Revelation 19 (BOICB)

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nʼeluigwe. Ha niile na-eti mkpu na-asị,“Haleluya!Nzọpụta, na ebube na ike niile dịrị Chineke anyị. 2 Nʼihi na ikpe ikpe ya niile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.Ọ kpeela nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe,onye ji ịkwa iko ya merụọ ụwa.Ọ bọọlara ọbọ ọbara ndị ohu ya nʼisi ya.” 3 Ọzọkwa, ha tiri mkpu,“Haleluya!Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.” 4 Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na anụ anọ ahụ dị ndụ dara nʼala nʼihu Chineke onye nọkwasịrị nʼelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị,“Amen, Haleluya!” 5 Otu olu sitekwara nʼocheeze ahụ na-asị,“Toonu Chineke anyị,unu ndị ohu ya niile,ndị ukwu na ndị nta,unu ndị na-atụ egwu ya.” 6 Mgbe ahụ, anụkwara m olu dara ka olu igwe mmadụ dịkwa ka ụzụ mmiri na-ekwo ekwo, dịkwa ka ụda egbe eluigwe dasiri ike na-asị,“Haleluya!Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile na-achị. 7 Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọkwaa anyị ụtọ.Ka anyị nye ya otuto.Nʼihi na ọlụlụ di na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ eruola,nwunye ya edoziekwala onwe ya. 8 E nyela ya ezi akwa ọcha nke na-enweghị ntụpọ ọbụla,na nke dị nnọọ ezi ọcha ka o yikwasị onwe ya.”(Ezi akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ezi omume nke ndị nsọ rụrụ.) 9 Mmụọ ozi ahụ gwara m sị, “Dee nke a: Ngọzị dịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nʼoriri ọlụlụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Nʼeziokwu, ndị a bụ okwu nke Chineke.” 10 Adara m nʼala nʼụkwụ ya ịkpọ isiala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesighị ka ị kpọọ isiala nye m nʼihi na abụ m naanị onyeozi ibe gị, na dịka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere Jisọs. Ọ bụ naanị Chineke ka i kwesiri ịkpọ isiala nye. Nʼihi na ọ bụ Mmụọ nke amụma na-agba ama ihe banyere Jisọs.” 11 Mgbe ahụ kwa, elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu ịnyịnya dị ọcha. Onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ onye a na-akpọ Onye kwesiri ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nʼụzọ ziri ezi na-ebukwa agha. 12 Anya ya na-acha dịka ire ọkụ. Ọtụtụ okpueze dịkwa ya nʼisi. Otu aha nke naanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nʼegedege ihu. 13 E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nʼọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke. 14 Usuu ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe ezi akwa ọcha, na-enweghị ntụpọ, nọ nʼelu ịnyịnya ọcha na-eso ya. 15 Ọ kpụ mma agha dị nkọ nʼọnụ ya, nke o ji egbutu mba niile. “Ọ ga-eji mkpara igwe achị ha.” Ọ na-azọchakwa mkpụrụ vaịnị nʼebe ịnara mmanya nke iwe ọkụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. 16 Otu aha ka e dere nʼelu uwe ya na nʼelu apata ya:Eze kachasị ndị eze niile, na Onyenwe kachasị ndị nwenụ niile. 17 Mgbe ahụ, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nʼime anyanwụ na-eti mkpu nʼoke olu, na-akpọku ụmụ nnụnụ niile na-efe nʼetiti mbara eluigwe, “Bịanụ! Zukọọnụ maka oke oriri nke Chineke. 18 Bịanụ soro rie anụ ahụ ndị eze, na ndị ọchịagha, na ndịisi agha. Sorokwanụ rie anụ ahụ ịnyịnya na anụ ahụ ndị nọkwasịrị nʼelu ha. Riekwanụ anụ ahụ ndị mmadụ, ndị ukwu na ndị nta, ndị ohu na ndị nweere onwe ha.” 19 Mgbe ahụ, ahụrụ m anụ ọhịa ọjọọ ahụ ya na ndị eze niile dị nʼụwa, na ndị agha ha, ka ha zukọtara ibu agha megide onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ahụ na ndị agha ya. 20 Ma e jidere anụ ọhịa ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ onye nke nọọrọ nʼihu ya gosi ihe ịrịbama nke o jiri duhie ndị niile natara akara nke anụ ọhịa ahụ, ya na ndị kpọọrọ ihe oyiyi ya isiala. A tụnyere anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ya na ndụ nʼime ọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. 21 Ndị agha ha fọdụrụnụ ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nʼọnụ onye ahụ nọ nʼelu ịnyịnya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe rikwara ozu ha.

