1 Samuel 7 (BOICB)

1 Ya mere, ndị ikom Kiriat Jearim bịara buru igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ bubata ya nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu. Ha doro Elieza, ọkpara Abinadab nsọ, ka ọ bụrụ onye na-elekọta igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ. 2 Igbe ahụ dịgidere na Kiriat Jearim ogologo oge, iri afọ abụọ zuruoke. Ma nʼoge a niile, ndị Izrel nọ na-eru ụjụ nʼihi ONYENWE ANYỊ. 3 Ya mere, Samuel gwara ezinaụlọ Izrel niile sị, “Ọ bụrụ na unu ji obi unu niile na alaghachikwute ONYENWE ANYỊ, mgbe ahụ, wezuganụ chi niile nke ndị ala ọzọ, na arụsị Ashtọret site nʼetiti unu. Kpebienụ nʼobi unu ịbịakwute ONYENWE ANYỊ, feekwa naanị ya ofufe. Ọ ga-anapụtakwa unu site nʼaka ndị Filistia.” 4 Ya mere, ndị Izrel wezugara arụsị Baal na Ashtọret ha, bido ife naanị ONYENWE ANYỊ. 5 Samuel gwara ha sị, “Unu ndị Izrel, zukọtaanụ na Mizpa, ka m rịọọ ONYENWE ANYỊ arịrịọ nʼisi unu.” 6 Mgbe ha niile zukọrọ nʼebe ahụ, ha kuuru mmiri wụpụ ya nʼala nʼihu ONYENWE ANYỊ. Nʼụbọchị ahụ kwa, ha buru ọnụ, kwupụta mmehie sị, “Anyị emehiela megide ONYENWE ANYỊ.” Ọ bụ na Mizpa ka Samuel malitere ikpe ụmụ Izrel ikpe. 7 Mgbe ndị Filistia nụrụ na ụmụ Izrel zukọrọ na Mizpa, ndị eze ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha, bịa ibuso Izrel agha. Mgbe ụmụ Izrel nụrụ na ha na-abịa nso, ha tụrụ ụjọ nke ukwuu. 8 Ha sịrị Samuel, “Akwụsịla itiku ONYENWE ANYỊ Chineke anyị mkpu akwa nʼihi anyị, kpeekwa ekpere ka ọ zọpụta anyị site nʼaka ndị Filistia.” 9 Mgbe ahụ, Samuel weere nwa atụrụ na-aṅụ ara jiri ya chụọrọ ONYENWE ANYỊ aja nsure ọkụ, rịọkwa ONYENWE ANYỊ ka o nyere Izrel aka. ONYENWE ANYỊ zara ekpere ya. 10 Nʼoge ahụ, mgbe Samuel nọ na-esure aja nsure ọkụ ahụ, ndị Filistia bịaruru nso ibuso Izrel agha, ma ONYENWE ANYỊ sitere nʼeluigwe were oke olu egbe eluigwe nke dara oke ụda chụsasịa ha. O mere ka ọgbaaghara bata nʼetiti ndị Filistia. Nke a mekwara ka ụmụ Izrel kpochapụ ha, 11 Ndị ikom Izrel si na Mizpa pụta chụso ndị Filistia ọsọ, na-etigbu ha nʼụzọ ruo na ndịda Bet-Ka. 12 Mgbe ahụ, Samuel weere otu nkume doo ya nʼagbata Mizpa na Shen, kpọọ ebe ahụ, Ebeneza, nke pụtara, “Nkume inyeaka,” nʼihi na ọ sịrị, “Nʼezie, ONYENWE ANYỊ enyerela anyị aka ruo ugbu a.” 13 Ya mere, mmeri a e meriri ndị Filistia mere ka ha ghara ibuso Izrel agha ọzọ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ kwụsịrị ha ime nke a ụbọchị niile nke ndụ Samuel. 14 E nyeghachiri ndị Izrel obodo niile ndị Filistia dọtara nʼagha na mbụ, nke dị site nʼEkrọn ruo Gat. Ndị Izrel napụtara oke ala ndị a site nʼaka ndị Filistia. Nʼụzọ dị otu a, e mere ka udo dị nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọrait. 15 Samuel nọgidere dịka onye ikpe ndị Izrel ụbọchị niile nke ndụ ya. 16 Afọ niile, ọ na-ejegharị site nʼotu obodo ruo nʼobodo ọzọ, site nʼobodo Betel ruo Gilgal, ruokwa Mizpa. Ọ na-anọkwa nʼobodo ndị a na-ekpe ndị Izrel ikpe. 17 Ma ọ na-alọghachi na Rema, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka ụlọ ya dị. O kpekwara ndị Izrel ikpe nʼebe ahụ, wuokwara ONYENWE ANYỊ ebe ịchụ aja nʼebe ahụ.

