1 Chronicles 23 (BOICB)
1 Mgbe Devid ghọrọ nnọọ agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ, o mere Solomọn nwa ya, eze Izrel. 2 Nʼoge a, ọ kpọkọtara ndị ndu Izrel niile, tinyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị. 3 A gụrụ ndị Livayị niile ọnụ, bụ ndị gbara iri afọ atọ gbagoo, chọpụta na ha dị iri puku ndị ikom atọ na asatọ nʼọnụọgụgụ. 4 Devid sịrị, “Nʼime ndị a, ka iri puku ndị ikom abụọ na anọ bụrụ ndị ga-ahụ maka ọrụ ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, puku ndị ikom isii a bụrụ ndịisi na ndị ikpe, 5 puku ndị ikom anọ abụrụ ndị nche ọnụ ụzọ ama, ebe puku ndị ikom anọ ndị ọzọ ga-eji ihe egwu dị iche iche nke m kwadobere maka ito ONYENWE ANYỊ, na-eto ya.” 6 Devid kewara ndị Livayị nʼoke, nʼoke dịka ụmụ ndị ikom Livayị si dị: Geshọn, Kohat na Merari. 7 E kekwara ikwu Geshọn ụzọ abụọ dịka ụmụ ya si dị,Ladan na Shimei. 8 Ndị sitere nʼezinaụlọ Ladan dị ndị ikom atọ:Jehiel, onyeisi ha, Zetam na Juel. 9 Ụmụ Shimei bụ,Shelomot, Haziel na Haran, ha dị ndị ikom atọ.Ndị a niile bụ ndịisi ezinaụlọ nʼikwu Ladan. 10 Ụmụ Shimei bụ,Jahat, Ziza, Jeush na Beriya.Ha dị ndị ikom anọ. 11 Jahat bụ onye mbụ, Ziza onye nke abụọ. Ma Jeush na Beriya amụtaghị ọtụtụ ụmụ ndị ikom. Nʼihi ya, a gụnyekọtara ha dịka otu ezinaụlọ, kenye ha otu ọrụ. 12 Ụmụ ndị ikom Kohat bụAmram, Izha, Hebrọn na Uziel. Ha dị ndị ikom anọ. 13 Ụmụ ndị ikom Amram bụ,Erọn na Mosis.Erọn ka e kewapụrụ iche, ido ya nsọ ya na ụmụ ya ruo ebighị ebi, maka ido ihe niile kachasị nsọ nsọ, ịchụ aja nʼihu ONYENWE ANYỊ, ije ozi nʼihu ya nakwa ikwupụta ngọzị nʼaha ya ruo ebighị ebi. 14 Ụmụ Mosis, onye nke Chineke ka a gụnyekọtara dịka ndị si nʼebo Livayị. 15 Ụmụ ndị ikom Mosis bụ,Geshọm na Elieza. 16 Ụmụ ndị ikom Geshọm bụShubuel, onye mbụ. 17 Ụmụ ụmụ Elieza bụRehabaya onye mbụ.Elieza amụtaghị ụmụ ndị ikom ọzọ, ma ụmụ ndị ikom Rohabaya dị ọtụtụ. 18 Ụmụ ndị ikom Izha bụShelomit onye mbụ. 19 Ụmụ ndị ikom Hebrọn bụJereaya onye mbụ, na Amaraya, onye nke abụọ,Jahaziel onye nke atọ, na Jekameam, onye nke anọ. 20 Ụmụ ndị ikom Uziel bụMaịka, onye mbụ, na Ishaya, onye nke abụọ. 21 Ụmụ ndị ikom Merari bụMahali na MushiỤmụ ndị ikom Mali bụElieza na Kish 22 Elieza nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ndị ikom. Ọ bụ naanị ụmụ ndị inyom ka ọ mụtara. Ụmụ nwanne nna ha, ụmụ ndị ikom Kish, lụrụ ha. 23 Ụmụ ndị ikom Mushi bụMahali, Eda na Jeremot. Ha dị ndị ikom atọ. 24 Ndị a bụ ụmụ ụmụ Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị, ndịisi ezi, dịka e si debanye aha, na dịka e si gụọ ha ọnụ nʼotu nʼotu, ya bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, ndị gbara iri afọ abụọ gbagoo. 