2 Corinthians 1 (BOICB)

1 Pọl, onyeozi nke Jisọs Kraịst dịka ọchịchọ nke Chineke si dị, na Timoti nwanne anyị nwoke, Na-edegara chọọchị Chineke nke dị na Kọrint, na ndị nsọ niile ndị nọ nʼala Akaịa akwụkwọ: 2 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 3 Otuto dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasiobi niile. 4 Onye na-akasị anyị obi nʼime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʼụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi. Inyere ha aka dịka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nʼaka Chineke. 5 Nʼihi na dịka anyị si eketa oke nʼime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a nkasiobi anyị na-ababiga ụba site na Kraịst. 6 Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nʼihi na nkasiobi unu, nakwa nzọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, ọ bụkwa nʼihi nkasiobi unu, nke na-arụpụta ike na ume iji ntachiobi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa. 7 Olileanya anyị nwere nʼebe unu nọ sịrị ike, ebe anyị maara na dịka unu si eketa oke nʼịta ahụhụ anyị, otu ahụkwa ka unu ga-esi keta oke na nkasiobi ahụ anyị na-anata. 8 Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nʼEshịa. Nʼezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesi dịrị ndụ. 9 Nʼezie, ọ dị nnọọ nʼoge ahụ, dịka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesighị ka anyị tụkwasị obi nʼike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nʼime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie. 10 Ọ bụ Chineke bụ onye zọpụtara anyị site nʼime oke ọnwụ dị otu a. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nʼihu na-azọpụtakwa anyị, 11 dịka unu ga-enyekwara anyị aka site nʼekpere unu, ka ọtụtụ nwere ike nye ekele nʼihi anyị maka onyinye amara anyị natara na nzaghachi ekpere ọtụtụ mmadụ ndị a na-ekpere anyị. 12 Ịnya isi anyị bụ nke a, na akọnuche anyị na-agbara anyị akaebe na anyị kpara agwa ọma nʼụwa, karịchasịa nʼebe unu nọ, nʼịdị nsọ na izi ezi nke si nʼaka Chineke. Nke a bụ site nʼamara o nyere anyị, ọ bụghị site nʼamamihe nke mmadụ. 13 Nʼihi na ihe anyị na-edere unu abụghị ihe unu na agaghị agụta maọbụ ghọta. Enwere m nchekwube na unu ga-aghọta ya nke ọma. 14 Dịka unu ghọtarala anyị nwa nke nta ugbu a, unu ga-eji anyị anya isi nʼụbọchị nke Onyenwe anyị Jisọs. 15 Ihe m na-ekwu were m anya, nke mere m ji chọọ ibu ụzọ bịa leta unu ka unu nwee uru abụọ. 16 Ebu m ya nʼobi na m ga-akwụsị hụ unu mgbe m na-agafe ịga Masidonia. Ebukwa m ya nʼobi m na mgbe m si Masidonia na-alaghachi na m ga-akwụsịkwa ileta unu, ka unu nweekwa ike inyere anyị aka mgbe anyị bidoro ịlaghachi Judịa. 17 E nwere m obi abụọ mgbe m chọrọ ime nke a? Ana m ezube nzube m dịka mmadụ nkịtị, onye dị nkwadobe ikwu “E,” na “E e,” nʼotu oge ahụ? 18 Ma dịka Chineke si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi, okwu anyị gwara unu abụghị “E,” na “E e.” 19 Nʼihi na Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼọnụ Saịlas na Timoti na mụ onwe m kwusaa abụghị “E” na “E e,” kama nʼime ya ọ bụ naanị “E.” 20 Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ “E” na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee “Amen” nʼinye Chineke otuto. 21 Ọ bụ Chineke nʼonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nʼime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e tere mmanụ. 22 Ọ kara anyị akara nʼihu, nyekwa anyị Mmụọ Nsọ ya ka o biri nʼobi anyị, dịka onye ga-ahụ na anyị ga-emezu nkwa ahụ niile. 23 Ana m akpọku Chineke dịka onye akaebe m, ọ bụ nʼihi ịnapụta unu mere m ji hapụ ịbịa Kọrint. 24 Ọ bụghị na anyị bụ ndị ọchịchị nke okwukwe unu, kama anyị so unu na-arụkọ ọrụ ka unu nwe ọṅụ nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka unu ga-esi kwụrụ chịm.

