Psalms 119 (BOICB)

1 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla,ndị na-ejegharị dịka iwu ONYENWE ANYỊ si dị. 2 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ yama jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike. 3 Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla;ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile. 4 I doola ụkpụrụndị a ga-erubekwara isi. 5 Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ikena-erube isi nye iwu gị niile! 6 Mgbe ahụ, ihere agaghị eme mmgbe m tulere uche nʼiwu gị niile. 7 Aga m eji obi ziri ezi too gịdịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi. 8 Aga m erubere iwu gị niile isi;biko ahapụkwala m. 9 Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ?Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị. 10 Eji m obi m niile na-achọsi gị ike.Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu. 11 Ezoola m okwu gị niile nʼobi m,igbochi m imehie imegide gị. 12 Otuto dịrị gị, o ONYENWE ANYỊ;kuziere m iwu gị niile. 13 Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịaiwu niile nke si nʼọnụ gị. 14 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niiledịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba. 15 Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gịna-atulekwa uche nʼụzọ gị niile. 16 Iwu gị na-amasị m;agaghị m elefu okwu gị anya. 17 Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ;aga m erubere okwu gị isi. 18 Kpughee anya m abụọka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị. 19 Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa;ezonarịla m iwu gị niile. 20 Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niilena-agụ mkpụrụobi m agụụ. 21 Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụna ndị na-anaghị agbaso iwu gị. 22 Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị,nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile. 23 Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m,ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị. 24 Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m;ha bụ ndị ndụmọdụ m. 25 Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu;kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị. 26 Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m;ugbu a, kuziere m iwu gị. 27 Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị;ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile. 28 Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba;gbaa m ume dịka okwu gị si dị. 29 Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile;site nʼiwu gị meere m amara. 30 Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi;e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile. 31 O ONYENWE ANYỊ, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike;ekwela ka ihere mee m. 32 Aga m agbaso iwu gị niilenʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya. 33 O ONYENWE ANYỊ, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile;mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ. 34 Nye m nghọta, aga m edebe iwu gịma jiri obi m niile rubere ya isi. 35 Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile,nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ. 36 Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niileọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe. 37 Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru;chebe ndụ m dịka okwu gị si dị. 38 Mezuo nkwa i kwere ohu gị,ka a tụọ egwu gị. 39 Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya,nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. 40 Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike!Chebe ndụ m site nʼezi omume gị. 41 O ONYENWE ANYỊ, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m,nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị; 42 mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị,nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị. 43 Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu,nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile. 44 Aga m anọgide na-erubere iwu gị isiruo mgbe ebighị ebi. 45 Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwenʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. 46 Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị ezema ihere agaghị eme m, 47 nʼihi na iwu gị na-amasị mnʼihi na ahụrụ m ha nʼanya. 48 Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya,ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile. 49 Cheta okwu i nyere ohu gị,nʼihi na i nyela m olileanya. 50 Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a:nkwa gị na-echebe ndụ m. 51 Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka,ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m. 52 O ONYENWE ANYỊ, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie,ha na-ewetara m nkasiobi. 53 Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume,ndị gbakụtara iwu gị azụ. 54 Iwu gị niile bụ isi okwu abụ mebe ọbụla m na-anọ. 55 Nʼabalị, o ONYENWE ANYỊ, ana m echeta aha gị,aga m edebekwa iwu gị. 56 Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile:ana m erubere ụkpụrụ gị isi. 57 O ONYENWE ANYỊ, ị bụ ihe nketa m;ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile. 58 Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị;meere m ebere dịka nkwa gị si dị. 59 Echeela m echiche banyere ụzọ m niile,chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile. 60 Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu ogeirubere iwu gị niile isi. 61 A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ,agaghị m echefu iwu gị. 62 Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekelenʼihi iwu gị niile ziri ezi. 63 Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị,ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị. 64 O ONYENWE ANYỊ, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị;kuziere m iwu gị niile. 65 Meere ohu gị ihe ọmadịka okwu gị si dị, o ONYENWE ANYỊ. 66 Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezinʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile. 67 Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m,ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi. 68 I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi;kuziere m iwu gị niile. 69 Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m,ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị. 70 Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha,ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị. 71 Ọ dị mma na m tara ahụhụka m nwee ike mụta iwu gị niile. 72 Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye mkarịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo. 73 Aka gị kere m, kpụọkwa m;nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile. 74 Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m,nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị. 75 O ONYENWE ANYỊ, amaara m na iwu gị niile ziri ezi,ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ. 76 Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi,dịka nkwa i kwere ohu gị si dị. 77 Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ,nʼihi na iwu gị na-amasị m. 78 Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere;ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. 79 Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m,ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile. 80 Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile,ka ihere ghara ime m. 81 Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị,ma olileanya m dị nʼokwu gị. 82 Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị;ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?” 83 Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ,anaghị m echefu iwu gị niile. 84 Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche?Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ? 85 Ndị mpako na-egwuru m olulu,bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị. 86 Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi;nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha. 87 Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi,ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ. 88 Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m,ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị. 89 O ONYENWE ANYỊ, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe. 90 Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ;ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike. 91 Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike,nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi. 92 A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m,agaara m anwụ nʼime nsogbu m. 93 Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile,nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m. 94 Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị;achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. 