Romans 10 (BOICB)
1 Ụmụnna m, ihe na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwu na ekpere m na-ekpe nye Chineke bụ ịhụ na a zọpụtara ha. 2 Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nʼobi nke ukwuu. Kama ịnụ ọkụ nʼobi ha abụghị site na mmazu Chineke. 3 Ebe ha na-amaghị ezi omume nke si na Chineke bịa kama ha chọrọ ihiwe nke onwe ha, ha ewedaghị onwe ha nʼokpuru ezi omume nke Chineke. 4 Kraịst bụ ọgwụgwụ iwu. Ya mere, ezi omume ga-adịrị onye ọbụla nke kwere. 5 Mosis si otu a dee banyere ezi omume nke sitere nʼiwu, “Onye ọbụla na-eme ihe ndị a ga-adị ndụ site na ha.” 6 Ma ezi omume ahụ nke sitere nʼokwukwe na-asị, “Asịla nʼime obi gị, ‘onye ga-arịgo nʼime eluigwe?’ ” (nke bụ, ikudata Kraịst) 7 “maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’ ” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). 8 Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ nọ gị nso, ọ dị nʼọnụ gị dịrịkwa nʼobi gị,” ọ bụ ya, bụ okwu okwukwe ahụ anyị na-ekwusa. 9 Ma ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta, na “Jisọs bụ Onyenwe anyị,” kwerekwa nʼime obi gị na Chineke kpọlitere ya site nʼọnwụ, a ga-azọpụta gị. 10 Nʼihi na ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kwere; a gụọ gị nʼonye ezi omume, ọ bụkwa ọnụ gị ka ị ga-eji kwupụta, a zọpụta gị. 11 Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.” 12 Nʼihi na o nweghị ihe dị iche nʼetiti onye Juu na onye mba ọzọ, otu Onyenwe anyị ahụ bụ Onye nwe mmadụ niile, ọ na-agọzibigakwa ndị na-akpọku ya oke. 13 Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.” 14 Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esikwa kwere nʼonye ahụ ha anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị? 15 Oleekwanụ otu ha ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ha? Dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, sị, “Lee, ka ha si maa mma bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma.” 16 Ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara oziọma ahụ. Nʼihi na Aịzaya kwuru, “Onyenwe anyị, onye kweere ozi anyị?” 17 Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nʼige ntị nʼoziọma a ka mmadụ ji enweta okwukwe, oziọma ahụ a na-anụ bụ site nʼokwu Kraịst. 18 Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie.“Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo,okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.” 19 Ọzọkwa, ana m ajụ, ọ bụ na Izrel aghọtaghị? Na mbụ, Mosis sịrị,“Aga m esite na ndị na-abụghị mba kpalie mmụọ ekworo nʼime unu;aga m esitekwa nʼobodo na-enweghị nghọta kpasuo unu iwe.” 20 Ma Aịzaya jiri nkwuwa okwu sị,“Ndị chọtara m bụ ndị na-adịghị ajụ ase m,ekpugheere m onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.” 21 O kwuru banyere ndị Izrel,“Agbasara m aka m ogologo ụbọchị niilenye ndị nnupu isi na ndị na-ekwesị olu ike.”
