ nʼoge mmemme a, a ga-ewezuga ya site nʼetiti ụmụ Izrel niile, nʼihi na ọ jụrụ iwetara ONYENWE ANYỊ onyinye nʼoge a kara aka. Onye dị otu a ga-ebu ahụhụ mmehie ya nʼisi ya. 14 “ ‘Onye ọbịa bi nʼetiti unu chọrọ iso na Mmemme Ngabiga ONYENWE ANYỊ, ọ ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e nyere si dị. Unu ga-enwe otu iwu ahụ nye onye amụrụ nʼala na mbịarambịa.’ ” 15 Nʼụbọchị ahụ e guzobere ụlọ nzute ahụ bụ ụlọ ikwu nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, igwe ojii kpuchiri ya. Site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ igwe ojii ahụ dị nʼelu ụlọ nzute ahụ dịka ọkụ nʼile anya. 16 Otu a ka ọ dịgidere mgbe niile. Igwe ojii kpuchigidere ya, ma nʼabalị ọ na-acha dị ka ọkụ. 17 Mgbe ọ bụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, ụmụ Izrel na-ebuli njem, ma mgbe ọbụla igwe ojii ahụ na-anọgide, ha na-anọgidekwa. 18 Mgbe ONYENWE ANYỊ nyekwara iwu, ha na-akwụsị, maa ụlọ ikwu ha. Oge niile igwe ojii nọgidere nʼelu ụlọ nzute ahụ ka ụmụ Izrel na-anọgidekwa nʼụlọ ikwu ha. 19 Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọọtee anya, ụmụ Izrel nʼonwe ha na-erube isi nʼiwu ONYENWE ANYỊ hapụ ịga nʼihu nʼije ha. 20 Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị abalị ole na ole. Dịka iwu ONYENWE ANYỊ si dị, ha na-ama ụlọ ikwu ha, maọbụ bulie njem ha. 21 Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Mgbe o si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie nʼụtụtụ, ụmụ Izrel na-ebuli njem ha. Ọ bụrụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ biliri, ụmụ Izrel na-ebuli njem ha. 22 Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọdụ nʼelu ụlọ nzute ahụ abalị abụọ, maọbụ otu ọnwa, maọbụ otu afọ, ụmụ Izrel na-anọgide nʼụlọ ikwu ha. Ma ngwangwa igwe ojii ahụ biliri, ha onwe ha na-ebulikwa njem ha. 23 Site nʼiwu ONYENWE ANYỊ na-enye, ha na-ama ụlọ ikwu ha, sitekwa nʼiwu ONYENWE ANYỊ nyere ha, ha na-ebili njem. Ha mere ihe niile ONYENWE ANYỊ kwuru nʼusoro dịka iwu o nyere ha site nʼọnụ Mosis si dị.
In Other Versions
Numbers 9 in the ANGEFD
Numbers 9 in the ANTPNG2D
Numbers 9 in the AS21
Numbers 9 in the BAGH
Numbers 9 in the BBPNG
Numbers 9 in the BBT1E
Numbers 9 in the BDS
Numbers 9 in the BEV
Numbers 9 in the BHAD
Numbers 9 in the BIB
Numbers 9 in the BLPT
Numbers 9 in the BNT
Numbers 9 in the BNTABOOT
Numbers 9 in the BNTLV
Numbers 9 in the BOATCB
Numbers 9 in the BOATCB2
Numbers 9 in the BOBCV
Numbers 9 in the BOCNT
Numbers 9 in the BOECS
Numbers 9 in the BOGWICC
Numbers 9 in the BOHCB
Numbers 9 in the BOHCV
Numbers 9 in the BOHLNT
Numbers 9 in the BOHNTLTAL
Numbers 9 in the BOILNTAP
Numbers 9 in the BOITCV
Numbers 9 in the BOKCV
Numbers 9 in the BOKCV2
Numbers 9 in the BOKHWOG
Numbers 9 in the BOKSSV
Numbers 9 in the BOLCB
Numbers 9 in the BOLCB2
Numbers 9 in the BOMCV
Numbers 9 in the BONAV
Numbers 9 in the BONCB
