1 Corinthians 15 (BOICB)

1 Ụmụnna m, ugbu a achọrọ m ime ka unu cheta oziọma ahụ m ziri unu mgbe m buru ụzọ bịakwute unu, nke unu kweere na ya, na nke unu guzosikwara ike nʼelu ya. 2 E si nʼoziọma a zọpụta unu, ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile jidesie ihe unu kweere na ya ike. Inwe okwukwe nʼihe ọzọ dị iche agaghị enyere unu aka. 3 Ihe m nyefere unu nʼaka na mbụ bụ ozi ahụ m natara ị debe, nke dị oke mkpa, na Kraịst nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie anyị, dịka akwụkwọ nsọ kwuru na ọ ga-anwụ. 4 Na e liri ya, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ, dịka akwụkwọ nsọ kwukwara na ọ ga-eme. 5 O gosiri Sefas onwe ya, emesịa, ndị ozi iri na abụọ ahụ hụkwara ya. 6 Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise nʼime ụmụnna onwe ya, nʼotu mgbe, ọtụtụ nʼime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nʼime ha adaala nʼụra ọnwụ. 7 Emesịa, Jemis hụrụ ya; o mekwara ka ndị ozi niile hụ ya. 8 Nʼikpeazụ, mụ onwe m hụkwara ya, dịka a ga-asị na m bụ nwa a na-amụghị nʼoge. 9 Nʼihi na ọ bụ m kachasị nta nʼime ndị ozi. O kwesikwaghị ka a akpọọ m onyeozi ya nʼihi na alụsoro m nzukọ Chineke ọgụ nke ukwuu. 10 Ma site nʼamara nke Chineke, abụ m ihe m bụ. Ọ pụtakwara na amara ya nʼebe m nọ abụghị ihe efu. Kama arụsịrị m ọrụ ike karịchasịa ndị ozi niile. Ma nʼezie, ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ ya nʼime m. 11 Ma ọ bụ m, maọbụ ndị ọzọ, otu a ka anyị siri kwusaa, otu a ka unu sikwa kwere. 12 Ma ọ bụrụ na a na-ekwusa na Kraịst si nʼọnwụ bilie, gịnị mere ụfọdụ unu ji na-ekwu na ndị nwụrụ anwụ apụghị isi nʼọnwụ bilie ọzọ. 13 Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ a pụghị i si nʼọnwụ bilie, nke a pụtara na e meghị ka Kraịst site nʼọnwụ bilie. 14 Ọ bụrụkwa na e meghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, ihe anyị na-ezisa bụ ihe efu, okwukwe unu nwere bụkwa ihe efu. 15 Ma karịa nke a, a na-ahụta anyị ka ndị ama ụgha nke Chineke, nʼihi na anyị gbara ama banyere Chineke, na-asị na o mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, bụ onye ọ na-emeghị ka o si nʼọnwụ bilie ma ọ bụrụ na-emeghị ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ. 16 Nʼihi na, ọ bụrụ na a pụghị ime ka ndị nwụrụ anwụ bilie dị ndụ ọzọ, emekwaghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie. 17 Ma ọ bụrụ na-emeghị ka Kraịst si nʼọnwụ bilie, okwukwe unu bụ ihe efu, unu ka ga-anwụ na mmehie unu. 18 Mgbe ahụ ndị nwụrụ anwụ nʼime Kraịst lara nʼiyi. 19 Ọ bụrụkwa na olileanya anyị nʼime Kraịst gwụrụ naanị na ndụ anyị nʼime ụwa a, anyị bụ ndị e kwesiri ka e mere ebere. 20 Ma e mere ka Kraịst si nʼọnwụ bilie nʼezie, onye mbụ nʼetiti ndị niile nwụrụ anwụ. 21 Nʼihi na dịka ọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa, otu a kwa ka mbilite nʼọnwụ si site nʼaka otu nwoke bịa. 22 Dịka mmadụ niile si anwụ site nʼaka Adam, otu a kwa ka mmadụ niile ga-esi dịkwa ndụ nʼime Kraịst. 23 Onye ọbụla ga-ebili nʼusoro nke ya, Kraịst mkpụrụ mbụ si nʼọnwụ bilie. Mgbe ọ lọghachiri, ndị niile bụ ndị nke Kraịst ga-esote. 24 Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ ihe niile ga-abịa, mgbe ọ ga-enyefe alaeze nʼaka Chineke bụ Nna, nʼihi na o meriela ịchị isi niile, na ikike niile na ike niile. 25 Nʼihi na ọ ga-abụ eze tutu ruo mgbe ọ lụgburu ndị iro ya niile, doo ha nʼokpuru ụkwụ ya. 26 Onye iro ikpeazụ a ga-emeri bụ ọnwụ. 27 Nʼihi na “O doola ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Ma mgbe ọbụla asịrị, “e doola ihe niile” nʼokpuru ụkwụ ya, o doro anya na Chineke agụnyeghị onwe ya, nʼihi na ọ bụ ya tinyere ihe niile nʼokpuru Kraịst. 28 Mgbe e merela ka ihe niile nọrọ nʼokpuru ya, mgbe ahụ, Ọkpara ya nʼonwe ya, ga-edobe onwe ya nʼokpuru onye ahụ dobere ihe niile nʼokpuru ya, ka Chineke bụrụ onye na-achị ihe niile. 29 Ma ọ bụghị otu a, gịnị mere ụfọdụ ji eme ndị otu ha baptizim nʼọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụrụ na e meghị ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie ma ọlị, nʼihi gịnị ka a na-eme mmadụ ndị a baptizim nʼọnọdụ ha? 30 Gịnị mere anyị ji nọrọ nʼize ndụ nʼoge awa ọbụla? 