Revelation 17 (BOICB)

1 Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ndị ahụ ji efere bịara sị m, “Bịa, aga m egosi gị ahụhụ ga-abịakwasị onye ahụ ụwa niile maara dịka akwụna, onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ọtụtụ mmiri nke ụwa. 2 Ndị eze ụwa esorola ya kwaa iko nʼotu ihe ndina, emeekwara ka ndị niile bi nʼụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.” 3 O duuru m nʼime mmụọ baa nʼọzara. Nʼebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nʼelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Aha ndị e dere anụ ọhịa ahụ nʼahụ bụ naanị okwu ikwulu Chineke. 4 Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara, gbarakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa na pieal kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nʼaka ya nke jupụtara nʼihe arụ na ihe ure niile o ji na-akwa iko ya. 5 Aha e dekwasịrị ya nʼegedege ihu bụ ihe omimi:Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn,nne ndị na-akwa ikona nke ihe arụ niile nke ụwa. 6 Ejikwa m anya m hụ na nwanyị ahụ aṅụjuola ọbara ndị nsọ afọ, ya na ọbara ndị ama Jisọs.Mgbe m hụrụ ya, ọ gbagwojuru m anya. 7 Ma mmụọ ozi ahụ sịrị m, “Gịnị mere ihe ị hụrụ ji ju gị anya? Aga m akọwara gị ihe omimi banyere nwanyị a na anụ ọhịa ahụ nke na-ebugharị ya, bụ nke nwere isi asaa na mpi iri. 8 Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ, nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị. Ma ọ ga-esi nʼolulu Abis ahụ pụta banye na mbibi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nʼime akwụkwọ ndụ ahụ site nʼoge e kere ụwa anya. Nʼihi na e nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị, ma ọ ga-emesi bịa. 9 “Nke a chọrọ uche nke nwere amamihe. Isi asaa ahụ nọchiri anya ugwu asaa ahụ nke nwanyị ahụ na-anọdụ nʼelu ha. Ha na-anọchikwa anya ndị eze asaa. 10 Ise nʼime ha adaala, otu ka nọ, nke ọzọ abịabeghị. Mgbe ọ bịara, ọ ga-anọ nwantakịrị oge. 11 Anụ ọhịa ahụ nke dịrịị ma ọ dịkwaghị, bụ onye nke asatọ, ọ bụ onye otu ndị eze asaa ahụ ma a lakwara ya nʼiyi. 12 “Mpi iri ahụ ị hụrụ nọchiri anya ndị eze iri na-anatabeghị alaeze. Ha na anụ ọhịa ahụ ga-anata ike ọchịchị dịka eze sọọsọ otu awa. 13 Ha ji otu obi na-enye anụ ọhịa ahụ ike ha na ịchị isi ha. 14 Ha ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ, ma Nwa Atụrụ ahụ ga-emeri ha nʼihi na ọ bụ Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile nakwa Eze kachasị ndị eze niile. Ndị so ya bụkwa ndị a kpọrọ, na ndị a họpụtara, ndị ya kwesikwara ntụkwasị obi.” 15 Mgbe ahụ ọ sịrị m, “Mmiri ndị ahụ ị hụrụ, ebe nwanyị akwụna ahụ nọ, bụ ndị mmadụ dị iche iche, igwe mmadụ, na mba dị iche iche na nʼasụsụ dị iche iche. 16 Anụ ọhịa ahụ na mpi iri ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwanyị akwụna ahụ asị. Ha ga-agba ya ọtọ, laakwa ya nʼiyi, ha ga-eri anụ ya, werekwa ọkụ rechapụ ya. 17 Chineke etinyela ya nʼobi ha imejupụta nzube ya site nʼinwe otu obi nakwa inyefe anụ ọhịa ahụ ikike ọchịchị alaeze ha, tutu ruo mgbe a ga-emezu okwu Chineke. 18 Ma nwanyị a ị hụrụ bụ obodo ukwu ahụ na-achị ndị eze niile nke ụwa.”

