Philemon 1 (BOICB)
1 Pọl, onye e tinyere nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na site nʼaka nwanna anyị Timoti, Anyị na-edetara gị ya ezi enyi anyị na onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, Fịlịmọn. 2 Anyị na-edetakwara ya nzukọ Kraịst dị nʼụlọ gị, na nwanna anyị nwanyị Afịa, na Akipos onye anyị na ya so na-alụ agha a. 3 Ka amara na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị unu. 4 Ana m ekele Chineke ekele mgbe ọbụla m na-echeta gị nʼekpere niile m na-ekpe. 5 Nʼihi na ana m anụ ihe banyere okwukwe i nwere nʼime Onyenwe anyị Jisọs, na ịhụnanya i na-egosi ndị nsọ niile. 6 Ekpere m na-ekpe banyere gị bụ ka mmekọrịta anyị na gị dịka ndị kwere ekwe, mee ka ị matazuo ihe ọma niile anyị nwere nʼime Kraịst. 7 Ịhụnanya gị na-enye m oke ọṅụ na ịgbaume, ezi nwanna m, nʼihi na emeela ka ndị nsọ nwee ume ọhụrụ site nʼinyeaka gị. 8 Ọ bụ ezie na-enwere m ike nʼime Kraịst inye gị iwu banyere ihe kwesiri ka i mee, ma agaghị m eme otu a. 9 Kama, ọ kaara m mma site na ndabere nke ịhụnanya, ịrịọ gị ya dị ka arịrịọ. Ee, ọ bụ mụ Pọl, agadi nwoke ahụ na onye mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-arịọ gị arịrịọ a. 10 Biko, arịọ m gị nʼisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m oge m nọ nʼụlọ mkpọrọ. 11 Na mbụ, o nweghị uru ọbụla ọ baara gị, ma ugbu a, ọ baara mụ na gị uru. 12 Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, onye bụ obi m ka m na-ezitere gị. 13 Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nʼebe a, ka o were ọnọdụ gị na-ejere m ozi ọ bụladị dị ka m nọ na mkpọrọ nʼihi oziọma. 14 Ma, a chọghị m ime ihe ọbụla na-enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama, achọrọ m ka i mee ihe si gị nʼobi pụta. 15 Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi. 16 Ọ bụghịkwa ohu ọzọ, kama ọ karịrị ohu, maka ọ dịka nwanna a hụrụ nʼanya, ọkachasị nʼebe mụ onwe m nọ, ma ọ ga-abụkwara gị karịchasịa, ma nʼanụ ahụ nakwa nʼime Onyenwe anyị. 17 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ị gụrụ m dị ka onye nnwekọ ihe, nabata ya dị ka ị ga-esi nabata m. 18 Biko, ọ bụrụ na o mejọrọ gị nʼụzọ ọbụla, ọ bụrụkwa na o ji ụgwọ ọbụla, gụọ ya dị ka ụgwọ m ji gị. 19 Mụ bụ Pọl ji aka m dee nke a; aga m akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nʼihi na ụgwọ i ji m bụ gị onwe gị. 20 Nwanna m, mere m ihe a m na-arịọ gị nʼihi Onyenwe anyị. Mekwa ka obi m dị ọhụrụ nʼime Kraịst. 21 Olileanya m siri m ike na ị ga-aṅa m ntị, ana m edere gị akwụkwọ a, na ị ga-eme, ma karịakwa ka m rịọrọ. 22 Ihe ọzọkwa, bụ na m chọrọ ka ị kwadoro m ọnụụlọ ebe m ga-anọ dị ka ọbịa ma m bịa, maka enwere m olileanya na a ga-aza ekpere unu ime ka m si nʼebe a pụta bịakwute unu. 23 Epafras, onye mụ na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼihi Kraịst Jisọs na-ekele gị. 24 Mak, na Arịstakọs, na Dimas, na Luk, ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ na-ekelekwa unu. 25 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.