31 Nʼịgwa unu eziokwu, ụmụnna m, ana m ezute ọnwụ kwa ụbọchị. Ihe m ji kwupụta nke a bụ nʼihi ịnya isi nke m ji unu anya nʼime Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị. 32 Ọ bụrụ na ndụ anyị na-agwụ nʼụwa a, dịka ndị mmadụ na-ekwu, gịnị bụkwanụ uru m nwere nʼihi ọgụ m na-alụso anụ ọhịa, bụ ndị ikom Efesọs? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ bilie,“Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ,nʼihi na echi anyị ga-anwụ.” 33 Unu ekwela ka e duhie unu. Nʼihi na mkparịkọta agwa ọjọọ na-emebi ezi agwa. 34 Sitenụ na ndụ enweghị nghọta unu lọghachita dịka unu kwesiri, unu emehiekwala ọzọ. Nʼihi na-enwere ụfọdụ bụ ndị na-amaghị Chineke. Ana m ekwu nke a ka ihere mee unu. 35 Ma ụfọdụ ga-ajụ, “Olee otu a ga-esi mee ka onye nwụrụ anwụ bilie? Olee ụdị ahụ ha ga-enwe mgbe ha ga-apụta?” 36 Onye nzuzu! Mkpụrụ ọka i tinyere nʼala agaghị epu ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ nwụọ. 37 Mgbe ị na-agha mkpụrụ, ọ bụghị anụ ahụ nke ga-apụta ka ị na-agha, kama ọ bụ naanị mkpụrụ nkịtị, eleghị anya mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ mkpụrụ ọzọ. 38 Ma Chineke na-enye ya ahụ dịka o si chọọ. Ọ na-enyekwa mkpụrụ ọbụla nʼime mkpụrụ niile ahụ nke kwesiri ya. 39 Anụ ahụ niile abụghị otu, mmadụ nwere anụ ahụ dị iche, anụ ọhịa nwere ụdị anụ ahụ nke ha. Anụ ufe nwere anụ ahụ ha, azụ nwekwara nke ha. 40 Ahụ nke eluigwe na ahụ nke ụwa dịkwa. Ma ịma mma na ebube nke ahụ nke eluigwe bụ otu, ịma mma na ebube nke ahụ nke ụwa dịkwa iche. 41 Anyanwụ nwere ebube nke ya, ọnwa nwekwa nke ya, kpakpando nwekwara ebube nke ya. Kpakpando dịkwa iche site nʼibe ya nʼịma mma na ebube. 42 Otu a ka ọ dị nʼebe mbilite nʼọnwụ ndị nwụrụ anwụ dị. Mgbe e liri anụ ahụ anyị, ihe nwụrụ anwụ na nke pụrụ ire ure ka ọ bụ, ma mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. 43 A na-eli ahụ onye nwụrụ anwụ dịka ihe enweghị ugwu, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼebube. A na-eli onye nwụrụ anwụ nʼadịghị ike, ma a na-eme ka o si nʼọnwụ bilie nʼịdị ike. 44 A na-eli onye nwụrụ anwụ dịka anụ ahụ nkịtị, ma a na-eme ka o jiri ahụ nke mmụọ kulite.Ọ bụrụ na e nwere anụ ahụ nkịtị, e nwekwara ahụ nke mmụọ. 45 E dere ya, “Mmadụ mbụ, bụ Adam, ghọrọ mkpụrụobi dị ndụ, Adam nke ikpeazụ bụ mmụọ na-enye ndụ.” 46 Ma mmụọ e bughị ụzọ, kama ọ bụ ahụ nkịtị, ma mmụọ bịara nʼikpeazụ. 47 Mmadụ nke nwoke sitere nʼala, ejikwa aja kpụọ ya; mmadụ nke abụọ si nʼeluigwe bịa. 48 Dị ka mmadụ nke mbụ ahụ e jiri aja kpụọ dị, otu a ka ndị niile si nʼaja pụta dịkwa. Ma dị ka mmadụ nke eluigwe ahụ dị, otu a ka ndị niile bụ ụmụ eluigwe dịkwa. 49 Dịka anyị niile yikwasịrị onyinyo nke nwoke e jiri aja kpụọ, otu ahụkwa ka anyị ga-esi yikwasị onyinyo nke nwoke nke eluigwe. 50 Ihe m na-ekwu, ụmụnna m, bụ na anụ ahụ na ọbara enweghị ike iketa alaeze Chineke. Ihe na-ere ure agaghịkwa eketa ereghị ure. 51 Ma geenụ ntị ka m gwa unu ihe omimi a! Ọ bụghị anyị niile na-aga ịnwụ, kama, a ga-enye anyị anụ ahụ ọhụrụ nke pụrụ iche. 52 Nʼotu mgbe, nʼotu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ. Nʼihi na opi ga-ada, a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilite na-ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị. 53 Nʼihi na a ghaghị ịgbanwe anụ ahụ anyị a nke na-anwụ anwụ, nyekwa anyị ahụ nke na-agaghị anwụ ọzọ. 54 Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, nke a pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwụ. Mgbe ahụ, okwu ahụ e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ sịrị, “Elomiela ọnwụ, meriekwa ike ya niile.” 55 “Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị?Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?” 56 Nʼihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbata mmadụ bụ mmehie, ma ihe na-enye mmehie ike bụ iwu. 57 Ka ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. 58 Ya mere, ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya, kwụsienụ ike, bụrụnụ akwaa akwụrụ. Nọgidenụ nʼọrụ Onyenwe anyị mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-arụ nʼime Onyenwe anyị abụghị ihe efu.

