Psalms 100 (BOICB)
undefined Abụ Ọma maka ikele ekele afọ ojuju. 1 Tikusienụ ONYENWE ANYỊ mkpu ọṅụ ike, ụwa niile. 2 Jiri obi ụtọ fee ONYENWE ANYỊ ofufe;jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya 3 Matanụ na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke.Ọ bụ ya onwe ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị,anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ. 4 Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama yajiri otuto baa nʼogige ya;keleenụ ya, tookwa aha ya. 5 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.