2 Samuel 21 (BOICB)

1 Ụnwụ dara afọ atọ nʼoge Devid na-achị, afọ kwa afọ. Devid chọrọ ihu ONYENWE ANYỊ. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sịrị, “Ọ bụ maka Sọl na ọbara ụlọ ya kwafuru, nʼihi na o gburu ndị Gibiọn.” 2 Eze kpọrọ ndị Gibiọn, gwa ha okwu. (Ndị Gibiọn abụghị ndị Izrel, kama ha bụ ndị fọdụrụ nʼime ndị Amọrait, ndị bi nʼala Kenan mgbe ụmụ Izrel batara. Mgbe ahụ ha batara, ndị Izrel ṅụrụ iyi nye ndị Gibiọn na ha agaghị egbu ha, ma Sọl sitere nʼịnụ ọkụ nke obi nʼihi Izrel na Juda chọọ ikpochapụ ha.) 3 Devid jụrụ ndị Gibiọn ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere unu? Gịnị ka m ga-eji kpuchie mmehie a e mere megide unu, ime ka unu gọzie ihe nketa ONYENWE ANYỊ?” 4 Ndị Gibiọn zara ya sị, “Nsogbu anyị na Sọl na ndị ụlọ ya abụghị ihe a ga-eji ọlaọcha maọbụ ọlaedo mezie. Anyị achọkwaghị ka onye ọbụla nʼIzrel nwụọ nʼihi anyị.”Devid sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 5 Ha zara eze sị, “Kwere ka anyị wezuga nwoke ahụ wetaara anyị mbibi na ịla nʼiyi, onye ahụ mere ka anyị ghara inwe ebe obibi ọbụla nʼala Izrel. 6 Ka akpọnye anyị ndị ikom asaa site nʼụmụ ya, ka anyị kwụgbuo ha nye ONYENWE ANYỊ na Gibea Sọl, onye ONYENWE ANYỊ họpụtara.”Eze zara sị, “Aga m akpọnye unu ha.” 7 Ma eze nwere ọmịiko nʼahụ Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, nʼihi ịgba ndụ dị nʼetiti ya na Jonatan nʼihu ONYENWE ANYỊ. 8 Ma eze kpọọrọ Amoni na Mefiboshet, ụmụ ndị ikom abụọ nke Rizpa, nwa nwanyị Aịa, bụ ndị ọ mụtaara Sọl. Nakwa ụmụ ndị ikom ise nke Merab nwa Sọl mụtara mgbe ọ bụ nwunye Adriel, nwa Bazilai onye Mehola. 9 O nyefere ha niile nʼaka ndị Gibiọn; ndị Gibiọn kwụbakwara ha nʼugwu nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ha asaa nwụrụ nʼotu ụbọchị na mmalite owuwe ihe ubi nke ọka balị. 10 Ma Rizpa, nwa nwanyị Aịa were akwa mkpe gbasara onwe ya nʼelu nkume. O kweghịkwa ka anụ ufe bekwasị ha nʼehihie, maọbụ anụ ọhịa nʼabalị. Ọ nọgidere nʼebe ahụ site nʼoge mmalite owuwe ihe ubi tutu ruo mgbe mmiri bidoro izokwasị anụ ahụ ha. 11 Mgbe a gwara Devid ihe Rizpa, nwa nwanyị Aịa, iko nwanyị Sọl mere, 12 ọ gara chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya Jonatan site nʼaka ndị nwe obodo Jebesh Gilead. Ha gara na nzuzo zuru ozu Sọl na Jonatan site nʼama dị na Bet-Shan, ebe ndị Filistia kwụbara ha, oge ha gburu Sọl na Gilboa. 13 Devid sitere nʼebe ahụ chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan, chịkọtaakwa ọkpụkpụ ndị ahụ akwụgburu. 14 Ha liri ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan nʼobodo Zela nʼala Benjamin, nʼime ili Kish nna Sọl, meekwa ihe ndị ọzọ niile eze nyere nʼiwu. Mgbe nke a gasịrị, Chineke zara ekpere nʼihi ala ahụ. 15 Emesịa, ndị Filistia busokwara Izrel agha ọzọ. Devid na ndị agha ya pụkwara ịlụso ha ọgụ. Nʼoge ha na-alụ ọgụ a, ike gwụrụ Devid nke ukwuu. 16 Mgbe ahụ, Ishibi-Benob, otu onye agbụrụ Rafa, onye ịdị arọ nke bronz dị nʼọnụ ùbe ya ruru kilogram atọ na ọkara, onye jikwa mma agha ọhụrụ, bịaruru Devid nso chọọ igbu ya. 17 Ma Abishai nwa Zeruaya bịara nyere Devid aka, tigbuo onye Filistia ahụ. Site nʼoge ahụ, ndị ikom Devid ṅụrụ iyi sị ya, “Ị gaghị esokwa anyị gaa ibu agha ọzọ! Ka a ghara imenyụ oriọna Izrel.” 18 Mgbe oge gaturu, ha na ndị Filistia lụrụ agha ọzọ na Gob. Nʼoge a, Sibekai, onye Husha, gburu Saf, otu nʼime ndị agbụrụ Rafa. 19 Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ na Gob, Elhanan nwa Jaịa onye Betlehem gburu nwanne Golaịat onye Gat, onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa. 20 Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa. 21 Mgbe ọ kọchara Izrel, Jonatan nwa Shimei, nwanne nwoke Devid, gburu ya. 22 Mmadụ anọ ndị a bụ ndị agbụrụ Rafa dị na Gat. Devid na ndị agha ya gburu ha niile.

