Revelation 14 (BOICB)
1 Elere m anya hụ Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo nʼugwu Zayọn. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya nʼegedege ihu ha. 2 Anụkwara m olu si nʼeluigwe na-ada dịka ụda mmiri si nʼime nkume na-asọpụta, maọbụ dịka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu m nụrụ dịka olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ. 3 Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ, ha na-abụ abụ ọhụrụ. Nke naanị ha bụ ndị a gbapụtara nʼụwa pụrụ ịmụta. 4 Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ. 5 Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a hụrụ nʼọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta. 6 Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe. O ji oziọma nke ebighị ebi ahụ nʼaka, nke ọ na-aga ikwusara mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile na mmadụ niile nọ nʼụwa. 7 O jiri oke olu kwuo sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na oge ikpe ya eruola. Kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri niile.” 8 Mgbe ahụ mmụọ ozi nke abụọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “ ‘Ọ daala! Ọ daala, bụ Babilọn obodo ukwu ahụ,’ bụ nke mere ka mba niile ṅụọ mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.” 9 Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọbụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ si nʼime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nʼegedege ihu maọbụ nʼaka ya, 10 ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. 11 Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya. 12 Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume nye ndị nsọ ya, bụ ndị nke Chineke na-erubere iwu ya isi, na-eguzosikwa ike nʼokwukwe ha nʼime Jisọs.” 13 Anụkwara m olu nke si nʼeluigwe daa na-asị, dee ihe a nʼakwụkwọ, “Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị nwụrụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.”“E, ha ga-ezu ike site na ndọgbu niile nke ha dọgburu onwe ha, nʼihi na ọrụ ha rụrụ ga-eso ha,” ka Mmụọ Nsọ na-ekwu. 14 Elere m anya hụ otu igwe ọcha, nke onye nọdụrụ na ya dịka nwa nke mmadụ. O kpu okpueze e jiri naanị ọlaedo mee, jirikwa mma iwe ihe ubi dị nkọ, nʼaka ya. 15 Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi sitere nʼụlọnsọ ukwu pụta, tikuo onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha sị, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nʼihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nʼụwa achaala nke ọma.” 16 Ya mere, onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼime ụwa, ghọta ihe dị nʼụwa dịka ihe ubi. 17 Mmụọ ozi ọzọ sitekwara nʼụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ. 18 Mmụọ ozi ọzọ, nke na-elekọta ọkụ sitekwara nʼebe ịchụ aja ahụ pụta, were olu ike gwa mmụọ ozi ahụ ji mma dị nkọ sị, “Were mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ bipụ osisi ụyọkọ mkpụrụ grepu site na vaịnị niile dị nʼụwa, nʼihi na ha niile achaala.” 19 Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼụwa, bipụsịa ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ahụ chịkọta ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha. 20 A zọchakwara mkpụrụ vaịnị ahụ nʼebe a na-azọcha mkpụrụ vaịnị nke dị nʼazụ obodo. Ọbara si nʼebe ahụ gbapụta dị elu ruo ihe dịka eriri e ji ekegide ịnyịnya nʼisi ime ka ọ gaa ebe achọrọ, ọ bụ ihe ruru narị kilomita atọ nʼogologo.
