Psalms 31 (BOICB)

undefined Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. 1 ONYENWE ANYỊ, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ;ekwela ka ihere mee m;site nʼezi omume gị gbapụta m. 2 Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m,bịa ngwangwa gbapụta m;ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m. 3 Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike,nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m. 4 Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m,nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike. 5 Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m;gbapụta m, o ONYENWE ANYỊ, Chineke, onye eziokwu. 6 Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru;ana m atụkwasị ONYENWE ANYỊ obi m. 7 Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị,nʼihi na ị hụrụ nsogbu mmarakwa ihe mgbu nke mmụọ m. 8 I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m,kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ. 9 O ONYENWE ANYỊ, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m.Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa;ike adịghịkwa m. 10 Iru ụjụ eriela m ahụ;ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m;ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa mruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m. 11 Nʼihi ndị iro m niile;ndị agbataobi m na-elelị m anya.Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m,ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee. 12 Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ.A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m. 13 Anụla m nkwulu ha megide m;oke egwu dị nʼakụkụ niile;ha na-agba izu megide m,na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m. 14 Ma ana m atụkwasị gị obi ONYENWE ANYỊ.Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.” 15 Oge m niile dị gị nʼaka.Napụta m nʼaka ndị iro mna nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ. 16 Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ;zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ. 17 O ONYENWE ANYỊ, ekwela ka ihere mee m,nʼihi na akpọkuola m gị;kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ,ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu. 18 Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam;nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelịka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume. 19 Lee ka ịdị mma gị si baa ụba,nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị,nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị,nʼihu ọha mmadụ. 20 I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gịpụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ;ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị;ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche. 21 Otuto dịrị ONYENWE ANYỊnʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuumgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu. 22 Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị,“Ewezugala m site nʼihu ya!”Ma ị nụrụ arịrịọ m maka eberemgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka. 23 Hụnụ ONYENWE ANYỊ nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi,nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya,ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu. 24 Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike,unu niile ndị olileanya ha dị nʼime ONYENWE ANYỊ.

