1 Corinthians 4 (BOICB)

1 Achọrọ m ka unu na-ele anyị anya dịka ndị na-ejere Kraịst ozi, ndị e nyefere ihe omimi Chineke nʼaka. 2 Ma ihe dị mkpa bụ na o kwesiri ka ndị na-elekọta ihe ọbụla bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. 3 Anaghị m echegbu onwe m banyere ihe unu na-eche gbasara m maọbụ ihe a na-ekpe nʼụlọikpe nke mmadụ. Nʼezie, anaghị m ekpekwa onwe m ikpe. 4 O doro m anya na akọnuche m adịghị ama m ikpe, ma nke a egosighị na m bụ onye ikpe na-amaghị. Ọ bụ Onyenwe anyị naanị ka ọ dịrị ikpe m ikpe. 5 Ya mere, unu ekpela ikpe tupu oge ya eruo, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abịa. Ọ ga-eme ka ihe niile zoro ezo nʼọchịchịrị pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo niile nke dị nʼobi nʼanwụ. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼotu nʼotu ga-anatakwa otuto ruuru ya site nʼaka Chineke. 6 Ugbu a ụmụnna m ejiri m onwe m na Apọlọs mara unu atụ maka ọdịmma nke unu, ka unu nwee ike isite nʼaka anyị mụta ihe site nʼihe ahụ e dere bụ nke na-asị, “Unu agafekwala ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.” Ka onye ọbụla nʼime unu hapụ iji otu onye nyaa isi ma leda ndị ọzọ anya. 7 Onye gwara gị na ị pụrụ iche nʼetiti mmadụ ndị ọzọ? Ọ dị ihe ọbụla i nwere nke abụghị ihe ị natara anata? Ọ bụ gịnị ka i nwere nke ị na-anataghị anata? Ma ọ bụrụ na i natara ya, gịnị mere i ji anya isi dịka a ga-asị na ị nataghị ya anata? 8 Ma ugbu a, ihe niile zuru unu oke. Ugbu a, unu abụrụkwala ndị ọgaranya. Unu abụrụla eze ma anyị esoghị unu. Nʼezie, ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu anọrọla nʼocheeze unu, ka anyị nwe ike soro unu bụrụ eze. 9 Ọ na-adị m nnọọ ka Chineke o weere anyị bụ ndị ozi mee anyị ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta naanị mgbe ihe niile na-agwụsị agwụsị, dịka ndị a mara ikpe ọnwụ. Nʼihi na-akpọpụtara anyị nʼihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi. 10 Anyị aghọọla ndị nzuzu nʼihi Kraịst, ma unu onwe unu bụ ndị maara ihe nʼime Kraịst. Anyị bụ ndị na-adịghị ike ma unu dị ike. Anyị bụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-eleda anya, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ. 11 Tutu ruo ugbu a, anyị na-ebu ọnụ nọrọkwa nʼakpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị. 12 Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-agọzi ha. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi. 13 Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa. 14 Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dịka ụmụ m hụrụ nʼanya. 15 Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu. 16 Ya mere, ana arịọ m unu, ka unu na-eṅomi ndụ m. 17 Nʼihi nke a, ana m ezitere unu Timoti, bụ ezi nwa m onye m hụrụ nʼanya, nke kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị. Ọ ga-echetara unu otu m si e bi ndụ nʼime Onyenwe anyị Kraịst Jisọs, dịka m na-akụzi ya nʼebe niile na nzukọ niile. 18 Ụfọdụ nʼime unu amalitela ịfụlị onwe ha elu, chee na mụ enweghị ike ịbịakwute unu ọzọ. 19 Ma site nʼike Onyenwe anyị, aga m abịa ịhụ unu anya nʼoge na-adịghị anya. Mgbe m bịara, aga m achọpụta ihe ndị ahụ na-akpa nganga pụrụ ime, ọ bụghị ihe ha nwere ike ikwu. 20 Nʼihi na alaeze Chineke abụghị ihe okwu ọnụ kama ọ bụ ngosipụta ịdị ike. 21 Ya mere, unu ka ọ dịrị ịhọrọ nke unu chọrọ. Unu chọrọ ka m jiri ụtarị bịakwute unu, ka ọ bụ ka m jiri obi dị umeala na mmụọ nke ịhụnanya bịa?