25 Nʼihi na Devid kwuru sị, “Ebe ọ bụ na ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel enyela ndị ya udo, ebe ọ bụkwa na ọ ga-ebi na Jerusalem ruo ebighị ebi. 26 Ugbu a, ọ dịkwaghị mkpa ọ dị na ndị Livayị ga na-ebugharị ụlọ ikwu, maọbụ ngwongwo ọbụla nke ije ozi niile ya.” 27 Ịgụ ndị Livayị ọnụ bụ otu nʼime ihe ikpeazụ Devid mere tupu ọ nwụọ. A gụrụ ndị Livayị gbara iri afọ abụọ gbagoo ọnụ. 28 Ọrụ e nyere ndị Livayị niile bụ inyere ụmụ Erọn ndị nchụaja aka nʼofufe nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ: ilekọta ogige, na ọnụụlọ nta ndị dị nʼakụkụ ya niile, na ime ka ihe nsọ niile dị ọcha, na ịrụ ọrụ ọbụla e nyere ha nʼụlọ Chineke. 29 Ọ bụkwa ọrụ ha iwebata achịcha a na-eche nʼihu Chineke, na ụtụ ọka e ji enye onyinye mkpụrụ ọka, na achịcha mbadamba a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. Ọrụ ha bụkwa ịgwakọta ihe e ji eme achịcha, na ighe ya, na ilekọta ihe ọtụtụ niile e ji atụ ihe. 30 Ụtụtụ ọbụla, na anyasị ọbụla, ọ bụ ọrụ ha iguzo nʼihu ONYENWE ANYỊ ịbụ abụ otuto, na ekele. 31 Ha na-enyekwa aka nʼihe gbasara aja nsure ọkụ a na-achụ nʼụbọchị izuike, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka. Mgbe niile ka ha ga-eje ozi ha nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka usoro ha na ọnụọgụgụ ha si dị. 32 Ya mere, e tinyere ọrụ ilekọta ụlọ nzute ONYENWE ANYỊ, na ụlọnsọ ukwu ahụ nʼaka ha. Ha ka ọ dịkwara inyere ndị ikwu ha, bụ ndị nchụaja ahụ, ụmụ Erọn, aka nʼọrụ ha niile nʼụlọnsọ ukwu ahụ.
In Other Versions
1 Chronicles 23 in the ANGEFD
1 Chronicles 23 in the ANTPNG2D
1 Chronicles 23 in the AS21
1 Chronicles 23 in the BAGH
1 Chronicles 23 in the BBPNG
1 Chronicles 23 in the BBT1E
1 Chronicles 23 in the BDS
1 Chronicles 23 in the BEV
1 Chronicles 23 in the BHAD
1 Chronicles 23 in the BIB
1 Chronicles 23 in the BLPT
1 Chronicles 23 in the BNT
1 Chronicles 23 in the BNTABOOT
1 Chronicles 23 in the BNTLV
1 Chronicles 23 in the BOATCB
1 Chronicles 23 in the BOATCB2
1 Chronicles 23 in the BOBCV
1 Chronicles 23 in the BOCNT
1 Chronicles 23 in the BOECS
1 Chronicles 23 in the BOGWICC
1 Chronicles 23 in the BOHCB
1 Chronicles 23 in the BOHCV
1 Chronicles 23 in the BOHLNT
1 Chronicles 23 in the BOHNTLTAL
1 Chronicles 23 in the BOILNTAP
1 Chronicles 23 in the BOITCV
1 Chronicles 23 in the BOKCV
1 Chronicles 23 in the BOKCV2
1 Chronicles 23 in the BOKHWOG
1 Chronicles 23 in the BOKSSV
1 Chronicles 23 in the BOLCB
1 Chronicles 23 in the BOLCB2
1 Chronicles 23 in the BOMCV
1 Chronicles 23 in the BONAV
1 Chronicles 23 in the BONCB
1 Chronicles 23 in the BONLT
1 Chronicles 23 in the BONUT2
1 Chronicles 23 in the BOPLNT
1 Chronicles 23 in the BOSCB
1 Chronicles 23 in the BOSNC
1 Chronicles 23 in the BOTLNT
1 Chronicles 23 in the BOVCB
1 Chronicles 23 in the BOYCB
1 Chronicles 23 in the BPBB
1 Chronicles 23 in the BPH
1 Chronicles 23 in the BSB
1 Chronicles 23 in the CCB
1 Chronicles 23 in the CUV
1 Chronicles 23 in the CUVS
1 Chronicles 23 in the DBT
1 Chronicles 23 in the DGDNT
1 Chronicles 23 in the DHNT
1 Chronicles 23 in the DNT
1 Chronicles 23 in the ELBE
1 Chronicles 23 in the EMTV
1 Chronicles 23 in the ESV
1 Chronicles 23 in the FBV
1 Chronicles 23 in the FEB
1 Chronicles 23 in the GGMNT
