2 Chronicles 18 (BOICB)

1 Ugbu a, Jehoshafat nwere akụnụba na ugwu buru ibu, bịakwa ghọọ ọgọ Ehab. 2 Mgbe afọ ole na ole gasịrị, Jehoshafat gara Sameria ileta Ehab. Ehab gbuuru ya na ndị ya na ha yi ọtụtụ atụrụ na ehi, ọ kpọrọ oriri kwagide ya ka o buso Ramọt Gilead agha. 3 Ehab eze Izrel jụrụ Jehoshafat eze Juda, sị, “Ị ga-eso m buso Ramọt Gilead agha?”Jehoshafat zaghachiri, “Otu m dị ka gị onwe gị dị, ndị nke m bụkwa ndị gị. Anyị ga-eso gị gaa agha.” 4 Ma Jehoshafat gwakwara eze Izrel, sị, “Buru ụzọ chọpụta ntụziaka ONYENWE ANYỊ.” 5 Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma dị narị ndị ikom anọ nʼọnụọgụgụ jụọ ha, sị, “Anyị a ga-ebuso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?”Ha zara, “Gaa, nʼihi na Chineke ga-enyefe ha nʼaka eze.” 6 Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma ONYENWE ANYỊ nọ nʼebe a, onye anyị nwere ike ịjụta ase nʼaka ya?” 7 Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ ONYENWE ANYỊ ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla, ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.”Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.” 8 Mgbe ahụ, eze Izrel kpọrọ otu onye na-ejere ya ozi sị ya, “Mee ọsịịsọ kpọta Maikaya nwa Imla nʼebe a.” 9 Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha. 10 Zedekaya nwa Kenaana, mere mpi igwe, ọ kwupụtara sị, “Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ na-ekwu, ‘Ihe ndị a ka ị ga-eji sọgide ndị Aram, ruo mgbe a ga-ala ha nʼiyi.’ ” 11 Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-enyefe ya nʼaka eze.” 12 Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.” 13 Ma Maikaya sịrị, “Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, aga m agwa ya naanị ihe Chineke m kwuru.” 14 Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?”Ọ zara, “Gaa, ma nwekwa mmeri, nʼihi na a ga-enyefe ha nʼaka gị.” 15 Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha ONYENWE ANYỊ?” 16 Mgbe ahụ, Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ ma ONYENWE ANYỊ sịrị, ‘Ndị a enweghị onyendu, ka onye ọbụla laghachi nʼụlọ ya nʼudo.’ ” 17 Eze Izrel sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?” 18 Maikaya gara nʼihu sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ: Ahụrụ m ONYENWE ANYỊ ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya. 19 Ma ONYENWE ANYỊ sịrị, ‘Onye ga-aga rafuo Ehab, eze Izrel, ka ọ gaa buso Ramọt Gilead agha, gaa nwụọ nʼebe ahụ?’“Otu onye tụpụtara aro nke a, ebe onye ọzọ tụpụtara nke ọzọ. 20 Nʼikpeazụ, otu mmụọ pụtara guzo nʼihu ONYENWE ANYỊ sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’“ONYENWE ANYỊ jụrụ ya sị, ‘Olee otu ị ga-esi mee nke a?’ 21 “Ọ zara, ‘Aga m apụ bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile.’“ONYENWE ANYỊ sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’ 22 “Ma ugbu a, ONYENWE ANYỊ etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. ONYENWE ANYỊ ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.” 23 Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na ONYENWE ANYỊ gara, mgbe ọ hapụrụ m bịa ịgwa gị okwu?” 24 Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.” 25 Eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn, onye na-achị obodo a, na Joash, nwa eze. 26 Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’ ” 27 Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị ONYENWE ANYỊ si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile, hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama.” 28 Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda pụrụ gawa Ramọt Gilead. 29 Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha. 30 Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha, ndị na-agba ụgbọ agha iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.” 31 Mgbe ndị ọchịagha na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya, ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu, nke mere na ONYENWE ANYỊ nyeere ya aka. Chineke wezugara ha site nʼebe ọ nọ, 32 nʼihi na mgbe ndị ọchịagha, na-achị ndị na-agba ụgbọ agha hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ha kwụsịrị ịchụso ya. 33 Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ ihe ikpuchi obi na uwe agha ya. Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m nʼihi na emerụọla m ahụ.” 34 Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile. Eze Izrel guzobere onwe ya ka ọ kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu ruo uhuruchi. Ọ nwụrụ mgbe anyanwụ dara.

