2 Chronicles 21 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, Jehoshafat sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Jehoram nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 2 Ụmụnne Jehoram, ndị bụkwa ụmụ Jehoshafat bụ ndị a: Azaraya, Jehiel, Zekaraya, Azarayu, Maikel na Shefataya. Ndị a niile bụ ụmụ Jehoshafat, bụ eze Izrel. 3 Nna ha nyere onye ọbụla nʼime ha ọtụtụ onyinye nke ọlaọcha, na ọlaedo, na ihe ndị dị oke ọnụahịa, tinyere obodo e wusiri ike nʼime Juda. Ma o mere Jehoram eze, nʼihi na ọ bu ọkpara ya. 4 Mgbe Jehoram mere onwe ya ka o guzosie ike nʼebe alaeze nna ya dị, o weere mma agha gbuo ụmụnne ya ndị ikom niile, tinyere ụfọdụ nʼime ndịisi Izrel. 5 Jehoram gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ asatọ na Jerusalem. 6 O soro ụzọ ndị eze Izrel, dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. 7 Ma nʼagbanyeghị nke a, ONYENWE ANYỊ achọghị ibibi ụlọ Devid, nʼihi ọgbụgba ndụ ahụ ONYENWE ANYỊ na Devid nwere. Nʼihi na o kwere ya nkwa ime ka oriọna dịịrị ya na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 8 Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze. 9 Ya mere, Jehoram duuru ndịisi agha ya na ụgbọ agha ya niile gaa nʼebe ahụ. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu. 10 Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa.Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ, nʼihi na Jehoram gbakụtara ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna ya ha azụ. 11 O wukwara ọtụtụ ebe dị elu nʼọtụtụ ugwu nke Juda, mee ka ndị bi na Jerusalem were onwe ha nye ife arụsị. O si otu a duhiekwa Juda. 12 Jehoram natara akwụkwọ ozi site nʼaka Ịlaịja onye amụma, nke sịrị:“Otu a ka ONYENWE ANYỊ Chineke nke nna gị Devid, kwuru, ‘Nʼihi na i soghị ụzọ niile nke nna gị, bụ Jehoshafat, maọbụ nke Asa bụ eze Juda, 13 kama ị sooro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, meekwa ka ndị Juda na ndị Jerusalem fee chi ọzọ, dịka ụlọ Ehab mere. Ị gbuola ụmụnne nke gị, ndị bụ ndị si nʼezinaụlọ nke gị onwe gị, ndị ikom bụ ndị dị mma karịa gị. 14 Ya mere, ugbu a, ONYENWE ANYỊ ga-eji ihe otiti nke ọrịa tie ndị gị, ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye gị, na ihe niile i nwere. 15 Gị onwe gị kwa ga-ada nʼoke ọrịa, ọrịa afọ nke na-agaghị ekwe ngwọta. Ọrịa a ga-eme ka eriri afọ gị na-enupụta kwa ụbọchị.’ ” 16 ONYENWE ANYỊ mekwara ka ndị Filistia, na ndị Arab, ndị bi nso ndị Kush, bịa lụso Jehoram agha. 17 Ha ji ike bata Juda, buru ihe niile dị mma ha hụrụ nʼụlọeze, tinyere ụmụ nwoke ya niile na ndị nwunye ya niile. Ọ bụ naanị Ahazaya, nwa ya nwoke nke nta ka ha hapụrụ. 18 Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka ONYENWE ANYỊ mere ka ọrịa afọ nke a na-apụghị ịgwọta agwọta bịakwasị Jehoram. 19 Mgbe afọ abụọ gasịrị, eriri afọ ya nupụtara nʼihi ọrịa ahụ. Ọ nwụkwara nʼoke ihe mgbu. Mgbe e liri ya, e meghị omenaala ịkwanye ọkụ olili dịka a na-eme nʼoge a na-eli ndị eze. 20 Ọ gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze Jerusalem. Ọ chịrị afọ asatọ nwụọ. Ọnwụ ya abụghị ihe mwute nye onye ọbụla. E liri ya nʼobodo Devid ma ọ bụghị nʼime ili a na-eli ndị eze.