95 Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi,ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. 96 Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke,ma iwu gị niile enweghị nsọtụ. 97 O, otu m si hụ iwu gị nʼanya!Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile. 98 Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m,ha na-anọnyere m oge niile. 99 Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe,nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile. 100 Enwere m nghọta karịa ndị okenyenʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi. 101 Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụlaka m nwee ike rubere okwu gị isi 102 Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile,nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha. 103 Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ,ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ! 104 A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile;ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị. 105 Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ mbụrụkwa ìhè nʼụzọ m. 106 Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike,na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile. 107 Ataala m ahụhụ nke ukwuu;chebe ndụ m, o ONYENWE ANYỊ, dịka okwu gị si dị. 108 O ONYENWE ANYỊ, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m,kuziekwara m iwu gị niile. 109 Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile,ma echezọghị m iwu gị. 110 Ndị ajọ omume esielera m ọnya,ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo. 111 Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi;ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ. 112 Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gịruo na ngwụcha. 113 Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị,ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. 114 Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m;olileanya m dị nʼokwu gị. 115 Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ,ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m! 116 Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ;ekwekwala ka olileanya m daa. 117 Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara;aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile. 118 Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị,nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi. 119 Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu;nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya. 120 Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị;ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile. 121 Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi;ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m. 122 Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya;ekwela ka ndị mpako kpagbuo m. 123 Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gịebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi. 124 Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dịma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile. 125 Abụ m ohu gị, nye m nghọta,ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile. 126 O ONYENWE ANYỊ, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ,nʼihi na a na-emebi iwu gị. 127 Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanyakarịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha, 128 nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi,akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị. 129 Iwu gị niile dị ịtụnanya;ya mere, ana m erubere ha isi. 130 Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè;ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe. 131 Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike,na-achọsi iwu gị niile ike. 132 Chee m ihu, meere m ebere,dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere. 133 Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị;ekwela ka mmehie chịa m. 134 Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m,ka m nwee ike debe iwu gị. 135 Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị.Kuziere m ụkpụrụ gị niile. 136 Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuunʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị. 137 O ONYENWE ANYỊ, ị bụ onye ezi omume,iwu gị niile zikwara ezi. 138 Ụkpụrụ gị niile ziri ezi;ha kwesiri ntụkwasị obi. 139 Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya,ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba. 140 Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma,ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya. 141 Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya,ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya. 142 Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi.Iwu gị niile bụkwa eziokwu. 143 Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m,ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m. 144 Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi;nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ. 145 Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o ONYENWE ANYỊ,aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile. 146 Ana m akpọku gị; zọpụta maga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile. 147 Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka;olileanya m dị nʼokwu gị. 148 Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m,nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile. 149 Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị;chebe ndụ m, o ONYENWE ANYỊ, dịka iwu gị niile si dị. 150 Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nsoma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya. 151 Ma ị nọ nso, ONYENWE ANYỊ;ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu. 152 Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị,na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. 153 Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m,nʼihi na echefughị m iwu gị. 154 Kpepụta m, gbapụta m,chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị. 155 Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ,nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile. 156 O ONYENWE ANYỊ, ọmịiko gị dị ukwuu;chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị. 157 Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ,ma aga m anọgide na-edebe iwu gị. 158 Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi,nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi. 159 Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya;chebe ndụ m, o ONYENWE ANYỊ, dịka ịhụnanya gị si dị. 160 Okwu gị niile bụ eziokwu;iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 161 Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere,ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị. 162 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gịdịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. 163 Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ,ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. 164 Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị,nʼihi iwu gị ziri ezi. 165 Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu,ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ. 166 Ana m echere nzọpụta gị, o ONYENWE ANYỊ,na-agbasokwa iwu gị niile. 167 Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isinʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu. 168 Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi,nʼihi na ị maara ụzọ m niile. 169 Ka akwa m ruo gị ntị, o ONYENWE ANYỊ;nye m nghọta dịka okwu gị si dị. 170 Ka arịrịọ m ruo gị ntị;gbapụta m dịka nkwa gị si dị. 171 Ka ọnụ m jupụta nʼotuto,nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile. 172 Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị,nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. 173 Nọọ na njikere oge niile inyere m aka,nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile. 174 Ana m ele anya nzọpụta gị, o ONYENWE ANYỊ,iwu gị bụ ihe na-amasị m. 175 Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị,ka iwu gị niile gbaa m ume. 176 Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu,chọọ ohu gị,nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.