In Other Versions

2 Samuel 21 in the ANGEFD

2 Samuel 21 in the ANTPNG2D

2 Samuel 21 in the AS21

2 Samuel 21 in the BAGH

2 Samuel 21 in the BBPNG

2 Samuel 21 in the BBT1E

2 Samuel 21 in the BDS

2 Samuel 21 in the BEV

2 Samuel 21 in the BHAD

2 Samuel 21 in the BIB

2 Samuel 21 in the BLPT

2 Samuel 21 in the BNT

2 Samuel 21 in the BNTABOOT

2 Samuel 21 in the BNTLV

2 Samuel 21 in the BOATCB

2 Samuel 21 in the BOATCB2

2 Samuel 21 in the BOBCV

2 Samuel 21 in the BOCNT

2 Samuel 21 in the BOECS

2 Samuel 21 in the BOGWICC

2 Samuel 21 in the BOHCB

2 Samuel 21 in the BOHCV

2 Samuel 21 in the BOHLNT

2 Samuel 21 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 21 in the BOILNTAP

2 Samuel 21 in the BOITCV

2 Samuel 21 in the BOKCV

2 Samuel 21 in the BOKCV2

2 Samuel 21 in the BOKHWOG

2 Samuel 21 in the BOKSSV

2 Samuel 21 in the BOLCB

2 Samuel 21 in the BOLCB2

2 Samuel 21 in the BOMCV

2 Samuel 21 in the BONAV

2 Samuel 21 in the BONCB

2 Samuel 21 in the BONLT

2 Samuel 21 in the BONUT2

2 Samuel 21 in the BOPLNT

2 Samuel 21 in the BOSCB

2 Samuel 21 in the BOSNC

2 Samuel 21 in the BOTLNT

2 Samuel 21 in the BOVCB

2 Samuel 21 in the BOYCB

2 Samuel 21 in the BPBB

2 Samuel 21 in the BPH

2 Samuel 21 in the BSB

2 Samuel 21 in the CCB

2 Samuel 21 in the CUV

2 Samuel 21 in the CUVS

2 Samuel 21 in the DBT

2 Samuel 21 in the DGDNT

2 Samuel 21 in the DHNT

2 Samuel 21 in the DNT

2 Samuel 21 in the ELBE

2 Samuel 21 in the EMTV

2 Samuel 21 in the ESV

2 Samuel 21 in the FBV

2 Samuel 21 in the FEB

2 Samuel 21 in the GGMNT

2 Samuel 21 in the GNT

2 Samuel 21 in the HARY

2 Samuel 21 in the HNT

2 Samuel 21 in the IRVA

2 Samuel 21 in the IRVB

2 Samuel 21 in the IRVG

2 Samuel 21 in the IRVH

2 Samuel 21 in the IRVK

2 Samuel 21 in the IRVM

2 Samuel 21 in the IRVM2

2 Samuel 21 in the IRVO

2 Samuel 21 in the IRVP

2 Samuel 21 in the IRVT

2 Samuel 21 in the IRVT2

2 Samuel 21 in the IRVU

2 Samuel 21 in the ISVN

2 Samuel 21 in the JSNT

2 Samuel 21 in the KAPI

2 Samuel 21 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 21 in the KBV

