1 Corinthians 6 (BOICB)

1 Mgbe onye ọbụla nʼetiti unu nwere esemokwu megide ibe ya, unu ọ pụrụ i buru okwu ahụ gaa nʼụlọikpe ka ndị ajọ omume kpeere unu ikpe, karịa ịga ya nʼihu ndị nsọ? 2 Ọ bụ na unu amabeghị na ọ bụ ndị nsọ ga-ekpe ụwa ikpe? Ọ bụrụkwa na unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ pụtara na unu etozughị oke idozi okwu ntakịrị dapụtara nʼetiti unu? 3 Ọ bụ na unu amataghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi okwu ụka dịkarịsịrị nta nke ndụ a? 4 Ya mere, ọ bụrụ na esemokwu dị otu a adapụta nʼetiti unu, unu ga-ewere okwu ahụ jekwuru ndị ibi ndụ ha na-akpọ nzukọ ihe efu ka ha kpee ya? 5 Ana m ekwu nke a ime ka ihere mee unu. Ọ ga-abụ na e nweghị ike ịchọta ọ bụladị otu onye maara ihe nʼetiti unu, onye ga na-ekpe ikpe dị nʼetiti nwanna na ibe ya? 6 Ma lee, nwanna na-akpọrọ nwanna ya aga ụlọ ikpe, ka ndị na-ekweghị ekwe kpee ha ikpe! 7 Ebe unu na-enwe esemokwu nke ikpe ikpe nʼetiti unu, ọ pụtara na unu bụ ndị emeriri kpamkpam. Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka emejọ unu? Nʼihi gịnị ka unu na-adịghị ekwe ka a ghọgbuo unu? 8 Ma unu onwe unu na-emejọ, ma na-aghọgbu, ọ bụladị ụmụnna unu nʼime Kraịst. 9 Ọ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ajọ omume dị otu a enweghị oke ọbụla nʼalaeze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu. Nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla na-akwa iko, na ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwunye na-akwa iko, na ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko, 10 ndị niile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, maọbụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nʼalaeze Chineke. 11 Na mbụ, ụfọdụ nʼime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nʼime Mmụọ nke Chineke anyị ka a gụrụ unu ka ndị ezi omume. 12 Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma a gaghị ekwe ka ihe ọbụla na-achị m. 13 Unu na-asị, “E mere ihe oriri maka afọ, meekwa afọ maka ihe oriri, ma Chineke ga-emebi ma afọ ma ihe oriri.” Ekeghị ahụ anyị maka ịkwa iko, kama o mere ya maka Onyenwe anyị, Onyenwe anyị dịkwa maka ahụ anyị. 14 Chineke mere ka Onyenwe anyị site nʼọnwụ bilie, ọ ga-ejikwa ike ya mee ka anyị si nʼọnwụ bilie. 15 Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụna? Tụfiaa! 16 Ọ bụ na unu amataghị na onye ya na nwanyị akwụna na-enwe mmekọrịta, ya na nwanyị ahụ bụ otu ahụ? Nʼihi na e kwuru, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” 17 Ma onye ọbụla e jikọtara ya na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nʼime mmụọ. 18 Gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ dịka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya. 19 Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọnsọ nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, onye bi nʼime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke. 20 E jiri oke ọnụahịa zọpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

