2 Corinthians 5 (BOICB)
1 Nʼihi na anyị ma nke ọma na mgbe e mebiri ụlọ ikwu nke anyị bi nʼime ya, bụ ụlọ nke ụwa a, anyị nwere ụlọ nke sitere na Chineke, ụlọ nke ejighị aka wuo, ga-adị ebighị ebi nʼeluigwe. 2 Ugbu a anyị nọ na-asụ ude, na-enwe agụụ inweta ebe obibi anyị dị nʼeluigwe. 3 Ka ọ ga-abụ anyị yiri ya, ka anyị hapụ ịdị ka ndị gba ọtọ. 4 Mgbe ahụ niile anyị nọ nʼime ụlọ ikwu a, anyị na-anọgide nʼịsụ ude nke ibu arọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị chọrọ ịnwụ anwụ bụrụ ndị na-enweghị anụ ahụ, kama ọ bụ nʼihi na anyị chọrọ ka e yikwasị anyị anụ ahụ nke eluigwe ahụ, ka anụ ahụ a pụrụ ịnwụ anwụ yikwasị ndụ ebighị ebi. 5 Chineke onye ya onwe ya, bụ onye kwadobere anyị maka mgbanwo nke a, nyekwara anyị Mmụọ Nsọ ka ọ bụrụ onye ga-ahụ na anyị ga-enwetazu nkwa ahụ niile. 6 Nʼihi nke a, anyị nwere obi ike mgbe niile, nʼihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nʼihu na-adị ndụ nʼanụ ahụ a, anyị na Onyenwe anyị anọghị. 7 Nʼihi ọ bụ okwukwe ka anyị ji adị ndụ ọ bụghị ihe anya hụrụ. 8 Obi siri anyị ike. Ọ gaara amasị anyị ịhapụ ụlọ nke a anyị bi na ya, bụ ahụ anyị ma lakwuru Onyenwe anyị nʼebe obibi ya. 9 Ya mere, ma anyị nọ nʼụlọ a maọbụ nʼọzọ, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị mee ihe ga-atọ ya ụtọ. 10 Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ. 11 Ọ bụ nʼihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ka ndị mmadụ mata Chineke makwaara ụdị mmadụ anyị bụ. Enwekwara m olileanya na nke a pụtara ihe nye akọnuche unu. 12 Anyị adịghị agbalị ịgwa unu na anyị dị mma, kama anyị chọrọ inye unu ihe unu ga-eji nyaa isi mgbe unu na-ekwu ihe banyere anyị, ka unu nwee ike ịmata ihe unu ga-azaghachi ndị ahụ na-anya isi banyere ihe ha ji anya ha hụ, kama ihe dị mmadụ nʼobi. 13 Ọ bụrụ na anyị amaghị onwe anyị, ọ bụ nʼihi Chineke, ọ bụrụ na anyị nwere uche zuruoke, ọ bụ nʼihi unu. 14 Ọ bụ ịhụnanya Kraịst na-akwagide anyị, nʼihi na anyị kwere na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile, nke pụtara na mmadụ niile anwụọla. 15 Ọ nwụrụ nʼihi mmadụ niile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama maka onye ahụ nwụrụ nʼihi ha ma sikwa nʼọnwụ kulie. 16 Bido ugbu a gawa, anyị adịghị elekwa onye ọbụla anya dịka mmadụ nkịtị. Nʼihi na anyị sitere nʼụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a, anyị amakwaghị ya nʼụzọ dị otu a. 17 Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie. 18 Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nʼaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nʼudo. Ma ugbu a, o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nʼudo. 19 Ihe nke a pụtara bụ na Chineke sitere na Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị na mma. Ọ dịghị agụkọrọ ụmụ mmadụ mmehie niile, kama o tinyela nʼaka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ. 20 Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka ọ bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo. 21 Nʼihi na o mere ka onye ahụ na-amaghị mmehie bụrụ mmehie nʼọnọdụ anyị, ka esi otu a mee ka anyị nwee oke nʼime ezi omume Chineke site na ya.
