Psalms 18 (BOICB)

undefined Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu ONYENWE ANYỊ. Ọ bụụrụ ONYENWE ANYỊ okwu niile nke abụ a mgbe ONYENWE ANYỊ napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị: 1 O ONYENWE ANYỊ, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m. 2 ONYENWE ANYỊ bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya. 3 Akpọkuru m ONYENWE ANYỊ, onye e kwesiri inye otuto,ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m. 4 Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ;ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m. 5 Ụdọ nke ili kere m gburugburu,ọnya nke ọnwụ guzogidere m. 6 Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m ONYENWE ANYỊ;etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka;akwa m rutekwara ya ntị,o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m. 7 Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji,ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji,ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. 8 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta,ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta;icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. 9 O kewara mbara eluigwe, rịdata;oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. 10 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,o feliri elu nʼelu nku nke ifufe. 11 O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe. 12 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojiiji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga. 13 ONYENWE ANYỊ sitere nʼeluigwe bigbọọ;olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda. 14 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa,o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha. 15 E kpughere ala ala nke oke osimiri,gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ,site nʼịba mba gị, O ONYENWE ANYỊ,na nkuume si gị nʼimi pụta. 16 O sitere nʼelu setịpụ aka ya,jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile. 17 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m. 18 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m,ma ONYENWE ANYỊ bụrụ m ihe ndabere. 19 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ. 20 ONYENWE ANYỊ mesoro m dịka ezi omume m si dị;ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị. 21 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke ONYENWE ANYỊ,ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ. 22 Iwu ya niile dị nʼihu m,esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m. 23 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,edebekwara m onwe m pụọ na mmehie. 24 ONYENWE ANYỊ kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya. 25 Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke. 26 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ. 27 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala. 28 Ọ bụ gị, ONYENWE ANYỊ, na-eme ka oriọna m na-enwu,Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. 29 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ,sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. 30 Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke,okwu ọnụ ONYENWE ANYỊ bụ ihe a nụchara anụcha;ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. 31 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị ONYENWE ANYỊ?Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị? 32 Ọ bụ Chineke na-enye m ike,na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. 33 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele;Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu. 34 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz. 35 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,aka nri gị na-akwagidekwa m,inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu. 36 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ,ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ. 37 Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha;alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi. 38 Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite.Ha dara nʼokpuru ụkwụ m. 39 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha,i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m. 40 I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ.Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị. 41 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.Ha kpọkuru ONYENWE ANYỊ, ma ọ zaghị ha. 42 Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu;a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ. 43 Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba;ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi. 44 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m. 45 Obi na-ada ha mba;ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta. 46 ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m!Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m. 47 Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ,onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m, 48 onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.I mere ka m dị elu karịa ndị iro,napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike. 49 Nʼihi nke a, ONYENWE ANYỊ, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche,aga m abụku aha gị abụ otuto. 50 Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu;Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada,nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

