Psalms 111 (BOICB)
1 Toonu ONYENWE ANYỊ! Aga m eji obi m niile jaa ONYENWE ANYỊ mmanʼime nzukọ ndị ụzọ ha ziri ezi na nʼime ọgbakọ ukwuu. 2 Ọrụ niile ONYENWE ANYỊ na-arụ dị ukwuu;ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha. 3 Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma,ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 4 O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; ONYENWE ANYỊ bụ onye amara na onye ọmịiko. 5 Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri;ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 6 O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile,site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ. 7 Ọrụ aka ya niile bụ ihe kwesiri ekwesi na ikpe ziri ezi;ụkpụrụ ya niile bụ ihe kwesiri ntụkwasị obi. 8 E hiwere ha ịdị ruo mgbe niile ebighị ebi,ha bụ ihe e mere nʼikwesị ntụkwasị obi na izi ezi. 9 O wetaara ndị ya mgbapụta;o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi,aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu. 10 Ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ bụ mmalite amamihe;ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta.Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.