Psalms 47 (BOICB)
undefined Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. 1 Kụọnụ aka unu, unu mba niile;jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke. 2 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke kachasị ihe niile elu.Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile. 3 O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị;ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị. 4 Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị,ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela 5 Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. ONYENWE ANYỊ ewerela olu opi ike rigoo. 6 Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto;bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto. 7 Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile.Jirinụ abụ too ya. 8 Chineke bụ eze mba niile;ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile. 9 Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala,dịka ndị Chineke nke Ebraham,nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke;ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.