In Other Versions
Philemon 1 in the ANGEFD
Philemon 1 in the ANTPNG2D
Philemon 1 in the AS21
Philemon 1 in the BAGH
Philemon 1 in the BBPNG
Philemon 1 in the BBT1E
Philemon 1 in the BDS
Philemon 1 in the BEV
Philemon 1 in the BHAD
Philemon 1 in the BIB
Philemon 1 in the BLPT
Philemon 1 in the BNT
Philemon 1 in the BNTABOOT
Philemon 1 in the BNTLV
Philemon 1 in the BOATCB
Philemon 1 in the BOATCB2
Philemon 1 in the BOBCV
Philemon 1 in the BOCNT
Philemon 1 in the BOECS
Philemon 1 in the BOGWICC
Philemon 1 in the BOHCB
Philemon 1 in the BOHCV
Philemon 1 in the BOHLNT
Philemon 1 in the BOHNTLTAL
Philemon 1 in the BOILNTAP
Philemon 1 in the BOITCV
Philemon 1 in the BOKCV
Philemon 1 in the BOKCV2
Philemon 1 in the BOKHWOG
Philemon 1 in the BOKSSV
Philemon 1 in the BOLCB
Philemon 1 in the BOLCB2
Philemon 1 in the BOMCV
Philemon 1 in the BONAV
Philemon 1 in the BONCB
Philemon 1 in the BONLT
Philemon 1 in the BONUT2
Philemon 1 in the BOPLNT
Philemon 1 in the BOSCB
Philemon 1 in the BOSNC
Philemon 1 in the BOTLNT
Philemon 1 in the BOVCB
Philemon 1 in the BOYCB
Philemon 1 in the BPBB
Philemon 1 in the BPH
Philemon 1 in the BSB
Philemon 1 in the CCB
Philemon 1 in the CUV
Philemon 1 in the CUVS
Philemon 1 in the DBT
Philemon 1 in the DGDNT
Philemon 1 in the DHNT
Philemon 1 in the DNT
Philemon 1 in the ELBE
Philemon 1 in the EMTV
Philemon 1 in the ESV
Philemon 1 in the FBV
Philemon 1 in the FEB
Philemon 1 in the GGMNT
Philemon 1 in the GNT
Philemon 1 in the HARY
Philemon 1 in the HNT
Philemon 1 in the IRVA
Philemon 1 in the IRVB
Philemon 1 in the IRVG
Philemon 1 in the IRVH
Philemon 1 in the IRVK
Philemon 1 in the IRVM
Philemon 1 in the IRVM2
Philemon 1 in the IRVO
Philemon 1 in the IRVP
Philemon 1 in the IRVT
Philemon 1 in the IRVT2
Philemon 1 in the IRVU
Philemon 1 in the ISVN
Philemon 1 in the JSNT
Philemon 1 in the KAPI
Philemon 1 in the KBT1ETNIK
Philemon 1 in the KBV
Philemon 1 in the KJV
Philemon 1 in the KNFD
Philemon 1 in the LBA
Philemon 1 in the LBLA
Philemon 1 in the LNT
Philemon 1 in the LSV
Philemon 1 in the MAAL
Philemon 1 in the MBV
Philemon 1 in the MBV2
Philemon 1 in the MHNT
Philemon 1 in the MKNFD
Philemon 1 in the MNG
Philemon 1 in the MNT
Philemon 1 in the MNT2
Philemon 1 in the MRS1T
Philemon 1 in the NAA
Philemon 1 in the NASB
Philemon 1 in the NBLA
Philemon 1 in the NBS
Philemon 1 in the NBVTP
Philemon 1 in the NET2
Philemon 1 in the NIV11
Philemon 1 in the NNT
Philemon 1 in the NNT2
Philemon 1 in the NNT3
Philemon 1 in the PDDPT
Philemon 1 in the PFNT
Philemon 1 in the RMNT
Philemon 1 in the SBIAS
Philemon 1 in the SBIBS
Philemon 1 in the SBIBS2
Philemon 1 in the SBICS
Philemon 1 in the SBIDS
Philemon 1 in the SBIGS
Philemon 1 in the SBIHS
Philemon 1 in the SBIIS
Philemon 1 in the SBIIS2
Philemon 1 in the SBIIS3
Philemon 1 in the SBIKS
Philemon 1 in the SBIKS2
Philemon 1 in the SBIMS
Philemon 1 in the SBIOS
Philemon 1 in the SBIPS
Philemon 1 in the SBISS
Philemon 1 in the SBITS
Philemon 1 in the SBITS2
Philemon 1 in the SBITS3
Philemon 1 in the SBITS4
Philemon 1 in the SBIUS
Philemon 1 in the SBIVS
Philemon 1 in the SBT
Philemon 1 in the SBT1E
Philemon 1 in the SCHL
Philemon 1 in the SNT
Philemon 1 in the SUSU
Philemon 1 in the SUSU2
Philemon 1 in the SYNO
Philemon 1 in the TBIAOTANT
Philemon 1 in the TBT1E
Philemon 1 in the TBT1E2
Philemon 1 in the TFTIP
Philemon 1 in the TFTU
Philemon 1 in the TGNTATF3T
Philemon 1 in the THAI
Philemon 1 in the TNFD
Philemon 1 in the TNT
Philemon 1 in the TNTIK
Philemon 1 in the TNTIL
Philemon 1 in the TNTIN
Philemon 1 in the TNTIP
Philemon 1 in the TNTIZ
Philemon 1 in the TOMA
Philemon 1 in the TTENT
Philemon 1 in the UBG
Philemon 1 in the UGV
Philemon 1 in the UGV2
Philemon 1 in the UGV3
Philemon 1 in the VBL
Philemon 1 in the VDCC
Philemon 1 in the YALU
Philemon 1 in the YAPE
Philemon 1 in the YBVTP
Philemon 1 in the ZBP