In Other Versions

Revelation 17 in the ANGEFD

Revelation 17 in the ANTPNG2D

Revelation 17 in the AS21

Revelation 17 in the BAGH

Revelation 17 in the BBPNG

Revelation 17 in the BBT1E

Revelation 17 in the BDS

Revelation 17 in the BEV

Revelation 17 in the BHAD

Revelation 17 in the BIB

Revelation 17 in the BLPT

Revelation 17 in the BNT

Revelation 17 in the BNTABOOT

Revelation 17 in the BNTLV

Revelation 17 in the BOATCB

Revelation 17 in the BOATCB2

Revelation 17 in the BOBCV

Revelation 17 in the BOCNT

Revelation 17 in the BOECS

Revelation 17 in the BOGWICC

Revelation 17 in the BOHCB

Revelation 17 in the BOHCV

Revelation 17 in the BOHLNT

Revelation 17 in the BOHNTLTAL

Revelation 17 in the BOILNTAP

Revelation 17 in the BOITCV

Revelation 17 in the BOKCV

Revelation 17 in the BOKCV2

Revelation 17 in the BOKHWOG

Revelation 17 in the BOKSSV

Revelation 17 in the BOLCB

Revelation 17 in the BOLCB2

Revelation 17 in the BOMCV

Revelation 17 in the BONAV

Revelation 17 in the BONCB

Revelation 17 in the BONLT

Revelation 17 in the BONUT2

Revelation 17 in the BOPLNT

Revelation 17 in the BOSCB

Revelation 17 in the BOSNC

Revelation 17 in the BOTLNT

Revelation 17 in the BOVCB

Revelation 17 in the BOYCB

Revelation 17 in the BPBB

Revelation 17 in the BPH

Revelation 17 in the BSB

Revelation 17 in the CCB

Revelation 17 in the CUV

Revelation 17 in the CUVS

Revelation 17 in the DBT

Revelation 17 in the DGDNT

Revelation 17 in the DHNT

Revelation 17 in the DNT

Revelation 17 in the ELBE

Revelation 17 in the EMTV

Revelation 17 in the ESV

Revelation 17 in the FBV

Revelation 17 in the FEB

Revelation 17 in the GGMNT

Revelation 17 in the GNT

Revelation 17 in the HARY

Revelation 17 in the HNT

Revelation 17 in the IRVA

Revelation 17 in the IRVB

Revelation 17 in the IRVG

Revelation 17 in the IRVH

Revelation 17 in the IRVK

Revelation 17 in the IRVM

Revelation 17 in the IRVM2

Revelation 17 in the IRVO

Revelation 17 in the IRVP

Revelation 17 in the IRVT

Revelation 17 in the IRVT2

Revelation 17 in the IRVU

Revelation 17 in the ISVN

Revelation 17 in the JSNT

Revelation 17 in the KAPI

Revelation 17 in the KBT1ETNIK

Revelation 17 in the KBV

Revelation 17 in the KJV

Revelation 17 in the KNFD

Revelation 17 in the LBA

Revelation 17 in the LBLA

Revelation 17 in the LNT

Revelation 17 in the LSV

Revelation 17 in the MAAL

Revelation 17 in the MBV

Revelation 17 in the MBV2

Revelation 17 in the MHNT

Revelation 17 in the MKNFD

Revelation 17 in the MNG

Revelation 17 in the MNT

Revelation 17 in the MNT2

Revelation 17 in the MRS1T

Revelation 17 in the NAA

Revelation 17 in the NASB

Revelation 17 in the NBLA

Revelation 17 in the NBS

Revelation 17 in the NBVTP

Revelation 17 in the NET2

Revelation 17 in the NIV11

Revelation 17 in the NNT

Revelation 17 in the NNT2

Revelation 17 in the NNT3

Revelation 17 in the PDDPT

Revelation 17 in the PFNT

Revelation 17 in the RMNT

Revelation 17 in the SBIAS

Revelation 17 in the SBIBS

Revelation 17 in the SBIBS2

Revelation 17 in the SBICS

Revelation 17 in the SBIDS

Revelation 17 in the SBIGS

Revelation 17 in the SBIHS

Revelation 17 in the SBIIS

Revelation 17 in the SBIIS2

Revelation 17 in the SBIIS3

Revelation 17 in the SBIKS

Revelation 17 in the SBIKS2

Revelation 17 in the SBIMS

Revelation 17 in the SBIOS

Revelation 17 in the SBIPS

Revelation 17 in the SBISS

Revelation 17 in the SBITS

Revelation 17 in the SBITS2

Revelation 17 in the SBITS3

Revelation 17 in the SBITS4

Revelation 17 in the SBIUS

Revelation 17 in the SBIVS

Revelation 17 in the SBT

Revelation 17 in the SBT1E

Revelation 17 in the SCHL

Revelation 17 in the SNT

Revelation 17 in the SUSU

Revelation 17 in the SUSU2

Revelation 17 in the SYNO

Revelation 17 in the TBIAOTANT

Revelation 17 in the TBT1E

Revelation 17 in the TBT1E2

Revelation 17 in the TFTIP

Revelation 17 in the TFTU

Revelation 17 in the TGNTATF3T

Revelation 17 in the THAI

Revelation 17 in the TNFD

Revelation 17 in the TNT

Revelation 17 in the TNTIK

Revelation 17 in the TNTIL

Revelation 17 in the TNTIN

Revelation 17 in the TNTIP

Revelation 17 in the TNTIZ

Revelation 17 in the TOMA

Revelation 17 in the TTENT

Revelation 17 in the UBG

Revelation 17 in the UGV

Revelation 17 in the UGV2

Revelation 17 in the UGV3

Revelation 17 in the VBL

Revelation 17 in the VDCC

Revelation 17 in the YALU

Revelation 17 in the YAPE

Revelation 17 in the YBVTP

Revelation 17 in the ZBP