In Other Versions
Revelation 14 in the ANGEFD
Revelation 14 in the ANTPNG2D
Revelation 14 in the AS21
Revelation 14 in the BAGH
Revelation 14 in the BBPNG
Revelation 14 in the BBT1E
Revelation 14 in the BDS
Revelation 14 in the BEV
Revelation 14 in the BHAD
Revelation 14 in the BIB
Revelation 14 in the BLPT
Revelation 14 in the BNT
Revelation 14 in the BNTABOOT
Revelation 14 in the BNTLV
Revelation 14 in the BOATCB
Revelation 14 in the BOATCB2
Revelation 14 in the BOBCV
Revelation 14 in the BOCNT
Revelation 14 in the BOECS
Revelation 14 in the BOGWICC
Revelation 14 in the BOHCB
Revelation 14 in the BOHCV
Revelation 14 in the BOHLNT
Revelation 14 in the BOHNTLTAL
Revelation 14 in the BOILNTAP
Revelation 14 in the BOITCV
Revelation 14 in the BOKCV
Revelation 14 in the BOKCV2
Revelation 14 in the BOKHWOG
Revelation 14 in the BOKSSV
Revelation 14 in the BOLCB
Revelation 14 in the BOLCB2
Revelation 14 in the BOMCV
Revelation 14 in the BONAV
Revelation 14 in the BONCB
Revelation 14 in the BONLT
Revelation 14 in the BONUT2
Revelation 14 in the BOPLNT
Revelation 14 in the BOSCB
Revelation 14 in the BOSNC
Revelation 14 in the BOTLNT
Revelation 14 in the BOVCB
Revelation 14 in the BOYCB
Revelation 14 in the BPBB
Revelation 14 in the BPH
Revelation 14 in the BSB
Revelation 14 in the CCB
Revelation 14 in the CUV
Revelation 14 in the CUVS
Revelation 14 in the DBT
Revelation 14 in the DGDNT
Revelation 14 in the DHNT
Revelation 14 in the DNT
Revelation 14 in the ELBE
Revelation 14 in the EMTV
Revelation 14 in the ESV
Revelation 14 in the FBV
Revelation 14 in the FEB
Revelation 14 in the GGMNT
Revelation 14 in the GNT
Revelation 14 in the HARY
Revelation 14 in the HNT
Revelation 14 in the IRVA
Revelation 14 in the IRVB
Revelation 14 in the IRVG
Revelation 14 in the IRVH
Revelation 14 in the IRVK
Revelation 14 in the IRVM
Revelation 14 in the IRVM2
Revelation 14 in the IRVO
Revelation 14 in the IRVP
Revelation 14 in the IRVT
Revelation 14 in the IRVT2
Revelation 14 in the IRVU
Revelation 14 in the ISVN
Revelation 14 in the JSNT
Revelation 14 in the KAPI
Revelation 14 in the KBT1ETNIK
Revelation 14 in the KBV
Revelation 14 in the KJV
Revelation 14 in the KNFD
Revelation 14 in the LBA
Revelation 14 in the LBLA
Revelation 14 in the LNT
Revelation 14 in the LSV
Revelation 14 in the MAAL
Revelation 14 in the MBV
Revelation 14 in the MBV2
Revelation 14 in the MHNT
Revelation 14 in the MKNFD
Revelation 14 in the MNG
Revelation 14 in the MNT
Revelation 14 in the MNT2
Revelation 14 in the MRS1T
Revelation 14 in the NAA
Revelation 14 in the NASB
Revelation 14 in the NBLA
Revelation 14 in the NBS
Revelation 14 in the NBVTP
Revelation 14 in the NET2
Revelation 14 in the NIV11
Revelation 14 in the NNT
Revelation 14 in the NNT2
Revelation 14 in the NNT3
Revelation 14 in the PDDPT
Revelation 14 in the PFNT
Revelation 14 in the RMNT
Revelation 14 in the SBIAS
Revelation 14 in the SBIBS
Revelation 14 in the SBIBS2
Revelation 14 in the SBICS
Revelation 14 in the SBIDS
Revelation 14 in the SBIGS
Revelation 14 in the SBIHS
Revelation 14 in the SBIIS
Revelation 14 in the SBIIS2
Revelation 14 in the SBIIS3
Revelation 14 in the SBIKS
Revelation 14 in the SBIKS2
Revelation 14 in the SBIMS
Revelation 14 in the SBIOS
Revelation 14 in the SBIPS
Revelation 14 in the SBISS
Revelation 14 in the SBITS
Revelation 14 in the SBITS2
Revelation 14 in the SBITS3
Revelation 14 in the SBITS4
Revelation 14 in the SBIUS
Revelation 14 in the SBIVS
Revelation 14 in the SBT
Revelation 14 in the SBT1E
Revelation 14 in the SCHL
Revelation 14 in the SNT
Revelation 14 in the SUSU
Revelation 14 in the SUSU2
Revelation 14 in the SYNO
Revelation 14 in the TBIAOTANT
Revelation 14 in the TBT1E
Revelation 14 in the TBT1E2
Revelation 14 in the TFTIP
Revelation 14 in the TFTU
Revelation 14 in the TGNTATF3T
Revelation 14 in the THAI
Revelation 14 in the TNFD
Revelation 14 in the TNT
Revelation 14 in the TNTIK
Revelation 14 in the TNTIL
Revelation 14 in the TNTIN
Revelation 14 in the TNTIP
Revelation 14 in the TNTIZ
Revelation 14 in the TOMA
Revelation 14 in the TTENT
Revelation 14 in the UBG
Revelation 14 in the UGV
Revelation 14 in the UGV2
Revelation 14 in the UGV3
Revelation 14 in the VBL
Revelation 14 in the VDCC
Revelation 14 in the YALU
Revelation 14 in the YAPE
Revelation 14 in the YBVTP
Revelation 14 in the ZBP