2 Timothy 4 (BOICB)
1 Ya mere, ana m adụsi gị ọdụ ike nʼihu Chineke na nʼihu Kraịst Jisọs, onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. Ejikwa m ọbịbịa ya na alaeze ya na-asị gị, 2 kwusaa okwu ahụ mgbe niile; dịkwa njikere, mgbe o kwesiri ekwesi na mgbe ọ na-ekwesighị, jiri ya nye ntụziaka, jiri ya baa mba, jirikwa ya gbaa ndị mmadụ ume, site na ntachiobi na ilezi anya inye ezi ndụmọdụ. 3 Nʼihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị ịchọ ndị ozizi ha ga-eji gbaa onwe ha gburugburu, ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ. 4 Ha agaghị ege ntị nʼeziokwu ahụ, kama ha ga-ege ntị nʼakụkọ na-enweghị isi. 5 Ma guzosie ike, nọọ na nche mgbe niile, na-edi ahụhụ, na-arụkwa ọrụ gị dịka onye oziọma. Rụzukwaa ihe ị kwesiri ịrụ nʼọrụ gị. 6 Nʼihi na ugbu a, abụrụla m rịị onye a na-awụpụ dị ka aja ihe ọṅụṅụ, oge ụla m eruokwala. 7 Alụsịala m ọgụ ọma ahụ, agbasịala m ọsọ ahụ, edebezuokwala m okwukwe ahụ. 8 Ugbu a, e deberela m okpueze nke ezi omume, nke Onyenwe anyị, onye ikpe ezi omume ahụ, ga-enye m nʼụbọchị ahụ. Ma ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, kama ọ ga-enyekwa ya ndị ahụ niile ọ na-agụsị agụ ike ịhụ ya anya. 9 Gbalịsie ike ịbịakwute m ọsịịsọ, 10 nʼihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nʼanya ahapụla m gaa Tesalonaịka. Kresens agaala Galeshịa, Taịtọs agakwaala Dalmetia. 11 Ọ bụ naanị Luk nọnyere m. Mgbe ị na-abịa, kpọta Mak nʼihi na ọ ga-enyere m aka nʼije ozi m. 12 Ezipụla m Taịkikọs ka ọ gaa Efesọs. 13 Mgbe ị na-abịa, wetara m uwe m ji achụ oyi, bụ nke m hapụrụ nʼaka Kapọs na Troas, wetakwara m akwụkwọ m niile ahụ dị nʼebe ahụ, ọkachasị akwụkwọ akpụkpọ anụ niile ahụ. 14 Alegzanda onye na-akpụ ọla emeela m ọtụtụ ihe ọjọọ. Onyenwe anyị ga-akwụghachi ya dị ka ihe o mere m si dị. 15 Kpachara anya nʼebe ọ nọ, nʼihi na o guzosiri ike megide ihe niile anyị kwuru. 16 Na mbụ, mgbe m pụtara ikpere ọnụ m, ọ dịghị onye kwụnyeere m. Ha niile gbahapụrụ m. Ka a hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie. 17 Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ike ikwusa oziọma ka ndị mba ọzọ niile nụrụ ya. Ọ zọpụtara m, site nʼọnụ ọdụm. 18 Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 19 Keleere m Prisila na Akwila na ndị niile bi nʼụlọ Onisiferọs. 20 Erastọs nọ na Kọrint, ma ahapụrụ m Trofimọs na Melitọs nʼọnọdụ ahụ esighị ike. 21 Jisie ike bịarute nʼebe a tupu oge oyi eruo. Yubulọs na-ekele gị, ya na Pudins, na Lainọs na Klọdia na ụmụnna anyị niile. 22 Ka Onyenwe anyị nọnyere mmụọ gị. Ka amara dịnyere gị.