In Other Versions

1 Corinthians 15 in the ANGEFD

1 Corinthians 15 in the ANTPNG2D

1 Corinthians 15 in the AS21

1 Corinthians 15 in the BAGH

1 Corinthians 15 in the BBPNG

1 Corinthians 15 in the BBT1E

1 Corinthians 15 in the BDS

1 Corinthians 15 in the BEV

1 Corinthians 15 in the BHAD

1 Corinthians 15 in the BIB

1 Corinthians 15 in the BLPT

1 Corinthians 15 in the BNT

1 Corinthians 15 in the BNTABOOT

1 Corinthians 15 in the BNTLV

1 Corinthians 15 in the BOATCB

1 Corinthians 15 in the BOATCB2

1 Corinthians 15 in the BOBCV

1 Corinthians 15 in the BOCNT

1 Corinthians 15 in the BOECS

1 Corinthians 15 in the BOGWICC

1 Corinthians 15 in the BOHCB

1 Corinthians 15 in the BOHCV

1 Corinthians 15 in the BOHLNT

1 Corinthians 15 in the BOHNTLTAL

1 Corinthians 15 in the BOILNTAP

1 Corinthians 15 in the BOITCV

1 Corinthians 15 in the BOKCV

1 Corinthians 15 in the BOKCV2

1 Corinthians 15 in the BOKHWOG

1 Corinthians 15 in the BOKSSV

1 Corinthians 15 in the BOLCB

1 Corinthians 15 in the BOLCB2

1 Corinthians 15 in the BOMCV

1 Corinthians 15 in the BONAV

1 Corinthians 15 in the BONCB

1 Corinthians 15 in the BONLT

1 Corinthians 15 in the BONUT2

1 Corinthians 15 in the BOPLNT

1 Corinthians 15 in the BOSCB

1 Corinthians 15 in the BOSNC

1 Corinthians 15 in the BOTLNT

1 Corinthians 15 in the BOVCB

1 Corinthians 15 in the BOYCB

1 Corinthians 15 in the BPBB

1 Corinthians 15 in the BPH

1 Corinthians 15 in the BSB

1 Corinthians 15 in the CCB

1 Corinthians 15 in the CUV

1 Corinthians 15 in the CUVS

1 Corinthians 15 in the DBT

1 Corinthians 15 in the DGDNT

1 Corinthians 15 in the DHNT

1 Corinthians 15 in the DNT

1 Corinthians 15 in the ELBE

1 Corinthians 15 in the EMTV

1 Corinthians 15 in the ESV

1 Corinthians 15 in the FBV

1 Corinthians 15 in the FEB

1 Corinthians 15 in the GGMNT

1 Corinthians 15 in the GNT

1 Corinthians 15 in the HARY

1 Corinthians 15 in the HNT

1 Corinthians 15 in the IRVA

1 Corinthians 15 in the IRVB

1 Corinthians 15 in the IRVG

1 Corinthians 15 in the IRVH

1 Corinthians 15 in the IRVK

1 Corinthians 15 in the IRVM

1 Corinthians 15 in the IRVM2

1 Corinthians 15 in the IRVO

1 Corinthians 15 in the IRVP

1 Corinthians 15 in the IRVT

1 Corinthians 15 in the IRVT2

1 Corinthians 15 in the IRVU

1 Corinthians 15 in the ISVN

1 Corinthians 15 in the JSNT

1 Corinthians 15 in the KAPI

1 Corinthians 15 in the KBT1ETNIK

1 Corinthians 15 in the KBV

1 Corinthians 15 in the KJV