In Other Versions

1 Corinthians 4 in the ANGEFD

1 Corinthians 4 in the ANTPNG2D

1 Corinthians 4 in the AS21

1 Corinthians 4 in the BAGH

1 Corinthians 4 in the BBPNG

1 Corinthians 4 in the BBT1E

1 Corinthians 4 in the BDS

1 Corinthians 4 in the BEV

1 Corinthians 4 in the BHAD

1 Corinthians 4 in the BIB

1 Corinthians 4 in the BLPT

1 Corinthians 4 in the BNT

1 Corinthians 4 in the BNTABOOT

1 Corinthians 4 in the BNTLV

1 Corinthians 4 in the BOATCB

1 Corinthians 4 in the BOATCB2

1 Corinthians 4 in the BOBCV

1 Corinthians 4 in the BOCNT

1 Corinthians 4 in the BOECS

1 Corinthians 4 in the BOGWICC

1 Corinthians 4 in the BOHCB

1 Corinthians 4 in the BOHCV

1 Corinthians 4 in the BOHLNT

1 Corinthians 4 in the BOHNTLTAL

1 Corinthians 4 in the BOILNTAP

1 Corinthians 4 in the BOITCV

1 Corinthians 4 in the BOKCV

1 Corinthians 4 in the BOKCV2

1 Corinthians 4 in the BOKHWOG

1 Corinthians 4 in the BOKSSV

1 Corinthians 4 in the BOLCB

1 Corinthians 4 in the BOLCB2

1 Corinthians 4 in the BOMCV

1 Corinthians 4 in the BONAV

1 Corinthians 4 in the BONCB

1 Corinthians 4 in the BONLT

1 Corinthians 4 in the BONUT2

1 Corinthians 4 in the BOPLNT

1 Corinthians 4 in the BOSCB

1 Corinthians 4 in the BOSNC

1 Corinthians 4 in the BOTLNT

1 Corinthians 4 in the BOVCB

1 Corinthians 4 in the BOYCB

1 Corinthians 4 in the BPBB

1 Corinthians 4 in the BPH

1 Corinthians 4 in the BSB

1 Corinthians 4 in the CCB

1 Corinthians 4 in the CUV

1 Corinthians 4 in the CUVS

1 Corinthians 4 in the DBT

1 Corinthians 4 in the DGDNT

1 Corinthians 4 in the DHNT

1 Corinthians 4 in the DNT

1 Corinthians 4 in the ELBE

1 Corinthians 4 in the EMTV

1 Corinthians 4 in the ESV

1 Corinthians 4 in the FBV

1 Corinthians 4 in the FEB

1 Corinthians 4 in the GGMNT

1 Corinthians 4 in the GNT

1 Corinthians 4 in the HARY

1 Corinthians 4 in the HNT

1 Corinthians 4 in the IRVA

1 Corinthians 4 in the IRVB

1 Corinthians 4 in the IRVG

1 Corinthians 4 in the IRVH

1 Corinthians 4 in the IRVK

1 Corinthians 4 in the IRVM

1 Corinthians 4 in the IRVM2

1 Corinthians 4 in the IRVO

1 Corinthians 4 in the IRVP

1 Corinthians 4 in the IRVT

1 Corinthians 4 in the IRVT2

1 Corinthians 4 in the IRVU

1 Corinthians 4 in the ISVN

1 Corinthians 4 in the JSNT

1 Corinthians 4 in the KAPI

1 Corinthians 4 in the KBT1ETNIK

1 Corinthians 4 in the KBV

1 Corinthians 4 in the KJV

1 Corinthians 4 in the KNFD

1 Corinthians 4 in the LBA

1 Corinthians 4 in the LBLA

1 Corinthians 4 in the LNT

1 Corinthians 4 in the LSV

1 Corinthians 4 in the MAAL

1 Corinthians 4 in the MBV

1 Corinthians 4 in the MBV2

1 Corinthians 4 in the MHNT

1 Corinthians 4 in the MKNFD

1 Corinthians 4 in the MNG

1 Corinthians 4 in the MNT

1 Corinthians 4 in the MNT2

1 Corinthians 4 in the MRS1T

1 Corinthians 4 in the NAA

1 Corinthians 4 in the NASB

1 Corinthians 4 in the NBLA

1 Corinthians 4 in the NBS

1 Corinthians 4 in the NBVTP

1 Corinthians 4 in the NET2

1 Corinthians 4 in the NIV11

1 Corinthians 4 in the NNT

1 Corinthians 4 in the NNT2

1 Corinthians 4 in the NNT3

1 Corinthians 4 in the PDDPT

1 Corinthians 4 in the PFNT

1 Corinthians 4 in the RMNT

1 Corinthians 4 in the SBIAS

1 Corinthians 4 in the SBIBS

1 Corinthians 4 in the SBIBS2

1 Corinthians 4 in the SBICS

1 Corinthians 4 in the SBIDS

1 Corinthians 4 in the SBIGS

1 Corinthians 4 in the SBIHS

1 Corinthians 4 in the SBIIS

1 Corinthians 4 in the SBIIS2

1 Corinthians 4 in the SBIIS3

1 Corinthians 4 in the SBIKS

1 Corinthians 4 in the SBIKS2

1 Corinthians 4 in the SBIMS

1 Corinthians 4 in the SBIOS

1 Corinthians 4 in the SBIPS

1 Corinthians 4 in the SBISS

1 Corinthians 4 in the SBITS

1 Corinthians 4 in the SBITS2

1 Corinthians 4 in the SBITS3

1 Corinthians 4 in the SBITS4

1 Corinthians 4 in the SBIUS

1 Corinthians 4 in the SBIVS

1 Corinthians 4 in the SBT

1 Corinthians 4 in the SBT1E

1 Corinthians 4 in the SCHL

1 Corinthians 4 in the SNT

1 Corinthians 4 in the SUSU

1 Corinthians 4 in the SUSU2

1 Corinthians 4 in the SYNO

1 Corinthians 4 in the TBIAOTANT

1 Corinthians 4 in the TBT1E

1 Corinthians 4 in the TBT1E2

1 Corinthians 4 in the TFTIP

1 Corinthians 4 in the TFTU

1 Corinthians 4 in the TGNTATF3T

1 Corinthians 4 in the THAI

1 Corinthians 4 in the TNFD

1 Corinthians 4 in the TNT

1 Corinthians 4 in the TNTIK

1 Corinthians 4 in the TNTIL

1 Corinthians 4 in the TNTIN

1 Corinthians 4 in the TNTIP

1 Corinthians 4 in the TNTIZ

1 Corinthians 4 in the TOMA

1 Corinthians 4 in the TTENT

1 Corinthians 4 in the UBG

1 Corinthians 4 in the UGV

1 Corinthians 4 in the UGV2

1 Corinthians 4 in the UGV3

1 Corinthians 4 in the VBL

1 Corinthians 4 in the VDCC

1 Corinthians 4 in the YALU

1 Corinthians 4 in the YAPE

1 Corinthians 4 in the YBVTP

1 Corinthians 4 in the ZBP