In Other Versions
Romans 10 in the ANGEFD
Romans 10 in the ANTPNG2D
Romans 10 in the AS21
Romans 10 in the BAGH
Romans 10 in the BBPNG
Romans 10 in the BBT1E
Romans 10 in the BDS
Romans 10 in the BEV
Romans 10 in the BHAD
Romans 10 in the BIB
Romans 10 in the BLPT
Romans 10 in the BNT
Romans 10 in the BNTABOOT
Romans 10 in the BNTLV
Romans 10 in the BOATCB
Romans 10 in the BOATCB2
Romans 10 in the BOBCV
Romans 10 in the BOCNT
Romans 10 in the BOECS
Romans 10 in the BOGWICC
Romans 10 in the BOHCB
Romans 10 in the BOHCV
Romans 10 in the BOHLNT
Romans 10 in the BOHNTLTAL
Romans 10 in the BOILNTAP
Romans 10 in the BOITCV
Romans 10 in the BOKCV
Romans 10 in the BOKCV2
Romans 10 in the BOKHWOG
Romans 10 in the BOKSSV
Romans 10 in the BOLCB
Romans 10 in the BOLCB2
Romans 10 in the BOMCV
Romans 10 in the BONAV
Romans 10 in the BONCB
Romans 10 in the BONLT
Romans 10 in the BONUT2
Romans 10 in the BOPLNT
Romans 10 in the BOSCB
Romans 10 in the BOSNC
Romans 10 in the BOTLNT
Romans 10 in the BOVCB
Romans 10 in the BOYCB
Romans 10 in the BPBB
Romans 10 in the BPH
Romans 10 in the BSB
Romans 10 in the CCB
Romans 10 in the CUV
Romans 10 in the CUVS
Romans 10 in the DBT
Romans 10 in the DGDNT
Romans 10 in the DHNT
Romans 10 in the DNT
Romans 10 in the ELBE
Romans 10 in the EMTV
Romans 10 in the ESV
Romans 10 in the FBV
Romans 10 in the FEB
Romans 10 in the GGMNT
Romans 10 in the GNT
Romans 10 in the HARY
Romans 10 in the HNT
Romans 10 in the IRVA
Romans 10 in the IRVB
Romans 10 in the IRVG
Romans 10 in the IRVH
Romans 10 in the IRVK
Romans 10 in the IRVM
Romans 10 in the IRVM2
Romans 10 in the IRVO
Romans 10 in the IRVP
Romans 10 in the IRVT
Romans 10 in the IRVT2
Romans 10 in the IRVU
Romans 10 in the ISVN
Romans 10 in the JSNT
Romans 10 in the KAPI
Romans 10 in the KBT1ETNIK
Romans 10 in the KBV
Romans 10 in the KJV
Romans 10 in the KNFD
Romans 10 in the LBA
Romans 10 in the LBLA
Romans 10 in the LNT
Romans 10 in the LSV
Romans 10 in the MAAL
Romans 10 in the MBV
Romans 10 in the MBV2
Romans 10 in the MHNT
Romans 10 in the MKNFD
Romans 10 in the MNG
Romans 10 in the MNT
Romans 10 in the MNT2
Romans 10 in the MRS1T
Romans 10 in the NAA
Romans 10 in the NASB
Romans 10 in the NBLA
Romans 10 in the NBS
Romans 10 in the NBVTP
Romans 10 in the NET2
Romans 10 in the NIV11
Romans 10 in the NNT
Romans 10 in the NNT2
Romans 10 in the NNT3
Romans 10 in the PDDPT
Romans 10 in the PFNT
Romans 10 in the RMNT
Romans 10 in the SBIAS
Romans 10 in the SBIBS
Romans 10 in the SBIBS2
Romans 10 in the SBICS
Romans 10 in the SBIDS
Romans 10 in the SBIGS
Romans 10 in the SBIHS
Romans 10 in the SBIIS
Romans 10 in the SBIIS2
Romans 10 in the SBIIS3
Romans 10 in the SBIKS
Romans 10 in the SBIKS2
Romans 10 in the SBIMS
Romans 10 in the SBIOS
Romans 10 in the SBIPS
Romans 10 in the SBISS
Romans 10 in the SBITS
Romans 10 in the SBITS2
Romans 10 in the SBITS3
Romans 10 in the SBITS4
Romans 10 in the SBIUS
Romans 10 in the SBIVS
Romans 10 in the SBT
Romans 10 in the SBT1E
Romans 10 in the SCHL
Romans 10 in the SNT
Romans 10 in the SUSU
Romans 10 in the SUSU2
Romans 10 in the SYNO
Romans 10 in the TBIAOTANT
Romans 10 in the TBT1E
Romans 10 in the TBT1E2
Romans 10 in the TFTIP
Romans 10 in the TFTU
Romans 10 in the TGNTATF3T
Romans 10 in the THAI
Romans 10 in the TNFD
Romans 10 in the TNT
Romans 10 in the TNTIK
Romans 10 in the TNTIL
Romans 10 in the TNTIN
Romans 10 in the TNTIP
Romans 10 in the TNTIZ
Romans 10 in the TOMA
Romans 10 in the TTENT
Romans 10 in the UBG
Romans 10 in the UGV
Romans 10 in the UGV2
Romans 10 in the UGV3
Romans 10 in the VBL
Romans 10 in the VDCC
Romans 10 in the YALU
Romans 10 in the YAPE
Romans 10 in the YBVTP
Romans 10 in the ZBP