Numbers 9 in the BONLT
Numbers 9 in the BONUT2
Numbers 9 in the BOPLNT
Numbers 9 in the BOSCB
Numbers 9 in the BOSNC
Numbers 9 in the BOTLNT
Numbers 9 in the BOVCB
Numbers 9 in the BOYCB
Numbers 9 in the BPBB
Numbers 9 in the BPH
Numbers 9 in the BSB
Numbers 9 in the CCB
Numbers 9 in the CUV
Numbers 9 in the CUVS
Numbers 9 in the DBT
Numbers 9 in the DGDNT
Numbers 9 in the DHNT
Numbers 9 in the DNT
Numbers 9 in the ELBE
Numbers 9 in the EMTV
Numbers 9 in the ESV
Numbers 9 in the FBV
Numbers 9 in the FEB
Numbers 9 in the GGMNT
Numbers 9 in the GNT
Numbers 9 in the HARY
Numbers 9 in the HNT
Numbers 9 in the IRVA
Numbers 9 in the IRVB
Numbers 9 in the IRVG
Numbers 9 in the IRVH
Numbers 9 in the IRVK
Numbers 9 in the IRVM
Numbers 9 in the IRVM2
Numbers 9 in the IRVO
Numbers 9 in the IRVP
Numbers 9 in the IRVT
Numbers 9 in the IRVT2
Numbers 9 in the IRVU
Numbers 9 in the ISVN
Numbers 9 in the JSNT
Numbers 9 in the KAPI
Numbers 9 in the KBT1ETNIK
Numbers 9 in the KBV
Numbers 9 in the KJV
Numbers 9 in the KNFD
Numbers 9 in the LBA
Numbers 9 in the LBLA
Numbers 9 in the LNT
Numbers 9 in the LSV
Numbers 9 in the MAAL
Numbers 9 in the MBV
Numbers 9 in the MBV2
Numbers 9 in the MHNT
Numbers 9 in the MKNFD
Numbers 9 in the MNG
Numbers 9 in the MNT
Numbers 9 in the MNT2
Numbers 9 in the MRS1T
Numbers 9 in the NAA
Numbers 9 in the NASB
Numbers 9 in the NBLA
Numbers 9 in the NBS
Numbers 9 in the NBVTP
Numbers 9 in the NET2
Numbers 9 in the NIV11
Numbers 9 in the NNT
Numbers 9 in the NNT2
Numbers 9 in the NNT3
Numbers 9 in the PDDPT
Numbers 9 in the PFNT
Numbers 9 in the RMNT
Numbers 9 in the SBIAS
Numbers 9 in the SBIBS
Numbers 9 in the SBIBS2
Numbers 9 in the SBICS
Numbers 9 in the SBIDS
Numbers 9 in the SBIGS
Numbers 9 in the SBIHS
Numbers 9 in the SBIIS
Numbers 9 in the SBIIS2
Numbers 9 in the SBIIS3
Numbers 9 in the SBIKS
Numbers 9 in the SBIKS2
Numbers 9 in the SBIMS
Numbers 9 in the SBIOS
Numbers 9 in the SBIPS
Numbers 9 in the SBISS
Numbers 9 in the SBITS
Numbers 9 in the SBITS2
Numbers 9 in the SBITS3
Numbers 9 in the SBITS4
Numbers 9 in the SBIUS
Numbers 9 in the SBIVS
Numbers 9 in the SBT
Numbers 9 in the SBT1E
Numbers 9 in the SCHL
Numbers 9 in the SNT
Numbers 9 in the SUSU
Numbers 9 in the SUSU2
Numbers 9 in the SYNO
Numbers 9 in the TBIAOTANT
Numbers 9 in the TBT1E
Numbers 9 in the TBT1E2
Numbers 9 in the TFTIP
Numbers 9 in the TFTU
Numbers 9 in the TGNTATF3T
Numbers 9 in the THAI
Numbers 9 in the TNFD
Numbers 9 in the TNT
Numbers 9 in the TNTIK
Numbers 9 in the TNTIL
Numbers 9 in the TNTIN
Numbers 9 in the TNTIP
Numbers 9 in the TNTIZ
Numbers 9 in the TOMA
Numbers 9 in the TTENT
Numbers 9 in the UBG
Numbers 9 in the UGV
Numbers 9 in the UGV2
Numbers 9 in the UGV3
Numbers 9 in the VBL
Numbers 9 in the VDCC
Numbers 9 in the YALU
Numbers 9 in the YAPE
Numbers 9 in the YBVTP
Numbers 9 in the ZBP