In Other Versions

1 Corinthians 6 in the ANGEFD

1 Corinthians 6 in the ANTPNG2D

1 Corinthians 6 in the AS21

1 Corinthians 6 in the BAGH

1 Corinthians 6 in the BBPNG

1 Corinthians 6 in the BBT1E

1 Corinthians 6 in the BDS

1 Corinthians 6 in the BEV

1 Corinthians 6 in the BHAD

1 Corinthians 6 in the BIB

1 Corinthians 6 in the BLPT

1 Corinthians 6 in the BNT

1 Corinthians 6 in the BNTABOOT

1 Corinthians 6 in the BNTLV

1 Corinthians 6 in the BOATCB

1 Corinthians 6 in the BOATCB2

1 Corinthians 6 in the BOBCV

1 Corinthians 6 in the BOCNT

1 Corinthians 6 in the BOECS

1 Corinthians 6 in the BOGWICC

1 Corinthians 6 in the BOHCB

1 Corinthians 6 in the BOHCV

1 Corinthians 6 in the BOHLNT

1 Corinthians 6 in the BOHNTLTAL

1 Corinthians 6 in the BOILNTAP

1 Corinthians 6 in the BOITCV

1 Corinthians 6 in the BOKCV

1 Corinthians 6 in the BOKCV2

1 Corinthians 6 in the BOKHWOG

1 Corinthians 6 in the BOKSSV

1 Corinthians 6 in the BOLCB

1 Corinthians 6 in the BOLCB2

1 Corinthians 6 in the BOMCV

1 Corinthians 6 in the BONAV

1 Corinthians 6 in the BONCB

1 Corinthians 6 in the BONLT

1 Corinthians 6 in the BONUT2

1 Corinthians 6 in the BOPLNT

1 Corinthians 6 in the BOSCB

1 Corinthians 6 in the BOSNC

1 Corinthians 6 in the BOTLNT

1 Corinthians 6 in the BOVCB

1 Corinthians 6 in the BOYCB

1 Corinthians 6 in the BPBB

1 Corinthians 6 in the BPH

1 Corinthians 6 in the BSB

1 Corinthians 6 in the CCB

1 Corinthians 6 in the CUV

1 Corinthians 6 in the CUVS

1 Corinthians 6 in the DBT

1 Corinthians 6 in the DGDNT

1 Corinthians 6 in the DHNT

1 Corinthians 6 in the DNT

1 Corinthians 6 in the ELBE

1 Corinthians 6 in the EMTV

1 Corinthians 6 in the ESV

1 Corinthians 6 in the FBV

1 Corinthians 6 in the FEB

1 Corinthians 6 in the GGMNT

1 Corinthians 6 in the GNT

1 Corinthians 6 in the HARY

1 Corinthians 6 in the HNT

1 Corinthians 6 in the IRVA

1 Corinthians 6 in the IRVB

1 Corinthians 6 in the IRVG

1 Corinthians 6 in the IRVH

1 Corinthians 6 in the IRVK

1 Corinthians 6 in the IRVM

1 Corinthians 6 in the IRVM2

1 Corinthians 6 in the IRVO

1 Corinthians 6 in the IRVP

1 Corinthians 6 in the IRVT

1 Corinthians 6 in the IRVT2

1 Corinthians 6 in the IRVU

1 Corinthians 6 in the ISVN

1 Corinthians 6 in the JSNT

1 Corinthians 6 in the KAPI

1 Corinthians 6 in the KBT1ETNIK

1 Corinthians 6 in the KBV

1 Corinthians 6 in the KJV

1 Corinthians 6 in the KNFD

1 Corinthians 6 in the LBA

1 Corinthians 6 in the LBLA

1 Corinthians 6 in the LNT

1 Corinthians 6 in the LSV

1 Corinthians 6 in the MAAL

1 Corinthians 6 in the MBV

1 Corinthians 6 in the MBV2

1 Corinthians 6 in the MHNT

1 Corinthians 6 in the MKNFD

1 Corinthians 6 in the MNG

1 Corinthians 6 in the MNT

1 Corinthians 6 in the MNT2

1 Corinthians 6 in the MRS1T

1 Corinthians 6 in the NAA

1 Corinthians 6 in the NASB

1 Corinthians 6 in the NBLA

1 Corinthians 6 in the NBS

1 Corinthians 6 in the NBVTP

1 Corinthians 6 in the NET2

1 Corinthians 6 in the NIV11

1 Corinthians 6 in the NNT

1 Corinthians 6 in the NNT2

1 Corinthians 6 in the NNT3

1 Corinthians 6 in the PDDPT

1 Corinthians 6 in the PFNT

1 Corinthians 6 in the RMNT

1 Corinthians 6 in the SBIAS

1 Corinthians 6 in the SBIBS

1 Corinthians 6 in the SBIBS2

1 Corinthians 6 in the SBICS

1 Corinthians 6 in the SBIDS

1 Corinthians 6 in the SBIGS

1 Corinthians 6 in the SBIHS

1 Corinthians 6 in the SBIIS

1 Corinthians 6 in the SBIIS2

1 Corinthians 6 in the SBIIS3

1 Corinthians 6 in the SBIKS

1 Corinthians 6 in the SBIKS2

1 Corinthians 6 in the SBIMS

1 Corinthians 6 in the SBIOS

1 Corinthians 6 in the SBIPS

1 Corinthians 6 in the SBISS

1 Corinthians 6 in the SBITS

1 Corinthians 6 in the SBITS2

1 Corinthians 6 in the SBITS3

1 Corinthians 6 in the SBITS4

1 Corinthians 6 in the SBIUS

1 Corinthians 6 in the SBIVS

1 Corinthians 6 in the SBT

1 Corinthians 6 in the SBT1E

1 Corinthians 6 in the SCHL

1 Corinthians 6 in the SNT

1 Corinthians 6 in the SUSU

1 Corinthians 6 in the SUSU2

1 Corinthians 6 in the SYNO

1 Corinthians 6 in the TBIAOTANT

1 Corinthians 6 in the TBT1E

1 Corinthians 6 in the TBT1E2

1 Corinthians 6 in the TFTIP

1 Corinthians 6 in the TFTU

1 Corinthians 6 in the TGNTATF3T

1 Corinthians 6 in the THAI

1 Corinthians 6 in the TNFD

1 Corinthians 6 in the TNT

1 Corinthians 6 in the TNTIK

1 Corinthians 6 in the TNTIL

1 Corinthians 6 in the TNTIN

1 Corinthians 6 in the TNTIP

1 Corinthians 6 in the TNTIZ

1 Corinthians 6 in the TOMA

1 Corinthians 6 in the TTENT

1 Corinthians 6 in the UBG

1 Corinthians 6 in the UGV

1 Corinthians 6 in the UGV2

1 Corinthians 6 in the UGV3

1 Corinthians 6 in the VBL

1 Corinthians 6 in the VDCC

1 Corinthians 6 in the YALU

1 Corinthians 6 in the YAPE

1 Corinthians 6 in the YBVTP

1 Corinthians 6 in the ZBP