In Other Versions
2 Corinthians 5 in the ANGEFD
2 Corinthians 5 in the ANTPNG2D
2 Corinthians 5 in the AS21
2 Corinthians 5 in the BAGH
2 Corinthians 5 in the BBPNG
2 Corinthians 5 in the BBT1E
2 Corinthians 5 in the BDS
2 Corinthians 5 in the BEV
2 Corinthians 5 in the BHAD
2 Corinthians 5 in the BIB
2 Corinthians 5 in the BLPT
2 Corinthians 5 in the BNT
2 Corinthians 5 in the BNTABOOT
2 Corinthians 5 in the BNTLV
2 Corinthians 5 in the BOATCB
2 Corinthians 5 in the BOATCB2
2 Corinthians 5 in the BOBCV
2 Corinthians 5 in the BOCNT
2 Corinthians 5 in the BOECS
2 Corinthians 5 in the BOGWICC
2 Corinthians 5 in the BOHCB
2 Corinthians 5 in the BOHCV
2 Corinthians 5 in the BOHLNT
2 Corinthians 5 in the BOHNTLTAL
2 Corinthians 5 in the BOILNTAP
2 Corinthians 5 in the BOITCV
2 Corinthians 5 in the BOKCV
2 Corinthians 5 in the BOKCV2
2 Corinthians 5 in the BOKHWOG
2 Corinthians 5 in the BOKSSV
2 Corinthians 5 in the BOLCB
2 Corinthians 5 in the BOLCB2
2 Corinthians 5 in the BOMCV
2 Corinthians 5 in the BONAV
2 Corinthians 5 in the BONCB
2 Corinthians 5 in the BONLT
2 Corinthians 5 in the BONUT2
2 Corinthians 5 in the BOPLNT
2 Corinthians 5 in the BOSCB
2 Corinthians 5 in the BOSNC
2 Corinthians 5 in the BOTLNT
2 Corinthians 5 in the BOVCB
2 Corinthians 5 in the BOYCB
2 Corinthians 5 in the BPBB
2 Corinthians 5 in the BPH
2 Corinthians 5 in the BSB
2 Corinthians 5 in the CCB
2 Corinthians 5 in the CUV
2 Corinthians 5 in the CUVS
2 Corinthians 5 in the DBT
2 Corinthians 5 in the DGDNT
2 Corinthians 5 in the DHNT
2 Corinthians 5 in the DNT
2 Corinthians 5 in the ELBE
2 Corinthians 5 in the EMTV
2 Corinthians 5 in the ESV
2 Corinthians 5 in the FBV
2 Corinthians 5 in the FEB
2 Corinthians 5 in the GGMNT
2 Corinthians 5 in the GNT
2 Corinthians 5 in the HARY
2 Corinthians 5 in the HNT
2 Corinthians 5 in the IRVA
2 Corinthians 5 in the IRVB
2 Corinthians 5 in the IRVG
2 Corinthians 5 in the IRVH
2 Corinthians 5 in the IRVK
2 Corinthians 5 in the IRVM
2 Corinthians 5 in the IRVM2
2 Corinthians 5 in the IRVO
2 Corinthians 5 in the IRVP
2 Corinthians 5 in the IRVT
2 Corinthians 5 in the IRVT2
2 Corinthians 5 in the IRVU
2 Corinthians 5 in the ISVN
2 Corinthians 5 in the JSNT
2 Corinthians 5 in the KAPI
2 Corinthians 5 in the KBT1ETNIK
2 Corinthians 5 in the KBV
2 Corinthians 5 in the KJV
2 Corinthians 5 in the KNFD
2 Corinthians 5 in the LBA
2 Corinthians 5 in the LBLA
2 Corinthians 5 in the LNT
2 Corinthians 5 in the LSV
2 Corinthians 5 in the MAAL
2 Corinthians 5 in the MBV
2 Corinthians 5 in the MBV2
2 Corinthians 5 in the MHNT
2 Corinthians 5 in the MKNFD
2 Corinthians 5 in the MNG
2 Corinthians 5 in the MNT
2 Corinthians 5 in the MNT2
2 Corinthians 5 in the MRS1T
2 Corinthians 5 in the NAA
2 Corinthians 5 in the NASB
2 Corinthians 5 in the NBLA
2 Corinthians 5 in the NBS
2 Corinthians 5 in the NBVTP
2 Corinthians 5 in the NET2
2 Corinthians 5 in the NIV11
2 Corinthians 5 in the NNT
2 Corinthians 5 in the NNT2
2 Corinthians 5 in the NNT3
2 Corinthians 5 in the PDDPT
2 Corinthians 5 in the PFNT
2 Corinthians 5 in the RMNT
2 Corinthians 5 in the SBIAS
2 Corinthians 5 in the SBIBS
2 Corinthians 5 in the SBIBS2
2 Corinthians 5 in the SBICS
2 Corinthians 5 in the SBIDS
2 Corinthians 5 in the SBIGS
2 Corinthians 5 in the SBIHS
2 Corinthians 5 in the SBIIS
2 Corinthians 5 in the SBIIS2
2 Corinthians 5 in the SBIIS3
2 Corinthians 5 in the SBIKS
2 Corinthians 5 in the SBIKS2
2 Corinthians 5 in the SBIMS
2 Corinthians 5 in the SBIOS
2 Corinthians 5 in the SBIPS
2 Corinthians 5 in the SBISS
2 Corinthians 5 in the SBITS
2 Corinthians 5 in the SBITS2
2 Corinthians 5 in the SBITS3
2 Corinthians 5 in the SBITS4
2 Corinthians 5 in the SBIUS
2 Corinthians 5 in the SBIVS
2 Corinthians 5 in the SBT
2 Corinthians 5 in the SBT1E
2 Corinthians 5 in the SCHL
2 Corinthians 5 in the SNT
2 Corinthians 5 in the SUSU
2 Corinthians 5 in the SUSU2
2 Corinthians 5 in the SYNO
2 Corinthians 5 in the TBIAOTANT
2 Corinthians 5 in the TBT1E
2 Corinthians 5 in the TBT1E2
2 Corinthians 5 in the TFTIP
2 Corinthians 5 in the TFTU
2 Corinthians 5 in the TGNTATF3T
2 Corinthians 5 in the THAI
2 Corinthians 5 in the TNFD
2 Corinthians 5 in the TNT
2 Corinthians 5 in the TNTIK
2 Corinthians 5 in the TNTIL
2 Corinthians 5 in the TNTIN
2 Corinthians 5 in the TNTIP
2 Corinthians 5 in the TNTIZ
2 Corinthians 5 in the TOMA
2 Corinthians 5 in the TTENT
2 Corinthians 5 in the UBG
2 Corinthians 5 in the UGV
2 Corinthians 5 in the UGV2
2 Corinthians 5 in the UGV3
2 Corinthians 5 in the VBL
2 Corinthians 5 in the VDCC
2 Corinthians 5 in the YALU
2 Corinthians 5 in the YAPE
2 Corinthians 5 in the YBVTP
2 Corinthians 5 in the ZBP