In Other Versions

2 Chronicles 18 in the ANGEFD

2 Chronicles 18 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 18 in the AS21

2 Chronicles 18 in the BAGH

2 Chronicles 18 in the BBPNG

2 Chronicles 18 in the BBT1E

2 Chronicles 18 in the BDS

2 Chronicles 18 in the BEV

2 Chronicles 18 in the BHAD

2 Chronicles 18 in the BIB

2 Chronicles 18 in the BLPT

2 Chronicles 18 in the BNT

2 Chronicles 18 in the BNTABOOT

2 Chronicles 18 in the BNTLV

2 Chronicles 18 in the BOATCB

2 Chronicles 18 in the BOATCB2

2 Chronicles 18 in the BOBCV

2 Chronicles 18 in the BOCNT

2 Chronicles 18 in the BOECS

2 Chronicles 18 in the BOGWICC

2 Chronicles 18 in the BOHCB

2 Chronicles 18 in the BOHCV

2 Chronicles 18 in the BOHLNT

2 Chronicles 18 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 18 in the BOILNTAP

2 Chronicles 18 in the BOITCV

2 Chronicles 18 in the BOKCV

2 Chronicles 18 in the BOKCV2

2 Chronicles 18 in the BOKHWOG

2 Chronicles 18 in the BOKSSV

2 Chronicles 18 in the BOLCB

2 Chronicles 18 in the BOLCB2

2 Chronicles 18 in the BOMCV

2 Chronicles 18 in the BONAV

2 Chronicles 18 in the BONCB

2 Chronicles 18 in the BONLT

2 Chronicles 18 in the BONUT2

2 Chronicles 18 in the BOPLNT

2 Chronicles 18 in the BOSCB

2 Chronicles 18 in the BOSNC

2 Chronicles 18 in the BOTLNT

2 Chronicles 18 in the BOVCB

2 Chronicles 18 in the BOYCB

2 Chronicles 18 in the BPBB

2 Chronicles 18 in the BPH

2 Chronicles 18 in the BSB

2 Chronicles 18 in the CCB

2 Chronicles 18 in the CUV

2 Chronicles 18 in the CUVS

2 Chronicles 18 in the DBT

2 Chronicles 18 in the DGDNT

2 Chronicles 18 in the DHNT

2 Chronicles 18 in the DNT

2 Chronicles 18 in the ELBE

2 Chronicles 18 in the EMTV

2 Chronicles 18 in the ESV

2 Chronicles 18 in the FBV

2 Chronicles 18 in the FEB

2 Chronicles 18 in the GGMNT

2 Chronicles 18 in the GNT

2 Chronicles 18 in the HARY

2 Chronicles 18 in the HNT

2 Chronicles 18 in the IRVA

2 Chronicles 18 in the IRVB

2 Chronicles 18 in the IRVG

2 Chronicles 18 in the IRVH

2 Chronicles 18 in the IRVK

2 Chronicles 18 in the IRVM

2 Chronicles 18 in the IRVM2

2 Chronicles 18 in the IRVO

2 Chronicles 18 in the IRVP

2 Chronicles 18 in the IRVT

2 Chronicles 18 in the IRVT2

2 Chronicles 18 in the IRVU

2 Chronicles 18 in the ISVN

2 Chronicles 18 in the JSNT

2 Chronicles 18 in the KAPI

2 Chronicles 18 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 18 in the KBV

2 Chronicles 18 in the KJV

2 Chronicles 18 in the KNFD

2 Chronicles 18 in the LBA

2 Chronicles 18 in the LBLA

2 Chronicles 18 in the LNT

2 Chronicles 18 in the LSV

2 Chronicles 18 in the MAAL

2 Chronicles 18 in the MBV

2 Chronicles 18 in the MBV2

2 Chronicles 18 in the MHNT

2 Chronicles 18 in the MKNFD

2 Chronicles 18 in the MNG

2 Chronicles 18 in the MNT

2 Chronicles 18 in the MNT2

2 Chronicles 18 in the MRS1T

2 Chronicles 18 in the NAA

2 Chronicles 18 in the NASB

2 Chronicles 18 in the NBLA

2 Chronicles 18 in the NBS

2 Chronicles 18 in the NBVTP

2 Chronicles 18 in the NET2

2 Chronicles 18 in the NIV11

2 Chronicles 18 in the NNT

2 Chronicles 18 in the NNT2

2 Chronicles 18 in the NNT3

2 Chronicles 18 in the PDDPT

2 Chronicles 18 in the PFNT

2 Chronicles 18 in the RMNT

2 Chronicles 18 in the SBIAS

2 Chronicles 18 in the SBIBS

2 Chronicles 18 in the SBIBS2

2 Chronicles 18 in the SBICS

2 Chronicles 18 in the SBIDS

2 Chronicles 18 in the SBIGS

2 Chronicles 18 in the SBIHS

2 Chronicles 18 in the SBIIS

2 Chronicles 18 in the SBIIS2

2 Chronicles 18 in the SBIIS3

2 Chronicles 18 in the SBIKS

2 Chronicles 18 in the SBIKS2

2 Chronicles 18 in the SBIMS

2 Chronicles 18 in the SBIOS

2 Chronicles 18 in the SBIPS

2 Chronicles 18 in the SBISS

2 Chronicles 18 in the SBITS

2 Chronicles 18 in the SBITS2

2 Chronicles 18 in the SBITS3

2 Chronicles 18 in the SBITS4

2 Chronicles 18 in the SBIUS

2 Chronicles 18 in the SBIVS

2 Chronicles 18 in the SBT

2 Chronicles 18 in the SBT1E

2 Chronicles 18 in the SCHL

2 Chronicles 18 in the SNT

2 Chronicles 18 in the SUSU

2 Chronicles 18 in the SUSU2

2 Chronicles 18 in the SYNO

2 Chronicles 18 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 18 in the TBT1E

2 Chronicles 18 in the TBT1E2

2 Chronicles 18 in the TFTIP

2 Chronicles 18 in the TFTU

2 Chronicles 18 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 18 in the THAI

2 Chronicles 18 in the TNFD

2 Chronicles 18 in the TNT

2 Chronicles 18 in the TNTIK

2 Chronicles 18 in the TNTIL

2 Chronicles 18 in the TNTIN

2 Chronicles 18 in the TNTIP

2 Chronicles 18 in the TNTIZ

2 Chronicles 18 in the TOMA

2 Chronicles 18 in the TTENT

2 Chronicles 18 in the UBG

2 Chronicles 18 in the UGV

2 Chronicles 18 in the UGV2

2 Chronicles 18 in the UGV3

2 Chronicles 18 in the VBL

2 Chronicles 18 in the VDCC

2 Chronicles 18 in the YALU

2 Chronicles 18 in the YAPE

2 Chronicles 18 in the YBVTP

2 Chronicles 18 in the ZBP