2 Peter 3 (BOICB)
1 Ndị enyi m, nke a bụ akwụkwọ nke abụọ m na-edetara unu. Nʼime ha abụọ, ihe m mere bụ ichetara unu ihe ndị ahụ niile unu maara na itute uche unu banyere echiche zuruoke. 2 Achọrọ m ka unu cheta okwu ndị amụma dị nsọ kwuru mgbe ochie na iwu nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị nyere site na ndị ozi ya. 3 Na mbụ, unu ga-amata nke a, na nʼoge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-apụta, site nʼịkwa emo gbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ 4 na-asị, “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị? Kemgbe nna nna anyị ha nwụrụ, ihe niile ka dị otu ha dị na mbụ, site nʼokike ụwa.” 5 Ha kpachaara anya chefuo na site nʼogologo oge gara aga, e sitere nʼokwu ọnụ Chineke kee eluigwe ma meekwa ka ụwa dịrị site na mmiri nke gbara ụwa gburugburu. 6 Ọ bụkwa site na mmiri ndị a ka e ji bibie ma laa nʼiyi ụwa nke dị nʼoge ahụ. 7 Ọ bụkwa otu okwu ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị niile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nʼiyi. 8 Ndị enyi m, unu echefula otu okwu a, nʼanya Chineke, otu ụbọchị dịka puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị. 9 Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị. 10 Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya. 11 Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke, 12 dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa. 13 Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị. 14 Bikonu ndị m hụrụ nʼanya, mgbe unu nọ na-ele anya ihe ndị a, jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, ndị na-enweghị ịta ụta na ndị ha na ya dị nʼudo. 15 Chetakwanụ na ntachiobi Onyenwe anyị pụtara nzọpụta, dịka ezi nwanna anyị Pọl jiri amamihe Chineke nyere ya deere unu ihe banyere ya. 16 O na-ede otu ihe ahụ nʼakwụkwọ ozi ya niile, na-ekwu ihe banyere ihe ndị a nʼime ha. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta nke ndị nzuzu na ndị na-amaghị ihe na-akọwa dịka ha si chepụta nʼobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere dịka ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ, si otu a wetara onwe ha ịla nʼiyi. 17 Ya mere, ezi ndị enyi m, ebe unu matara nke a, nọrọnụ na nche ka a ghara isite na njehie ndị na-emebi iwu duhie unu, ime ka unu si nʼọnọdụ unu daa. 18 Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen.
In Other Versions
2 Peter 3 in the ANGEFD
2 Peter 3 in the ANTPNG2D
2 Peter 3 in the AS21
2 Peter 3 in the BAGH
2 Peter 3 in the BBPNG
2 Peter 3 in the BBT1E
2 Peter 3 in the BDS
2 Peter 3 in the BEV
2 Peter 3 in the BHAD
2 Peter 3 in the BIB
2 Peter 3 in the BLPT
2 Peter 3 in the BNT
2 Peter 3 in the BNTABOOT
2 Peter 3 in the BNTLV
2 Peter 3 in the BOATCB
2 Peter 3 in the BOATCB2
2 Peter 3 in the BOBCV
2 Peter 3 in the BOCNT
2 Peter 3 in the BOECS
2 Peter 3 in the BOGWICC
2 Peter 3 in the BOHCB
2 Peter 3 in the BOHCV
2 Peter 3 in the BOHLNT
2 Peter 3 in the BOHNTLTAL
2 Peter 3 in the BOILNTAP
2 Peter 3 in the BOITCV
2 Peter 3 in the BOKCV
2 Peter 3 in the BOKCV2