In Other Versions

2 Chronicles 21 in the ANGEFD

2 Chronicles 21 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 21 in the AS21

2 Chronicles 21 in the BAGH

2 Chronicles 21 in the BBPNG

2 Chronicles 21 in the BBT1E

2 Chronicles 21 in the BDS

2 Chronicles 21 in the BEV

2 Chronicles 21 in the BHAD

2 Chronicles 21 in the BIB

2 Chronicles 21 in the BLPT

2 Chronicles 21 in the BNT

2 Chronicles 21 in the BNTABOOT

2 Chronicles 21 in the BNTLV

2 Chronicles 21 in the BOATCB

2 Chronicles 21 in the BOATCB2

2 Chronicles 21 in the BOBCV

2 Chronicles 21 in the BOCNT

2 Chronicles 21 in the BOECS

2 Chronicles 21 in the BOGWICC

2 Chronicles 21 in the BOHCB

2 Chronicles 21 in the BOHCV

2 Chronicles 21 in the BOHLNT

2 Chronicles 21 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 21 in the BOILNTAP

2 Chronicles 21 in the BOITCV

2 Chronicles 21 in the BOKCV

2 Chronicles 21 in the BOKCV2

2 Chronicles 21 in the BOKHWOG

2 Chronicles 21 in the BOKSSV

2 Chronicles 21 in the BOLCB

2 Chronicles 21 in the BOLCB2

2 Chronicles 21 in the BOMCV

2 Chronicles 21 in the BONAV

2 Chronicles 21 in the BONCB

2 Chronicles 21 in the BONLT

2 Chronicles 21 in the BONUT2

2 Chronicles 21 in the BOPLNT

2 Chronicles 21 in the BOSCB

2 Chronicles 21 in the BOSNC

2 Chronicles 21 in the BOTLNT

2 Chronicles 21 in the BOVCB

2 Chronicles 21 in the BOYCB

2 Chronicles 21 in the BPBB

2 Chronicles 21 in the BPH

2 Chronicles 21 in the BSB

2 Chronicles 21 in the CCB

2 Chronicles 21 in the CUV

2 Chronicles 21 in the CUVS

2 Chronicles 21 in the DBT

2 Chronicles 21 in the DGDNT

2 Chronicles 21 in the DHNT

2 Chronicles 21 in the DNT

2 Chronicles 21 in the ELBE

2 Chronicles 21 in the EMTV

2 Chronicles 21 in the ESV

2 Chronicles 21 in the FBV

2 Chronicles 21 in the FEB

2 Chronicles 21 in the GGMNT

2 Chronicles 21 in the GNT

2 Chronicles 21 in the HARY

2 Chronicles 21 in the HNT

2 Chronicles 21 in the IRVA

2 Chronicles 21 in the IRVB

2 Chronicles 21 in the IRVG

2 Chronicles 21 in the IRVH

2 Chronicles 21 in the IRVK

2 Chronicles 21 in the IRVM

2 Chronicles 21 in the IRVM2

2 Chronicles 21 in the IRVO

2 Chronicles 21 in the IRVP

2 Chronicles 21 in the IRVT

2 Chronicles 21 in the IRVT2

2 Chronicles 21 in the IRVU

2 Chronicles 21 in the ISVN

2 Chronicles 21 in the JSNT

2 Chronicles 21 in the KAPI

2 Chronicles 21 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 21 in the KBV

2 Chronicles 21 in the KJV

2 Chronicles 21 in the KNFD

2 Chronicles 21 in the LBA

2 Chronicles 21 in the LBLA

2 Chronicles 21 in the LNT

2 Chronicles 21 in the LSV

2 Chronicles 21 in the MAAL

2 Chronicles 21 in the MBV

2 Chronicles 21 in the MBV2

2 Chronicles 21 in the MHNT

2 Chronicles 21 in the MKNFD

2 Chronicles 21 in the MNG

2 Chronicles 21 in the MNT

2 Chronicles 21 in the MNT2

2 Chronicles 21 in the MRS1T

2 Chronicles 21 in the NAA

2 Chronicles 21 in the NASB

2 Chronicles 21 in the NBLA

2 Chronicles 21 in the NBS

2 Chronicles 21 in the NBVTP

2 Chronicles 21 in the NET2

2 Chronicles 21 in the NIV11

2 Chronicles 21 in the NNT

2 Chronicles 21 in the NNT2

2 Chronicles 21 in the NNT3

2 Chronicles 21 in the PDDPT

2 Chronicles 21 in the PFNT

2 Chronicles 21 in the RMNT

2 Chronicles 21 in the SBIAS

2 Chronicles 21 in the SBIBS

2 Chronicles 21 in the SBIBS2

2 Chronicles 21 in the SBICS

2 Chronicles 21 in the SBIDS

2 Chronicles 21 in the SBIGS

2 Chronicles 21 in the SBIHS

2 Chronicles 21 in the SBIIS

2 Chronicles 21 in the SBIIS2

2 Chronicles 21 in the SBIIS3

2 Chronicles 21 in the SBIKS

2 Chronicles 21 in the SBIKS2

2 Chronicles 21 in the SBIMS

2 Chronicles 21 in the SBIOS

2 Chronicles 21 in the SBIPS

2 Chronicles 21 in the SBISS

2 Chronicles 21 in the SBITS

2 Chronicles 21 in the SBITS2

2 Chronicles 21 in the SBITS3

2 Chronicles 21 in the SBITS4

2 Chronicles 21 in the SBIUS

2 Chronicles 21 in the SBIVS

2 Chronicles 21 in the SBT

2 Chronicles 21 in the SBT1E

2 Chronicles 21 in the SCHL

2 Chronicles 21 in the SNT

2 Chronicles 21 in the SUSU

2 Chronicles 21 in the SUSU2

2 Chronicles 21 in the SYNO

2 Chronicles 21 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 21 in the TBT1E

2 Chronicles 21 in the TBT1E2

2 Chronicles 21 in the TFTIP

2 Chronicles 21 in the TFTU

2 Chronicles 21 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 21 in the THAI

2 Chronicles 21 in the TNFD

2 Chronicles 21 in the TNT

2 Chronicles 21 in the TNTIK

2 Chronicles 21 in the TNTIL

2 Chronicles 21 in the TNTIN

2 Chronicles 21 in the TNTIP

2 Chronicles 21 in the TNTIZ

2 Chronicles 21 in the TOMA

2 Chronicles 21 in the TTENT

2 Chronicles 21 in the UBG

2 Chronicles 21 in the UGV

2 Chronicles 21 in the UGV2

2 Chronicles 21 in the UGV3

2 Chronicles 21 in the VBL

2 Chronicles 21 in the VDCC

2 Chronicles 21 in the YALU

2 Chronicles 21 in the YAPE

2 Chronicles 21 in the YBVTP

2 Chronicles 21 in the ZBP