1 Chronicles 23 in the GNT
1 Chronicles 23 in the HARY
1 Chronicles 23 in the HNT
1 Chronicles 23 in the IRVA
1 Chronicles 23 in the IRVB
1 Chronicles 23 in the IRVG
1 Chronicles 23 in the IRVH
1 Chronicles 23 in the IRVK
1 Chronicles 23 in the IRVM
1 Chronicles 23 in the IRVM2
1 Chronicles 23 in the IRVO
1 Chronicles 23 in the IRVP
1 Chronicles 23 in the IRVT
1 Chronicles 23 in the IRVT2
1 Chronicles 23 in the IRVU
1 Chronicles 23 in the ISVN
1 Chronicles 23 in the JSNT
1 Chronicles 23 in the KAPI
1 Chronicles 23 in the KBT1ETNIK
1 Chronicles 23 in the KBV
1 Chronicles 23 in the KJV
1 Chronicles 23 in the KNFD
1 Chronicles 23 in the LBA
1 Chronicles 23 in the LBLA
1 Chronicles 23 in the LNT
1 Chronicles 23 in the LSV
1 Chronicles 23 in the MAAL
1 Chronicles 23 in the MBV
1 Chronicles 23 in the MBV2
1 Chronicles 23 in the MHNT
1 Chronicles 23 in the MKNFD
1 Chronicles 23 in the MNG
1 Chronicles 23 in the MNT
1 Chronicles 23 in the MNT2
1 Chronicles 23 in the MRS1T
1 Chronicles 23 in the NAA
1 Chronicles 23 in the NASB
1 Chronicles 23 in the NBLA
1 Chronicles 23 in the NBS
1 Chronicles 23 in the NBVTP
1 Chronicles 23 in the NET2
1 Chronicles 23 in the NIV11
1 Chronicles 23 in the NNT
1 Chronicles 23 in the NNT2
1 Chronicles 23 in the NNT3
1 Chronicles 23 in the PDDPT
1 Chronicles 23 in the PFNT
1 Chronicles 23 in the RMNT
1 Chronicles 23 in the SBIAS
1 Chronicles 23 in the SBIBS
1 Chronicles 23 in the SBIBS2
1 Chronicles 23 in the SBICS
1 Chronicles 23 in the SBIDS
1 Chronicles 23 in the SBIGS
1 Chronicles 23 in the SBIHS
1 Chronicles 23 in the SBIIS
1 Chronicles 23 in the SBIIS2
1 Chronicles 23 in the SBIIS3
1 Chronicles 23 in the SBIKS
1 Chronicles 23 in the SBIKS2
1 Chronicles 23 in the SBIMS
1 Chronicles 23 in the SBIOS
1 Chronicles 23 in the SBIPS
1 Chronicles 23 in the SBISS
1 Chronicles 23 in the SBITS
1 Chronicles 23 in the SBITS2
1 Chronicles 23 in the SBITS3
1 Chronicles 23 in the SBITS4
1 Chronicles 23 in the SBIUS
1 Chronicles 23 in the SBIVS
1 Chronicles 23 in the SBT
1 Chronicles 23 in the SBT1E
1 Chronicles 23 in the SCHL
1 Chronicles 23 in the SNT
1 Chronicles 23 in the SUSU
1 Chronicles 23 in the SUSU2
1 Chronicles 23 in the SYNO
1 Chronicles 23 in the TBIAOTANT
1 Chronicles 23 in the TBT1E
1 Chronicles 23 in the TBT1E2
1 Chronicles 23 in the TFTIP
1 Chronicles 23 in the TFTU
1 Chronicles 23 in the TGNTATF3T
1 Chronicles 23 in the THAI
1 Chronicles 23 in the TNFD
1 Chronicles 23 in the TNT
1 Chronicles 23 in the TNTIK
1 Chronicles 23 in the TNTIL
1 Chronicles 23 in the TNTIN
1 Chronicles 23 in the TNTIP
1 Chronicles 23 in the TNTIZ
1 Chronicles 23 in the TOMA
1 Chronicles 23 in the TTENT
1 Chronicles 23 in the UBG
1 Chronicles 23 in the UGV
1 Chronicles 23 in the UGV2
1 Chronicles 23 in the UGV3
1 Chronicles 23 in the VBL
1 Chronicles 23 in the VDCC
1 Chronicles 23 in the YALU
1 Chronicles 23 in the YAPE
1 Chronicles 23 in the YBVTP
1 Chronicles 23 in the ZBP