In Other Versions

Psalms 119 in the ANGEFD

Psalms 119 in the ANTPNG2D

Psalms 119 in the AS21

Psalms 119 in the BAGH

Psalms 119 in the BBPNG

Psalms 119 in the BBT1E

Psalms 119 in the BDS

Psalms 119 in the BEV

Psalms 119 in the BHAD

Psalms 119 in the BIB

Psalms 119 in the BLPT

Psalms 119 in the BNT

Psalms 119 in the BNTABOOT

Psalms 119 in the BNTLV

Psalms 119 in the BOATCB

Psalms 119 in the BOATCB2

Psalms 119 in the BOBCV

Psalms 119 in the BOCNT

Psalms 119 in the BOECS

Psalms 119 in the BOGWICC

Psalms 119 in the BOHCB

Psalms 119 in the BOHCV

Psalms 119 in the BOHLNT

Psalms 119 in the BOHNTLTAL

Psalms 119 in the BOILNTAP

Psalms 119 in the BOITCV

Psalms 119 in the BOKCV

Psalms 119 in the BOKCV2

Psalms 119 in the BOKHWOG

Psalms 119 in the BOKSSV

Psalms 119 in the BOLCB

Psalms 119 in the BOLCB2

Psalms 119 in the BOMCV

Psalms 119 in the BONAV

Psalms 119 in the BONCB

Psalms 119 in the BONLT

Psalms 119 in the BONUT2

Psalms 119 in the BOPLNT

Psalms 119 in the BOSCB

Psalms 119 in the BOSNC

Psalms 119 in the BOTLNT

Psalms 119 in the BOVCB

Psalms 119 in the BOYCB

Psalms 119 in the BPBB

Psalms 119 in the BPH

Psalms 119 in the BSB

Psalms 119 in the CCB

Psalms 119 in the CUV

Psalms 119 in the CUVS

Psalms 119 in the DBT

Psalms 119 in the DGDNT

Psalms 119 in the DHNT

Psalms 119 in the DNT

Psalms 119 in the ELBE

Psalms 119 in the EMTV

Psalms 119 in the ESV

Psalms 119 in the FBV

Psalms 119 in the FEB

Psalms 119 in the GGMNT

Psalms 119 in the GNT

Psalms 119 in the HARY

Psalms 119 in the HNT

Psalms 119 in the IRVA

Psalms 119 in the IRVB

Psalms 119 in the IRVG

Psalms 119 in the IRVH

Psalms 119 in the IRVK

Psalms 119 in the IRVM

Psalms 119 in the IRVM2

Psalms 119 in the IRVO

Psalms 119 in the IRVP

Psalms 119 in the IRVT

Psalms 119 in the IRVT2

Psalms 119 in the IRVU

Psalms 119 in the ISVN

Psalms 119 in the JSNT

Psalms 119 in the KAPI

Psalms 119 in the KBT1ETNIK

Psalms 119 in the KBV

Psalms 119 in the KJV

