Zechariah 8 (BOICB)

1 Okwu ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị, 2 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “Ana m ekwo ekworo dị ukwuu nʼihi Zayọn. Nʼezie, ekworo ahụ na-anụ m ọkụ dị ukwuu nʼahụ.” 3 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, “Aga m alọghachi na Zayọn, bịa biri na Jerusalem. Mgbe ahụ, a ga-akpọ Jerusalem, obodo Eziokwu. A ga-akpọkwa ugwu ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile Ugwu Nsọ.” 4 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Agadi ndị ikom na agadi ndị inyom ga-anọdụkwa ala ọzọ na mbara ụzọ niile nke Jerusalem, onye ọbụla ga-ejidekwa mkpara nʼaka ya nʼihi ọnụọgụgụ afọ ha gbara. 5 Okporoụzọ nke obodo ahụ niile ga-ejupụtakwa nʼụmụntakịrị ndị nwoke na ndị nwanyị na-egwugharị egwu na ama ebe ahụ.” 6 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “O nwere ike bụrụ na ihe ndị a ga-adị ka ihe dịkarịrị ike imezu nʼanya ndị ahụ ga-afọdụ nʼoge ahụ, ma ọ ga-abụ ihe dịkarịrị ike ime nʼanya m?” Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 7 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m azọpụta ndị m site na mba niile dị nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ. 8 Aga m akpọghachitekwa ha, mee ka ha biri na Jerusalem. Ha ga-abụkwa ndị m, mụ onwe m ga-abụ Chineke ha, onye ezi omume na onye kwesiri ntụkwasị obi.” 9 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “Ka aka unu sie ike, ka enwe ike wuo ụlọnsọ a, unu ndị na-anụ ugbu a otu okwu ahụ, nke ndị amụma kwuru mgbe a tọrọ ntọala iwugharị ụlọnsọ m, bụ ụlọ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile. 10 Tupu ụbọchị ahụ, akwụbeghị ma ndị mmadụ ma ụmụ anụmanụ ụgwọ ọrụ ha. Ọ dịghịkwa udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼihi ndị iro ya, ebe m mere ka onye ọbụla bụrụ onye na-emegide ibe ya. 11 Ma ugbu a, agaghị m emeso ndị fọdụrụ nʼala a, dịka m si meso ha nʼoge gara aga.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. 12 “Nʼihi na mkpụrụ ga-eto nke ọma, osisi vaịnị ga-amị mkpụrụ ya, ala ubi ga-ewepụtakwa ihe omume, igirigi eluigwe ga-ezokwasịkwa ala. Ihe ndị a niile ka m ga-enye ndị fọdụrụ nʼala a ka ọ bụụrụ ha ihe nketa. 13 Dịka unu bụ Juda na Izrel si bụrụ ihe a na-abụ ọnụ nʼetiti mba dị iche iche, otu a ka m ga-esi zọpụta unu, unu ga-abụkwa ngọzị. Unu atụla ụjọ, kama meenụ ka aka unu sie ike nʼọrụ unu.” 14 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Dịka m si kpebie ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu, na dịka m na-egosighị ebere nʼahụ nna nna unu ha mgbe ha kpasuru m iwe,” ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, 15 “otu a ka m kpebikwara ọzọ nʼụbọchị ndị a imere Jerusalem na Juda ihe ọma. Unu atụla ụjọ. 16 Ihe ndị a ka unu ga-eme: Kwuonụ eziokwu nye ibe unu, kpeenụ ikpe eziokwu nʼụlọikpe unu, nke a na-eweta udo. 17 Unu echela echiche ọjọọ megide ibe unu; unu ahụla ịṅụ iyi ụgha nʼanya. Ihe ndị a niile ka m kpọrọ asị,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 18 Okwu ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị, 19 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu: “Ibu ọnụ unu na-ebu nʼọnwa nke anọ, ọnwa nke ise, ọnwa nke asaa na nʼọnwa nke iri ga-aghọrọ unu oge ịṅụrị ọṅụ na oge obi ụtọ. Ha ga-abụrụ Juda mmemme obi ụtọ. Nʼihi ya, hụnụ eziokwu na udo nʼanya.” 20 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwukwa: “Ndị dị iche iche na ndị bi nʼọtụtụ obodo dị iche iche ka ga-abịa. 21 Ndị bi nʼotu obodo ga-ejekwa nʼobodo ọzọ, sị, ‘Ka anyị jee na-atụfughị oge gaa rịọọ ONYENWE ANYỊ arịrịọ, ka anyị chọọnụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile. Mụ onwe m na-ejekwa.’ 22 Ọtụtụ ndị mmadụ na ọtụtụ mba dị ike ga-abịa Jerusalem ịchọ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, na ịrịọ ya arịrịọ.” 23 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼụbọchị ndị ahụ, mmadụ iri, ndị ga-esi na mba dị iche iche, ndị na-asụkwa asụsụ dị iche iche, ga-ejide otu onye Juda aka nʼọnụ ọnụ uwe ya na-asị, ‘Kwere ka anyị soro gị jee, nʼihi na anyị anụla na Chineke nọnyeere unu.’ ”