1 Corinthians 15 in the KNFD

1 Corinthians 15 in the LBA

1 Corinthians 15 in the LBLA

1 Corinthians 15 in the LNT

1 Corinthians 15 in the LSV

1 Corinthians 15 in the MAAL

1 Corinthians 15 in the MBV

1 Corinthians 15 in the MBV2

1 Corinthians 15 in the MHNT

1 Corinthians 15 in the MKNFD

1 Corinthians 15 in the MNG

1 Corinthians 15 in the MNT

1 Corinthians 15 in the MNT2

1 Corinthians 15 in the MRS1T

1 Corinthians 15 in the NAA

1 Corinthians 15 in the NASB

1 Corinthians 15 in the NBLA

1 Corinthians 15 in the NBS

1 Corinthians 15 in the NBVTP

1 Corinthians 15 in the NET2

1 Corinthians 15 in the NIV11

1 Corinthians 15 in the NNT

1 Corinthians 15 in the NNT2

1 Corinthians 15 in the NNT3

1 Corinthians 15 in the PDDPT

1 Corinthians 15 in the PFNT

1 Corinthians 15 in the RMNT

1 Corinthians 15 in the SBIAS

1 Corinthians 15 in the SBIBS

1 Corinthians 15 in the SBIBS2

1 Corinthians 15 in the SBICS

1 Corinthians 15 in the SBIDS

1 Corinthians 15 in the SBIGS

1 Corinthians 15 in the SBIHS

1 Corinthians 15 in the SBIIS

1 Corinthians 15 in the SBIIS2

1 Corinthians 15 in the SBIIS3

1 Corinthians 15 in the SBIKS

1 Corinthians 15 in the SBIKS2

1 Corinthians 15 in the SBIMS

1 Corinthians 15 in the SBIOS

1 Corinthians 15 in the SBIPS

1 Corinthians 15 in the SBISS

1 Corinthians 15 in the SBITS

1 Corinthians 15 in the SBITS2

1 Corinthians 15 in the SBITS3

1 Corinthians 15 in the SBITS4

1 Corinthians 15 in the SBIUS

1 Corinthians 15 in the SBIVS

1 Corinthians 15 in the SBT

1 Corinthians 15 in the SBT1E

1 Corinthians 15 in the SCHL

1 Corinthians 15 in the SNT

1 Corinthians 15 in the SUSU

1 Corinthians 15 in the SUSU2

1 Corinthians 15 in the SYNO

1 Corinthians 15 in the TBIAOTANT

1 Corinthians 15 in the TBT1E

1 Corinthians 15 in the TBT1E2

1 Corinthians 15 in the TFTIP

1 Corinthians 15 in the TFTU

1 Corinthians 15 in the TGNTATF3T

1 Corinthians 15 in the THAI

1 Corinthians 15 in the TNFD

1 Corinthians 15 in the TNT

1 Corinthians 15 in the TNTIK

1 Corinthians 15 in the TNTIL

1 Corinthians 15 in the TNTIN

1 Corinthians 15 in the TNTIP

1 Corinthians 15 in the TNTIZ

1 Corinthians 15 in the TOMA

1 Corinthians 15 in the TTENT

1 Corinthians 15 in the UBG

1 Corinthians 15 in the UGV

1 Corinthians 15 in the UGV2

1 Corinthians 15 in the UGV3

1 Corinthians 15 in the VBL

1 Corinthians 15 in the VDCC

1 Corinthians 15 in the YALU

1 Corinthians 15 in the YAPE

1 Corinthians 15 in the YBVTP

1 Corinthians 15 in the ZBP