In Other Versions

2 Corinthians 1 in the ANGEFD

2 Corinthians 1 in the ANTPNG2D

2 Corinthians 1 in the AS21

2 Corinthians 1 in the BAGH

2 Corinthians 1 in the BBPNG

2 Corinthians 1 in the BBT1E

2 Corinthians 1 in the BDS

2 Corinthians 1 in the BEV

2 Corinthians 1 in the BHAD

2 Corinthians 1 in the BIB

2 Corinthians 1 in the BLPT

2 Corinthians 1 in the BNT

2 Corinthians 1 in the BNTABOOT

2 Corinthians 1 in the BNTLV

2 Corinthians 1 in the BOATCB

2 Corinthians 1 in the BOATCB2

2 Corinthians 1 in the BOBCV

2 Corinthians 1 in the BOCNT

2 Corinthians 1 in the BOECS

2 Corinthians 1 in the BOGWICC

2 Corinthians 1 in the BOHCB

2 Corinthians 1 in the BOHCV

2 Corinthians 1 in the BOHLNT

2 Corinthians 1 in the BOHNTLTAL

2 Corinthians 1 in the BOILNTAP

2 Corinthians 1 in the BOITCV

2 Corinthians 1 in the BOKCV

2 Corinthians 1 in the BOKCV2

2 Corinthians 1 in the BOKHWOG

2 Corinthians 1 in the BOKSSV

2 Corinthians 1 in the BOLCB

2 Corinthians 1 in the BOLCB2

2 Corinthians 1 in the BOMCV

2 Corinthians 1 in the BONAV

2 Corinthians 1 in the BONCB

2 Corinthians 1 in the BONLT

2 Corinthians 1 in the BONUT2

2 Corinthians 1 in the BOPLNT

2 Corinthians 1 in the BOSCB

2 Corinthians 1 in the BOSNC

2 Corinthians 1 in the BOTLNT

2 Corinthians 1 in the BOVCB

2 Corinthians 1 in the BOYCB

2 Corinthians 1 in the BPBB

2 Corinthians 1 in the BPH

2 Corinthians 1 in the BSB

2 Corinthians 1 in the CCB

2 Corinthians 1 in the CUV

2 Corinthians 1 in the CUVS

2 Corinthians 1 in the DBT

2 Corinthians 1 in the DGDNT

2 Corinthians 1 in the DHNT

2 Corinthians 1 in the DNT

2 Corinthians 1 in the ELBE

2 Corinthians 1 in the EMTV

2 Corinthians 1 in the ESV

2 Corinthians 1 in the FBV

2 Corinthians 1 in the FEB

2 Corinthians 1 in the GGMNT

2 Corinthians 1 in the GNT

2 Corinthians 1 in the HARY

2 Corinthians 1 in the HNT

2 Corinthians 1 in the IRVA

2 Corinthians 1 in the IRVB

2 Corinthians 1 in the IRVG

2 Corinthians 1 in the IRVH

2 Corinthians 1 in the IRVK

2 Corinthians 1 in the IRVM

2 Corinthians 1 in the IRVM2

2 Corinthians 1 in the IRVO

2 Corinthians 1 in the IRVP

2 Corinthians 1 in the IRVT

2 Corinthians 1 in the IRVT2

2 Corinthians 1 in the IRVU

2 Corinthians 1 in the ISVN

2 Corinthians 1 in the JSNT

2 Corinthians 1 in the KAPI

2 Corinthians 1 in the KBT1ETNIK

2 Corinthians 1 in the KBV

2 Corinthians 1 in the KJV

2 Corinthians 1 in the KNFD

2 Corinthians 1 in the LBA

2 Corinthians 1 in the LBLA

2 Corinthians 1 in the LNT

2 Corinthians 1 in the LSV

2 Corinthians 1 in the MAAL

2 Corinthians 1 in the MBV

2 Corinthians 1 in the MBV2

2 Corinthians 1 in the MHNT

2 Corinthians 1 in the MKNFD

2 Corinthians 1 in the MNG

2 Corinthians 1 in the MNT

2 Corinthians 1 in the MNT2

2 Corinthians 1 in the MRS1T

2 Corinthians 1 in the NAA

2 Corinthians 1 in the NASB

2 Corinthians 1 in the NBLA

2 Corinthians 1 in the NBS

2 Corinthians 1 in the NBVTP

2 Corinthians 1 in the NET2

2 Corinthians 1 in the NIV11

2 Corinthians 1 in the NNT

2 Corinthians 1 in the NNT2

2 Corinthians 1 in the NNT3

2 Corinthians 1 in the PDDPT

2 Corinthians 1 in the PFNT

2 Corinthians 1 in the RMNT

2 Corinthians 1 in the SBIAS

2 Corinthians 1 in the SBIBS

2 Corinthians 1 in the SBIBS2

2 Corinthians 1 in the SBICS

2 Corinthians 1 in the SBIDS

2 Corinthians 1 in the SBIGS

2 Corinthians 1 in the SBIHS

2 Corinthians 1 in the SBIIS

2 Corinthians 1 in the SBIIS2

2 Corinthians 1 in the SBIIS3

2 Corinthians 1 in the SBIKS

2 Corinthians 1 in the SBIKS2

2 Corinthians 1 in the SBIMS

2 Corinthians 1 in the SBIOS

2 Corinthians 1 in the SBIPS

2 Corinthians 1 in the SBISS

2 Corinthians 1 in the SBITS

2 Corinthians 1 in the SBITS2

2 Corinthians 1 in the SBITS3

2 Corinthians 1 in the SBITS4

2 Corinthians 1 in the SBIUS

2 Corinthians 1 in the SBIVS

2 Corinthians 1 in the SBT

2 Corinthians 1 in the SBT1E

2 Corinthians 1 in the SCHL

2 Corinthians 1 in the SNT

2 Corinthians 1 in the SUSU

2 Corinthians 1 in the SUSU2

2 Corinthians 1 in the SYNO

2 Corinthians 1 in the TBIAOTANT

2 Corinthians 1 in the TBT1E

2 Corinthians 1 in the TBT1E2

2 Corinthians 1 in the TFTIP

2 Corinthians 1 in the TFTU

2 Corinthians 1 in the TGNTATF3T

2 Corinthians 1 in the THAI

2 Corinthians 1 in the TNFD

2 Corinthians 1 in the TNT

2 Corinthians 1 in the TNTIK

2 Corinthians 1 in the TNTIL

2 Corinthians 1 in the TNTIN

2 Corinthians 1 in the TNTIP

2 Corinthians 1 in the TNTIZ

2 Corinthians 1 in the TOMA

2 Corinthians 1 in the TTENT

2 Corinthians 1 in the UBG

2 Corinthians 1 in the UGV

2 Corinthians 1 in the UGV2

2 Corinthians 1 in the UGV3

2 Corinthians 1 in the VBL

2 Corinthians 1 in the VDCC

2 Corinthians 1 in the YALU

2 Corinthians 1 in the YAPE

2 Corinthians 1 in the YBVTP

2 Corinthians 1 in the ZBP