Ruth 1 (BOICB)

1 Nʼoge ndị ahụ, mgbe ndị ikpe na-achị, oke ụnwụ dara nʼala Izrel. Nʼihi ụnwụ a, otu nwoke, onye Betlehem, obodo dị na Juda, kwakọọrọ ihe ya niile, duru nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom abụọ, hapụ obodo ya gaa biri dịka ọbịa nʼala Moab. 2 Aha nwoke a bụ Elimelek. Aha nwunye ya bụ Naomi, ma aha ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ Mahlọn na Kilịọn. Ha bụ ndị Efrat si Betlehem nke dị na Juda. Ha bịarutere nʼala Moab biri nʼebe ahụ. 3 Ma Elimelek di Naomi nwụrụ, hapụ naanị Naomi, na ụmụ ya ndị ikom abụọ. 4 Ha lụrụ ndị nwunye site nʼetiti ndị inyom Moab. Aha nke mbụ bụ Ọpa, ebe aha nke abụọ bụ Rut. Ha biri nʼebe ahụ ihe dị ka afọ iri. 5 Mahlọn na Kilịọn mechara nwụọ. Ya mere, Naomi ghọrọ onye gba aka di, na onye gba aka ụmụ. 6 Mgbe Naomi nọ nʼala Moab nụ na ONYENWE ANYỊ eletala ndị Izrel site nʼinye ha ihe oriri, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ kwadoro ịlaghachi azụ nʼala Izrel. 7 Ya mere, Naomi na ndị nwunye ụmụ ya abụọ hapụrụ ala Moab ebe ha bi kemgbe, malite ịgbaso ụzọ ha ga-esi laghachi nʼala Juda. 8 Mgbe ahụ, Naomi gwara ndị nwunye ụmụ ya abụọ okwu sị ha, “Ngwa, onye ọbụla nʼime unu laghachi nʼụlọ nne ya. Ka ONYENWE ANYỊ gosi unu obiọma dịka unu si gosi mụ onwe m, na ndị unu nwụrụ anwụ. 9 Ka ONYENWE ANYỊ nyekwa unu di ọzọ ma meekwa ka unu chọta udo nʼezinaụlọ ọzọ.”Mgbe ahụ Naomi suturu ha ọnụ, ha niile kwara akwa. 10 Ma Ọpa na Rut zara Naomi sị ya, “E, anyị agaghị ala. Anyị ga-esoro gị laghachikwuru ndị gị.” 11 Naomi zara sị ha, “Laghachinụ ụmụ m, ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ga-eji soro m laa? E nwere m ike ịmụta ụmụ ndị ikom ọzọ ndị ga-abụ di unu? 12 Laghachinụ azụ ụmụ m. Emeela m agadi ịlụ di ọzọ. A sịkwarị na olileanya fọdụụrụ m ịlụ di na ịmụta ụmụ ndị ikom nʼabalị taa, 13 unu ga-echere ruo mgbe ha tolitere? Unu ga-anọ na-alụghị di ọzọ? Mba, ụmụ m ndị inyom, ọnọdụ m dị ilu karịa nke unu, nʼihi na ONYENWE ANYỊ esepụtala aka ya imegide m.” 14 Ha welitere olu ha kwaa akwa ọzọ. Mgbe ahụ Ọpa suturu nne di ya ọnụ ma Rut kwusịrị ike nʼebe ọ nọ. 15 Ma Naomi gwara ya sị, “Lee, nwunye nwanne di gị alaghachikwurula ndị nwe ya na chi ya niile, soro ya laa.” 16 Ma Rut zara, “Akwagidela m ka m hapụ gị, maọbụ ime ka m site nʼiso gị chigharịa. Aga m esoro gị gaa ebe ọbụla ị na-aga. Aga m esokwa gị biri nʼebe ọbụla ị ga-ebi; ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m, 17 ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ, ebe ahụ kwa ka a ga-eli m. Ka ONYENWE ANYỊ mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ekwere ka ihe ọzọ, ma ọ bụghị ọnwụ, kewaa mụ na gị.” 18 Mgbe Naomi hụrụ na Rut ekpebiela nʼime onwe ya iso ya, ọ kwụsịrị ịgwa ya okwu ọzọ. 19 Ya mere, ha abụọ gagidere ije rute Betlehem. Mgbe ha batara Betlehem, obodo ahụ mere mkpọtụ, nʼihi nlọta ha. Ndị inyom jụrụ sị, “Ọ bụ Naomi bụ nke a nʼezie?” 20 Ma Naomi zara ha sị, “Unu akpọkwala m Naomi, kama kpọọnụ m Mara, nʼihi na Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka ndụ m jupụta nʼihe ilu. 21 Aka m juru eju mgbe m si nʼebe a pụọ, ma ONYENWE ANYỊ emeela ka m gbara aka lọta. Gịnị mere unu ji akpọ m Naomi ebe ọ bụ na ONYENWE ANYỊ gbakụtara m azụ, ebe ọ bụ na Onye pụrụ ime ihe niile mere ka nsogbu dakwasị m.” 22 Otu a ka Naomi na Rut onye Moab bụ nwunye nwa ya si laghachi nʼala Juda. Oge ha ji lọbata nʼobodo Betlehem bụ oge a na-amalite ịghọ ọka balị.