2 Samuel 21 in the KJV

2 Samuel 21 in the KNFD

2 Samuel 21 in the LBA

2 Samuel 21 in the LBLA

2 Samuel 21 in the LNT

2 Samuel 21 in the LSV

2 Samuel 21 in the MAAL

2 Samuel 21 in the MBV

2 Samuel 21 in the MBV2

2 Samuel 21 in the MHNT

2 Samuel 21 in the MKNFD

2 Samuel 21 in the MNG

2 Samuel 21 in the MNT

2 Samuel 21 in the MNT2

2 Samuel 21 in the MRS1T

2 Samuel 21 in the NAA

2 Samuel 21 in the NASB

2 Samuel 21 in the NBLA

2 Samuel 21 in the NBS

2 Samuel 21 in the NBVTP

2 Samuel 21 in the NET2

2 Samuel 21 in the NIV11

2 Samuel 21 in the NNT

2 Samuel 21 in the NNT2

2 Samuel 21 in the NNT3

2 Samuel 21 in the PDDPT

2 Samuel 21 in the PFNT

2 Samuel 21 in the RMNT

2 Samuel 21 in the SBIAS

2 Samuel 21 in the SBIBS

2 Samuel 21 in the SBIBS2

2 Samuel 21 in the SBICS

2 Samuel 21 in the SBIDS

2 Samuel 21 in the SBIGS

2 Samuel 21 in the SBIHS

2 Samuel 21 in the SBIIS

2 Samuel 21 in the SBIIS2

2 Samuel 21 in the SBIIS3

2 Samuel 21 in the SBIKS

2 Samuel 21 in the SBIKS2

2 Samuel 21 in the SBIMS

2 Samuel 21 in the SBIOS

2 Samuel 21 in the SBIPS

2 Samuel 21 in the SBISS

2 Samuel 21 in the SBITS

2 Samuel 21 in the SBITS2

2 Samuel 21 in the SBITS3

2 Samuel 21 in the SBITS4

2 Samuel 21 in the SBIUS

2 Samuel 21 in the SBIVS

2 Samuel 21 in the SBT

2 Samuel 21 in the SBT1E

2 Samuel 21 in the SCHL

2 Samuel 21 in the SNT

2 Samuel 21 in the SUSU

2 Samuel 21 in the SUSU2

2 Samuel 21 in the SYNO

2 Samuel 21 in the TBIAOTANT

2 Samuel 21 in the TBT1E

2 Samuel 21 in the TBT1E2

2 Samuel 21 in the TFTIP

2 Samuel 21 in the TFTU

2 Samuel 21 in the TGNTATF3T

2 Samuel 21 in the THAI

2 Samuel 21 in the TNFD

2 Samuel 21 in the TNT

2 Samuel 21 in the TNTIK

2 Samuel 21 in the TNTIL

2 Samuel 21 in the TNTIN

2 Samuel 21 in the TNTIP

2 Samuel 21 in the TNTIZ

2 Samuel 21 in the TOMA

2 Samuel 21 in the TTENT

2 Samuel 21 in the UBG

2 Samuel 21 in the UGV

2 Samuel 21 in the UGV2

2 Samuel 21 in the UGV3

2 Samuel 21 in the VBL

2 Samuel 21 in the VDCC

2 Samuel 21 in the YALU

2 Samuel 21 in the YAPE

2 Samuel 21 in the YBVTP

2 Samuel 21 in the ZBP