In Other Versions

Revelation 19 in the ANGEFD

Revelation 19 in the ANTPNG2D

Revelation 19 in the AS21

Revelation 19 in the BAGH

Revelation 19 in the BBPNG

Revelation 19 in the BBT1E

Revelation 19 in the BDS

Revelation 19 in the BEV

Revelation 19 in the BHAD

Revelation 19 in the BIB

Revelation 19 in the BLPT

Revelation 19 in the BNT

Revelation 19 in the BNTABOOT

Revelation 19 in the BNTLV

Revelation 19 in the BOATCB

Revelation 19 in the BOATCB2

Revelation 19 in the BOBCV

Revelation 19 in the BOCNT

Revelation 19 in the BOECS

Revelation 19 in the BOGWICC

Revelation 19 in the BOHCB

Revelation 19 in the BOHCV

Revelation 19 in the BOHLNT

Revelation 19 in the BOHNTLTAL

Revelation 19 in the BOILNTAP

Revelation 19 in the BOITCV

Revelation 19 in the BOKCV

Revelation 19 in the BOKCV2

Revelation 19 in the BOKHWOG

Revelation 19 in the BOKSSV

Revelation 19 in the BOLCB

Revelation 19 in the BOLCB2

Revelation 19 in the BOMCV

Revelation 19 in the BONAV

Revelation 19 in the BONCB

Revelation 19 in the BONLT

Revelation 19 in the BONUT2

Revelation 19 in the BOPLNT

Revelation 19 in the BOSCB

Revelation 19 in the BOSNC

Revelation 19 in the BOTLNT

Revelation 19 in the BOVCB

Revelation 19 in the BOYCB

Revelation 19 in the BPBB

Revelation 19 in the BPH

Revelation 19 in the BSB

Revelation 19 in the CCB

Revelation 19 in the CUV

Revelation 19 in the CUVS

Revelation 19 in the DBT

Revelation 19 in the DGDNT

Revelation 19 in the DHNT

Revelation 19 in the DNT

Revelation 19 in the ELBE

Revelation 19 in the EMTV

Revelation 19 in the ESV

Revelation 19 in the FBV

Revelation 19 in the FEB

Revelation 19 in the GGMNT

Revelation 19 in the GNT

Revelation 19 in the HARY

Revelation 19 in the HNT

Revelation 19 in the IRVA

Revelation 19 in the IRVB

Revelation 19 in the IRVG

Revelation 19 in the IRVH

Revelation 19 in the IRVK

Revelation 19 in the IRVM

Revelation 19 in the IRVM2

Revelation 19 in the IRVO

Revelation 19 in the IRVP

Revelation 19 in the IRVT

Revelation 19 in the IRVT2

Revelation 19 in the IRVU

Revelation 19 in the ISVN

Revelation 19 in the JSNT

Revelation 19 in the KAPI

Revelation 19 in the KBT1ETNIK

Revelation 19 in the KBV

Revelation 19 in the KJV

Revelation 19 in the KNFD

Revelation 19 in the LBA

Revelation 19 in the LBLA

Revelation 19 in the LNT

Revelation 19 in the LSV

Revelation 19 in the MAAL

Revelation 19 in the MBV

Revelation 19 in the MBV2

Revelation 19 in the MHNT

Revelation 19 in the MKNFD

Revelation 19 in the MNG

Revelation 19 in the MNT

Revelation 19 in the MNT2

Revelation 19 in the MRS1T

Revelation 19 in the NAA

Revelation 19 in the NASB

Revelation 19 in the NBLA

Revelation 19 in the NBS

Revelation 19 in the NBVTP

Revelation 19 in the NET2

Revelation 19 in the NIV11

Revelation 19 in the NNT

Revelation 19 in the NNT2

Revelation 19 in the NNT3

Revelation 19 in the PDDPT

Revelation 19 in the PFNT

Revelation 19 in the RMNT

Revelation 19 in the SBIAS

Revelation 19 in the SBIBS

Revelation 19 in the SBIBS2

Revelation 19 in the SBICS

Revelation 19 in the SBIDS

Revelation 19 in the SBIGS

Revelation 19 in the SBIHS

Revelation 19 in the SBIIS

Revelation 19 in the SBIIS2

Revelation 19 in the SBIIS3

Revelation 19 in the SBIKS

Revelation 19 in the SBIKS2

Revelation 19 in the SBIMS

Revelation 19 in the SBIOS

Revelation 19 in the SBIPS

Revelation 19 in the SBISS

Revelation 19 in the SBITS

Revelation 19 in the SBITS2

Revelation 19 in the SBITS3

Revelation 19 in the SBITS4

Revelation 19 in the SBIUS

Revelation 19 in the SBIVS

Revelation 19 in the SBT

Revelation 19 in the SBT1E

Revelation 19 in the SCHL

Revelation 19 in the SNT

Revelation 19 in the SUSU

Revelation 19 in the SUSU2

Revelation 19 in the SYNO

Revelation 19 in the TBIAOTANT

Revelation 19 in the TBT1E

Revelation 19 in the TBT1E2

Revelation 19 in the TFTIP

Revelation 19 in the TFTU

Revelation 19 in the TGNTATF3T

Revelation 19 in the THAI

Revelation 19 in the TNFD

Revelation 19 in the TNT

Revelation 19 in the TNTIK

Revelation 19 in the TNTIL

Revelation 19 in the TNTIN

Revelation 19 in the TNTIP

Revelation 19 in the TNTIZ

Revelation 19 in the TOMA

Revelation 19 in the TTENT

Revelation 19 in the UBG

Revelation 19 in the UGV

Revelation 19 in the UGV2

Revelation 19 in the UGV3

Revelation 19 in the VBL

Revelation 19 in the VDCC

Revelation 19 in the YALU

Revelation 19 in the YAPE

Revelation 19 in the YBVTP

Revelation 19 in the ZBP