Psalms 119 in the KNFD

Psalms 119 in the LBA

Psalms 119 in the LBLA

Psalms 119 in the LNT

Psalms 119 in the LSV

Psalms 119 in the MAAL

Psalms 119 in the MBV

Psalms 119 in the MBV2

Psalms 119 in the MHNT

Psalms 119 in the MKNFD

Psalms 119 in the MNG

Psalms 119 in the MNT

Psalms 119 in the MNT2

Psalms 119 in the MRS1T

Psalms 119 in the NAA

Psalms 119 in the NASB

Psalms 119 in the NBLA

Psalms 119 in the NBS

Psalms 119 in the NBVTP

Psalms 119 in the NET2

Psalms 119 in the NIV11

Psalms 119 in the NNT

Psalms 119 in the NNT2

Psalms 119 in the NNT3

Psalms 119 in the PDDPT

Psalms 119 in the PFNT

Psalms 119 in the RMNT

Psalms 119 in the SBIAS

Psalms 119 in the SBIBS

Psalms 119 in the SBIBS2

Psalms 119 in the SBICS

Psalms 119 in the SBIDS

Psalms 119 in the SBIGS

Psalms 119 in the SBIHS

Psalms 119 in the SBIIS

Psalms 119 in the SBIIS2

Psalms 119 in the SBIIS3

Psalms 119 in the SBIKS

Psalms 119 in the SBIKS2

Psalms 119 in the SBIMS

Psalms 119 in the SBIOS

Psalms 119 in the SBIPS

Psalms 119 in the SBISS

Psalms 119 in the SBITS

Psalms 119 in the SBITS2

Psalms 119 in the SBITS3

Psalms 119 in the SBITS4

Psalms 119 in the SBIUS

Psalms 119 in the SBIVS

Psalms 119 in the SBT

Psalms 119 in the SBT1E

Psalms 119 in the SCHL

Psalms 119 in the SNT

Psalms 119 in the SUSU

Psalms 119 in the SUSU2

Psalms 119 in the SYNO

Psalms 119 in the TBIAOTANT

Psalms 119 in the TBT1E

Psalms 119 in the TBT1E2

Psalms 119 in the TFTIP

Psalms 119 in the TFTU

Psalms 119 in the TGNTATF3T

Psalms 119 in the THAI

Psalms 119 in the TNFD

Psalms 119 in the TNT

Psalms 119 in the TNTIK

Psalms 119 in the TNTIL

Psalms 119 in the TNTIN

Psalms 119 in the TNTIP

Psalms 119 in the TNTIZ

Psalms 119 in the TOMA

Psalms 119 in the TTENT

Psalms 119 in the UBG

Psalms 119 in the UGV

Psalms 119 in the UGV2

Psalms 119 in the UGV3

Psalms 119 in the VBL

Psalms 119 in the VDCC

Psalms 119 in the YALU

Psalms 119 in the YAPE

Psalms 119 in the YBVTP

Psalms 119 in the ZBP