2 Peter 3 in the BOKHWOG
2 Peter 3 in the BOKSSV
2 Peter 3 in the BOLCB
2 Peter 3 in the BOLCB2
2 Peter 3 in the BOMCV
2 Peter 3 in the BONAV
2 Peter 3 in the BONCB
2 Peter 3 in the BONLT
2 Peter 3 in the BONUT2
2 Peter 3 in the BOPLNT
2 Peter 3 in the BOSCB
2 Peter 3 in the BOSNC
2 Peter 3 in the BOTLNT
2 Peter 3 in the BOVCB
2 Peter 3 in the BOYCB
2 Peter 3 in the BPBB
2 Peter 3 in the BPH
2 Peter 3 in the BSB
2 Peter 3 in the CCB
2 Peter 3 in the CUV
2 Peter 3 in the CUVS
2 Peter 3 in the DBT
2 Peter 3 in the DGDNT
2 Peter 3 in the DHNT
2 Peter 3 in the DNT
2 Peter 3 in the ELBE
2 Peter 3 in the EMTV
2 Peter 3 in the ESV
2 Peter 3 in the FBV
2 Peter 3 in the FEB
2 Peter 3 in the GGMNT
2 Peter 3 in the GNT
2 Peter 3 in the HARY
2 Peter 3 in the HNT
2 Peter 3 in the IRVA
2 Peter 3 in the IRVB
2 Peter 3 in the IRVG
2 Peter 3 in the IRVH
2 Peter 3 in the IRVK
2 Peter 3 in the IRVM
2 Peter 3 in the IRVM2
2 Peter 3 in the IRVO
2 Peter 3 in the IRVP
2 Peter 3 in the IRVT
2 Peter 3 in the IRVT2
2 Peter 3 in the IRVU
2 Peter 3 in the ISVN
2 Peter 3 in the JSNT
2 Peter 3 in the KAPI
2 Peter 3 in the KBT1ETNIK
2 Peter 3 in the KBV
2 Peter 3 in the KJV
2 Peter 3 in the KNFD
2 Peter 3 in the LBA
2 Peter 3 in the LBLA
2 Peter 3 in the LNT
2 Peter 3 in the LSV
2 Peter 3 in the MAAL
2 Peter 3 in the MBV
2 Peter 3 in the MBV2
2 Peter 3 in the MHNT
2 Peter 3 in the MKNFD
2 Peter 3 in the MNG
2 Peter 3 in the MNT
2 Peter 3 in the MNT2
2 Peter 3 in the MRS1T
2 Peter 3 in the NAA
2 Peter 3 in the NASB
2 Peter 3 in the NBLA
2 Peter 3 in the NBS
2 Peter 3 in the NBVTP
2 Peter 3 in the NET2
2 Peter 3 in the NIV11
2 Peter 3 in the NNT
2 Peter 3 in the NNT2
2 Peter 3 in the NNT3
2 Peter 3 in the PDDPT
2 Peter 3 in the PFNT
2 Peter 3 in the RMNT
2 Peter 3 in the SBIAS
2 Peter 3 in the SBIBS
2 Peter 3 in the SBIBS2
2 Peter 3 in the SBICS
2 Peter 3 in the SBIDS
2 Peter 3 in the SBIGS
2 Peter 3 in the SBIHS
2 Peter 3 in the SBIIS
2 Peter 3 in the SBIIS2
2 Peter 3 in the SBIIS3
2 Peter 3 in the SBIKS
2 Peter 3 in the SBIKS2
2 Peter 3 in the SBIMS
2 Peter 3 in the SBIOS
2 Peter 3 in the SBIPS
2 Peter 3 in the SBISS
2 Peter 3 in the SBITS
2 Peter 3 in the SBITS2
2 Peter 3 in the SBITS3
2 Peter 3 in the SBITS4
2 Peter 3 in the SBIUS
2 Peter 3 in the SBIVS
2 Peter 3 in the SBT
2 Peter 3 in the SBT1E
2 Peter 3 in the SCHL
2 Peter 3 in the SNT
2 Peter 3 in the SUSU
2 Peter 3 in the SUSU2
2 Peter 3 in the SYNO
2 Peter 3 in the TBIAOTANT
2 Peter 3 in the TBT1E
2 Peter 3 in the TBT1E2
2 Peter 3 in the TFTIP
2 Peter 3 in the TFTU
2 Peter 3 in the TGNTATF3T
2 Peter 3 in the THAI
2 Peter 3 in the TNFD
2 Peter 3 in the TNT
2 Peter 3 in the TNTIK
2 Peter 3 in the TNTIL
2 Peter 3 in the TNTIN
2 Peter 3 in the TNTIP
2 Peter 3 in the TNTIZ
2 Peter 3 in the TOMA
2 Peter 3 in the TTENT
2 Peter 3 in the UBG
2 Peter 3 in the UGV
2 Peter 3 in the UGV2
2 Peter 3 in the UGV3
2 Peter 3 in the VBL
2 Peter 3 in the VDCC
2 Peter 3 in the YALU
2 Peter 3 in the YAPE
2 Peter 3 in the YBVTP
2 Peter 3 in the ZBP