In Other Versions

Zechariah 8 in the ANGEFD

Zechariah 8 in the ANTPNG2D

Zechariah 8 in the AS21

Zechariah 8 in the BAGH

Zechariah 8 in the BBPNG

Zechariah 8 in the BBT1E

Zechariah 8 in the BDS

Zechariah 8 in the BEV

Zechariah 8 in the BHAD

Zechariah 8 in the BIB

Zechariah 8 in the BLPT

Zechariah 8 in the BNT

Zechariah 8 in the BNTABOOT

Zechariah 8 in the BNTLV

Zechariah 8 in the BOATCB

Zechariah 8 in the BOATCB2

Zechariah 8 in the BOBCV

Zechariah 8 in the BOCNT

Zechariah 8 in the BOECS

Zechariah 8 in the BOGWICC

Zechariah 8 in the BOHCB

Zechariah 8 in the BOHCV

Zechariah 8 in the BOHLNT

Zechariah 8 in the BOHNTLTAL

Zechariah 8 in the BOILNTAP

Zechariah 8 in the BOITCV

Zechariah 8 in the BOKCV

Zechariah 8 in the BOKCV2

Zechariah 8 in the BOKHWOG

Zechariah 8 in the BOKSSV

Zechariah 8 in the BOLCB

Zechariah 8 in the BOLCB2

Zechariah 8 in the BOMCV

Zechariah 8 in the BONAV

Zechariah 8 in the BONCB

Zechariah 8 in the BONLT

Zechariah 8 in the BONUT2

Zechariah 8 in the BOPLNT

Zechariah 8 in the BOSCB

Zechariah 8 in the BOSNC

Zechariah 8 in the BOTLNT

Zechariah 8 in the BOVCB

Zechariah 8 in the BOYCB

Zechariah 8 in the BPBB

Zechariah 8 in the BPH

Zechariah 8 in the BSB

Zechariah 8 in the CCB

Zechariah 8 in the CUV

Zechariah 8 in the CUVS

Zechariah 8 in the DBT

Zechariah 8 in the DGDNT

Zechariah 8 in the DHNT

Zechariah 8 in the DNT

Zechariah 8 in the ELBE

Zechariah 8 in the EMTV

Zechariah 8 in the ESV

Zechariah 8 in the FBV

Zechariah 8 in the FEB

Zechariah 8 in the GGMNT

Zechariah 8 in the GNT

Zechariah 8 in the HARY

Zechariah 8 in the HNT

Zechariah 8 in the IRVA

Zechariah 8 in the IRVB

Zechariah 8 in the IRVG

Zechariah 8 in the IRVH

Zechariah 8 in the IRVK

Zechariah 8 in the IRVM

Zechariah 8 in the IRVM2

Zechariah 8 in the IRVO

Zechariah 8 in the IRVP

Zechariah 8 in the IRVT

Zechariah 8 in the IRVT2

Zechariah 8 in the IRVU

Zechariah 8 in the ISVN

Zechariah 8 in the JSNT

Zechariah 8 in the KAPI

Zechariah 8 in the KBT1ETNIK

Zechariah 8 in the KBV

Zechariah 8 in the KJV

Zechariah 8 in the KNFD

Zechariah 8 in the LBA

Zechariah 8 in the LBLA

Zechariah 8 in the LNT

Zechariah 8 in the LSV

Zechariah 8 in the MAAL

Zechariah 8 in the MBV

Zechariah 8 in the MBV2

Zechariah 8 in the MHNT

Zechariah 8 in the MKNFD

Zechariah 8 in the MNG

Zechariah 8 in the MNT

Zechariah 8 in the MNT2

Zechariah 8 in the MRS1T

Zechariah 8 in the NAA

Zechariah 8 in the NASB

Zechariah 8 in the NBLA

Zechariah 8 in the NBS

Zechariah 8 in the NBVTP

Zechariah 8 in the NET2

Zechariah 8 in the NIV11

Zechariah 8 in the NNT

Zechariah 8 in the NNT2

Zechariah 8 in the NNT3

Zechariah 8 in the PDDPT

Zechariah 8 in the PFNT

Zechariah 8 in the RMNT

Zechariah 8 in the SBIAS

Zechariah 8 in the SBIBS

Zechariah 8 in the SBIBS2

Zechariah 8 in the SBICS

Zechariah 8 in the SBIDS

Zechariah 8 in the SBIGS

Zechariah 8 in the SBIHS

Zechariah 8 in the SBIIS

Zechariah 8 in the SBIIS2

Zechariah 8 in the SBIIS3

Zechariah 8 in the SBIKS

Zechariah 8 in the SBIKS2

Zechariah 8 in the SBIMS

Zechariah 8 in the SBIOS

Zechariah 8 in the SBIPS

Zechariah 8 in the SBISS

Zechariah 8 in the SBITS

Zechariah 8 in the SBITS2

Zechariah 8 in the SBITS3

Zechariah 8 in the SBITS4

Zechariah 8 in the SBIUS

Zechariah 8 in the SBIVS

Zechariah 8 in the SBT

Zechariah 8 in the SBT1E

Zechariah 8 in the SCHL

Zechariah 8 in the SNT

Zechariah 8 in the SUSU

Zechariah 8 in the SUSU2

Zechariah 8 in the SYNO

Zechariah 8 in the TBIAOTANT

Zechariah 8 in the TBT1E

Zechariah 8 in the TBT1E2

Zechariah 8 in the TFTIP

Zechariah 8 in the TFTU

Zechariah 8 in the TGNTATF3T

Zechariah 8 in the THAI

Zechariah 8 in the TNFD

Zechariah 8 in the TNT

Zechariah 8 in the TNTIK

Zechariah 8 in the TNTIL

Zechariah 8 in the TNTIN

Zechariah 8 in the TNTIP

Zechariah 8 in the TNTIZ

Zechariah 8 in the TOMA

Zechariah 8 in the TTENT

Zechariah 8 in the UBG

Zechariah 8 in the UGV

Zechariah 8 in the UGV2

Zechariah 8 in the UGV3

Zechariah 8 in the VBL

Zechariah 8 in the VDCC

Zechariah 8 in the YALU

Zechariah 8 in the YAPE

Zechariah 8 in the YBVTP

Zechariah 8 in the ZBP