In Other Versions

Ruth 1 in the ANGEFD

Ruth 1 in the ANTPNG2D

Ruth 1 in the AS21

Ruth 1 in the BAGH

Ruth 1 in the BBPNG

Ruth 1 in the BBT1E

Ruth 1 in the BDS

Ruth 1 in the BEV

Ruth 1 in the BHAD

Ruth 1 in the BIB

Ruth 1 in the BLPT

Ruth 1 in the BNT

Ruth 1 in the BNTABOOT

Ruth 1 in the BNTLV

Ruth 1 in the BOATCB

Ruth 1 in the BOATCB2

Ruth 1 in the BOBCV

Ruth 1 in the BOCNT

Ruth 1 in the BOECS

Ruth 1 in the BOGWICC

Ruth 1 in the BOHCB

Ruth 1 in the BOHCV

Ruth 1 in the BOHLNT

Ruth 1 in the BOHNTLTAL

Ruth 1 in the BOILNTAP

Ruth 1 in the BOITCV

Ruth 1 in the BOKCV

Ruth 1 in the BOKCV2

Ruth 1 in the BOKHWOG

Ruth 1 in the BOKSSV

Ruth 1 in the BOLCB

Ruth 1 in the BOLCB2

Ruth 1 in the BOMCV

Ruth 1 in the BONAV

Ruth 1 in the BONCB

Ruth 1 in the BONLT

Ruth 1 in the BONUT2

Ruth 1 in the BOPLNT

Ruth 1 in the BOSCB

Ruth 1 in the BOSNC

Ruth 1 in the BOTLNT

Ruth 1 in the BOVCB

Ruth 1 in the BOYCB

Ruth 1 in the BPBB

Ruth 1 in the BPH

Ruth 1 in the BSB

Ruth 1 in the CCB

Ruth 1 in the CUV

Ruth 1 in the CUVS

Ruth 1 in the DBT

Ruth 1 in the DGDNT

Ruth 1 in the DHNT

Ruth 1 in the DNT

Ruth 1 in the ELBE

Ruth 1 in the EMTV

Ruth 1 in the ESV

Ruth 1 in the FBV

Ruth 1 in the FEB

Ruth 1 in the GGMNT

Ruth 1 in the GNT

Ruth 1 in the HARY

Ruth 1 in the HNT

Ruth 1 in the IRVA

Ruth 1 in the IRVB

Ruth 1 in the IRVG

Ruth 1 in the IRVH

Ruth 1 in the IRVK

Ruth 1 in the IRVM

Ruth 1 in the IRVM2

Ruth 1 in the IRVO

Ruth 1 in the IRVP

Ruth 1 in the IRVT

Ruth 1 in the IRVT2

Ruth 1 in the IRVU

Ruth 1 in the ISVN

Ruth 1 in the JSNT

Ruth 1 in the KAPI

Ruth 1 in the KBT1ETNIK

Ruth 1 in the KBV

Ruth 1 in the KJV

Ruth 1 in the KNFD

Ruth 1 in the LBA

Ruth 1 in the LBLA

Ruth 1 in the LNT

Ruth 1 in the LSV

Ruth 1 in the MAAL

Ruth 1 in the MBV

Ruth 1 in the MBV2

Ruth 1 in the MHNT

Ruth 1 in the MKNFD

Ruth 1 in the MNG

Ruth 1 in the MNT

Ruth 1 in the MNT2

Ruth 1 in the MRS1T

Ruth 1 in the NAA

Ruth 1 in the NASB

Ruth 1 in the NBLA

Ruth 1 in the NBS

Ruth 1 in the NBVTP

Ruth 1 in the NET2

Ruth 1 in the NIV11

Ruth 1 in the NNT

Ruth 1 in the NNT2

Ruth 1 in the NNT3

Ruth 1 in the PDDPT

Ruth 1 in the PFNT

Ruth 1 in the RMNT

Ruth 1 in the SBIAS

Ruth 1 in the SBIBS

Ruth 1 in the SBIBS2

Ruth 1 in the SBICS

Ruth 1 in the SBIDS

Ruth 1 in the SBIGS

Ruth 1 in the SBIHS

Ruth 1 in the SBIIS

Ruth 1 in the SBIIS2

Ruth 1 in the SBIIS3

Ruth 1 in the SBIKS

Ruth 1 in the SBIKS2

Ruth 1 in the SBIMS

Ruth 1 in the SBIOS

Ruth 1 in the SBIPS

Ruth 1 in the SBISS

Ruth 1 in the SBITS

Ruth 1 in the SBITS2

Ruth 1 in the SBITS3

Ruth 1 in the SBITS4

Ruth 1 in the SBIUS

Ruth 1 in the SBIVS

Ruth 1 in the SBT

Ruth 1 in the SBT1E

Ruth 1 in the SCHL

Ruth 1 in the SNT

Ruth 1 in the SUSU

Ruth 1 in the SUSU2

Ruth 1 in the SYNO

Ruth 1 in the TBIAOTANT

Ruth 1 in the TBT1E

Ruth 1 in the TBT1E2

Ruth 1 in the TFTIP

Ruth 1 in the TFTU

Ruth 1 in the TGNTATF3T

Ruth 1 in the THAI

Ruth 1 in the TNFD

Ruth 1 in the TNT

Ruth 1 in the TNTIK

Ruth 1 in the TNTIL

Ruth 1 in the TNTIN

Ruth 1 in the TNTIP

Ruth 1 in the TNTIZ

Ruth 1 in the TOMA

Ruth 1 in the TTENT

Ruth 1 in the UBG

Ruth 1 in the UGV

Ruth 1 in the UGV2

Ruth 1 in the UGV3

Ruth 1 in the VBL

Ruth 1 in the VDCC

Ruth 1 in the YALU

Ruth 1 in the YAPE

Ruth 1 in the YBVTP

Ruth 1 in the ZBP