In Other Versions

Psalms 18 in the ANGEFD

Psalms 18 in the ANTPNG2D

Psalms 18 in the AS21

Psalms 18 in the BAGH

Psalms 18 in the BBPNG

Psalms 18 in the BBT1E

Psalms 18 in the BDS

Psalms 18 in the BEV

Psalms 18 in the BHAD

Psalms 18 in the BIB

Psalms 18 in the BLPT

Psalms 18 in the BNT

Psalms 18 in the BNTABOOT

Psalms 18 in the BNTLV

Psalms 18 in the BOATCB

Psalms 18 in the BOATCB2

Psalms 18 in the BOBCV

Psalms 18 in the BOCNT

Psalms 18 in the BOECS

Psalms 18 in the BOGWICC

Psalms 18 in the BOHCB

Psalms 18 in the BOHCV

Psalms 18 in the BOHLNT

Psalms 18 in the BOHNTLTAL

Psalms 18 in the BOILNTAP

Psalms 18 in the BOITCV

Psalms 18 in the BOKCV

Psalms 18 in the BOKCV2

Psalms 18 in the BOKHWOG

Psalms 18 in the BOKSSV

Psalms 18 in the BOLCB

Psalms 18 in the BOLCB2

Psalms 18 in the BOMCV

Psalms 18 in the BONAV

Psalms 18 in the BONCB

Psalms 18 in the BONLT

Psalms 18 in the BONUT2

Psalms 18 in the BOPLNT

Psalms 18 in the BOSCB

Psalms 18 in the BOSNC

Psalms 18 in the BOTLNT

Psalms 18 in the BOVCB

Psalms 18 in the BOYCB

Psalms 18 in the BPBB

Psalms 18 in the BPH

Psalms 18 in the BSB

Psalms 18 in the CCB

Psalms 18 in the CUV

Psalms 18 in the CUVS

Psalms 18 in the DBT

Psalms 18 in the DGDNT

Psalms 18 in the DHNT

Psalms 18 in the DNT

Psalms 18 in the ELBE

Psalms 18 in the EMTV

Psalms 18 in the ESV

Psalms 18 in the FBV

Psalms 18 in the FEB

Psalms 18 in the GGMNT

Psalms 18 in the GNT

Psalms 18 in the HARY

Psalms 18 in the HNT

Psalms 18 in the IRVA

Psalms 18 in the IRVB

Psalms 18 in the IRVG

Psalms 18 in the IRVH

Psalms 18 in the IRVK

Psalms 18 in the IRVM

Psalms 18 in the IRVM2

Psalms 18 in the IRVO

Psalms 18 in the IRVP

Psalms 18 in the IRVT

Psalms 18 in the IRVT2

Psalms 18 in the IRVU

Psalms 18 in the ISVN

Psalms 18 in the JSNT

Psalms 18 in the KAPI

Psalms 18 in the KBT1ETNIK

Psalms 18 in the KBV

Psalms 18 in the KJV

Psalms 18 in the KNFD

Psalms 18 in the LBA

Psalms 18 in the LBLA

Psalms 18 in the LNT

Psalms 18 in the LSV

Psalms 18 in the MAAL

Psalms 18 in the MBV

Psalms 18 in the MBV2

Psalms 18 in the MHNT

Psalms 18 in the MKNFD

Psalms 18 in the MNG

Psalms 18 in the MNT

Psalms 18 in the MNT2

Psalms 18 in the MRS1T

Psalms 18 in the NAA

Psalms 18 in the NASB

Psalms 18 in the NBLA

Psalms 18 in the NBS

Psalms 18 in the NBVTP

Psalms 18 in the NET2

Psalms 18 in the NIV11

Psalms 18 in the NNT

Psalms 18 in the NNT2

Psalms 18 in the NNT3

Psalms 18 in the PDDPT

Psalms 18 in the PFNT

Psalms 18 in the RMNT

Psalms 18 in the SBIAS

Psalms 18 in the SBIBS

Psalms 18 in the SBIBS2

Psalms 18 in the SBICS

Psalms 18 in the SBIDS

Psalms 18 in the SBIGS

Psalms 18 in the SBIHS

Psalms 18 in the SBIIS

Psalms 18 in the SBIIS2

Psalms 18 in the SBIIS3

Psalms 18 in the SBIKS

Psalms 18 in the SBIKS2

Psalms 18 in the SBIMS

Psalms 18 in the SBIOS

Psalms 18 in the SBIPS

Psalms 18 in the SBISS

Psalms 18 in the SBITS

Psalms 18 in the SBITS2

Psalms 18 in the SBITS3

Psalms 18 in the SBITS4

Psalms 18 in the SBIUS

Psalms 18 in the SBIVS

Psalms 18 in the SBT

Psalms 18 in the SBT1E

Psalms 18 in the SCHL

Psalms 18 in the SNT

Psalms 18 in the SUSU

Psalms 18 in the SUSU2

Psalms 18 in the SYNO

Psalms 18 in the TBIAOTANT

Psalms 18 in the TBT1E

Psalms 18 in the TBT1E2

Psalms 18 in the TFTIP

Psalms 18 in the TFTU

Psalms 18 in the TGNTATF3T

Psalms 18 in the THAI

Psalms 18 in the TNFD

Psalms 18 in the TNT

Psalms 18 in the TNTIK

Psalms 18 in the TNTIL

Psalms 18 in the TNTIN

Psalms 18 in the TNTIP

Psalms 18 in the TNTIZ

Psalms 18 in the TOMA

Psalms 18 in the TTENT

Psalms 18 in the UBG

Psalms 18 in the UGV

Psalms 18 in the UGV2

Psalms 18 in the UGV3

Psalms 18 in the VBL

Psalms 18 in the VDCC

Psalms 18 in the YALU

Psalms 18 in the YAPE

Psalms 18 in the YBVTP

Psalms 18 in the ZBP