In Other Versions
2 Timothy 4 in the ANGEFD
2 Timothy 4 in the ANTPNG2D
2 Timothy 4 in the AS21
2 Timothy 4 in the BAGH
2 Timothy 4 in the BBPNG
2 Timothy 4 in the BBT1E
2 Timothy 4 in the BDS
2 Timothy 4 in the BEV
2 Timothy 4 in the BHAD
2 Timothy 4 in the BIB
2 Timothy 4 in the BLPT
2 Timothy 4 in the BNT
2 Timothy 4 in the BNTABOOT
2 Timothy 4 in the BNTLV
2 Timothy 4 in the BOATCB
2 Timothy 4 in the BOATCB2
2 Timothy 4 in the BOBCV
2 Timothy 4 in the BOCNT
2 Timothy 4 in the BOECS
2 Timothy 4 in the BOGWICC
2 Timothy 4 in the BOHCB
2 Timothy 4 in the BOHCV
2 Timothy 4 in the BOHLNT
2 Timothy 4 in the BOHNTLTAL
2 Timothy 4 in the BOILNTAP
2 Timothy 4 in the BOITCV
2 Timothy 4 in the BOKCV
2 Timothy 4 in the BOKCV2
2 Timothy 4 in the BOKHWOG
2 Timothy 4 in the BOKSSV
2 Timothy 4 in the BOLCB
2 Timothy 4 in the BOLCB2
2 Timothy 4 in the BOMCV
2 Timothy 4 in the BONAV
2 Timothy 4 in the BONCB
2 Timothy 4 in the BONLT
2 Timothy 4 in the BONUT2
2 Timothy 4 in the BOPLNT
2 Timothy 4 in the BOSCB
2 Timothy 4 in the BOSNC
2 Timothy 4 in the BOTLNT
2 Timothy 4 in the BOVCB
2 Timothy 4 in the BOYCB
2 Timothy 4 in the BPBB
2 Timothy 4 in the BPH
2 Timothy 4 in the BSB
2 Timothy 4 in the CCB
2 Timothy 4 in the CUV
2 Timothy 4 in the CUVS
2 Timothy 4 in the DBT
2 Timothy 4 in the DGDNT
2 Timothy 4 in the DHNT
2 Timothy 4 in the DNT
2 Timothy 4 in the ELBE
2 Timothy 4 in the EMTV
2 Timothy 4 in the ESV
2 Timothy 4 in the FBV
2 Timothy 4 in the FEB
2 Timothy 4 in the GGMNT
2 Timothy 4 in the GNT
2 Timothy 4 in the HARY
2 Timothy 4 in the HNT
2 Timothy 4 in the IRVA
2 Timothy 4 in the IRVB
2 Timothy 4 in the IRVG
2 Timothy 4 in the IRVH
2 Timothy 4 in the IRVK
2 Timothy 4 in the IRVM
2 Timothy 4 in the IRVM2
2 Timothy 4 in the IRVO
2 Timothy 4 in the IRVP
2 Timothy 4 in the IRVT
2 Timothy 4 in the IRVT2
2 Timothy 4 in the IRVU
2 Timothy 4 in the ISVN
2 Timothy 4 in the JSNT
2 Timothy 4 in the KAPI
2 Timothy 4 in the KBT1ETNIK
2 Timothy 4 in the KBV
2 Timothy 4 in the KJV
2 Timothy 4 in the KNFD
2 Timothy 4 in the LBA
2 Timothy 4 in the LBLA
2 Timothy 4 in the LNT
2 Timothy 4 in the LSV
2 Timothy 4 in the MAAL
2 Timothy 4 in the MBV
2 Timothy 4 in the MBV2
2 Timothy 4 in the MHNT
2 Timothy 4 in the MKNFD
2 Timothy 4 in the MNG
2 Timothy 4 in the MNT
2 Timothy 4 in the MNT2
2 Timothy 4 in the MRS1T
2 Timothy 4 in the NAA
2 Timothy 4 in the NASB
2 Timothy 4 in the NBLA
2 Timothy 4 in the NBS
2 Timothy 4 in the NBVTP
2 Timothy 4 in the NET2
2 Timothy 4 in the NIV11
2 Timothy 4 in the NNT
2 Timothy 4 in the NNT2
2 Timothy 4 in the NNT3
2 Timothy 4 in the PDDPT
2 Timothy 4 in the PFNT
2 Timothy 4 in the RMNT
2 Timothy 4 in the SBIAS
2 Timothy 4 in the SBIBS
2 Timothy 4 in the SBIBS2
2 Timothy 4 in the SBICS
2 Timothy 4 in the SBIDS
2 Timothy 4 in the SBIGS
2 Timothy 4 in the SBIHS
2 Timothy 4 in the SBIIS
2 Timothy 4 in the SBIIS2
2 Timothy 4 in the SBIIS3
2 Timothy 4 in the SBIKS
2 Timothy 4 in the SBIKS2
2 Timothy 4 in the SBIMS
2 Timothy 4 in the SBIOS
2 Timothy 4 in the SBIPS
2 Timothy 4 in the SBISS
2 Timothy 4 in the SBITS
2 Timothy 4 in the SBITS2
2 Timothy 4 in the SBITS3
2 Timothy 4 in the SBITS4
2 Timothy 4 in the SBIUS
2 Timothy 4 in the SBIVS
2 Timothy 4 in the SBT
2 Timothy 4 in the SBT1E
2 Timothy 4 in the SCHL
2 Timothy 4 in the SNT
2 Timothy 4 in the SUSU
2 Timothy 4 in the SUSU2
2 Timothy 4 in the SYNO
2 Timothy 4 in the TBIAOTANT
2 Timothy 4 in the TBT1E
2 Timothy 4 in the TBT1E2
2 Timothy 4 in the TFTIP
2 Timothy 4 in the TFTU
2 Timothy 4 in the TGNTATF3T
2 Timothy 4 in the THAI
2 Timothy 4 in the TNFD
2 Timothy 4 in the TNT
2 Timothy 4 in the TNTIK
2 Timothy 4 in the TNTIL
2 Timothy 4 in the TNTIN
2 Timothy 4 in the TNTIP
2 Timothy 4 in the TNTIZ
2 Timothy 4 in the TOMA
2 Timothy 4 in the TTENT
2 Timothy 4 in the UBG
2 Timothy 4 in the UGV
2 Timothy 4 in the UGV2
2 Timothy 4 in the UGV3
2 Timothy 4 in the VBL
2 Timothy 4 in the VDCC
2 Timothy 4 in the YALU
2 Timothy 4 in the YAPE
2 Timothy 4 in the YBVTP
2 Timothy 4 in the ZBP