In Other Versions

1 Samuel 7 in the ANGEFD

1 Samuel 7 in the ANTPNG2D

1 Samuel 7 in the AS21

1 Samuel 7 in the BAGH

1 Samuel 7 in the BBPNG

1 Samuel 7 in the BBT1E

1 Samuel 7 in the BDS

1 Samuel 7 in the BEV

1 Samuel 7 in the BHAD

1 Samuel 7 in the BIB

1 Samuel 7 in the BLPT

1 Samuel 7 in the BNT

1 Samuel 7 in the BNTABOOT

1 Samuel 7 in the BNTLV

1 Samuel 7 in the BOATCB

1 Samuel 7 in the BOATCB2

1 Samuel 7 in the BOBCV

1 Samuel 7 in the BOCNT

1 Samuel 7 in the BOECS

1 Samuel 7 in the BOGWICC

1 Samuel 7 in the BOHCB

1 Samuel 7 in the BOHCV

1 Samuel 7 in the BOHLNT

1 Samuel 7 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 7 in the BOILNTAP

1 Samuel 7 in the BOITCV

1 Samuel 7 in the BOKCV

1 Samuel 7 in the BOKCV2

1 Samuel 7 in the BOKHWOG

1 Samuel 7 in the BOKSSV

1 Samuel 7 in the BOLCB

1 Samuel 7 in the BOLCB2

1 Samuel 7 in the BOMCV

1 Samuel 7 in the BONAV

1 Samuel 7 in the BONCB

1 Samuel 7 in the BONLT

1 Samuel 7 in the BONUT2

1 Samuel 7 in the BOPLNT

1 Samuel 7 in the BOSCB

1 Samuel 7 in the BOSNC

1 Samuel 7 in the BOTLNT

1 Samuel 7 in the BOVCB

1 Samuel 7 in the BOYCB

1 Samuel 7 in the BPBB

1 Samuel 7 in the BPH

1 Samuel 7 in the BSB

1 Samuel 7 in the CCB

1 Samuel 7 in the CUV

1 Samuel 7 in the CUVS

1 Samuel 7 in the DBT

1 Samuel 7 in the DGDNT

1 Samuel 7 in the DHNT

1 Samuel 7 in the DNT

1 Samuel 7 in the ELBE

1 Samuel 7 in the EMTV

1 Samuel 7 in the ESV

1 Samuel 7 in the FBV

1 Samuel 7 in the FEB

1 Samuel 7 in the GGMNT

1 Samuel 7 in the GNT

1 Samuel 7 in the HARY

1 Samuel 7 in the HNT

1 Samuel 7 in the IRVA

1 Samuel 7 in the IRVB

1 Samuel 7 in the IRVG

1 Samuel 7 in the IRVH

1 Samuel 7 in the IRVK

1 Samuel 7 in the IRVM

1 Samuel 7 in the IRVM2

1 Samuel 7 in the IRVO

1 Samuel 7 in the IRVP

1 Samuel 7 in the IRVT

1 Samuel 7 in the IRVT2

1 Samuel 7 in the IRVU

1 Samuel 7 in the ISVN

1 Samuel 7 in the JSNT

1 Samuel 7 in the KAPI

1 Samuel 7 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 7 in the KBV

1 Samuel 7 in the KJV

1 Samuel 7 in the KNFD

1 Samuel 7 in the LBA

1 Samuel 7 in the LBLA

1 Samuel 7 in the LNT

1 Samuel 7 in the LSV

1 Samuel 7 in the MAAL

1 Samuel 7 in the MBV

1 Samuel 7 in the MBV2

1 Samuel 7 in the MHNT

1 Samuel 7 in the MKNFD

1 Samuel 7 in the MNG

1 Samuel 7 in the MNT

1 Samuel 7 in the MNT2

1 Samuel 7 in the MRS1T

1 Samuel 7 in the NAA

1 Samuel 7 in the NASB

1 Samuel 7 in the NBLA

1 Samuel 7 in the NBS

1 Samuel 7 in the NBVTP

1 Samuel 7 in the NET2

1 Samuel 7 in the NIV11

1 Samuel 7 in the NNT

1 Samuel 7 in the NNT2

1 Samuel 7 in the NNT3

1 Samuel 7 in the PDDPT

1 Samuel 7 in the PFNT

1 Samuel 7 in the RMNT

1 Samuel 7 in the SBIAS

1 Samuel 7 in the SBIBS

1 Samuel 7 in the SBIBS2

1 Samuel 7 in the SBICS

1 Samuel 7 in the SBIDS

1 Samuel 7 in the SBIGS

1 Samuel 7 in the SBIHS

1 Samuel 7 in the SBIIS

1 Samuel 7 in the SBIIS2

1 Samuel 7 in the SBIIS3

1 Samuel 7 in the SBIKS

1 Samuel 7 in the SBIKS2

1 Samuel 7 in the SBIMS

1 Samuel 7 in the SBIOS

1 Samuel 7 in the SBIPS

1 Samuel 7 in the SBISS

1 Samuel 7 in the SBITS

1 Samuel 7 in the SBITS2

1 Samuel 7 in the SBITS3

1 Samuel 7 in the SBITS4

1 Samuel 7 in the SBIUS

1 Samuel 7 in the SBIVS

1 Samuel 7 in the SBT

1 Samuel 7 in the SBT1E

1 Samuel 7 in the SCHL

1 Samuel 7 in the SNT

1 Samuel 7 in the SUSU

1 Samuel 7 in the SUSU2

1 Samuel 7 in the SYNO

1 Samuel 7 in the TBIAOTANT

1 Samuel 7 in the TBT1E

1 Samuel 7 in the TBT1E2

1 Samuel 7 in the TFTIP

1 Samuel 7 in the TFTU

1 Samuel 7 in the TGNTATF3T

1 Samuel 7 in the THAI

1 Samuel 7 in the TNFD

1 Samuel 7 in the TNT

1 Samuel 7 in the TNTIK

1 Samuel 7 in the TNTIL

1 Samuel 7 in the TNTIN

1 Samuel 7 in the TNTIP

1 Samuel 7 in the TNTIZ

1 Samuel 7 in the TOMA

1 Samuel 7 in the TTENT

1 Samuel 7 in the UBG

1 Samuel 7 in the UGV

1 Samuel 7 in the UGV2

1 Samuel 7 in the UGV3

1 Samuel 7 in the VBL

1 Samuel 7 in the VDCC

1 Samuel 7 in the YALU

1 Samuel 7 in the YAPE

1 Samuel 7 in the YBVTP

1 Samuel 7 in the ZBP