In Other Versions

Psalms 31 in the ANGEFD

Psalms 31 in the ANTPNG2D

Psalms 31 in the AS21

Psalms 31 in the BAGH

Psalms 31 in the BBPNG

Psalms 31 in the BBT1E

Psalms 31 in the BDS

Psalms 31 in the BEV

Psalms 31 in the BHAD

Psalms 31 in the BIB

Psalms 31 in the BLPT

Psalms 31 in the BNT

Psalms 31 in the BNTABOOT

Psalms 31 in the BNTLV

Psalms 31 in the BOATCB

Psalms 31 in the BOATCB2

Psalms 31 in the BOBCV

Psalms 31 in the BOCNT

Psalms 31 in the BOECS

Psalms 31 in the BOGWICC

Psalms 31 in the BOHCB

Psalms 31 in the BOHCV

Psalms 31 in the BOHLNT

Psalms 31 in the BOHNTLTAL

Psalms 31 in the BOILNTAP

Psalms 31 in the BOITCV

Psalms 31 in the BOKCV

Psalms 31 in the BOKCV2

Psalms 31 in the BOKHWOG

Psalms 31 in the BOKSSV

Psalms 31 in the BOLCB

Psalms 31 in the BOLCB2

Psalms 31 in the BOMCV

Psalms 31 in the BONAV

Psalms 31 in the BONCB

Psalms 31 in the BONLT

Psalms 31 in the BONUT2

Psalms 31 in the BOPLNT

Psalms 31 in the BOSCB

Psalms 31 in the BOSNC

Psalms 31 in the BOTLNT

Psalms 31 in the BOVCB

Psalms 31 in the BOYCB

Psalms 31 in the BPBB

Psalms 31 in the BPH

Psalms 31 in the BSB

Psalms 31 in the CCB

Psalms 31 in the CUV

Psalms 31 in the CUVS

Psalms 31 in the DBT

Psalms 31 in the DGDNT

Psalms 31 in the DHNT

Psalms 31 in the DNT

Psalms 31 in the ELBE

Psalms 31 in the EMTV

Psalms 31 in the ESV

Psalms 31 in the FBV

Psalms 31 in the FEB

Psalms 31 in the GGMNT

Psalms 31 in the GNT

Psalms 31 in the HARY

Psalms 31 in the HNT

Psalms 31 in the IRVA

Psalms 31 in the IRVB

Psalms 31 in the IRVG

Psalms 31 in the IRVH

Psalms 31 in the IRVK

Psalms 31 in the IRVM

Psalms 31 in the IRVM2

Psalms 31 in the IRVO

Psalms 31 in the IRVP

Psalms 31 in the IRVT

Psalms 31 in the IRVT2

Psalms 31 in the IRVU

Psalms 31 in the ISVN

Psalms 31 in the JSNT

Psalms 31 in the KAPI

Psalms 31 in the KBT1ETNIK

Psalms 31 in the KBV

Psalms 31 in the KJV

Psalms 31 in the KNFD

Psalms 31 in the LBA

Psalms 31 in the LBLA

Psalms 31 in the LNT

Psalms 31 in the LSV

Psalms 31 in the MAAL

Psalms 31 in the MBV

Psalms 31 in the MBV2

Psalms 31 in the MHNT

Psalms 31 in the MKNFD

Psalms 31 in the MNG

Psalms 31 in the MNT

Psalms 31 in the MNT2

Psalms 31 in the MRS1T

Psalms 31 in the NAA

Psalms 31 in the NASB

Psalms 31 in the NBLA

Psalms 31 in the NBS

Psalms 31 in the NBVTP

Psalms 31 in the NET2

Psalms 31 in the NIV11

Psalms 31 in the NNT

Psalms 31 in the NNT2

Psalms 31 in the NNT3

Psalms 31 in the PDDPT

Psalms 31 in the PFNT

Psalms 31 in the RMNT

Psalms 31 in the SBIAS

Psalms 31 in the SBIBS

Psalms 31 in the SBIBS2

Psalms 31 in the SBICS

Psalms 31 in the SBIDS

Psalms 31 in the SBIGS

Psalms 31 in the SBIHS

Psalms 31 in the SBIIS

Psalms 31 in the SBIIS2

Psalms 31 in the SBIIS3

Psalms 31 in the SBIKS

Psalms 31 in the SBIKS2

Psalms 31 in the SBIMS

Psalms 31 in the SBIOS

Psalms 31 in the SBIPS

Psalms 31 in the SBISS

Psalms 31 in the SBITS

Psalms 31 in the SBITS2

Psalms 31 in the SBITS3

Psalms 31 in the SBITS4

Psalms 31 in the SBIUS

Psalms 31 in the SBIVS

Psalms 31 in the SBT

Psalms 31 in the SBT1E

Psalms 31 in the SCHL

Psalms 31 in the SNT

Psalms 31 in the SUSU

Psalms 31 in the SUSU2

Psalms 31 in the SYNO

Psalms 31 in the TBIAOTANT

Psalms 31 in the TBT1E

Psalms 31 in the TBT1E2

Psalms 31 in the TFTIP

Psalms 31 in the TFTU

Psalms 31 in the TGNTATF3T

Psalms 31 in the THAI

Psalms 31 in the TNFD

Psalms 31 in the TNT

Psalms 31 in the TNTIK

Psalms 31 in the TNTIL

Psalms 31 in the TNTIN

Psalms 31 in the TNTIP

Psalms 31 in the TNTIZ

Psalms 31 in the TOMA

Psalms 31 in the TTENT

Psalms 31 in the UBG

Psalms 31 in the UGV

Psalms 31 in the UGV2

Psalms 31 in the UGV3

Psalms 31 in the VBL

Psalms 31 in the VDCC

Psalms 31 in the YALU

Psalms 31 in the YAPE

Psalms 31 in the YBVTP

Psalms 31 in the ZBP