2 Thessalonians 1 (BOICB)
1 Pọl, na Saịlas, na Timoti dere akwụkwọ a, Na-edegara nzukọ dị nʼobodo Tesalonaịka nʼime Chineke Nna anyị, na nʼime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 2 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. 3 Ụmụnna, anyị aghaghị ikele Chineke ekele mgbe niile banyere unu. O kwesiri ka anyị mee otu a, nʼihi okwukwe unu na-abawanye. Ịhụnanya onye ọbụla nʼime unu nwere nʼebe ibe ya nọ na-abawanyekwa. 4 Nʼihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nʼetiti nzukọ Chineke niile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachiobi nọgidesie ike nʼime nsogbu niile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu, ọ bụladị nʼetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu. 5 Ihe ndị a niile na-egosi na ikpe Chineke bụ nke ziri ezi, nke e ji eme unu ndị kwesiri alaeze Chineke, nke unu na-ata ahụhụ nʼihi ya. 6 Chineke bụ onye ezi omume nʼezie. Ọ ga-eji mkpagbu kwụghachi ndị na-akpagbu unu. 7 Ọ ga-enyekwa unu bụ ndị a na-akpagbu na anyị onwe anyị ezumike. Ọ ga-eme nke a mgbe a ga-eme ka Onyenwe anyị Jisọs ya na ndị mmụọ ozi si nʼeluigwe pụta ìhè. 8 Ọ ga-abịa nʼụdị ire ọkụ taa ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ na ndị jụrụ ịnabata oziọma nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 9 Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya, 10 nʼụbọchị ahụ ọ ga-abịa ịnara ịja mma na otuto, nʼime ndị nsọ ya, ya na ka ọ bụrụ ihe ịtụnanya nʼebe ndị kweerenụ nọ, nʼihi na unu kwenyere ama nke oziọma ahụ anyị gbaara unu. 11 Nʼihi nke a, anyị na-anọgide nʼekpere nʼihi unu, na-arịọ ka Chineke gụọ unu dịka ndị kwesiri ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, na-arịọkwa ka o site nʼike ya mee ka unu mezuo ebumnobi nke ihe dị mma, na ezi ọrụ niile nke okwukwe. 12 Ka e nye aha Onyenwe anyị Jisọs otuto nʼime unu, unu onwe unu nʼime ya kwa, dị ka amara nke Chineke anyị na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst si dị.
In Other Versions
2 Thessalonians 1 in the ANGEFD
2 Thessalonians 1 in the ANTPNG2D
2 Thessalonians 1 in the BBPNG
2 Thessalonians 1 in the BBT1E
2 Thessalonians 1 in the BNTABOOT
2 Thessalonians 1 in the BNTLV
2 Thessalonians 1 in the BOATCB
2 Thessalonians 1 in the BOATCB2
2 Thessalonians 1 in the BOBCV
2 Thessalonians 1 in the BOCNT
2 Thessalonians 1 in the BOECS
2 Thessalonians 1 in the BOGWICC
2 Thessalonians 1 in the BOHCB
2 Thessalonians 1 in the BOHCV
2 Thessalonians 1 in the BOHLNT
2 Thessalonians 1 in the BOHNTLTAL
2 Thessalonians 1 in the BOILNTAP
2 Thessalonians 1 in the BOITCV
2 Thessalonians 1 in the BOKCV
2 Thessalonians 1 in the BOKCV2
2 Thessalonians 1 in the BOKHWOG
2 Thessalonians 1 in the BOKSSV
2 Thessalonians 1 in the BOLCB
2 Thessalonians 1 in the BOLCB2
2 Thessalonians 1 in the BOMCV
2 Thessalonians 1 in the BONAV
2 Thessalonians 1 in the BONCB
2 Thessalonians 1 in the BONLT
2 Thessalonians 1 in the BONUT2
2 Thessalonians 1 in the BOPLNT
2 Thessalonians 1 in the BOSCB
2 Thessalonians 1 in the BOSNC
2 Thessalonians 1 in the BOTLNT
2 Thessalonians 1 in the BOVCB
2 Thessalonians 1 in the BOYCB
2 Thessalonians 1 in the DGDNT
2 Thessalonians 1 in the GGMNT
2 Thessalonians 1 in the IRVM2
2 Thessalonians 1 in the IRVT2
2 Thessalonians 1 in the KBT1ETNIK
2 Thessalonians 1 in the MKNFD
2 Thessalonians 1 in the MRS1T
2 Thessalonians 1 in the NBVTP
2 Thessalonians 1 in the NIV11
2 Thessalonians 1 in the PDDPT
2 Thessalonians 1 in the SBIAS
2 Thessalonians 1 in the SBIBS
2 Thessalonians 1 in the SBIBS2
2 Thessalonians 1 in the SBICS
2 Thessalonians 1 in the SBIDS
2 Thessalonians 1 in the SBIGS
2 Thessalonians 1 in the SBIHS
2 Thessalonians 1 in the SBIIS
2 Thessalonians 1 in the SBIIS2
2 Thessalonians 1 in the SBIIS3
2 Thessalonians 1 in the SBIKS
2 Thessalonians 1 in the SBIKS2
2 Thessalonians 1 in the SBIMS
2 Thessalonians 1 in the SBIOS
2 Thessalonians 1 in the SBIPS
2 Thessalonians 1 in the SBISS
2 Thessalonians 1 in the SBITS
2 Thessalonians 1 in the SBITS2
2 Thessalonians 1 in the SBITS3
2 Thessalonians 1 in the SBITS4
2 Thessalonians 1 in the SBIUS
2 Thessalonians 1 in the SBIVS
2 Thessalonians 1 in the SBT1E
2 Thessalonians 1 in the SUSU2
2 Thessalonians 1 in the TBIAOTANT
2 Thessalonians 1 in the TBT1E
2 Thessalonians 1 in the TBT1E2
2 Thessalonians 1 in the TFTIP
2 Thessalonians 1 in the TGNTATF3T
2 Thessalonians 1 in the TNTIK
2 Thessalonians 1 in the TNTIL
2 Thessalonians 1 in the TNTIN
2 Thessalonians 1 in the TNTIP
2 Thessalonians 1 in the TNTIZ
2 Thessalonians 1 in the TTENT